Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

N’ebee Taa Ka A Na-eme Ihe Kraịst Kụziri?

N’ebee Taa Ka A Na-eme Ihe Kraịst Kụziri?

N’ebee Taa Ka A Na-eme Ihe Kraịst Kụziri?

N’ỌTỤTỤ ebe, a na-ele Jizọs Kraịst anya dị ka otu n’ime ndị ikom kasị ukwuu dịworo ndụ. Ọtụtụ ndị na-ele ya anya dị ka nwoke kasị ukwuu nke dịworo ndụ. Ruo ihe fọrọ nke nta ugbu a ka o ruo puku afọ abụọ, ihe ndị ọ kụziri anọwo na-agbanwe nnọọ ndụ ndị mmadụ. Otu onye edemede si England bụ́ Melvyn Bragg dere na ihe ndị Jizọs kụziri emewo ka ndị mmadụ “site n’imere ndị ọzọ ihe ọma na ịdị obiọma ruo n’ịbụ omepụrụ onye ọ dịịrị a ma ama.”

Olee Otú E Si Ele Iso Ụzọ Kraịst Anya?

Olee otú e si ele Iso Ụzọ Kraịst anya? A na-ele ya anya dị ka “ihe kasị eme ka mmadụ na Chineke dịrị ná mma.” David Kelso nke Mahadum Glasgow Caledonia nke dị na Scotland kwupụtara echiche ya. O dere, sị: “E mepụtawo ọtụtụ ihe n’ọrụ nkà, ihe owuwu, nkà ihe ọmụma, egwú ma rụọrọ ọha mmadụ ọrụ n’aha Iso Ụzọ Kraịst kemgbe puku afọ abụọ ọ malitere.”

Otú ọ dị, ọtụtụ ndị ọzọ nwere echiche dị iche na nke ahụ. Nsogbu ha abụghị na Iso Ụzọ Kraịst bụ okpukpe nke dabeere n’ihe ndị Jizọs Kraịst kụziri na nkwenkwe bụ́ na Jizọs bụ Ọkpara Chineke. Kama nke ahụ, ihe na-awụ ha akpata oyi n’ahụ́ bụ àgwà ndị okpukpe bụ́ ndị na-azọrọ na ha na-eso ụzọ Kraịst na-akpa.

Dị ka ihe atụ, onye Germany bụ́ ọkà ihe ọmụma na narị afọ nke 19, bụ́ Friedrich Nietzsche, kọwara Iso Ụzọ Kraịst dị ka “ntụpọ a na-apụghị ịsachapụ asachapụ nke ihe a kpọrọ mmadụ nwere.” O dere, sị: “Iso Ụzọ Kraịst bụ ọnụ kasịnụ a bụrụ ụmụ mmadụ, ihe kasị akpata omume rụrụ arụ juru ebe niile, . . . ọ pụrụ inweta ihe ọ bụla ọ chọrọ site n’imekpọ ndị mmadụ ọnụ, ịgha ụgha, nakwa site n’ime ihe na nzuzo.” Ọ bụ eziokwu na echiche Nietzsche nwere banyere Iso Ụzọ Kraịst abụchaghị otú Iso Ụzọ Kraịst dị, ma ụfọdụ ndị na-eche echiche ekwuwo ihe yiri nke ahụ. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ruo ọtụtụ afọ, e jighị àgwà Jizọs Kraịst mara ndị na-azọrọ na ha bụ Ndị Kraịst kama ihe e ji mara ha bụ “arụrụala, mpụ jọgburu onwe ya, na nkwulu.”

Kraịst Ọ̀ Ka Na-akwado Iso Ụzọ Kraịst?

Ọ bụ ihe ezi uche dịzi na ya ịjụ, sị, “Kraịst ọ̀ ka na-akwado Iso Ụzọ Kraịst?” Ụfọdụ pụrụ ịza n’egbughị oge, sị, “Eenụ! Ọ̀ bụ na o kweghị ụmụazụ ya nkwa na ya ga-anọnyere ha ‘ruo ọgwụgwụ ụwa’?” (Matiu 28:20, King James Version) Ee, Jizọs kwuru otú ahụ. Ma ihe o kwuru ọ̀ pụtara na ya ga-anọnyere onye ọ bụla zọọrọ na ya bụ onye na-eso ụzọ ya n’agbanyeghị otú omume onye ahụ dị?

Cheta na ụfọdụ ndị ndú okpukpe nke oge Jizọs chere na Chineke nọnyeere ha n’agbanyeghị otú omume ha dị. Ebe ọ bụ na Chineke họọrọ Izrel ịrụrụ ya ọrụ pụrụ iche, ụfọdụ ndị ndú okpukpe chere na Chineke agatụghị agbahapụ ha—otú ọ bụla ọ sọrọ omume ha ya dịrị. (Maịka 3:11) Otú ọ dị, ha mesịrị gbahapụchaa iwu na ụkpụrụ Chineke. N’ihi ya, Jizọs Kraịst gwara ha hoo haa, sị: “Lee! A gbahapụworo unu ụlọ unu.” (Matiu 23:38) Chineke jụrụ okpukpe ha, ma mee ka ndị agha Rom bibie isi obodo ha, bụ́ Jeruselem, na ụlọ nsọ ya na 70 O.A.

Ihe yiri nke ahụ ọ̀ pụrụ ime Iso Ụzọ Kraịst? Ka anyị hụ ihe Jizọs chọrọ ka ụmụazụ ya na-eme mgbe o kwere ha nkwa na ya ga-anọnyere ha “ruo ọgwụgwụ ụwa.”

[Foto ndị dị na peeji nke 2, 3]

Ihe ndị Jizọs Kraịst kụziri nwere mmetụta dị ukwuu n’ahụ́ ọtụtụ nde mmadụ gburugburu ụwa