Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Obodo Ndị Dịpụrụ Adịpụ na Bolivia Anụ Ozi Ọma

Obodo Ndị Dịpụrụ Adịpụ na Bolivia Anụ Ozi Ọma

Obodo Ndị Dịpụrụ Adịpụ na Bolivia Anụ Ozi Ọma

ANYỊ dị ihe dị ka mmadụ 20 nọrọ n’ụsọ osimiri, jiri ịnụ ọkụ n’obi na-atụ anya njem otu ụbọchị anyị na-aga ime iji leta obodo ndị dị n’akụkụ osimiri. Anyị nọ n’ala ala Ugwu Andes, bụ́ ebe osimiri Beni si na-asọbanye ná nnukwu osimiri Amazon nke ala ya dị larịị. Ọ bụ ebe mara mma dị egwu.

Otú ọ dị, anyị abụghị ndị njem nleta. Ụfọdụ n’ime anyị bụ ndị nwe obodo; ọtụtụ n’ime anyị si n’obodo ukwu dị iche iche bịa ma biri na Rurrenabaque ebe a, bụ́ obere obodo mara mma nke nwere osisi ndị nwere okooko na ụlọ akịrịka. Nanị ụzụ a na-anụ n’okporo ámá ya bụ nke ọgba tum tum ole na ole na-ebu ndị njem. Gịnị mere anyị ji na-eme njem a?

A na-emekwa ụdị njem a n’ọtụtụ ebe ndị ọzọ na Bolivia. Ndịàmà Jehova si n’obodo ndị mepere emepe na ndị si mba ọzọ ji ozi ọma Alaeze Chineke na-aga n’ime obodo dị iche iche.—Matiu 24:14.

Bolivia dị n’etiti Ebe Ndịda America. Mba a nwere ala ka nke France okpukpu abụọ ma ọnụ ọgụgụ nke ndị bi ná mba a ji nanị obere ihe karịa otu ụzọ n’ụzọ iri nke ndị bi na France. Ihe ka ọtụtụ ná ndị bi na Bolivia bi n’obodo ukwu na n’obere obodo ndị dị n’ugwu ndị dị nnọọ elu bụ́ ebe ndị a na-egwupụta ihe n’ala, ndị ọzọ bikwa n’obodo ndị dị na ndagwurugwu bụ́ ebe ndị a na-arụ ọrụ ugbo. Otú ọ dị, n’ebe ndị a na-enwe okpomọkụ bụ́ ebe ala dị larịị, oké ọhịa sara mbara na-adị n’agbata obodo dị iche iche.

N’agbata afọ 1950 na 1969, ndị ozi ala ọzọ nwere obi ike, ndị dị ka Betty Jackson, Elsie Meynberg, Pamela Moseley, na Charlotte Tomaschafsky, malitere ikwusa ozi ọma n’ọtụtụ obodo ndị dịpụrụ adịpụ. Ha kụziiri ndị nwere ezi obi eziokwu sitere na Bible ma nye aka hiwe obere ọgbakọ dị iche iche. N’agbata afọ 1980 na 1999, ọnụ ọgụgụ Ndịàmà Jehova mụbara okpukpu isii, karịsịa n’obodo ukwu. Ugbu a, e nwere ọgbakọ n’akụkụ nile nke obodo a. Ọgbakọ ndị ahụ dị n’ógbè ndị mepere emepe, bụ́ ebe ndị mmadụ na-arụ ọrụ n’ọfịs ndị dị n’ụlọ elu ndị nwere ọtụtụ okpukpu, biri ná nnukwu ụlọ ndị mara mma, ma na-azụ ihe ná nnukwu ụlọ ahịa dị iche iche. Ma, e nwekwara ọgbakọ n’ógbè ndị dịpụrụ adịpụ, bụ́ ebe ndị mmadụ bi n’ụlọ ájá, na-azụ ihe n’ọma ahịa, ma na-eyi uwe ọdịnala ndị tụrụ àgwà. N’agbanyeghị nke ahụ, gịnị ka a pụrụ ime iji nyere ọtụtụ ndị bi n’ebe ndị ahụ dịpụrụ adịpụ aka ịmata Jehova?

