Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ntụrụndụ Ziri Ezi Bụ́ nke Na-eme Ka E Nwee Ume Ọhụrụ

Ntụrụndụ Ziri Ezi Bụ́ nke Na-eme Ka E Nwee Ume Ọhụrụ

Ntụrụndụ Ziri Ezi Bụ́ nke Na-eme Ka E Nwee Ume Ọhụrụ

“Ma unu na-eri ihe ma unu na-aṅụ ihe ọṅụṅụ ma unu na-eme ihe ọ bụla ọzọ, na-emenụ ihe nile iji nye Chineke otuto.”—1 NDỊ KỌRINT 10:31.

1, 2. N’ihi gịnị ka a pụrụ iji lee ịtụrụ ndụ anya dị ka “onyinye Chineke,” ma ịdọ aka ná ntị dị aṅaa doro anya ka Bible na-enye?

Ọ DỊGHỊ onye ọ na-adịghị amasị ime ihe ndị ga-enye ya obi ụtọ ná ndụ. Chineke anyị, bụ́ Jehova, bụ Chineke onye obi ụtọ, ọ chọrọ ka anyị na-enwe obi ụtọ ná ndụ, o nyekwara anyị ihe ndị ga-eme ka nke ahụ kwe omume. (1 Timoti 1:11; 6:17) Eze Solomọn maara ihe dere, sị: “Amawo m na ọ dịghị ezi ihe dịịrị ha, ma ọ́ bụghị ka mmadụ ṅụrịa ọṅụ, . . . Ọzọkwa, mmadụ ọ bụla nke na-eri ihe, nke na-aṅụkwa ihe ọṅụṅụ, nke na-ahụkwa ezi ihe ná ndọgbu nile ọ na-adọgbu onwe ya n’ọrụ, onyinye Chineke ka nke ahụ bụ.”—Eklisiastis 3:12, 13.

2 Ọ bụ ihe na-enye ume ọhụrụ mgbe mmadụ zurutụrụ ike iji tụọ ndụ ya mmanụ n’ihi ezi ihe nke ọ rụpụtara, karịsịa ma ọ bụrụ na ọ bụ ya na ezinụlọ ya ma ọ bụ ndị enyi ya nọ. A pụrụ ile ya anya n’ụzọ kwesịrị ekwesị dị ka “onyinye Chineke.” Otú ọ dị, na Onye Okike anyị nyere anyị ihe n’ụba enyeghị anyị ikike ikpori ndụ n’ụzọ a na-achịkwaghị achịkwa. Bible na-akatọ ịṅụbiga mmanya ókè, iribiga ihe ókè, na omume rụrụ arụ. Ọ na-adọkwa aka ná ntị na ndị na-eme ihe ndị dị otú a “agaghị eketa alaeze Chineke.”—1 Ndị Kọrint 6:9, 10; Ilu 23:20, 21; 1 Pita 4:1-4.

3. Gịnị ga-enyere anyị aka ịmụrụ anya n’ụzọ ime mmụọ ma nọgide buru oké ụbọchị Jehova nke na-abịanụ n’uche?

3 Ọ dịbeghị mgbe ọ bụla ọzọ o siiri Ndị Kraịst ike iji amamihe na-eme ihe n’ime ụwa nke rụrụ arụ ma ghara ime omume e ji mara ụwa, karịa ka o siiri ha ike n’ụbọchị ikpeazụ ndị a siri ike obibi. (Jọn 17:15, 16) Dị ka e buru n’amụma, ndị ọgbọ a aghọwo “ndị na-ahụ ihe ụtọ n’anya kama ịbụ ndị na-ahụ Chineke n’anya” ruo n’ókè nke na ha ‘amataghị’ ihe ndị na-egosi na “oké mkpagbu” dị nnọọ nso. (2 Timoti 3:4, 5; Matiu 24:21, 37-39) Jizọs dọrọ ụmụazụ ya aka ná ntị, sị: “Lezienụ onwe unu anya ka a ghara inwe mgbe iribiga ihe ókè na ịṅụ oké mmanya na nchegbu nke ndụ ga-anyịgbu obi unu, ụbọchị ahụ ewee bịakwasị unu na mberede n’otu ntabi anya dị ka ọnyà.” (Luk 21:34, 35) Dị ka ndị ohu Chineke, anyị kpebisiri ike ịṅa ntị n’ịdọ aka ná ntị Jizọs. N’adịghị ka ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke, bụ́ ndị anyị na ha bi n’ime ụwa, anyị na-agbalịsi ike ịmụrụ anya n’ụzọ ime mmụọ ma buru oké ụbọchị Jehova n’uche.—Zefanaịa 3:8; Luk 21:36.

