Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Gịnị ka Pọl onyeozi bu n’uche mgbe o kwuru na ụmụ nwanyị kwesịrị “ịgbachi nkịtị n’ọgbakọ”?

Pọl degaara ọgbakọ Ndị Kraịst nọ na Kọrint akwụkwọ, sị: “Dị ka ọ dị n’ọgbakọ nile nke ndị nsọ, ka ụmụ nwanyị na-agbachi nkịtị n’ọgbakọ, n’ihi na e nyeghị ha ikike ikwu okwu.” (1 Ndị Kọrint 14:33, 34) Ịtụle ihe gbara ndụmọdụ Pọl gburugburu ga-enyere anyị aka ịghọta ihe Pọl bu n’uche.

Na 1 Ndị Kọrint isi 14, Pọl nọ na-ekwu banyere nzukọ Ndị Kraịst. Ọ kọwara ihe ndị e kwesịrị ịmụ ná nzukọ ndị a ma tụọ aro otú a ga-esi mụọ ha. (1 Ndị Kọrint 14:1-6, 26-34) Ọ gara n’ihu ime ka nzube e ji enwe nzukọ Ndị Kraịst pụta ìhè—“ka e wee wulie ọgbakọ elu.”—1 Ndị Kọrint 14:4, 5, 12, 26.

Ndụmọdụ Pọl nyere ka a “gbachie nkịtị” pụtara ugboro atọ ná 1 Ndị Kọrint isi 14. Na nke ọ bụla, ọ bụ ìgwè dị iche nọ n’ọgbakọ ka ọ na-agwa, ma n’ozuzu, o bu otu ihe n’uche kwuo ya—ọ bụ ka “ihe nile were ọnọdụ n’ụzọ kwesịrị ekwesị nakwa dị ka ndokwa si dị.”—1 Ndị Kọrint 14:40.

Nke mbụ, Pọl kwuru, sị: “Ọ bụrụkwa na mmadụ na-ekwu okwu n’asụsụ dị iche, ka ọ ghara ịkarị mmadụ abụọ ma ọ bụ atọ ma ọ karị ka, onye kwusịakwa ibe ya ekwuo; ka otu onye na-emekwa nsụgharị. Ma ọ bụrụ na e nweghị onye nsụgharị, ya gbachie nkịtị n’ọgbakọ ma na-agwa onwe ya na Chineke okwu.” (1 Ndị Kọrint 14:27, 28) Nke a apụtaghị na onye dị otu ahụ agatụghị ekwu okwu ná nzukọ kama, ọ pụtara na e nwere oge o kwesịrị ịgbachi nkịtị. E kwesịrị icheta na ọ bụrụ na e jiri asụsụ ndị ọzọ na-adịghị aghọta na-ekwu okwu, a gaghị emezu nzube e ji maka ya enwe nzukọ ndị ahụ nke bụ́ iji wulie ibe anyị elu.

Nke abụọ, Pọl kwuru, sị: “Ka ndị amụma abụọ ma ọ bụ atọ kwuo okwu, ka ndị ọzọ chọpụtakwa ihe ọ pụtara. Ma ọ bụrụ na e kpugheere onye nke ọzọ ihe mgbe ọ nọ ala n’ebe ahụ, ka onye nke mbụ gbachie nkịtị.” Nke a apụtaghị na onye amụma nke mbụ agaghị na-ekwu okwu ná nzukọ kama o kwesịrị ịgbachi nkịtị mgbe ụfọdụ. Mgbe ọ gbachiri nkịtị, onye nke e kpugheere ọhụụ pụziri ịgwa nzukọ ahụ ihe ọ hụrụ, a ga-emezukwa nzube mere e ji nwee nzukọ ahụ nke bụ́ ka “e wee gbaa mmadụ nile ume.”—1 Ndị Kọrint 14:26, 29-31.