Ịhapụ Ntụsara Ahụ́ Dị n’Obodo Ndị Mepere Emepe

N’ime afọ 20 gara aga, ọtụtụ ndị esila n’obodo ebe ndị a na-egwupụta ihe n’ala nakwa n’ime ime obodo ndị dị na Bolivia kwaga n’obodo ukwu dị iche iche. Ọ na-esi ike ịhụ ka ndị mmadụ si n’obodo ukwu na-akwaga n’ime obodo. Ọtụtụ ime obodo nwere nanị otu telifon ma na-enwe ọkụ eletrik ruo nanị awa ole na ole n’ụbọchị. Ndịàmà bi n’ime obodo ndị a pụrụ ịhụ ndị kwere ekwe ibe ha nanị ná mgbakọ ukwu ndị a na-enwe kwa afọ, ịga mgbakọ ndị ahụ pụkwara ifu nnukwu ego, dị ize ndụ, ma na-agwụ ike. E nweghị ụlọ akwụkwọ ndị dị elu n’ime obodo. Gịnịzi na-akwali ọtụtụ Ndịàmà Jehova isi n’obodo ndị mepere emepe kwaga n’ime obodo?

Luis kwuru n’oge na-adịbeghị anya, sị: “Enwere m ohere inweta ọrụ n’obodo La Paz. Ma ndị mụrụ m na-agwa m na ọrụ ime ndị na-eso ụzọ bụ ọrụ kasị mma mmadụ ga-arụ. N’ihi ya, eji m obere oge mụọ ka e si ewu ụlọ n’ụlọ akwụkwọ. N’oge m nọ ezumike na Rurrenabaque, ahụrụ m otú o si amasị ndị mmadụ ige ntị n’ozi ọma ahụ. Mgbe m hụrụ na e nwere nanị ụmụnna ole na ole n’ebe ahụ, ekpebiri m na aghaghị m nnọọ ịbịa nye aka. Ugbu a m na-eduziri mmadụ 12 ọmụmụ Bible n’ebe obibi ha. Dị ka ihe atụ, m na-amụrụ otu nwoke na-akatabeghị ahụ́ na nwunye ya bụ́ ndị nwere ụmụ anọ ihe. Ọ na-aṅụbu oké mmanya ma na-agba chaa chaa, ma ọ hapụchaala ihe ndị ahụ ma malite ịgwa ndị enyi ya ihe ndị ọ na-amụta banyere Jehova. Ọ na-akwado akwado maka ọmụmụ ihe ya mgbe nile. Mgbe ọ bụla ọ ga-aga igbu osisi n’oké ọhịa ruo ihe dị ka ụbọchị atọ ma ọ bụ anọ, ọ na-ewute ya n’ihi na ọ chọghị ka ihe ọ bụla kwaa ya. Mgbe ọ bụla m hụrụ ha ná nzukọ, m na-ekweta na ihe ndị m chụrụ n’àjà iji bịa ebe a abụghị n’efu.”

Juana bụ nne nanị ya na-azụ nwa. O kwuru, sị: “M na-arụbu ọrụ dị ka odozi ụlọ na La Paz. Amalitere m ozi oge nile n’obodo ahụ mgbe nwa m nwoke ka dị obere. Mgbe m letara Rurrenabaque, achọpụtara m na m ga-enyere nnọọ ọtụtụ ndị aka karị ma ọ bụrụ na m kwata ebe a. N’ihi ya, anyị kwatara ebe a, enwetakwara m ọrụ dị ka odozi ụlọ. Ná mmalite, okpomọkụ na ụmụ ahụhụ dị ebe a siiri anyị ike odidi. Ma anyị anọwo afọ asaa ebe a. M na-eduzi ọtụtụ ọmụmụ Bible kwa izu, ọtụtụ ndị m na-amụrụ ihe na-egosipụtakwa ekele ha nwere site n’ịbịa nzukọ.” Juana na nwa ya nwoke so ná ndị ahụ na-eche ụgbọ ha ga-eji gaa n’obodo ndị dị n’akụkụ osimiri. I nwere ike isonyere anyị.

