Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịmata Ihe Dị Mma ma Mee Ya

Ịmata Ihe Dị Mma ma Mee Ya

Akụkọ Ndụ

Ịmata Ihe Dị Mma ma Mee Ya

DỊ KA HADYN SANDERSON SI KỌỌ

Jizọs gwara ndịozi ya n’otu oge, sị: “Ọ bụrụ na unu maara ihe ndị a, unu ga-enwe obi ụtọ ma ọ bụrụ na unu emee ha.” (Jọn 13:17) Ee, anyị nwere ike ịma ihe dị mma, ma mgbe ụfọdụ, ebe nsogbu na-adị bụ n’ime ya eme! Otú ọ dị, ekwenyesiri m ike na okwu ndị ahụ Jizọs kwuru bụ eziokwu ugbu a m gafeworo afọ iri asatọ, nke m ji afọ iri anọ n’ime ya jee ozi ala ọzọ. Ime ihe Chineke gwara anyị mee na-eme ka anyị nwee obi ụtọ n’ezie. Ka m kọwaa ihe m bu n’uche.

NA 1925, mgbe m dị afọ atọ, papa m na mama m gara gere otu okwu dabeere na Bible e kwuru n’obodo m bụ́ Newcastle nke dị n’Australia. Okwu ahụ isiokwu ya bụ “Ọtụtụ Nde Ndị Dị Ndụ Ugbu A Agaghị Anwụ Ma Ọlị,” mere ka mama m kweta na ya achọtawo eziokwu ahụ, ọ malitekwara ịgachi ọmụmụ ihe anya. Mmasị papa m nwere n’eziokwu ahụ jụrụ oyi ngwa ngwa. Ọ malitere imegide mama m n’ihi okpukpe ọhụrụ ya ma yie ya egwu na ya ga-ahapụ anyị ma ọ bụrụ na ọ kwụsịghị iso Ndịàmà Jehova. Mama m hụrụ papa m n’anya, ọ chọkwara ka ezinụlọ anyị dịrị n’otu. Ka o sina dị, ọ maara na irubere Chineke isi dị mkpa karị ihe ọ bụla ọzọ, o kpebisikwara ike ime ihe ziri ezi n’anya Jehova. (Matiu 10:34-39) Papa m hapụrụ ezinụlọ anyị, ana m ahụkwa ya nanị mgbe ụfọdụ ka ọ hapụsịrị anyị.

Mgbe m chere echiche laa azụ, m na-enwe mmasị n’otú mama m si guzosie ike n’akụkụ Chineke. Mkpebi ya mere ka mụ na nwanne m nwanyị nke tọrọ m, bụ́ Beulah, jiri ndụ anyị na-ejere Jehova ozi, bụ́ nke na-eweta afọ ojuju. Ọ kụzikwaara anyị na mgbe anyị matara ihe ziri ezi, anyị aghaghị ịgbalịsi ike ime ya.

Ihe Ndị Lere Okwukwe M Ule

Ndị Mmụta Bible, dị ka a maara Ndịàmà Jehova n’oge ahụ, gbataara nnọọ ezinụlọ anyị ọsọ enyemaka. Nne mama m bịara binyere anyị, ọ nabatakwara eziokwu Bible. Ya na mama m na-esokwa aga ozi ọma mgbe nile, ejiji ha kwesịrị ekwesị na omume enyi ha mekwara ka ndị mmadụ na-akwanyere ha ùgwù.

Ụmụnna nwoke ndị tọrọ m lebaara m nnọọ anya ma nye m ọzụzụ ndị baara m uru. N’oge na-adịghị anya, amụtara m iji kaadị e ji agba àmà ezi ndị mmadụ ozi ọma n’ebe obibi ha n’ụzọ dị mfe. Ana m akpọnyekwara ndị mmadụ okwu dabeere ná Bible e tinyere n’ígwè gramafon. Esokwa m buru akwụkwọ e dere ihe e ji na-akpọsa ozi ọma, gagharịa n’okporo ámá dị n’obodo anyị. Ime nke a siiri m ike n’ihi na m na-atụ egwu. Otú ọ dị, amaara m ihe ziri ezi, ekpebisikwara m ike ime ya.

