Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Akụkọ Ndị E Nwetara n’Africa

Akụkọ Ndị E Nwetara n’Africa

Akụkọ Ndị E Nwetara n’Africa

Ọnụ ọgụgụ ala e nwere: 56

Ọnụ ọgụgụ mmadụ: 781,767,134

Ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa: 1,015,718

Ọnụ ọgụgụ ọmụmụ Bible: 1,820,540

UGANDA: Lucy bụ Onyeàmà nke na-arụ ọrụ n’otu nnukwu ụlọ ọrụ ebe a na-anara ọgwụ. Mgbe a chọpụtara na ego buru ibu furu n’ebe ahụ ọ na-arụ ọrụ, a kpọrọ ya na ndị ọrụ ibe ya ụfọdụ ka ha bịa ṅụọ iyi iji gosi na aka ha dị ọcha. Mgbe o ruru Lucy n’aka ka ọ bịa jide Bible ma ṅụọ iyi iji gosi na aka ya dị ọcha, kama ịṅụ iyi, ọ sapetara Ilu 15:3 ma gụọ ya n’olu dara ụda: “N’ebe nile ọ bụla ka anya abụọ nke Jehova dị, na-eche ndị ọjọọ na ndị bụ́ ezi mmadụ nche.” Mmadụ nile gbara nkịtị ruo nwa oge, onye zuuru ego ahụ gakwuuru onye na-elekọta ụlọ ọrụ ahụ ma kwuo na ọ bụ ya zuuru ego ahụ. Onye nlekọta ụlọ ọrụ ahụ kwuru na n’ọdịnihu, onye ọ bụla ga na-echeta akụkụ Akwụkwọ Nsọ ahụ Lucy gụrụ. E mesịrị tinyekwuoro Lucy ego n’ụgwọ ọnwa ya, e nyekwara ya ọrụ nke ịdị na-eji mkpịsị ugodi nke ụlọ ọrụ ahụ.

Benin: Josué ediela ọtụtụ emo a na-akwa ya n’ụlọ akwụkwọ. Mgbe ọ na-azataghị ajụjụ a jụrụ na klas, ụfọdụ ụmụ klas ibe ya na-akwa ya emo, na-asị, “Pastọ Jehova, olee otú ga-esi zajọọ ajụjụ a?” Ndị ọzọ na-eso akwa ya emo na-ekwugasị ihe dị ka, “Ọ na-eji oge ya nile ebugharị akpa.”

Josué kwuru, sị, “Ụjọ na-atụ m izute ụmụ klas ibe m mgbe na-aga ozi ọma ná ngwụsị izu.” O kpegaara Jehova ekpere banyere nke a ma gakwuru otu okenye, bụ́ onye gbara Josué ume ka ọ kata obi mee ihe banyere nke ahụ site n’itinyekwu oge n’ozi ubi nakwa site n’ịdị na-enyefe ụmụ klas ibe ya akwụkwọ ndị e ji amụ Bible n’atụghị egwu. Ihe ahụ a gwara Josué mee rụpụtara ihe atọ gbara ọkpụrụkpụ. Ọ na-ekwu, sị: “Ana m ejekarị ozi ugbu a dị ka ọsụ ụzọ inyeaka. Ana m amụrụ mmadụ abụọ n’ime ụmụ klas ibe m bụ́ ndị na-akwabu m emo Bible. M na-emekwuzi nke ọma n’agụmakwụkwọ m karịa ka m na-emebu.”

Etiopia: Ihe dị ka afọ abụọ gara aga, Asnakech hụrụ otu akwụkwọ ikike ịkwọ ụgbọala, ọ kpọtụrụ onye nwe ya, bụ́ otu nwanyị aha ya bụ Elsa, ma gwa ya oge ọ ga-eweghachiri ya akwụkwọ ikike ịkwọ ụgbọala ahụ. Ịkwụwa aka ọtọ Asnakech tụrụ nwanyị ahụ n’anya, ọ chọkwara inye ya ego. Asnakech jụrụ ịnara ego ahụ ma nye Elsa broshuọ bụ́ Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị? N’echi ya, Elsa malitere ịmụ Bible. O kwuru na aha ahụ bụ́ Jehova abụghịrị ya ihe ọhụrụ n’ihi na nna ya, bụ́ ụkọchukwu, agwala ya banyere aha ahụ. Mgbe ya na ndị ezinụlọ ya gara otu mgbakọ distrikti, di ya malitekwara ịmụ Bible. Otú ọ dị, mgbe nna ya, bụ́ ụkọchukwu chọpụtara ihe na-emenụ, iwe juru ya obi, ya ana-akpọ Ndịàmà Jehova ndị na-abaghị uru. Elsa kpebisiri ike ịnọgide na-amụ ihe, o jiri obiọma gwa nna ya na Ndịàmà Jehova adịtụghị otú ahụ o chere na ha dị. Nke a gwụrụ nna ya ike, o weere broshuọ Na-achọ nke nwa ya nwanyị n’agwaghị ya agwa. Ọ gụrụ ya ọtụtụ ugboro, ihe dị n’ime ya metụkwara ya n’obi. Mgbe nke ahụ gasịrị, ọ naghịzi akpọtụ Atọ n’Ime Otu mgbe ọ na-agọzi ndị na-agafe agafe dị ka ọ na-emebu. N’oge na-adịghị anya, ha malitere ịkpọ ya “onye jụrụ okwukwe,” ụfọdụ ndị chọdịrị iti ya ihe. N’ihi ya, ọ kwagara Addis Ababa, bụ́ ebe ọ nọ malite ịmụ Bible. Elsa na mmadụ asaa si n’ezinụlọ ya aghọọla Ndịàmà e mere baptizim. Di ya na nwa ya na-emekwa nke ọma n’ụzọ ime mmụọ.