Njem Ụgbọ Mmiri Ahụ

Injin azụ ụgbọ anyị nọ na-azụsi ike ka anyị si n’obere oghere dị n’etiti ugwu abụọ na-agafe. Ụmụ icheoku nọ na-ebe ka à ga-asị na ha achọghị anyị ebe ahụ. Mmiri ụrọ si n’ugwu ndị ahụ nọ na-agba ụgbọ anyị gburugburu ka ọkwọ ụgbọ anyị ji nkà kwọrọ ụgbọ ahụ na-agafe mmiri ahụ na-asọsi ike. Tupu ehihie, anyị ruru n’otu obere obodo. Anyị hụrụ otu n’ime ndị okenye Ọgbakọ Rurrenabaque n’ebe ahụ, o zikwara anyị ebe anyị ga-ezi ozi ọma.

Ndị obodo ahụ nabatara anyị nke ọma, n’okpuru ndò osisi ma ọ bụ n’ime ụlọ ha e ji achara rụọ ma jiri akịrịka kpuchie elu ya. N’oge na-adịghị anya, anyị zutere di na nwunye na-akatabeghị ahụ́ ji ihe e ji osisi mee na-akwori okpete. Mmiri ya na-agbaba n’efere. E mesịa, ha ga-esi mmiri ya n’ọkụ ruo mgbe ọ ghọrọ molasses na-eji oji nke a pụrụ ire n’obodo mepere emepe. Ha kpọbatara anyị n’ụlọ ha ma jụọ anyị ọtụtụ ajụjụ banyere Bible.

Anyị nọgidere na-aga n’osimiri ahụ, na-ezi ozi ọma site n’otu ime obodo ruo n’ọzọ. Ọtụtụ mmadụ nwere obi ụtọ ịnụ na Bible kwuru na ọrịa na ọnwụ ga-akwụsị. (Aịsaịa 25:8; 33:24) Ebe ọ bụ na e nweghị ọtụtụ ụlọ ọgwụ ebe a, e nwere ọtụtụ ezinụlọ ndị ụmụ ha nwụrụla. Ọrụ a kpata erie ha na-arụ bụ́ ọrụ ugbo na ịkụ azụ siri ike ma dị ize ndụ. N’ihi ya, ọtụtụ ndị nwere mmasị ná nkwa ahụ Chineke kwere nke e dekọrọ n’Abụ Ọma nke 72 banyere ọchịchị nke ga-eme ka ịda ogbenye kwụsị. N’agbanyeghị nke ahụ, ì chere na ndị nwere mmasị bi n’ebe ndị dị otú ahụ dịpụrụ adịpụ ga na-abịali nzukọ Ndị Kraịst? Ajụjụ ahụ nyere Eric na Vicky nsogbu n’obi. Ha bụ ndị ozi oge nile n’obodo Santa Rosa, bụ́ obodo ga-ewe awa atọ n’osimiri Amazon iji ruo ya.

Ndị Nwere Mmasị Hà Ga-abịa?

Afọ 12 gara aga, Eric na Vicky si California, U.S.A., bịa Bolivia. Otu onye nlekọta na-ejegharị ejegharị tụụrụ ha aro ka ha kwaga Santa Rosa. Vicky kwuru, sị: “E nwere nanị telifon abụọ n’obodo ahụ, e nweghịkwa Intanet. E nwere ọtụtụ anụ ọhịa ebe ahụ. Anyị na-ahụkarị agụ iyi, enyi nnụnụ, na nnukwu agwọ mgbe anyị ji ọgba tum tum anyị na-aga n’obodo ndị dịpụrụ adịpụ. Ma anyị nwere mmasị n’ebe ndị obodo ahụ nọ karịa n’ụmụ anụmanụ ndị ahụ. Anyị na-amụrụ ezinụlọ Vaca, bụ́ otu di na nwunye na-akatabeghị ahụ́ bụ́ ndị nwere obere ụmụaka anọ, Bible. Ebe ha bi dị ihe dị ka kilomita 26 site na Santa Rosa. Nna nwe ụlọ ahụ bụbu onye aṅụrụma, ma ugbu a, ọ gbanweela. Kwa izu, ọ na-akpọ ezinụlọ ya dum na nwanne ya nwanyị nke obere abịa nzukọ. Ọ na-ebu nwunye ya na obere nwa ya ná nnukwu ígwè ya. Nwa ya nke dị afọ itoolu na-eji ígwè ọzọ ebu nwanne ya, nke dịkwa afọ asatọ na-eji ígwè nke ya abịa. Ọ na-ewe ha awa atọ iji rute.” Ezinụlọ ahụ hụrụ Jehova n’anya n’ezie ma na-eme mgbalị nile ha nwere ike ime iji soro ọgbakọ na-akpakọrịta.