4. (a) N’ihi gịnị ka o ji esi ike ịhụ ihe ntụrụndụ ndị dị mma? (b) Ndụmọdụ dị aṅaa nke dị ná Ndị Efesọs 5:15, 16 ka anyị kwesịrị itinye n’ọrụ?

4 Ọ dịghị mfe izere omume rụrụ arụ nke juru n’ụwa a, ebe ọ bụ na Ekwensu emewo ka ha na-adọrọ adọrọ ma dị mfe omume. Ọ na-esi ike karịsịa mgbe anyị na-achọ ihe ndị anyị ga-eji atụrụ ndụ. Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ihe ntụrụndụ ndị e nwere n’ụwa a bụ ndị e mere iji kpalie ‘ọchịchọ anụ ahụ́ mmadụ.’ (1 Pita 2:11) Ihe ntụrụndụ ndị rụrụ arụ juru n’ebe ndị ọha na eze na-anọ, ma ha pụkwara isi n’akwụkwọ ọgụgụ, telivishọn, Intanet, na vidio gbebata n’ime ụlọ anyị. N’ihi ya, Okwu Chineke na-enye Ndị Kraịst ndụmọdụ amamihe dị na ya, sị: “Nọrọsienụ ike na nche ka otú unu si na-eje ije ghara ịdị ka ndị na-amaghị ihe kama dị ka ndị maara ihe, na-azụpụtara onwe unu oge kwesịrị ekwesị, n’ihi na ụbọchị ndị a jọrọ njọ.” (Ndị Efesọs 5:15, 16) Ọ bụ nanị mgbe anyị gbasochiri ndụmọdụ a anya ka anyị ga-ejide n’aka na ihe ntụrụndụ ndị na-akpali mmadụ itinye aka n’ihe ọjọọ agaghị arata anyị, wekọrọ oge anyị, ọbụna mebie mmekọrịta anyị na Jehova, bụ́ nke ga-akpatara anyị mbibi!—Jems 1:14, 15.

5. Gịnị kasị eme ka anyị nwee ume ọhụrụ?

5 Ebe ọ bụ na Ndị Kraịst na-arụsi ọrụ ike, o kwere nghọta na ha ga-achọ ịtụrụtụ ndụ mgbe ụfọdụ. Ọbụna Eklisiastis 3:4 kwuru na e nwere “mgbe ịchị ọchị” na “mgbe ite egwú.” Ya mere, Bible adịghị ele ntụrụndụ anya dị ka igbu oge. Ma ntụrụndụ kwesịrị ime ka anyị nwee ume ọhụrụ, ọ bụghị imebi mmekọrịta anyị na Jehova ma ọ bụ gbochie anyị ikere òkè n’ihe ime mmụọ. Ndị Kraịst tozuru okè maara site n’ahụmahụ ndị ha nweworo na a na-enweta obi ụtọ ka ukwuu n’inye ihe. Ha na-ebute uche Jehova ụzọ ná ndụ ha ma nwetara ‘mkpụrụ obi ha ezi ume ọhụrụ ‘ site n’ịnakwere yok na-adịghị egbu mgbu nke Jizọs.—Matiu 11:29, 30; Ọrụ 20:35.

Ịhọrọ Ihe Ntụrụndụ Kwesịrị Ekwesị

6, 7. Gịnị ga-enyere gị aka ịmata ihe ntụrụndụ ndị kwesịrị ekwesị na ndị na-ekwesịghị ekwesị?

