Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nlekọta Iji Mezuo Nzube Chineke

Nlekọta Iji Mezuo Nzube Chineke

Nlekọta Iji Mezuo Nzube Chineke

“[Chineke] ji ihe nile na-arụ ọrụ dị ka uche ya si agwa ya okwu.”—NDỊ EFESỌS 1:11.

1. N’ihi gịnị ka ọgbakọ nile nke Ndịàmà Jehova ga-eji zukọọ n’April 12, 2006?

NÁ MGBEDE Wednesday, April 12, 2006, ihe dị ka nde mmadụ 16 ga-ezukọ maka Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị. N’ebe nile ha ga-ezukọ, a ga-enwe tebụl nke achịcha na-ekoghị eko bụ́ nke na-anọchi anya ahụ́ Kraịst na mmanya na-acha ọbara ọbara nke na-anọchi anya ọbara ya ga-adị n’elu ya. Ka okwu na-akọwa ihe Ncheta ọnwụ Jizọs pụtara na-abịa ná njedebe, a ga-ebugharị ihe nnọchianya abụọ ahụ n’etiti ndị nile bịaranụ—a ga-ebu ụzọ bugharịa achịcha, mgbe nke ahụ gasịrị, e bugharịzie mmanya. N’ọgbakọ ole na ole nke Ndịàmà Jehova, otu onye ma ọ bụ karịa ná ndị bịaranụ ga-ata achịcha ahụ ma ṅụọ mmanya ahụ. Otú ọ dị, n’ọtụtụ ọgbakọ, ọ dịghị onye ga-ata achịcha ahụ ma ọ bụ ṅụọ mmanya ahụ. N’ihi gịnị ka o ji bụrụ nanị Ndị Kraịst ole na ole, bụ́ ndị nwere olileanya ịga eluigwe, na-ata ma na-aṅụ ihe nnọchianya ndị ahụ ebe ihe ka ọtụtụ, bụ́ ndị nwere olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’elu ala, na-adịghị ata ma na-aṅụ ha?

2, 3. (a) Olee otú Jehova si gaa n’ihu n’ike ihe dị ka nzube ya si dị? (b) Olee nzube Jehova ji kee ụwa na mmadụ?

2 Jehova bụ Chineke nke nzube. Iji mezuo ihe o zubere, o “ji ihe nile na-arụ ọrụ dị ka uche ya si agwa ya okwu.” (Ndị Efesọs 1:11) O buru ụzọ kee Ọkpara ọ mụrụ nanị ya. (Jọn 1:1, 14; Mkpughe 3:14) Jehova sizi n’aka Ọkpara ya a kee ezinụlọ nke ụmụ ya ndị bụ́ mmụọ ma mesịa kee eluigwe na ala a na-ahụ anya, tinyere ụwa na ụmụ mmadụ bi n’ime ya.—Job 38:4, 7; Abụ Ọma 103:19-21; Jọn 1:2, 3; Ndị Kọlọsi 1:15, 16.

3 Jehova ekeghị ụwa dị ka ebe ọ ga-anọ nwalee ụmụ mmadụ iji mara ma hà ruru eru isonye n’ezinụlọ nke ụmụ ya ndị bụ́ mmụọ n’eluigwe, dị ka ọtụtụ chọọchị nke Krisendọm na-akụzi. O nwere ihe o bu n’obi kpọmkwem wee kee ya, ọ bụ ka e wee “biri n’ime ya.” (Aịsaịa 45:18) Chineke kere ụwa maka mmadụ, keekwa mmadụ maka ụwa. (Abụ Ọma 115:16) Ihe Chineke zubere bụ ka ụwa nile bụrụ paradaịs nke ndị ezi omume, bụ́ ndị ga-arụ ọrụ na ya ma na-elekọta ya, ga-ebijupụta. Ọ dịtụghị mgbe e kwere di na nwunye mbụ ahụ nkwa na ha ga-emesị gaa eluigwe.—Jenesis 1:26-28; 2:7, 8, 15.