Nanị n’ime ọnwa 18, mmadụ 3 bịara ruo eruo ime baptizim, ihe dịkwa ka mmadụ 25 na-abịa nzukọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ọhụrụ a rụrụ na Santa Rosa. Ọ bụ ezie na ọtụtụ mmadụ chọrọ ịmụ Bible, ọtụtụ n’ime ha nwere ihe mgbochi ndị tara akpụ ha ga-emeri iji nwee ike ijere Jehova ozi.

Ihe Ịma Aka nke Ịlụ Di na Nwunye n’Ụzọ Iwu Kwadoro

Marina na Osni, bụ́ ndị ozi ala ọzọ na-eje ozi n’otu obodo dịpụrụ adịpụ nke dịdebere ókè Bolivia na Brazil, kwuru na ọtụtụ ndị bi ebe ahụ adịghị ewere alụmdi na nwunye dị ka ihe na-adịgide adịgide. Ha na-agbanwe di ma ọ bụ nwunye dị ka uwe. Osni kwuru, sị: “Ọ bụ nsogbu nke na-egbochi ndị mmadụ inwe ọganihu ime mmụọ. Mgbe ndị mmadụ chọrọ ịghọ ezi Ndị Kraịst, ọ na-esiri ha ike ma na-efu ha oké ego. Ụfọdụ aghaghị ịkwụsị mmekọrịta ndị ha nọbu na ha ma lụzie di ma ọ bụ nwunye n’ụzọ iwu kwadoro. N’agbanyeghị nke ahụ, mgbe ụfọdụ ndị ghọtara na Akwụkwọ Nsọ chọrọ ka ha deba alụmdi na nwunye ha n’akwụkwọ, ha na-arụsi ọrụ ike iji nweta ego iwu obodo kwuru ka ha kwụọ.”—Ndị Rom 13:1, 2; Ndị Hibru 13:4.

Marina kọrọ akụkọ banyere Norberto. Ọ kọrọ, sị: “Ya na ụmụ nwanyị dị iche iche ebiela tupu ya akwakwuru otu nwanyị na-eme bred. Norberto ji afọ 35 tọọ nwanyị ahụ, nwanyị ahụ nwekwara nwa nwoke, bụ́ onye Norberto jiziri mere nwa. Ka nwata ahụ na-eto, Norberto chọrọ ịbụrụ ya ezi ihe nlereanya. N’ihi ya, mgbe otu Onyeàmà kpọtụụrụ ha n’ebe ahụ a na-eme bred, kwuo na ya nwere ike iduziri onye ọ bụla chọrọnụ ọmụmụ Bible ebe obibi n’efu, Norberto nabatara ya, n’agbanyeghị na Norberto amaghị ihe agụ ma dịrị ihe karịrị afọ 70. Mgbe Norberto na nwanyị ahụ ya na ya bi mụtara ihe ndị Jehova chọrọ ha n’aka, ha lụrụ di na nwunye n’ụzọ iwu kwadoro, mgbe nke ahụ gasịkwara, e mere ha baptizim. Nwata nwoke ahụ aghọọla Onye Kraịst na-eji ihe akpọrọ ihe—nke bụ́ kpọmkwem ihe Norberto tụrụ nnọọ anya ya. Norberto amụtawo ịgụ ihe, ọbụna na-eme ihe omume ná nzukọ ọgbakọ. Ọ bụ ezie na ọ gbasikwaghị ike n’ihi afọ ndụ ya, ọ bụ onye nkwusa na-anụ ọkụ n’obi.”