6 Olee otú anyị pụrụ isi mata ihe ntụrụndụ nke kwesịịrị Onye Kraịst? Ndị nne na nna na-eduzi ụmụ ha na nke ahụ, ndị okenye na-enyekwara ndị enyemaka dị mkpa aka. N’ezie, ọ dịghị mkpa ka ndị ọzọ gwa anyị akwụkwọ ọgụgụ, fim, egwuregwu, egwú ọgbụgba, ma ọ bụ abụ nke kwesịrị ekwesị na nke na-ekwesịghị ekwesị. Pọl kwuru na ‘ndị tozuru okè, sitere n’iji ikike nghọta ha eme ihe zụọ ikike a ịmata ọdịiche dị n’ihe ziri ezi na ihe ọjọọ.’ (Ndị Hibru 5:14; 1 Ndị Kọrint 14:20) Bible na-agwa anyị ụkpụrụ ndị ga-eduzi anyị. Akọ na uche gị, bụ́ nke e ji Okwu Chineke zụọ, ga-enyere gị aka ma ọ bụrụ na i gee ya ntị.—1 Timoti 1:19.

7 Jizọs kwuru na “a na-amata osisi site ná mkpụrụ ya.” (Matiu 12:33) Ọ bụrụ na ihe ntụrụndụ na-akpali mmadụ ime ihe ike, itinye aka n’omume rụrụ arụ, ma ọ bụ ime mgbaasị, e kwesịrị ịjụ ya. E kwesịkwara izere ya ma ọ bụrụ na ọ na-etinye ndụ ma ọ bụ ahụ́ ike mmadụ n’ihe ize ndụ. A ga-ajụkwa ya ma ọ bụrụ na ọ na-akpatara onye ahụ ihe isi ike akụ̀ na ụba ma ọ bụ nkụda mmụọ, ma ọ bụ ma ọ bụrụ na ọ na-eme ka ndị ọzọ sụọ ngọngọ. Pọl onyeozi dọrọ anyị aka ná ntị na ọ bụrụ na anyị emebie akọ na uche nwanna anyị, anyị na-eme mmehie. Pọl dere, sị: “Mgbe unu si otú a na-emehie megide ụmụnna unu ma na-emebi akọ na uche ha na-adịghị ike, unu na-emehie megide Kraịst. Ya mere, ọ bụrụ na ihe oriri na-eme ka nwanna m sụọ ngọngọ, m gaghị atakwa anụ ọzọ ma ọlị, ka m wee ghara ime ka nwanna m sụọ ngọngọ.”—1 Ndị Kọrint 8:12, 13.

8. Olee ihe ize ndụ ndị dị n’egwuregwu kọmputa na fim dị iche iche?

8 Egwuregwu kọmputa na fim juru n’ahịa. Ụfọdụ pụrụ ịbụ ndị na-adịghị ize ndụ iji ha na-atụrụ ndụ, ma a pụrụ ịdị na-egosi ihe ndị Bible kagburu n’ihe ntụrụndụ ndị dị otú ahụ. N’eziokwu, egwuregwu ọ bụla nke pụrụ ime ka mmadụ kpatara onye ọzọ nkwarụ ma ọ bụ gbuo onye ahụ egbuo, ma ọ bụ ọbụna nke pụrụ ime ka mmadụ tinye aka n’omume rụrụ arụ abụghị egwuregwu nkịtị! Jehova kpọrọ ndị “na-ahụ ihe ike n’anya” asị. (Abụ Ọma 11:5; Ilu 3:31; Ndị Kọlọsi 3:5, 6) Ọ bụrụkwa na ihe i ji atụrụ ndụ na-akpali gị inwe anyaukwu ma ọ bụ ime ihe ike, ma ọ bụ na-eme ka i nwee nkụda mmụọ, ma ọ bụ na-ewekọrọ oge ị gaara eji mee ihe bara uru, mgbe ahụ, ghọta na ọ na-achọ imebi mmekọrịta gị na Jehova ma mee ihe ngwa ngwa banyere ya.—Matiu 18:8, 9.