A Mara Nzube Jehova Aka

4. Olee otú e si maa ọbụbụeze Jehova aka n’oge na-adịghị anya e kesịrị mmadụ?

4 Otu nwa mmụọ nke Chineke nupụụrụ ya isi ma kpebisie ike imebi nzube Jehova, si otú ahụ jiri nnwere onwe Chineke nyere ya imere onwe ya nhọrọ mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi. Ọ kpaghasịrị udo nke ndị nile ji ịhụnanya na-edo onwe ha n’okpuru ọbụbụeze Jehova na-enwe. Setan mere ka di na nwunye mbụ ahụ kewapụ onwe ha n’ebe Chineke nọ. (Jenesis 3:1-6) O kwughị na Jehova adịghị ike, kama nke ahụ, o kwuru na ụzọ o si achị ọchịchị adịghị mma, nke bụ́ na o rughịrị Ya ịbụ eze. Otú a ka ihe iseokwu metụtara oruru o ruuru Jehova ịbụ eze si malite n’ụwa n’oge na-adịghị anya e kesịrị mmadụ.

5. Olee ihe iseokwu ọzọ e welitere, oleekwa ndị o metụtara?

5 Setan welitere ihe iseokwu ọzọ ya na nke ọbụbụeze Chineke nwere njikọ n’oge Job. Setan mere ka e nyowe ihe ụmụ mmadụ bu n’obi na-edo onwe ha n’okpuru Jehova ma na-ejere Ya ozi enyowe. Setan kwuru na ụmụ mmadụ na-ejere Jehova ozi n’ihi ọdịmma nke onwe ha nanị, nakwa na ọ bụrụ na e lee ha ule, ha ga-agbakụta Chineke azụ. (Job 1:7-11; 2:4, 5) Ọ bụ ezie na ọ bụ onye na-ejere Jehova ozi n’ụwa ebe a ka e lekwasịrị anya kwuo ihe a, o metụtakwara ụmụ Chineke ndị bụ́ mmụọ, ọbụna Ọkpara Jehova mụrụ nanị ya.

6. Olee otú Jehova si mezuo nzube ya na ihe aha ya pụtara?

6 Iji mezuo nzube ya na ihe aha ya pụtara, Jehova mere onwe ya Onye Amụma na Onye Nzọpụta. * Ọ gwara Setan, sị: “Iro ka M ga-etinyekwa n’etiti gị na nwanyị ahụ, na n’etiti mkpụrụ gị na mkpụrụ ya: mkpụrụ ahụ ga-echifịa gị n’isi, gị onwe gị ga-echifịakwa ya n’ikiri ụkwụ.” (Jenesis 3:15) Site ná Mkpụrụ nke “nwanyị” ya, ma ọ bụ akụkụ nke nzukọ ya dị n’eluigwe, Jehova ga-azaghachi Setan aka ahụ ọ mara ọbụbụeze ya ma mee ka ụmụ Adam nwee olileanya na a ga-azọpụta ha ma mee ka ha dịgide ndụ.—Ndị Rom 5:21; Ndị Galeshia 4:26, 31.

“Ihe Nzuzo Dị Nsọ nke Uche Ya”

7. Olee nzube Jehova kpughere site n’aka Pọl onyeozi?

7 N’akwụkwọ ozi Pọl onyeozi degaara Ndị Kraịst nọ n’Efesọs, ọ kọwara nke ọma otú Jehova si na-elekọta ihe iji mezuo nzube ya. O dere, sị: “O mere ka anyị mara ihe nzuzo dị nsọ nke uche ya. Ihe nzuzo a bụ dị ka ihe dị ya ụtọ si dị bụ́ nke o zubeworo n’ime onwe ya maka nlekọta ihe n’ozuzu nke oge ahụ a kara aka, ya bụ, ịchịkọtaghachi ihe nile n’ime Kraịst, ihe ndị dị n’eluigwe na ihe ndị dị n’ụwa.” (Ndị Efesọs 1:9, 10) Ihe magburu onwe ya Jehova zubere bụ ime ka eluigwe na ụwa dị n’otu, ndị ga-ebijupụta ha abụrụkwa ndị ji ịhụnanya na-edo onwe ha n’okpuru ọbụbụeze ya. (Mkpughe 4:11) A ga-esi otú ahụ doo aha ya nsọ, mee Setan onye ụgha, meekwa ka uche ya mee “n’ụwa, dị ka ọ na-eme n’eluigwe.”—Matiu 6:10.