Côte d’Ivoire: Anderson nyere onye na-ere ihe n’otu ụlọ ahịa, bụ́ onye na-agụchi Bible anya, broshuọ bụ́ Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị? N’oge na-adịghị anya, a malitere ịmụrụ onye ahụ Bible. Isiokwu bụ́ “Ndụ Ezinụlọ nke Na-atọ Chineke Ụtọ” dọọrọ nnọọ mmasị nwoke ahụ. Ọ kọwara, sị: “Amaghị m na ma di ma nwunye nwechara ọrụ nke ha n’alụmdi na nwunye. Ọ bụrụ na m lọta mgbe oge gaworo, adịghị m achọ ịnụ ihe ọ bụla nwunye m nwere ikwu. M na-agwa ya, sị, ‘Ọ bụ m bụ nwoke nwe ụlọ, m ga-apụ mgbe ọ bụla m chọrọ ịpụ; ọ bụ gị bụ nwunye, ọrụ gị bụ ilekọta ụlọ.’ M na-alọtazi ozugbo ọrụ mechiri ma nyere nwunye m aka n’ọrụ ọ na-arụ n’ụlọ.”

Malawi: Mgbe otu nwanna nwoke na-aga ozi ọma, otu nwoke na-agba ígwè na-amajakarị ya. Mgbe ọ bụla nwoke ahụ hụrụ ka nwanna ahụ na-ezi ndị mmadụ ozi ọma, ọ na-akwụsị ma gbalịa ịkpalite arụmụka. O nwedịrị mgbe ọ gbalịrị ịnara nwanna ahụ Bible ya. Otu ụbọchị, nwoke ahụ gbafere ebe nwanna ahụ nọ na-amụrụ mmadụ Bible. Mgbe nwoke ahụ hulatara ka o mezie ihe mebiri n’ígwè ya, aka ya banyere na spok wiil ihu ígwè ya, o merụkwara ezigbo ahụ́ ná mkpịsị aka ya. Ọ bụ ezie na ihe ahụ nọ na-egbu nwoke ahụ mgbu nke ukwuu, n’ime ndị nile hụrụ ihe ahụ mere ya, ọ bụ nanị nwanna nwoke ahụ bụ onye kechiri mkpịsị aka ya ahụ ma mee ndokwa ka a kpọga ya ụlọ ọgwụ. Ka e mesịrị, nwanna ahụ gara n’ụlọ nwoke ahụ. Ihere mere nwoke ahụ n’ihi otú ahụ o si emesobu nwanna ahụ, o kwupụtara na ihe mere ya ji emeso ya otú ahụ bụ n’ihi ihe na-abụchaghị eziokwu ọ nụrụ banyere Ndịàmà Jehova. O kwuru, sị: “N’ezie, ọ bụ unu na-efe ezi Chineke ahụ. Amaghị m na ị ga-akpaso m àgwà obiọma otú a n’agbanyeghị ihe ọjọọ nile m mere gị.”