Mgbe m gụsịrị akwụkwọ, arụwara m ọrụ n’otu ụlọ akụ̀, ọrụ m gụnyere ime njem gaa n’ebe nile alaka ụlọ akụ̀ ahụ dị gburugburu steeti New South Wales. Ọ bụ ezie na Ndịàmà bi ná mba ahụ dị nanị ole na ole, ọzụzụ mama m nyere m mgbe m dị obere mere ka m nọgidesie ike n’akụkụ Jehova. Mama m detaara m akwụkwọ ozi ndị na-agba ume, bụ́ ndị nyeere m aka ịnọgidesi ike n’akụkụ Jehova.

Akwụkwọ ozi ndị ahụ nyeere m aka n’oge kwesịrị ekwesị. Agha Ụwa nke Abụọ malitere, e nyekwara m iwu ka m debanye aha n’òtù ndị agha. Onye manịja ụlọ akụ̀ ahụ bụ onye na-agachi chọọchị anya nakwa onye isi ndị agha n’obodo ya. Mgbe m kọwaara ya na m gaghị etinye aka n’agha n’ihi na m bụ Onye Kraịst, ọ gwara m họrọ otu n’ime ihe abụọ a—ịhapụ okpukpe m ma ọ bụkwanụ ịhapụ ụlọ akụ̀ ebe m na-arụ ọrụ! Nsogbu bịara ka njọ mgbe m gara n’ebe a na-ewe ndị agha nke dị n’obodo ahụ. Manịja ahụ nọ na-elegide m anya ka m rutere na tebụl ahụ ebe a nọ na-edebanye aha. Iwe were ndị ahụ na-edebanye aha ndị agha n’akwụkwọ mgbe m jụrụ ịbịanye aka n’akwụkwọ ahụ e ji edebanye aha ndị agha. Ọ dịghịịrị m mfe ma ọlị, ma ekpebisiri m ike ime ihe ziri ezi. Site n’enyemaka Jehova, ahụ́ amaghị m jijiji, anọgidesikwara m ike ná mkpebi m. Mgbe m mesịrị chọpụta na ụfọdụ ndị akpụ obi na-achọgharị m, akwakọtara m ngwongwo m ngwa ngwa ma banye m ụgbọ okporo ígwè, si n’obodo ahụ pụọ n’egbughị oge.

Mgbe m lọghachisịrị Newcastle, a kpụgara mụ na ụmụnna nwoke asaa ndị ọzọ, bụ́ ndị jụrụ ịga agha, n’ụlọikpe iji gbaa anyị ajụjụ. Ọkàikpe ahụ mara anyị ikpe ịga mkpọrọ ọrụ ahụhụ ruo ọnwa atọ. Ọ bụ ezie na ịga mkpọrọ abụghị ihe ọma, ime ihe ziri ezi wetaara m ọtụtụ ngọzi. Mgbe a tọhapụsịrị anyị, Hilton Wilkinson, bụ́ Onyeàmà ibe m a tụkọrọ mụ na ya mkpọrọ, gwara m ka m bịa rụwara ya ọrụ n’ebe ọ na-anọ ese foto. Ọ bụ n’ebe ahụ ka m hụrụ Melody, bụ́ onye m chọrọ ịlụ, ọ bụkwa ya na-anabata ndị mmadụ n’ụlọ ọrụ ahụ. Egosipụtara m nrara m raara onwe m nye Jehova site n’ime baptizim n’oge na-adịghị anya ka a tọhapụsịrị m.

Isetịpụ Ihe Mgbaru Ọsọ nke Ịbanye n’Ozi Oge Nile

Mụ na Melody mepere ebe a na-ese foto na Newcastle ka anyị lụchara. N’oge na-adịghị anya, ọrụ bịara zuo anyị ahụ́, nke a malitekwara ịkpatara anyị nsogbu ahụ́ ike, na-emetụtakwa mmekọrịta anyị na Jehova. Ted Jaracz, bụ́ onye na-eje ozi n’oge ahụ n’alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị n’Australia, onye sokwa ugbu a n’Òtù Na-achị Isi, tụụrụ anyị aro ka anyị setịpụ ihe mgbaru ọsọ nke ịmụba ozi anyị na-ejere Jehova. Ka anyị na ya kwurịtachara nke ahụ, anyị kpebiri ire ọrụ anyị ji achụta ego ma mee ka ndụ anyị dị mfe. Na 1954, mụ na nwunye m zụụrụ otu obere ụlọ ụgbọala na-adọkpụ, ma kwaga n’obodo Ballarat nke dị na steeti Victoria, anyị malitekwara ije ozi dị ka ndị ọsụ ụzọ, ma ọ bụ ndị ozi oge nile.