Otú Anyị Pụrụ Isi Tụrụ Ndụ n’Ụzọ Ziri Ezi

9, 10. Olee ihe ndị nwere nghọta pụrụ iji mere ihe ntụrụndụ?

9 Mgbe ụfọdụ, Ndị Kraịst na-ajụ, sị: “Oleedị ihe ntụrụndụ nke kwesịrị ekwesị? Ihe ka ukwuu n’ihe ntụrụndụ ndị dị n’ụwa megidere ụkpụrụ Bible.” Obi sie gị ike na a pụrụ inweta ihe ntụrụndụ kwesịrị ekwesị, ma ọ chọrọ mgbalị. Ọ chọrọ ka e buru ụzọ chebara ya echiche ma mee atụmatụ nke ọma banyere ya. Ndị nne na nna kwesịrị ichebara nke a echiche karịsịa. Ọ na-enye ọtụtụ ndị ume ọhụrụ iso ndị ezinụlọ ha na ụmụnna na-atụrụ ndụ. Iji nwayọọ na-eri ihe n’oge nri ma na-akparịta ihe ndị mere n’ụbọchị ma ọ bụ na-ekwurịta otu isiokwu dị na Bible, na-enye obi ụtọ ma na-ewuli elu. A pụrụ ime ndokwa ịga n’ebe ndị a na-edebe ụmụ anụmanụ, ịga n’ebe ndị a na-egwuri egwu, ịtụ ludo, na ịtụ okwe. Ihe ntụrụndụ ndị dị otú a pụrụ inye obi ụtọ na ume ọhụrụ.

10 Otu okenye na nwunye ya, bụ́ ndị zụliteworo ụmụ atọ kọrọ, sị: “Malite mgbe ụmụ anyị dị obere, anyị na-eme ka ha soro na-ahọta ebe ndị anyị ga-aga tụrụ ndụ. Mgbe ụfọdụ, anyị na-agwa nwata nke ọ bụla ka ọ kpọta ezigbo enyi ya ka o soro anyị. Nke a na-emekwa ka oge ntụrụndụ ahụ tọkwuo ụtọ. Anyị na-echetakwa ihe ụfọdụ ndị dị ịrịba ama mere ná ndụ ụmụ anyị. Site n’oge ruo n’oge, anyị na-akpọ ndị ezinụlọ na ndị enyi anyị nọ n’ọgbakọ anyị òkù ka ha bịa n’ụlọ anyị. Anyị na-anọ n’èzí esi ihe mgbe ụfọdụ ma na-egwuri egwu. Anyị na-akwọrọ ha n’ụgbọala agbagharị ma na-arị ugwu dị iche iche. Anyị na-ejikwa oge ndị dị otú ahụ amụ banyere ihe ndị Jehova kere.”

11, 12. (a) Gịnị ka ị pụrụ ime iji gụnye ndị ọzọ mgbe ị na-eme atụmatụ maka ntụrụndụ? (b) Olee ụdị nnọkọ ọtụtụ ndị na-adịghị echefu echefu?

11 Ị̀ pụrụ ịkpọ ndị ọzọ ka ha sonyere gị, ma ọ bụ ezinụlọ gị, mgbe ị na-eme atụmatụ maka ntụrụndụ mgbe ụfọdụ? Nke a pụrụ ịgba ụfọdụ ndị ume, dị ka ndị inyom di ha nwụrụ, onye na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye, ma ọ bụ ezinụlọ ndị nwere nanị nne ma ọ bụ nna. (Luk 14:12-14) Ị pụkwara ịkpọ mmadụ ole na ole n’ime ndị ọhụrụ e nwere n’ọgbakọ, ma i kwesịrị ịkpachara anya ịhụ na ha abụghị ndị mkpakọrịta ha ga-emebi omume nke ndị ọzọ. (2 Timoti 2:20, 21) Ọ bụrụ na ọ na-esiri ndị ahụ́ na-adịchaghị ike ịpụ apụ, ikekwe a pụrụ ime ndokwa ibute ihe oriri ma soro ha rie ya n’ụlọ ha.—Ndị Hibru 13:1, 2.