Nke atọ, Pọl gwara nanị ụmụnna nwanyị okwu, na-ekwu, sị: “Ka ụmụ nwanyị na-agbachi nkịtị n’ọgbakọ, n’ihi na e nyeghị ha ikike ikwu okwu, kama ka ha nọrọ n’okpuru.” (1 Ndị Kọrint 14:34) Gịnị mere Pọl ji nye ụmụnna nwanyị iwu a? Ọ bụ iji hụ na ihe na-aga n’usoro n’ọgbakọ. Pọl sịrị: “Ya mere, ọ bụrụ na ha chọrọ ịmụta ihe, ka ha jụọ di ha n’ụlọ, n’ihi na ọ bụ ihe ihere nwanyị ikwu okwu n’ọgbakọ.”—1 Ndị Kọrint 14:35.

Eleghị anya, ụfọdụ ụmụnna nwanyị nọ na-agbagha ihe ndị e kwuru n’ọgbakọ. Ndụmọdụ Pọl nyeere ụmụnna nwanyị aka ịhapụ àgwà dị otú ahụ nke na-akpata ọgba aghara ma jiri obi umeala nakwere ọnọdụ Jehova debere ha ná ndokwa o mere maka otú a ga-esi na-abụ isi, karịsịa ma a bịa n’ebe di ha nọ. (1 Ndị Kọrint 11:3) Ọzọkwa, site n’ịgbachi nkịtị, ụmụnna nwanyị na-egosi na ha adịghị achọ ịdị na-ezi ihe n’ọgbakọ. Mgbe o degaara Timoti akwụkwọ, Pọl gosiri na ọ ga-abụ ihe na-ekwesịghị ekwesi nwanyị ịchọ izi ihe n’ọgbakọ, o kwuru, sị: “Enyeghị m nwanyị ikike izi ihe, ma ọ bụ inwe ikike n’ebe nwoke nọ, kama ka ọ na-agbachi nkịtị.”—1 Timoti 2:12.

Nke ahụ ọ̀ pụtara na nwanna nwanyị agatụghị ekwu okwu ná nzukọ ọgbakọ? Ee e. N’oge Pọl, e nwere mgbe ụfọdụ ụmụnna nwanyị kpere ekpere ma ọ bụ buo amụma n’ọgbakọ, eleghị anya ọ bụ mmụọ nsọ kpaliri ha ime otú ahụ. N’oge ndị dị otú ahụ, ha na-egosipụta nkwanye ùgwù site n’ikpuchi isi ha. * (1 Ndị Kọrint 11:5) N’oge Pọl, nakwa taa, a gbara ma ụmụnna nwanyị ma ụmụnna nwoke ume ịdị na-ekwupụta olileanya ha n’ihu ọha. (Ndị Hibru 10:23-25) E wezuga n’ozi ubi, ụmụnna nwanyị na-ekwupụta olileanya ha ma na-agba ndị ọzọ ume mgbe a na-amụ ihe n’ọgbakọ, site n’ịza azịza ndị e chebaara echiche nke ọma mgbe a gwara ya mee otú ahụ, nakwa site n’ime ihe ngosi ná Nzukọ Ije Ozi ma ọ bụ ime ihe omume n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke.

N’ihi ya, ụmụnna nwanyị ‘na-agbachi nkịtị’ site n’ịghara ịchọwa ịrụ ọrụ dịịrị nwoke na ịchọ izi ihe n’ọgbakọ. Ha adịghị ewelite ajụjụ ndị na-akpalite ịrụ ụka bụ́ nke na-egosi na ha na-ama ịbụisi nke ndị na-ezi ihe n’ọgbakọ aka. Ụmụnna nwanyị na-enye nnọọ aka ịhụ na e nwere udo site n’ịrụ ọrụ ha dị ka o kwesịrị n’ọgbakọ, “ka ihe nile [ná nzukọ ọgbakọ] were ọnọdụ maka iwuli elu.”—1 Ndị Kọrint 14:26, 33.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 10 N’oge a, ụmụnna nwanyị tozuru okè na-agbaso ụkpụrụ a mgbe ọnọdụ ụfọdụ mere ka ọ dị mkpa ka ha rụọ ọrụ nwanna nwoke e mere baptizim kwesịrị ịrụ n’ọgbakọ.—Lee Ụlọ Nche nke July 15, 2002, peeji nke 26.