Jehova gọziri mgbalị anyị ka anyị so obere ọgbakọ dị na Ballarat na-arụkọ ọrụ. N’ihe dị ka otu afọ na ọnwa isii, ọnụ ọgụgụ nke ndị na-abịa ọmụmụ ihe gbagoro site ná mmadụ iri na asaa ruo mmadụ iri asaa. A bịara gwa m ka m malite ije ozi dị ka onye nlekọta na-ejegharị ejegharị, ma ọ bụ onye nlekọta sekit, na steeti South Australia. N’afọ atọ sochirinụ, anyị letara ọgbakọ ndị dị n’obodo Adelaide nakwa ógbè ndị dị n’akụkụ Osimiri Murray bụ́ ebe ndị a na-emepụta mmanya ma na-akọpụta mkpụrụ osisi citrus. Ndụ anyị gbanwere n’ezie! Anyị nwere obi ụtọ ka anyị na ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị na-ahụ n’anya na-arụkọ ọrụ. Ime ihe anyị maara na o ziri ezi na-akwụghachi nnọọ ụgwọ!

Ije Ozi Ala Ọzọ

Na 1958, mụ na nwunye m gwara alaka ụlọ ọrụ dị n’Australia na anyị ga-enwe mmasị ịga New York City maka mgbakọ mba nile, bụ́ “Ime Uche Chineke,” nke a ga-eme ná ngwụsị afọ ahụ. Ha zaghachiri site n’izitere anyị fọm maka ịga ụlọ akwụkwọ ndị ozi ala ọzọ nke Gilead, bụ́ nke a ga-enwe na United State. Anyị chere na anyị etofeela ịga ụlọ akwụkwọ Gilead, ebe ọ bụ na anyị eruola ihe dị ka afọ iri atọ na ise. Ka o sina dị, anyị zigaara ha fọm ndị ahụ, ha kpọkwara anyị ka anyị sonye na klas nke iri atọ na abụọ. Ka agụmakwụkwọ ahụ na-aga n’ihu, e kenyere anyị ije ozi ala ọzọ n’India! Ọ bụ ezie na ahụ́ erughị anyị ala mgbe anyị nụrụ nke a, anyị jiri ọṅụ nakwere ya n’ihi na anyị chọrọ ime ihe ziri ezi.

Anyị ji ụgbọ mmiri mee njem, ma rute Bombay (nke bụzi Mumbai ugbu a), n’otu isi ụtụtụ nke afọ 1959. Ka anyị rutere n’ọdụ ụgbọ mmiri nke dị n’obodo ahụ, anyị hụrụ ọtụtụ narị ndị ọrụ ike keta o rie ka ha ghasara n’ebe ahụ na-ehi ụra. Ebe ahụ nwechara otú o si na-esi. Anyị matara ihe anyị na-aga iche ihu n’obodo a mgbe anwụ malitere ịcha. Anyị ahụtụbeghị ụdị okpomọkụ dị otú a! Ọ bụ di na nwunye bụ́ ndị ozi ala ọzọ bụ́ Lynton na Jenny Dower, bụ́ ndị anyị na ha jekọrọ ozi na Ballarat, nabatara anyị. Ha kpọgara anyị n’alaka ụlọ ọrụ India na Ebe Obibi Betel nke dị n’otu ụlọ elu ndị mmadụ bijuru, bụ́ nke dịdewere nso etiti obodo ahụ. Ha dị ndị ọrụ afọ ofufo isii n’ebe obibi Betel ahụ. Nwanna Edwin Skinner, bụ́ onye nọworo na-eje ozi dị ka onye ozi ala ọzọ n’India kemgbe 1926, tụụrụ anyị aro ka anyị zụrụ akpa abụọ e ji eme njem tupu anyị agawa ebe e kenyere anyị ọrụ. Ọtụtụ ndị na-eji ụdị akpa ndị a eme njem n’ụgbọ okporo ígwè ndị e nwere n’India. Akpa ndị a bakwaara anyị uru ná njem ndị ọzọ anyị mere.

Ka anyị jisịrị ụgbọ okporo ígwè mee njem ruo abalị abụọ, anyị ruru Tiruchchirappalli bụ́ ebe e kenyere anyị ọrụ, nke bụ́ obodo dị n’ebe ndịda Madras (bụ́ Tamil Nadu ugbu a). Mgbe anyị rutere n’ebe ahụ, anyị sonyeere ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche atọ bụ́ ndị India, bụ́ ndị na-agbara narị puku mmadụ abụọ na iri puku ise bi ebe ahụ àmà. Ego a na-akpata dị ala. E nwere otu oge mgbe anyị nwere ihe na-erughị pam abụọ. Ma mgbe ego ahụ gwụrụ, Jehova agbahapụghị anyị. Otu nwoke anyị na-amụrụ Bible gbazinyere anyị ego iji nweta ụlọ kwesịrị ekwesị anyị ga-anọ na-amụ ihe. N’otu oge anyị na-enweghị ihe anyị ga-eri, otu onye agbata obi anyị wetaara anyị nri. Nri ahụ tọrọ m ụtọ, ma ose juru ya nke na o mere ka otuturu malite ịkpọ m!