12 Nnọkọ ebe ndị mmadụ na-eri nri ndị a na-ejighị oké ego sie, bụ́ ebe ndị nọkọtaranụ na-anụ otú ndị ọzọ si ghọọ Ndị Kraịst, ma mụta ihe ndị nyeere ndị ọzọ aka ịnọgide na-ekwesị ntụkwasị obi nye Chineke, bụ oge ọtụtụ ndị na-adịghị echefu echefu. A pụrụ iso ndị nile bịara nnọkọ ahụ kwurịta isiokwu ndị dabeere na Bible, a pụkwara ịgwa ụmụaka ka ha tinye ọnụ. Nkwurịta okwu ndị dị otú a pụrụ ịbụ oge agbamume bara uru nye onye ọ bụla, n’enweghị onye e menyere ihere ma ọ bụ onye ga-eche na ya erughị eru.

13. Olee otú Jizọs na Pọl si setịpụ ezi ihe nlereanya n’ile ndị ọzọ ọbịa nakwa n’ikwe ka ndị ọzọ lee ha ọbịa?

13 Jizọs setịpụrụ ihe nlereanya kwesịrị ekwesị n’ile ndị mmadụ ọbịa nakwa n’ikwe ka ndị ọzọ lee ya ọbịa. Ọ na-ejikarị oge ndị dị otú ahụ a kụziri ndị mmadụ ihe ndị ga-eme ka ha na Chineke dịrị ná mma. (Luk 5:27-39; 10:42; 19:1-10; 24:28-32) Ndị na-eso ụzọ ya na narị afọ mbụ ṅomiri ihe nlereanya ya. (Ọrụ 2:46, 47) Pọl onyeozi dere, sị: “Ọ na-agụsi m agụụ ike ịhụ unu, ka m wee nyetụ unu onyinye ime mmụọ ka e mee ka unu guzosie ike; ma ọ bụ, kama nke ahụ, ka unu wee gbarịta onwe unu ume, onye nke ọ bụla site n’okwukwe nke ibe ya, ma nke unu ma nke m.” (Ndị Rom 1:11, 12) N’ụzọ yiri nke ahụ, nnọkọ anyị kwesịrị ịbụ ebe a pụrụ ịnọ gbaa ndị ọzọ ume ma nwetakwa agbamume n’onwe anyị.—Ndị Rom 12:13; 15:1, 2.

Ihe Ụfọdụ Anyị Kwesịrị Iburu n’Uche na Ebe Ndị Anyị Ga-elezi Anya

14. Gịnị mere nnọkọ ndị buru oké ibu ji ha ekwesịghị ekwesị?

14 Inwe nnọkọ ntụrụndụ buru oké ibu ekwesịghị ekwesị n’ihi na ọ na-esikarị ike nchịkwa. N’oge ụfọdụ, ezinụlọ dị iche iche pụrụ ikpebi inwekọ ntụrụndụ ọnụ n’oge na-agaghị egbochi ha ikere òkè n’ihe ndị a na-eme n’ọgbakọ. Ha pụkwara igwuri egwuregwu ụfọdụ ndị na-adịghị akpata oké ịsọ mpi. Mgbe ndị okenye ụfọdụ, ndị ohu na-eje ozi, ma ọ bụ ndị ọzọ tozuru okè nọ ná nnọkọ ntụrụndụ, ha na-akpali ndị ọzọ ime ihe ziri ezi, nnọkọ ahụ pụkwara ịbụ nke na-enyekwu ume ọhụrụ.