Mmụọ Jehova Na-enye Ha Ike

Jizọs gwara ụmụazụ ya nke oge mbụ, sị: “Unu ga-anata ike mgbe mmụọ nsọ ga-adakwasị unu, unu ga-agbakwa àmà banyere m . . . ruo n’akụkụ kasị anya n’ụwa.” (Ọrụ 1:8) Lee ihe na-agba ume ọ bụ ịhụ ka mmụọ Chineke na-akwali ndị ikom na ndị inyom bụ́ Ndị Kraịst ịkwaga n’ebe ndị dị anya! Dị ka ihe atụ, n’afọ 2004, ihe dị ka Ndị Kraịst 30 na-anụ ọkụ n’obi kwetara ije ozi n’ókèala ndị dịpụrụ adịpụ ruo nwa oge dị ka ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche. Obi dị ha ụtọ n’ihi ihe nlereanya nke ihe dị ka otu narị ndị ala ọzọ na iri asatọ bịara Bolivia iji jee ozi dị ka ndị ọsụ ụzọ, ndị nlekọta sekit, ndị Betel, ma ọ bụ ndị ozi ala ọzọ. Puku ndị nkwusa Alaeze iri na asaa nọ na Bolivia na-eduzi iri puku ọmụmụ Bible abụọ na abụọ n’ụlọ ndị nwere mmasị.

Ihe na-enye ụmụnna ndị a ọṅụ dị ukwuu bụ na ha maara na Jehova ji mmụọ ya na-eduzi ha. Dị ka ihe atụ, Robert na Kathy nakweere ije ozi dị ka ndị ozi ala ọzọ na Camiri. Kemgbe ụwa, Camiri, bụ obodo dịpụrụ adịpụ nke dị n’otu ogologo mkpọda ugwu ahịhịa ndụ juru na ya nke dị n’akụkụ osimiri. Robert kwuru, sị: “Ọ dị nnọọ ka anyị bịara n’oge kwesịrị ekwesị. N’ime afọ abụọ, ihe dị ka mmadụ 40 aghọọla ndị nkwusa nke ozi ọma ahụ.”

Onye Aṅụrụma Na-agba Chaa Chaa Aṅaa Ntị

Ọtụtụ ndị bi n’obodo ndị ahụ na-enwe obi ụtọ n’ihi mgbanwe ndị a na-amụrụ Bible na-eme ná ndụ ha. Dị ka ihe atụ, otu ụbọchị n’ihe dị ka afọ anọ gara aga, otu onye aṅụrụma aha ya bụ Ariel dina n’elu àkwà ka mmanya na-egbu ya. Ọ bụ ezie na chaa chaa ọ na-agba mere ka ọ bụrụ onye a ma ama, ụgwọ o ji bụ́ nke na-arị elu, alụmdi na nwunye ya nọ ná nsogbu, na ụmụ ya ndị nwanyị o leghaara anya na-ewute ya nke ukwuu. Otu Onyeàmà Jehova na-aga site n’ụlọ ruo n’ụlọ mere ka echiche ya gbanwee. Ariel gere ntị nke ọma ka nwanna ahụ na-akọwa ihe ndị sitere n’Akwụkwọ Nsọ. N’oge na-adịghị anya, Ariel dina n’àkwà ọzọ, ma na nke ugbu a, ọ nọzi na-agụ ihe banyere inwe obi ụtọ n’ezinụlọ, Paradaịs, na ụzọ isi jeere Chineke ozi. N’ikpeazụ, o kwetara ịmụ Bible.