N’ozi Ubi

Ọ bụ ezie na ụfọdụ ndị bi na Tiruchchirappalli na-asụ Bekee, ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime ha na-asụ Tamil. N’ihi ya, anyị gbalịsiri ike ịmụta ụzọ dị mfe a pụrụ isi jiri asụsụ Tamil zie ndị mmadụ ozi ọma. Mgbalị dị otú a anyị mere iji mụta asụsụ ndị obodo ahụ mere ka ọtụtụ ndị obodo ahụ kwanyewere anyị ùgwù.

Ozi anyị gara site n’ụlọ ruo n’ụlọ tọrọ anyị ụtọ nke ukwuu. E ji ile ọbịa mara ndị India, ihe ka ọtụtụ n’ime ha kpọbatakwara anyị ka anyị bịa tụrụtụ ndụ mmanụ. Anyị nwere obi ụtọ dị ukwuu maka ọbịa ha lere anya n’ihi na okpomọkụ e nwere ebe ahụ dị egwu. Ọ bụ ihe na-egosi na mmadụ nwere àgwà ọma ibu ụzọ jụọ ha otú ha na-eme tupu anyị ebido ziwe ha ozi ọma. Ndị nwe ụlọ na-ajụkarị mụ na nwunye m, sị: “Ùnu bụ ndị ebee?” “Ùnu nwere ụmụ? N’ihi gịnị?” Ọ bụrụ na ha achọpụta na anyị enweghị ụmụ, ha na-agwa anyị dọkịta maara nke a na-akọ ga-enye anyị ọgwụ! Otú ọ dị, nkwurịta okwu ndị dị otú a nyeere anyị aka ịkọwa onwe anyị nakwa ịkọwara ha mkpa ọ dị ịkụziri ndị mmadụ Bible.

Ihe ka ọtụtụ ná ndị anyị gbaara àmà bụ ndị Hindu—nke bụ́ okpukpe dị iche n’okpukpe Ndị Kraịst. Kama isoro ha rụwa ụka banyere otú nkwenkwe ndị Hindu si dị mgbagwoju anya, anyị na-aga kpọmkwem n’isi ihe anyị ji bịa site n’ikwusara ha ozi ọma nke Alaeze Chineke—nke a rụpụtakwara ihe dị mma. N’ime ọnwa isii, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mmadụ iri abụọ malitere ịbịa nzukọ ndị anyị na-anọ n’ụlọ anyị na-enwe. Otu onye n’ime ha bụ onye injinia aha ya bụ Nallathambi. Ya na nwa ya nwoke, bụ́ Vijayalayan, mesịrị nyere ihe ruru mmadụ iri ise aka ịghọ ndị ohu Jehova. Vijayalayan jetụkwara ozi n’alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova nke dị n’India.

Ọrụ Njegharị

Anyị anọrubeghị ọnwa isii n’India mgbe a gwara m ka m malite ije ozi dị ka onye nlekọta distrikti mbụ e nwere n’India. Nke a pụtara na m ga na-eme njem gburugburu India, na-ahazi nzukọ, ma na-eso ìgwè itoolu na-asụ asụsụ dị iche iche e nwere n’India na-arụkọ ọrụ. Nke a abụghị obere ọrụ. Anyị na-akwakọta uwe na ngwá ọrụ ga-ezuru anyị ruo ọnwa isii n’ime igbe atọ nakwa n’ime akpa ndị ahụ anyị ji eme njem, ma tinye isi n’ụgbọ okporo ígwè na-aga obodo Madras (nke a na-akpọ Chennai ugbu a). Ebe ọ bụ na ebe ndị dị na distrikti anyị dị puku kilomita isii na narị ise n’ozuzu, anyị na-anọ n’ije mgbe nile. N’otu oge, anyị mechiri mgbakọ n’ebe ndịda Bangalore n’ụbọchị Sunday. N’izu na-eso ya, anyị gawara n’ebe ugwu Darjeeling nke dị n’ugwu nta dị na Himalaya, ịga mgbakọ ọzọ. Isi Bangalore gaa Darjeeling dị puku kilomita abụọ na narị asaa. Anyị gbakwara ụgbọ okporo ígwè ugboro ise tupu anyị eruo.