8. Gịnị ka okwu ahụ a sụgharịrị ịbụ “nlekọta,” pụtara?

8 Jehova ga-eji otu “nlekọta ihe” mezuo “ihe dị ya ụtọ,” ma ọ bụ nzube ya. Pọl ji okwu pụtara “ilekọta ezinụlọ” n’ụzọ nkịtị mee ihe. Ọ bụghị ọchịchị, dị ka Alaeze Mezaịa ahụ, kama ụzọ e si elekọta ihe. * Ụzọ magburu onwe ya Jehova ga-esi elekọta ihe iji mezuo nzube ya gụnyere “ihe nzuzo dị nsọ” bụ́ nke a ga-eji nwayọọ nwayọọ kpughee ka oge na-aga.—Ndị Efesọs 1:10; 3:9.

9. Olee otú Jehova si jiri nwayọọ nwayọọ kpughee ihe nzuzo dị nsọ banyere nzube ya?

9 Jehova ji nwayọọ nwayọọ kpughee otú ọ ga-esi mezuo nzube ya banyere Mkpụrụ ahụ e kwere ná nkwa n’Iden site n’ọgbụgba ndụ dị iche iche. Nkwa o kwere Ebreham mgbe ya na ya gbara ndụ gosiri na Mkpụrụ ahụ e kwere ná nkwa ga-abịa n’ụwa site n’usoro ọmụmụ Ebreham, nakwa na “mba nile nke ụwa” ga-esi na ya gọzie onwe ha. Ọgbụgba ndụ ahụ gosikwara na ndị ọzọ ga-eso ná mkpụrụ ahụ. (Jenesis 22:17, 18) Ọgbụgba ndụ Iwu Jehova na Izrel anụ ahụ́ gbara kpughere na Jehova zubere inwe “alaeze ndị nchụàjà.” (Ọpụpụ 19:5, 6) Ọgbụgba ndụ Jehova na Devid gbara gosiri na Mkpụrụ ahụ ga-abụ Onyeisi nke otu Alaeze ruo mgbe ebighị ebi. (2 Samuel 7:12, 13; Abụ Ọma 89:3, 4) Ozugbo ọgbụgba ndụ Iwu ahụ duuru ndị Juu ruo n’ebe Mezaịa ahụ nọ, Jehova kpughekwuru ụzọ ndị ọzọ nzube ya ga-esi mezuo. (Ndị Galeshia 3:19, 24) Ndị ahụ ga-esonyere akụkụ bụ́ isi nke mkpụrụ ahụ ga-aghọ “alaeze ndị nchụàjà” ahụ e buru n’amụma, ha ga-abanyekwa ‘n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ’ dị ka “Izrel” ọhụrụ, Izrel ime mmụọ.—Jeremaịa 31:31-34; Ndị Hibru 8:7-9. *

10, 11. (a) Olee otú Jehova si kpughee onye Mkpụrụ ahụ e kwere ná nkwa bụ? (b) N’ihi gịnị ka Ọkpara Chineke mụrụ nanị ya ji bịa n’ụwa?

10 Iji mezuo nzube Chineke, oge ruru ka Mkpụrụ ahụ e buru n’amụma bịa n’ụwa. Jehova zigara mmụọ ozi bụ́ Gebriel ka ọ gaa gwa Meri na ọ ga-amụ nwa nwoke bụ́ onye a ga-akpọ Jizọs. Mmụọ ozi ahụ gwara ya, sị: “Onye a ga-abụ onye ukwu, a ga-akpọkwa ya Ọkpara nke Onye Kasị Elu; Jehova Chineke ga-enyekwa ya ocheeze nke Devid bụ́ nna ya, ọ ga-achịkwa ụlọ Jekọb dị ka eze ruo mgbe ebighị ebi, alaeze ya agaghịkwa enwe ọgwụgwụ.” (Luk 1:32, 33) Otú ahụ ka e si mee ka a mata onye Mkpụrụ ahụ e kwere ná nkwa bụ.—Ndị Galeshịa 3:16; 4:4.