Mgbe ndị ozi ala ọzọ ahụ bịara na Camiri, nwunye Ariel, bụ́ Arminda, amụwakwala ihe—ma o jichaghị ịnụ ọkụ n’obi na-amụ ya. O kwuru, sị: “M ga-eme ihe ọ bụla iji mee ka ọ kwụsị ịṅụ mmanya. Ma echeghị m na ọ ga-akwụsịli. O nwekwaghị mmekwata.” Otú ọ dị, Bible ahụ ọ na-amụ bịara tọwa ya ụtọ karịa otú o cheburu. Ka ọ na-erule otu afọ, e meela ya baptizim, ya ana-agbakwara ndị ezinụlọ ya àmà. N’oge na-adịghị anya, ọtụtụ ndị ikwu ya raara ndụ ha nye Jehova.

A bịakwanụ n’ebe Ariel nọ, o siiri ya ike ịkwụsị ịṅụ mmanya, ise siga, na ịgba chaa chaa. Ihe gbanwere mgbe ọ kpọrọ ndị enyi ya nile òkù ịbịa Ncheta ọnwụ Jizọs. O kpebiri, sị: “Mụ na ndị na-abịaghị ga-akwụsị ịkpa. M ga-amụwara ndị bịaranụ Bible.” O si otú ahụ malitere mmadụ atọ ọmụmụ Bible. Ọbụna tupu Ariel abata n’ọgbakọ, ọ mụụrụ otu onye ikwu ya Bible bụ́ onye nwere ọganihu, ya na Ariel emeekwa baptizim n’otu ụbọchị. Arminda kwuru, sị: “Ọ dị ka à ga-asị na Ariel anyị na-ahụ ugbu a abụghịkwa Ariel anyị mabu.”

Robert kọrọ, sị: “Mgbe ikpeazụ a gụrụ ha ọnụ, mmadụ 24 si n’ezinụlọ ya na-abịachi nzukọ anya. E meela iri baptizim, asatọ ndị ọzọ bụkwa ndị nkwusa a na-emebeghị baptizim. Ụfọdụ ndị hụrụ na àgwà ha agbanweela malitekwara ịmụ Bible, ha na-abịakwa nzukọ ọgbakọ. Ndị na-abịa nzukọ esila n’otu narị mmadụ ruo otu narị na iri itoolu. Mụ na Kathy na-eduziri ihe dị ka mmadụ 30 ọmụmụ Bible, ha nile na-abịakwa ọmụmụ ihe. Obi dị anyị ụtọ na anyị nọ ebe a.”

Ihe na-eme n’obodo ndị ahụ dịpụrụ adịpụ na Bolivia bụ nanị akụkụ dị nta nke nchịkọbata zuru ụwa ọnụ e buru n’amụma ná Mkpughe isi 7 bụ́ nke na-ekwu na, “n’ụbọchị Onyenwe anyị,” a ga-achịkọta ndị ga-alanahụ oké mkpagbu ahụ. (Mkpughe 1:10; 7:9-14) Ọ dịtụbeghị mgbe ọtụtụ nde mmadụ si ná mba nile dịrịla n’otu n’ofufe nke ezi Chineke ahụ otú ha dị taa. Lee ka nke a si bụrụ ihe àmà na-enye ọṅụ nke na-egosi na mmezu nke nkwa ndị Chineke kwere dị nso!

[Foto dị na peeji nke 9]

Betty Jackson

[Foto dị na peeji nke 9]

Pamela Moseley

[Foto dị na peeji nke 9]

Elsie Meynberg

[Foto dị na peeji nke 9]

Charlotte Tomaschafsky, n’isi isi aka nri

[Foto dị na peeji nke 10]

Eric na Vicky bịara ije ozi n’ebe a chọkwuru ndị nkwusa Alaeze

[Foto dị na peeji nke 10]

Kwa izu, Ezinụlọ Vaca na-agba igwe awa atọ iji ruo n’Ụlọ Nzukọ Alaeze

[Foto dị na peeji nke 11]

Ndị bi n’obodo ndị dị nso n’osimiri Beni gere ntị nke ọma n’ozi ọma ahụ

[Foto dị na peeji nke 12]

Robert na Kathy na-eje ozi dị ka ndị ozi ala ọzọ na Camiri