15. N’ihi gịnị ka mmadụ ji kwesị ilekọta nnọkọ ọ kpọrọ anya nke ọma?

15 Ná nnọkọ ntụrụndụ, ndị na-ahazi ya ekwesịghị ichefu mkpa ọ dị ilekọta ya nke ọma. Ọ bụ ezie na ị ga-achọ ka ndị ọbịa gị kporie ndụ, ọ́ gaghị ewute gị ma ị nụ na e nwere onye ọbịa e mere ka ọ sụọ ngọngọ n’ụlọ gị n’ihi na i meghị ihe i kwesịrị ime? Tụlee ụkpụrụ dị na Deuterọnọmi 22:8. A chọrọ ka onye Izrel rụrụ ụlọ ọhụrụ rụnye ihe mgbochi n’elu ụlọ ya nke dị larịị bụ́ ebe a na-anọkarị eleta ndị ọbịa. N’ihi gịnị? “Ka ị ghara ime ka ọbara dị n’ụlọ gị, mgbe mmadụ ga-esi na ya daa.” N’ụzọ yiri nke ahụ, ihe ị na-eme iji chebe ndị bịara nnọkọ ị haziri—n’abụghị ịga tiwe iwu na-enweghị isi—kwesịrị ịbụ ihe na-agaghị emerụ ha ahụ́ na ihe na-agaghị emebi mmekọrịta ha na Chineke.

16. Olee otú e kwesịrị isi jiri ezi uche mee ihe ma ọ bụrụ na a ga-eke ndị mmadụ mmanya na-aba n’anya ná nnọkọ?

16 Ọ bụrụ na ị ga-eke mmanya na-aba n’anya ná nnọkọ ahụ, e kwesịrị iji ezi uche mee ihe. Ọtụtụ Ndị Kraịst na-ekpebi inye ndị ha kpọrọ òkù mmanya na-aba n’anya nanị ma ọ bụrụ na ha ga-eji aka ha na-ahụ maka ihe a na-enye ndị ọbịa ha ma ọ bụ ihe ndị ọbịa ha na-aṅụ. E kwesịghị ikwe ka e mee ihe ọ bụla nke pụrụ ime ka ndị ọzọ sụọ ngọngọ ma ọ bụ nwaa onye ọ bụla ọnwụnwa ịṅụbiga mmanya ókè. (Ndị Efesọs 5:18, 19) Ụfọdụ ndị ọbịa pụrụ ikpebi ịghara ịṅụ ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya n’ihi ihe ụfọdụ. N’ọtụtụ ebe, e nwere iwu na-ekwu afọ ole mmadụ ga-agba tupu ya enwee ike ịṅụ mmanya na-aba n’anya, Ndị Kraịst ga-erubekwara Siza isi, ọbụna ma a sị na iwu ndị dị otú a yiri ka ha adịghị ekwe mmadụ megharịa ahụ́.—Ndị Rom 13:5.

17. (a) Ọ bụrụ na a ga-akpọ egwú ná nnọkọ ntụrụndụ, n’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ka onye kpọrọ nnọkọ ahụ hụ na ọ họtara egwú ndị kwesịrị ekwesị? (b) Ọ bụrụ na a ga-agba egwú ná nnọkọ ahụ, olee otú a ga-esi mee ya n’ụzọ kwesịrị ekwesị?

17 Onye kpọrọ oriri kwesịrị ịhụ na egwú, egwú ndị a na-agba agba, ma ọ bụ ihe ndị ọzọ e ji atụrụ ndụ kwekọrọ n’ụkpụrụ Ndị Kraịst. Ụdị egwú na-amasị ndị mmadụ dịgasị iche iche, ụdị egwú dị iche iche jukwara ebe nile. Otú ọ dị, ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n‘egwú ndị e nwere taa na-akpali ndị mmadụ inupụ isi, itinye aka n’omume rụrụ arụ, na ime ihe ike. Ọ dị mkpa ime nhọrọ. Ọ bụghị iwu na egwú aghaghị ịdị jụụ tupu a gụnye ya n’egwú dị mma, o kwesịghịkwa ịbụ nke rụrụ arụ, bụ́ nke ndị gụrụ ya na-eti mkpu, na ndị nke na-ada oké ụda. Hụ na ọ bụghị onye na-amaghị mkpa ọ dị ime ka egwú ghara ịda oké ụda ka i nyere ọrụ ịhọta egwú ndị a ga-akpọ. Ịgba egwú n’ụzọ na-ekwesịghị ekwesị, nke gụnyere imegharị úkwù na ara n’ụzọ na-akpali agụụ mmekọahụ, ekwesịtụdịghị Ndị Kraịst.—1 Timoti 2:8-10.