11 Ọkpara Jehova mụrụ nanị ya ga-abịa n’ụwa ka e lee ya ule ruo ọnwụ. Ọ bụ Jizọs ga-enye azịza zuru okè maka aka ahụ Setan mara. Ọ̀ ga-ekwesị ntụkwasị obi nye Nna ya? Nke a metụtara ihe nzuzo ahụ dị nsọ. Pọl onyeozi mesịrị kọwaa ọrụ Jizọs, sị: “Ihe nzuzo dị nsọ banyere nsọpụrụ Chineke a dị ukwuu n’ezie: ‘E mere ka ọ pụta ìhè n’anụ ahụ́, a kpọrọ ya onye ezi omume na mmụọ, ọ pụtara ìhè nye ndị mmụọ ozi, e kwusara ya n’etiti ndị mba ọzọ, e kwere na ya n’ụwa, a naara ya gaa n’elu n’ebube.’” (1 Timoti 3:16) Ee, site n’ikwesị nnọọ ntụkwasị obi nye Chineke ruo ọnwụ, Jizọs gosiri n’ụzọ doro anya na ihe ndị ahụ Setan kwuru bụ ụgha. Ma, a ka ga-ekpughe akụkụ ndị ọzọ nke ihe nzuzo ahụ dị nsọ.

“Ihe Nzuzo Dị Nsọ nke Alaeze Chineke”

12, 13. (a) Gịnị bụ otu akụkụ nke “ihe nzuzo dị nsọ nke alaeze Chineke”? (b) Gịnịkwa ka nhọrọ ahụ Jehova họọrọ mmadụ ole na ole ịga eluigwe gụnyere?

12 N’otu n’ime oge ndị Jizọs gara Galili iji kwusaa ozi ọma, o gosiri na ihe nzuzo ahụ dị nsọ na ọchịchị Alaeze Mezaịa nwere njikọ chiri anya. Ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ọ bụ unu ka e nyere ikike ịghọta ihe nzuzo ndị dị nsọ nke alaeze eluigwe [“alaeze Chineke,” Mak 4:11].” (Matiu 13:11) Otu akụkụ nke ihe nzuzo ahụ bụ Jehova ịhọrọ “ìgwè atụrụ nta” bụ́ narị puku mmadụ na iri puku anọ na anọ iso Ọkpara ya chịa n’eluigwe dị ka ndị so ná mkpụrụ ahụ.—Luk 12:32; Mkpughe 14:1, 4.

13 Ebe ọ bụ na e kere ụmụ mmadụ ibi n’ụwa, ọ dị mkpa ka Jehova kee “ihe . . . ọhụrụ,” iji mee ka ụmụ mmadụ ụfọdụ gaa eluigwe. (2 Ndị Kọrint 5:17) Mgbe Pita onyeozi na-ekwu okwu dị ka otu n’ime ndị a họọrọ ịga eluigwe, o dere, sị: “Ka ngọzi dịrị Chineke na Nna nke Onyenwe anyị Jizọs Kraịst, n’ihi na dị ka ịdị ukwuu nke ebere ya si dị ọ mụrụ anyị ọzọ inwe olileanya dị ndụ site n’isi ná ndị nwụrụ anwụ kpọlite Jizọs Kraịst, inweta ihe nketa a na-apụghị ibibi ebibi na nke a na-emerụghị emerụ na nke na-adịghị emebi emebi. E debere ya n’eluigwe maka unu.”—1 Pita 1:3, 4.

14. (a) Olee otú ndị na-abụghị ndị Juu si sonye ‘n’ihe nzuzo dị nsọ nke alaeze Chineke’? (b) Gịnị mere anyị ji enwe ike ịghọta “ihe ndị miri emi nke Chineke”?

