Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Kọtụkwuoro Anyị!”

“Kọtụkwuoro Anyị!”

Kọtụkwuoro Anyị!”

ỤMỤ akwụkwọ nke otu ụlọ akwụkwọ kọleji dị na Nezlobnaya, Russia, nọ na klas ha na-amụ akwụkwọ ndị Mikhail Bulgakov dere. Otu n’ime akwụkwọ ndị ahụ kọwara Jizọs Kraịst n’ụzọ nlelị ma kọwaa Setan dị ka dike. Mgbe ha mụsịrị ihe, onye nkụzi ha gwara ha ka ha dee ihe odide banyere akwụkwọ ahụ ha na-amụ. Otú ọ dị, otu n’ime ụmụ akwụkwọ ahụ, bụ́ nwa okoro dị afọ iri na isii aha ya bụ Andrey onye bụ́ otu n’ime Ndịàmà Jehova, ji nkwanye ùgwù rịọ ka a gụpụ ya na ndị ga-ede ihe odide ahụ n’ihi na akọ na uche ya agaghị ekwe ya mụọ akwụkwọ dị otú ahụ. Ọ rịọrọ ka ya dee ihe odide nke ga-egosi ihe ya chere banyere Jizọs Kraịst. Onye nkụzi ha kwere.

Andrey kọwara n’edemede ya na ọ bụ ezie na ya adịghị akatọ echiche nke ndị ọzọ, na ya achọpụtala na ụzọ kasị mma isi mụta banyere Jizọs bụ ịgụ ihe ndekọ nke otu n’ime Oziọma anọ ahụ. Ọ bụrụ na unu emee otú ahụ, “unu ga-amụta banyere otú Jizọs si bie ndụ na ihe ndị ọ kụziri site n’ihe ndị ji anya ha hụ ihe merenụ dere.” Andrey gbakwụnyere, sị: “Ihe na-ewute m bụ otú e si kọwaa Setan. Ọ pụrụ ịdị na-atọ ụfọdụ ndị ọchị ịgụ akwụkwọ nke a kọwara Setan n’ime ya dị ka dike, ma nke ahụ adịghị atọ m ọchị.” Ọ kọwara na Setan bụ n’ezie ajọ mmụọ dị ike e kere eke nke gbakụtara Chineke azụ, ọ na-akpatakwara ihe a kpọrọ mmadụ ihe ọjọọ, nhụjuanya, na ahụhụ. Andrey mechiri ihe odide ya site n’ikwu, sị: “Echeghị m na ịgụ akwụkwọ a ga-abara m uru. Ghọtanụ na ọ dịghị ihe na-esere mụ na Bulgakov. Ihe mụ onwe m ga-eme iji mata ihe bụ́ eziokwu banyere Jizọs Kraịst bụ ịgụ Bible.”

Ihe Andrey dere masịrị onye nkụzi ya nke ukwuu nke mere ka ọ gwa Andrey ka ọ kwadebe akụkọ banyere Jizọs Kraịst nke ọ ga-akọrọ ụmụ klas ibe ya. Andrey kwetara ozugbo. Andrey gụrụ akụkọ ya n’ihu ụmụ klas ibe ya n’oge ọzọ ha na-agụ akwụkwọ na klas. Ọ kọwaara ha ihe mere o ji chee na Jizọs bụ nwoke kasị ukwuu nke dịworo ndụ. Ọ gụziiri ha otu isiakwụkwọ nke kwuru banyere ọnwụ Jizọs site n’akwụkwọ Bible bụ́ Matiu. Ebe ọ bụ na oge e nyere ya na-agwụnahụ ya, Andrey chọrọ imechi akụkọ ya, ma ụmụ klas ibe ya rịọrọ ya, sị: “Kọtụkwuoro anyị! Gịnị meziri?” Ọ gaziri n’ihu gụọrọ ha banyere mbilite n’ọnwụ Jizọs site n’ihe ndekọ Matiu.

Mgbe Andrey kwusịrị okwu, ụmụ klas ibe ya jụrụ ya ọtụtụ ajụjụ banyere Jehova na Jizọs. Andrey kwuru, sị: “Ekpegaara m Jehova ekpere ka o nye m amamihe, ọ zakwara ekpere m. Azara m ajụjụ nile ha jụrụ m!” Mgbe onye nkụzi ahụ kụzichaara ụmụ klas ya ihe, Andrey nyere ya akwụkwọ bụ́ Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ,  * onye nkụzi ahụ jikwa obi ụtọ nara ya. Andrey kwuru, sị: “O nyere m akara kasị elu n’ihi akụkọ m kọrọ ma jaa m mma n’ihi inwe ihe ndị m kweere na ha na ịghara ime ihere n’ihi ihe ndị ahụ m kweere na ha. O kwukwara na ya kweere na ihe ụfọdụ m kwuru bụ eziokwu.”

Andrey nwere obi ụtọ na ya mere ihe akọ na uche ya e ji Bible zụọ na-agwa ya site n’ịjụ ịgụ akwụkwọ na-akparị Jehova nakwa Ọkpara ya, bụ́ Jizọs Kraịst. Mkpebi ya a siri ike mere ka ọ jụ echiche Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị, ma meghekwaara ya ohere magburu onwe ya iji kwusaara ndị ọzọ eziokwu Bible.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 5 Nke Ndịàmà Jehova bipụtara.