N’oge anyị malitere njem anyị, anyị nwere mmasị igosi ndị mmadụ fim bụ́ The New World Society in Action. Fim a mere ka ndị mmadụ ghọta ọganihu e nweworo n’ọrụ ndị ohu Jehova na-arụ n’ụwa nile. Mgbe mgbe, ọtụtụ narị mmadụ na-abịa ekiri fim a. N’otu oge, anyị gosiri ìgwè mmadụ zukọtara n’akụkụ ụzọ fim ahụ. Ka fim ahụ na-aga n’ihu, mmiri rujuru. Ebe ọ bụ na e nwewo otu oge mgbe otu ìgwè kpasuru ọgba aghara mgbe a kwụsịtụrụ fim ahụ, ekpebiziri m ịga n’ihu n’igosi ha fim ahụ, ma emere m ka ọ gakwuo ngwa ngwa. Enwere m nnọọ obi ụtọ na fim ahụ gwụrụ na-akwụsịghị akwụsị tupu mmiri amalite ịtasị.

N’afọ ndị sochirinụ, mụ na Melody gazuru akụkụ ka ukwuu n’India. Ebe ọ bụ na ụdị ihe oriri, ejiji, asụsụ, na ọdịdị nke ógbè nke ọ bụla dị iche n’ibe ya, o yiri ka ọ bụ ime njem site n’otu mba gaa ná mba ọzọ. N’ezie, ihe ndị Jehova kere dịgasị nnọọ iche iche n’ụzọ na-adọrọ mmasị! Otú ahụ ka ọ dịkwa n’ihe banyere anụmanụ ndị bi n’ọhịa ndị dị n’India. N’otu oge ka anyị nọ n’oké ọhịa dị na Nepal, anyị hụrụ nnọọ otu nnukwute agụ. Ọ bụ anụmanụ dị egwu. Mgbe anyị hụrụ ya, ọchịchọ anyị nke bụ́ ibi na Paradaịs, bụ́ ebe udo ga-emesị dịrị n’etiti mmadụ na ụmụ anụmanụ, bịara sikwuo ike.

Mgbanwe Ndị E Nwere n’Otú E Si Ahazi Ọrụ Ndị Jehova

N’oge ahụ, ọ dị mkpa ka ụmụnna ndị nọ n’India gbasokwuo ntụziaka ndị e nyere banyere otú e kwesịrị isi na-ahazi ọrụ Ndịàmà Jehova. N’ọgbakọ ụfọdụ n’oge ahụ, ndị nwoke na ndị nwanyị adịghị anọdụ n’otu ebe mgbe a na-enwe nzukọ. Ọ na-esi ike ịmalite ọmụmụ ihe n’oge. N’otu ebe, a na-eji mgbịrịgba na-adasi ụda ike agwa ndị nkwusa na oge ọmụmụ ihe eruola. N’ebe ndị ọzọ, ọ bụ anyanwụ ka ụmụnna anyị ji ekpebi mgbe oge ruru maka ịbịa ọmụmụ ihe, ọ bụghị elekere. Ha adịghị enwe mgbakọ na nleta nke ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị mgbe e kwesịrị inwe ha. Ụmụnna ndị nọ n’ebe ndị ahụ dị njikere ime ihe ziri ezi, ma ha chọrọ ọzụzụ.

Na 1959, Ndịàmà Jehova hiwere Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Alaeze. Ọzụzụ a e nyere ndị nlekọta sekit, ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche, ndị ozi ala ọzọ, na ndị okenye gburugburu ụwa nyeere ha aka ịrụzu ọrụ ha nke dabeere n’Akwụkwọ Nsọ n’ụzọ dị irè karị. Ejere m ozi dị ka onye nkụzi mgbe ụlọ akwụkwọ ahụ malitere n’India na December 1961. Nke nta nke nta, ọgbakọ ndị dị n’India malitere irite uru site n’ọzụzụ ahụ, ha nwekwara ọganihu ngwa ngwa. Ozugbo ụmụnna ndị ahụ matara ihe ziri ezi, mmụọ nsọ Chineke kpaliri ha ime ya.

