Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mezaịa Ọ̀ Dị Anyị Mkpa?

Mezaịa Ọ̀ Dị Anyị Mkpa?

Mezaịa Ọ̀ Dị Anyị Mkpa?

Ị PỤRỤ ịdị na-ajụ ajụjụ ahụ bụ́, “Mezaịa ọ̀ dị anyị mkpa?” Ee, ọ ga-abụ ihe kwesịrị ekwesị ịjụ ma è nwere ezigbo uru Mezaịa ga-abara gị.

Ụfọdụ ndị ị pụrụ iji ihe ha kwuru kpọrọ ihe ga-emesi gị obi ike na azịza ya doro nnọọ anya: Mezaịa dị gị mkpa n’ezie, dịkwa ka ọ dị onye ọ bụla ọzọ. Otu ọkachamara n’Iwu ndị Juu na narị afọ mbụ dere banyere Mezaịa ahụ, sị: “N’agbanyeghị ole nkwa Chineke dị, ha abụrụwo Ee site na ya.” O si otú ahụ kọwaa ọrụ dị oké mkpa Mezaịa ahụ ga-arụ n’imezu nzube Onye Okike anyị bụ́ ịgọzi mba nile nke ụwa. (2 Ndị Kọrint 1:20) Ihe Mezaịa ahụ ga-arụ dị nnọọ oké mkpa nke na Bible buru amụma banyere ọbịbịa na ndụ elu ala ya. Henry H. Halley kwuru n’akwụkwọ ya nke ọtụtụ nde mmadụ jirila mee ihe ruo afọ 70, sị: “E dere Agba Ochie iji mee ka ndị mmadụ tụwa anya Ọbịbịa nke [Mezaịa ahụ] ma kwadebe ha maka ya.” Ma ọbịbịa ya ọ̀ dị mkpa? Gịnị mere i kwesịrị iji chọọ ịma?

“Mezaịa” pụtara n’ezie “Onye E Tere Mmanụ,” ya na okwu ahụ a maara nke ọma bụ́ “Kraịst” pụtakwara otu ihe. Onye a, bụ́ onye akwụkwọ bụ́ Encyclopædia Britannica, Mbipụta ya nke 1970, kpọrọ “onye mgbapụta kasịnụ,” bịara n’ihi àgwà asọpụrụghị Chineke nke di na nwunye mbụ ahụ, bụ́ Adam na Iv, kpara. Ha zuru okè mgbe e kere ha, ha nwekwara olileanya mara mma nke ịdị ndụ ebighị ebi n’ime Paradaịs, ma ha tụfuru olileanya ahụ. Otu mmụọ ozi nke nupụrụ isi, bụ́ onye e mesịrị mara dị ka Setan bụ́ Ekwensu, gwara ha na Onye Okike ha kpagidere ha nnọọ akpagide, nakwa na ọ ga-akara ha mma ịdị na-ekpebiri onwe ha ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ.—Jenesis 3:1-5.

A ghọgburu Iv, ya ekwerekwa ụgha ahụ. Adam sonyeere Ekwensu ná nnupụisi ahụ ọ kpalitere n’ihi na o ji nnọọ mkpakọrịta nke ya na nwunye ya kpọrọ ihe karịa ikwesị ntụkwasị obi nye Chineke. (Jenesis 3:6; 1 Timoti 2:14) Site n’omume ha, ha mere ihe karịrị ịtụfu olileanya ha nwere ịdị ndụ ebighị ebi na paradaịs. Ha bufere ụmụ ha gaje ịmụ mmehie na ihe ga-esi na ya pụta, bụ́ ọnwụ.—Ndị Rom 5:12.

Ozugbo ahụ, Onye Okike anyị, bụ́ Jehova, kpebiri otú ọ ga-esi dozie nsogbu dị iche iche nnupụisi ahụ ga-akpata. Ọ ga-eji ihe mesịrị bụrụ ụkpụrụ dị n’Iwu Mozis—nke bụ́ iji ihe ya na ihe ha nhata akwụ ụgwọ ya—mee ka ihe dịghachi otú ọ dịbu na mbụ. (Deuterọnọmi 19:21; 1 Jọn 3:8) A ghaghị ime ihe kwekọrọ n’ụkpụrụ a ma ọ bụrụ na onye ọ bụla n’ime ụmụ Adam na Iv a mụrụ ná mmehie ga-enweta ndụ agwụghị agwụ n’ụwa paradaịs, bụ́ ihe Onye Okike zubere maka ụmụ mmadụ. Nke a bụ ihe mere Mezaịa ji dị mkpa.

Mgbe Jehova Chineke na-ama Ekwensu ikpe, o buru amụma mbụ dị na Bible, sị: “Iro ka M ga-etinyekwa n’etiti gị na nwanyị ahụ, na n’etiti mkpụrụ gị na mkpụrụ ya: mkpụrụ ahụ ga-echifịa gị n’isi, gị onwe gị ga-echifịakwa ya n’ikiri ụkwụ.” (Jenesis 3:15) Otu onye ọkà mmụta Bible kwuru na “okwu [a] bụ mmalite nke nkwa ndị e kwere banyere mezaịa ahụ n’Akwụkwọ Nsọ.” Ọkà mmụta ọzọ kwuru na Mezaịa ahụ bụ onye Chineke “ga-eji dozie nsogbu nile mmehie mbụ ahụ kpatara,” ma si otú ahụ wetara ụmụ mmadụ ngọzi.—Ndị Hibru 2:14, 15.

Otú ọ dị, ị pụrụ ịma na a gọzibeghị agbụrụ mmadụ. Kama nke ahụ, ha nọ n’enweghị olileanya na n’obi nkoropụ. N’ihi ya, akwụkwọ bụ́ The World Book Encyclopedia na-ekwu na “ọtụtụ ndị Juu ka na-atụ anya ọbịbịa Mezaịa,” nakwa na ha na-atụ anya na ọ “ga-emezi ihe e mehiere emehie ma merie ndị iro nke ndị ya.” Otú ọ dị, Bible na-ekwu na Mezaịa ahụ abịawo. Ọ̀ dị ihe mere a ga-eji kwere ihe ahụ Bible na-ekwu? Isiokwu na-esonụ ga-aza ajụjụ ahụ.