14 Akụkụ ọzọ nke ihe nzuzo a dị nsọ n’ihe banyere ọchịchị Alaeze nke ga-abịa n’ọdịnihu bụ uche Chineke ime ka ndị na-abụghị ndị Juu sonye n’ọnụ ọgụgụ dị nta ga-eso Kraịst chịa n’eluigwe. Pọl kọwara akụkụ a nke “nlekọta” Jehova, ma ọ bụ ụzọ o si na-ahụ maka mmezu nke nzube ya, sị: “N’ọgbọ ndị ọzọ, e meghị ka ụmụ mmadụ mara ihe nzuzo a dị ka mmụọ nsọ kpugheworo ya ugbu a nye ndịozi na ndị amụma ya dị nsọ, ya bụ, na ndị mba ọzọ kwesịrị ịbụ ndị so na-eketa ihe na ndị so bụrụ akụkụ nke ahụ́ ahụ na ndị so anyị na-eketa nkwa ahụ n’ịdị n’otu nke anyị na Kraịst Jizọs site n’ozi ọma ahụ.” (Ndị Efesọs 3:5, 6) E mere ka ‘ndịozi dị nsọ’ ghọta akụkụ a nke ihe nzuzo ahụ dị nsọ. N’otu aka ahụkwa taa, anyị agaraghị aghọta “ihe ndị miri emi nke Chineke,” ma e wezụga enyemaka nke mmụọ nsọ.—1 Ndị Kọrint 2:10; 4:1; Ndị Kọlọsi 1:26, 27.

15, 16. N’ihi gịnị ka Jehova ji si n’etiti ihe a kpọrọ mmadụ họrọ ndị ha na Kraịst ga-eso chịa?

15 E kwuru na ‘e si n’ụwa zụta’ “narị puku na iri puku anọ na anọ” ahụ a hụrụ ka ha na “Nwa Atụrụ ahụ” na-eguzo n’elu Ugwu Zaịọn nke eluigwe, ‘e sikwa n’etiti ihe a kpọrọ mmadụ zụta ha dị ka mkpụrụ mbụ nye Chineke nakwa nye Nwa Atụrụ ahụ,’ bụ́ Kraịst Jizọs. (Mkpughe 14:1-4) Jehova họọrọ nwa mbụ o nwere n’eluigwe ịbụ mkpụrụ ahụ e kwere ná nkwa n’Iden, ma gịnị mere o ji si n’etiti ihe a kpọrọ mmadụ họrọ ndị ga-eso Kraịst chịa? Pọl onyeozi na-akọwa na a họọrọ ọnụ ọgụgụ a dị nta “dị ka nzube ya [Jehova] si dị,” “dị ka o si dị ya ezi mma n’uche.”—Ndị Rom 8:17, 28-30; Ndị Efesọs 1:5, 11; 2 Timoti 1:9.

16 Jehova zubere ido aha ukwu ya dị nsọ nsọ na igosi na o ruuru ya ịbụ eze eluigwe na ala. Site ná “nlekọta” Jehova, ma ọ bụ ụzọ o si ahazi ihe, nke na-egosipụta amamihe ya na-enweghị atụ, o zitere Ọkpara ya n’ụwa, bụ́ ebe e lere ya ule ruo ọnwụ. Ọzọkwa, Jehova kpebiri na ụmụ mmadụ bụ́ ndị dowokwara onwe ha n’okpuru ọbụbụeze Ya ruo ọnwụ ga-eso n’ọchịchị Alaeze Mezaịa nke Ọkpara ya.—Ndị Efesọs 1:8-12; Mkpughe 2:10, 11.

17. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji nwee obi ụtọ na Kraịst na ndị ahụ ya na ha ga-eso chịa ebiela n’ụwa dị ka mmadụ?