Nnukwu mgbakọ ndị e nwere gbakwara ụmụnna ume ma mee ka ha dị n’otu. Nke kasị pụta ìhè ná mgbakọ ndị ahụ bụ mgbakọ mba nile nke isiokwu ya bụ “Ozi Ọma Ebighị Ebi,” bụ́ nke e nwere na New Delhi n’afọ 1963. Ndịàmà nọ gburugburu India mere njem weere ha ọtụtụ puku kilomita iji gaa mgbakọ ahụ, ọtụtụ mefuru ego nile ha chekwara iji hụ na ha mere nke a. Ebe ọ bụ na narị mmadụ ise na iri asatọ na ise si n’ala iri abụọ na asaa bịa mgbakọ ahụ, nke a bụ nke mbụ Ndịàmà nọ n’India zutere ọnụ ọgụgụ buru ibu nke ụmụnna ndị si mba ọzọ ma soro ha nọkọọ.

Na 1961, a kpọrọ mụ na Melody òkù ịbịa sonye n’ezinụlọ Betel dị na Bombay, bụ́ ebe m mesịrị soro jee ozi na Kọmitii Alaka. Enwekwara m ihe ùgwù ndị ọzọ. Ejere m ozi dị ka onye nlekọta zoonu n’akụkụ nile nke Eshia nakwa n’Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwu Ụwa ruo ọtụtụ afọ. Ebe ọ bụ na a na-emegide ọrụ nkwusa ahụ n’ọtụtụ ebe ná mba ndị a m jere ozi na ha, ọ dị mkpa ka ndị nkwusa bi n’ebe ndị a ‘dị akọ dị ka agwọ ma bụrụkwa ndị aka ha dị ọcha dị ka nduru.’—Matiu 10:16.

Mmụba na Mgbanwe

Na 1959, bụ́ mgbe anyị rutere n’India na nke mbụ ya, ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa na-agachi ozi ọma anya n’obodo ahụ dị otu puku narị ise na iri na anọ. Taa, ọnụ ọgụgụ ahụ akarịala puku mmadụ iri abụọ na anọ. Iji hụ maka mkpa nke ọnụ ọgụgụ a na-amụba amụba, ezinụlọ Betel kwapụrụ ugboro abụọ kwaga n’ebe obibi dị iche iche n’ime ma ọ bụ n’ebe dị nso na Bombay. Ezinụlọ Betel mesịrị kwapụ ọzọ na March 2002, na nke ugbu a, ha kwagara n’ihe owuwu ọhụrụ buru nnọọ ibu bụ́ nke dị nso na Bangalore, n’ebe ndịda India. Ugbu a, ndị òtù ezinụlọ Betel dị narị mmadụ abụọ na iri anọ bi n’ebe obibi ọhụrụ a, ụfọdụ n’ime ha na-asụgharịkwa akwụkwọ ndị e ji amụ Bible gaa n’asụsụ iri abụọ.

Ọ bụ ezie na ọ gụsiri mụ na Melody agụụ ike iso kwaga Bangalore, bụ́ ebe ihe owuwu ọhụrụ anyị dị, na 1999 ọrịa mere ka anyị laghachi Australia. Anyị na-ejezi ozi n’ezinụlọ Betel dị na Sydney. Ọ bụ ezie na anyị anọkwaghị n’India, ịhụnanya anyị nwere n’ebe ndị enyi anyị na ndị anyị nyeere aka ha abata n’ọgbakọ n’obodo ahụ ka siri ike. Anyị na-enwe ọṅụ dị ukwuu mgbe ọ bụla anyị natara akwụkwọ ozi ha!

A gọziwo mụ na Melody n’ụzọ dị ukwuu ka anyị na-echeta ihe karịrị afọ iri ise anyị jiworo jee ozi dị ka ndị ozi oge nile. N’oge gara aga, ọrụ anyị bụ ime ka onyinyo ndị mmadụ dịgide na foto, ma ime ka ndị mmadụ dịgide n’ikike ncheta Chineke ka ya mma. Anyị enwewo ahụmahụ ndị magburu onwe ha n’ihi ikpebi ibute Chineke ụzọ ná ndụ anyị! N’ezie, ime ihe Chineke kwuru na o ziri ezi na-eweta ezi obi ụtọ!

[Map ndị dị na peeji 15]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

INDIA

New Delhi

Darjeeling

Bombay (Mumbai)

Bangalore

Madras (Chennai)

Tiruchchirappalli

[Foto ndị dị na peeji nke 13]

Hadyn na Melody in 1942

[Foto dị na peeji nke 16]

Ezinụlọ Betel dị n’India, 1975