Cameroon: N’otu ụlọ ọgwụ, otu nwanna nwanyị na-eto eto nọ n’ọnụ ụlọ ndị chọrọ ịhụ dọkịta na-anọ, ndị mmadụ jukwara ebe ahụ. Otu agadi nwoke ahụ́ na-adịghị batara. Ebe ọ bụ na ndị mmadụ anọchichaala oche nile, nwoke ahụ guzooro ọtọ. Nwanna nwanyị ahụ na-echeta, sị: “Emeteere m nwoke ahụ ebere ma bilie ka ọ nọrọ n’oche m. Nke a mere ka ndị nile nọ n’ebe ahụ malite ịtamu ntamu n’ihi na ịhapụrụ ya oche m pụtara na ọ bụ ya ga-aga ịhụ dọkịta ma ọ bụrụ na oge m ga-eji aga hụ dọkịta eruo. N’oge na-adịghị anya, otu nwanyị bịakwutere m ma jụọ m okpukpe m na-ekpe. Agwara m ya na abụ m otu n’ime Ndịàmà Jehova. O toro m n’ihi na dị ka o si chee, ọ bụ nanị ndị na-eto eto ole na ole ga-akpa àgwà dị otú ahụ. Ejiri m ohere ahụ jiri traktị ndị m ji gbaara ya na ndị ọzọ nọ ebe ahụ àmà. Azara m ọtụtụ ajụjụ ndị ha jụrụ. Ụfọdụ ndị mụ na ha kwurịtara okwu gbanwere echiche ha nweburu banyere Ndịàmà Jehova, ha nwekwuru ọchịchọ ka Ndịàmà bịa na nke ha.”

Togo: Mgbe ha nọ n’ozi n’otu ógbè dịpụrụ adịpụ, ụmụnna ụfọdụ hụrụ otu nwoke obi dị ụtọ n’ihi na ha bịara. O gosiri ha akwụkwọ abụọ o ji depụtaghachi ihe nile dị n’akwụkwọ bụ́ Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’Ime Paradaịs n’Elu Ala na akụkụ ụfọdụ nke akwụkwọ bụ́ “Make Sure of All Things.” Ọ hụrụ akwụkwọ ndị a n’ụlọ otu pastọ na-agbasa ozi ọma, bụ́ ebe o biri ruo oge ụfọdụ. Pastọ ahụ nwere ebe ndebe akwụkwọ abụọ, otu bụ ebe ọ na-edebe akwụkwọ ndị kasị amasị ya, ebe nke ọzọ bụ́ ebe ọ na-edebe “akwụkwọ ndị na-abachaghị uru.” Ọ bụ n’ebe pastọ a na-edebe akwụkwọ ndị na-abachaghị uru ka nwa okorobịa ahụ chọtara akwụkwọ ndị ahụ. Mgbe ọ gụsịrị peeji ole na ole nke otu n’ime akwụkwọ ndị ahụ, ozi dị na ya dọọrọ mmasị ya. Ebe ọ bụ na a gaghị ekwe ya were akwụkwọ ahụ, ọ maghịkwa ebe ọ ga-enweta ya, o depụtaghachiri ya. Mgbe ọ malitere ịkọrọ ndị mmadụ ihe ọ gụtara, ma mama ya ma pastọ ahụ malitere imegide ya. Ụmụnna ahụ nyere ya akwụkwọ ndị e ji amụ Bible ma na-enyere ya aka inwe ọganihu ime mmụọ.

South Africa: Onye Onyeàmà bụ́ Thandi, na-arụrụ ọrụ gwara ya ka o soro otu onye ọrụ ibe ya aha ya bụ Bella, bụ́ onye nwere nsogbu n’alụmdi na nwunye ya, kwurịta okwu. Di Bella, bụ́ onye uwe ojii, na-eti Bella ihe ma na-eme ya ihe na-egbu mmụọ ya, Bella kpebiziri ịgba ya alụkwaghịm. Thandi nyere Bella mkpụrụ abụọ nke akwụkwọ ahụ bụ́ Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ ma gbaa ya ume ka o nye di ya otu. Mgbe otu izu gasịrị, Thandi soro nwanyị ahụ kwurịta okwu ọzọ ma chọpụta na di nwanyị ahụ na-agụ akwụkwọ ahụ nakwa na udo adịla n’ụlọ ha. Mgbe ọnwa atọ gasịrị, Bella gwara Thandi na Chineke enyeworo ha aka mee alụmdi na nwunye ha ghara ịtọsa site n’ekpere na akwụkwọ Obi Ụtọ Ezinụlọ. Mgbe onye Bella na-arụrụ ọrụ nụrụ nke a, ọ tụrụ aro ka puku mmadụ abụọ nile na-arụrụ ya ọrụ nwetachaa akwụkwọ ahụ. Ka ọ dị ugbu a, Thandi enyefeela ndị ọrụ ibe ya mkpụrụ akwụkwọ Obi Ụtọ Ezinụlọ iri itoolu na isii. Ụlọ ọrụ ahụ nyere onyinye maka ọrụ zuru ụwa ọnụ Ndịàmà Jehova na-arụ.