17 Jehova gosiri ụmụ Adam ịhụnanya dị ukwuu site n’ime ka Ọkpara ya bịa n’ụwa nakwa isi n’etiti ihe a kpọrọ mmadụ họrọ ndị ha na Ọkpara ya ga-eso chịa n’Alaeze ahụ. Olee otú nke ahụ ga-esi baara ndị ọzọ kwesịrị ntụkwasị obi nye Jehova uru, malite n’Ebel gaa n’ihu? Iji mezuo ihe mbụ Jehova zubere maka ihe a kpọrọ mmadụ, ọ ga-adị mkpa ka a gwọọ ụmụ mmadụ ọrịa, mee ka ha na Chineke dịghachi ná mma ma mee ka ha zuo okè n’ihi na a mụrụ ha dị ka ohu nye mmehie na ọnwụ. (Ndị Rom 5:12) Lee ihe nkasi obi ọ bụ nye ndị ahụ na-atụ anya ịdị ndụ ebighị ebi n’elu ala ịmara na Eze ha ga-ahụ ha n’anya ma jiri obiọma ghọta mmetụta ha dị nnọọ ka o meere ndị na-eso ụzọ ya mgbe ọ na-eje ozi n’elu ala! (Matiu 11:28, 29; Ndị Hibru 2:17, 18; 4:15; 7:25, 26) Leekwa ihe na-emesi obi ike ọ bụ ha ịghọta na ndị ahụ ga-eso Kraịst bụrụ eze na ndị nchụàjà bụbu ndị ikom na ndị inyom nwere okwukwe, ndị lụsokwara adịghị ike ha dị iche iche ọgụ, na ndị ihe siirila ike ná ndụ, dị ka anyị!—Ndị Rom 7:21-25.

Nzube Jehova nke Na-adịghị Agbanwe Agbanwe

18, 19. N’ihi gịnị ka okwu Pọl nke dị ná Ndị Efesọs 1:8-11 ji dokwuo anyị anya, oleekwa ihe a ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?

18 Ugbu a anyị enwekwuola ike ịghọta ihe okwu ndị ahụ Pọl gwara Ndị Kraịst e tere mmanụ ná Ndị Efesọs 1:8-11 pụtara. O kwuru na Jehova emewo ka ha mara “ihe nzuzo dị nsọ nke uche ya,” na ‘e kenyere ha na Kraịst dị ka ndị nketa,’ nakwa na ‘a họpụtara ha tupu oge eruo dị ka nzube nke onye ahụ si dị bụ́ onye ji ihe nile na-arụ ọrụ dị ka uche ya si agwa ya okwu.’ Anyị ghọtara na nke a kwekọrọ ná “nlekọta” magburu onwe ya nke Jehova ji na-emezu nzube ya. Nke a na-enyekwara anyị aka ịghọta ihe mere o ji bụrụ nanị Ndị Kraịst ole na ole ná ndị na-abịa maka Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị na-ata ma na-aṅụ ihe nnọchianya ndị ahụ.

19 N’isiokwu na-esonụ, anyị ga-atụle ihe Ncheta ọnwa Kraịst pụtaara Ndị Kraịst nwere olileanya ịga eluigwe. Anyị ga-amụtakwa ihe mere na ọtụtụ nde bụ́ ndị nwere olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’elu ala kwesịrị iji nwee mmasị dị ukwuu n’ihe Ncheta ọnwụ ahụ nọchiri anya ya.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 6 Aha Chineke pụtara n’ụzọ nkịtị “Ọ Na-eme Ka Ọ Ghọọ.” Jehova pụrụ ịghọ ihe ọ bụla dị mkpa iji mezuo nzube ya.—Ọpụpụ 3:14.

^ par. 8 Okwu Pọl gosiri na “nlekọta” ahụ arụwala ọrụ n’oge ya, ebe Akwụkwọ Nsọ na-egosi na e guzobere Alaeze Mezaịa n’afọ 1914.

^ par. 9 Ọ bụrụ na ị chọrọ inweta nkọwa zuru ezu banyere ọgbụgba ndụ ndị a Jehova ji emezu nzube ya, lee Ụlọ Nche February 1, 1989, peeji nke 10-15.

Ntụleghachi

• N’ihi gịnị ka Jehova ji kee ụwa ma tinye mmadụ n’ime ya?

• N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ka e lee Ọkpara Jehova mụrụ nanị ya ule n’ụwa?

• N’ihi gịnị ka Jehova ji si n’etiti ihe a kpọrọ mmadụ họrọ ndị ha na Kraịst ga-eso chịa?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]