18. Olee otú ndị nne na nna pụrụ isi chebe ụmụ ha site n’inyocha nnọkọ ntụrụndụ ndị ha na-aga?

18 Ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst kwesịrị ịchọpụta ihe a na-aga ime ná nnọkọ a kpọrọ ụmụ ha òkù ịbịa, ọ ga-abụkwa ihe amamihe dị na ya iso ha gaa mgbe ụfọdụ. Ọ dị mwute ikwu na ụfọdụ ndị nne na nna ahapụwo ụmụ ha ịga nnọkọ ndị ọ na-adịghị onye na-achịkwa ha bụ́ ebe a rabaworo ọtụtụ ndị gara ya n’omume rụrụ arụ ma ọ bụ omume ndị ọzọ na-ekwesịghị ekwesị. (Ndị Efesọs 6:1-4) Ọ bụrụgodị na ndị ntorobịa eruwela afọ iri abụọ ma na-emekwa omume gosiri na a pụrụ ịtụkwasị ha obi, ọ ka dịkwa mkpa ka e nyere ha aka ‘ịgbanahụ ọchịchọ nke oge ntorobịa.’—2 Timoti 2:22.

19. Olee ihe anyị kwesịrị ịmata bụ́ nke pụrụ inyere anyị aka ilekwasị anya n’ihe anyị kwesịrị ‘ibu ụzọ na-achọ’?

19 Ntụrụndụ ndị dị mma ma na-enye ume ọhụrụ, bụ́ ndị a na-enwe site n’oge ruo n’oge, pụrụ ime ka ndụ na-atọkwu ụtọ. Jehova adịghị egbochi anyị ịtụrụ ndụ, ma ikwu nke bụ́ eziokwu, anyị maara na ihe omume ndị dị otú ahụ n’onwe ha adịghị eme ka anyị kpakọba akụ̀ ime mmụọ n’eluigwe. (Matiu 6:19-21) Jizọs nyeere ndị na-eso ụzọ ya aka ịghọta na ‘ibu ụzọ na-achọ alaeze ahụ na ezi omume Chineke’ bụ ihe dị mkpa ná ndụ, ọ bụghị ihe anyị pụrụ iri ma ọ bụ ịṅụ ma ọ bụ ihe anyị pụrụ iyi n’ahụ́, bụ́ “ihe ndị mba ọzọ na-achụsosi ike.”—Matiu 6:31-34.

20. Olee ezi ihe ndị ohu Jehova pụrụ ịtụ anya inweta site n’aka Onye ahụ na-enye ezi ihe nile?

20 Ee, ma anyị ‘na-eri ihe ma anyị na-aṅụ ihe ọṅụṅụ ma anyị na-eme ihe ọ bụla ọzọ,’ anyị pụrụ ime “ihe nile iji nye Chineke otuto,” na-ekele Onye na-enye anyị ezi ihe nile n’ókè kwesịrị ekwesị. (1 Ndị Kọrint 10:31) Na Paradaịs ya nke na-abịanụ n’elu ala, a ga-anọgide na-enwe oge a ga-eji na-enwe aṅụrị n’ihi ihe Jehova na-enye n’ụba. A ga-esokwa ndị nile mere ihe ndị ziri ezi Chineke chọrọ na-enwe nnọkọ ndị na-ewuli elu.—Abụ Ọma 145:16; Aịsaịa 25:6; 2 Ndị Kọrint 7:1.

Ị̀ Na-echeta?

• N’ihi gịnị ka o ji esiri Ndị Kraịst ike taa ịchọta ihe ntụrụndụ ndị dị mma?

• Olee ụdị ihe ntụrụndụ ndị na-eme ka ezinụlọ Ndị Kraịst nwee ume ọhụrụ?

• Mgbe mmadụ na-enwe ntụrụndụ, olee ihe ndị o kwesịrị iburu n’uche, oleekwa ebe ndị o kwesịrị ilezi anya?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 18]

Họrọ ihe ntụrụndụ ndị na-akpali mmadụ ime ezi ihe

[Foto ndị dị na peeji nke 19]

Ụdị ntụrụndụ ndị dị aṅaa ka Ndị Kraịst na-ajụ?