Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ole Ndị Bụ́ Ezi Ndị Kraịst?

Ole Ndị Bụ́ Ezi Ndị Kraịst?

Ole Ndị Bụ́ Ezi Ndị Kraịst?

“A NA-ENWE Iso Ụzọ Kraịst nanị mgbe a na-akụzi ihe banyere Jizọs Kraịst ma na-eme omume dị ka Kraịst.” (On Being a Christian) Otú ahụ ka ọkà mmụta okpukpe bụ́ onye Switzerland aha ya bụ Hans Küng si kwupụta otu eziokwu doro anya: A na-enwe ezi Iso Ụzọ Kraịst nanị mgbe ndị nwere obi eziokwu na-ebi ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’ihe Jizọs kụziri.

Oleekwanụ ma ọ bụrụ na ndị mmadụ n’otu n’otu ma ọ bụ òtù dị iche iche ana-azọrọ na ha bụ ụmụazụ Kraịst ma ha adịtụghị eme ihe Jizọs kụziri? Jizọs n’onwe ya kwuru na ọtụtụ ga-azọrọ na ha bụ Ndị Kraịst. Ha ga-ekwu ihe dịgasị iche iche ha meworo iji gosi na ha na-ejere ya ozi, na-asị: “Ọ̀ bụ na anyị ebughị amụma n’aha gị, chụpụkwa ndị mmụọ ọjọọ n’aha gị, rụọkwa ọtụtụ ọrụ dị ike n’aha gị?” Gịnịzi ka Jizọs ga-agwa ha? Okwu ndị a na-atụ n’anya ga-eme ka ikpe ya doo ha anya: “Ọ dịghị mgbe m maara unu! Sinụ n’ebe m nọ pụọ, unu ndị ọrụ mmebi iwu.”—Matiu 7:22, 23.

Nke ahụ bụ ịdọ aka ná ntị siri ike maka “ndị ọrụ mmebi iwu” bụ́ ndị na-azọrọ na ha bụ ụmụazụ Jizọs! Tụlee ihe abụọ bụ́ isi Jizọs kwuru na ndị mmadụ ga-eme ka ya wee nwee ike ịnakwere ha dị ka ezi Ndị Kraịst kama ịjụ ha dị ka ndị ọrụ mmebi iwu.

“Ọ Bụrụ na Unu Enwee Ịhụnanya n’Etiti Onwe Unu”

Otu n’ime ihe ndị ahụ Jizọs kwuru ka ndị mmadụ na-eme bụ́ nke a: “Ana m enye unu iwu ọhụrụ, ka unu na-ahụrịta ibe unu n’anya; dị nnọọ ka m hụworo unu n’anya, ka unu na-ahụrịtakwa ibe unu n’anya. Mmadụ nile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ma ọ bụrụ na unu enwee ịhụnanya n’etiti onwe unu.”Jọn 13:34, 35.

Jizọs chọrọ ka ụmụazụ ya nwee ezi ịhụnanya maka ibe ha nakwa maka ihe a kpọrọ mmadụ. Ọtụtụ Ndị Kraịst anọwo na-eme otú ahụ eri ọtụtụ narị afọ kemgbe Jizọs dịsịrị ndụ n’ụwa. Ma, oleekwanụ banyere ihe ka ọtụtụ n’òtù okpukpe bụ́ ndị na-azọrọ na ha na-agbaso nzọụkwụ Kraịst? È ji ịhụnanya mara ha? Ọ dịghị ma ọlị. Kama nke ahụ, ọ bụ ha nọ n’isi agha na ọgba aghara ndị a na-apụghị ịgụta ọnụ bụ́ ndị a kwafuru ọbara ndị aka ha dị ọcha na ha.—Mkpughe 18:24.

Nke ahụ na-emekwa taa. Mba ndị sị na ha bụ Ndị Kraịst bụ isi sekpụ ntị n’ogbugbu e gburu ọtụtụ mmadụ n’agha ụwa abụọ ndị a lụrụ n’agbata afọ 1914 na 1945. N’oge na-adịchabeghị anya, chọọchị ndị sị na ha bụ Ndị Kraịst nọ n’isi n’arụ ndị a kpara nakwa ná mgbalị ndị e mere igbukpọ otu agbụrụ na Rwanda na 1994. Onye bụbu achịbishọp Ndị Anglịkan bụ́ Desmond Tutu dere, sị: “Ndị a ji obi ịta mmiri gburịta onwe ha si n’otu okpukpe. Ihe ka ọtụtụ n’ime ha bụ Ndị Kraịst.”

“Ọ Bụrụ na Unu Anọgide n’Okwu M”

Jizọs mere ka ihe nke abụọ a chọrọ ka ezi ndị na-eso ụzọ ya na-eme doo anya mgbe o kwuru, sị: “Ọ bụrụ na unu anọgide n’okwu m, unu bụ n’ezie ndị na-eso ụzọ m, unu ga-amarakwa eziokwu ahụ, eziokwu ahụ ga-emekwa ka unu nwere onwe unu.”—Jọn 8:31, 32.

Jizọs na-atụ anya ka ụmụazụ ya nọgide n’okwu ya—ya bụ, ka ha na-agbaso ihe ndị ọ kụziri. Ọkà mmụta okpukpe bụ́ Küng kwuru na ndị ndú okpukpe bụ́ ndị na-azọrọ na ha na-eso ụzọ Kraịst “nakweere echiche ndị Grik” kama ịgbaso ihe Jizọs kụziri. Ha ejiwo ihe ndị dị ka ozizi anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi, pọgatrị, ife Meri ofufe na inwe òtù ndị ụkọchukwu, tinyekwara ozizi ndị ọzọ—ozizi ndị ha si n’okpukpe ndị ọgọ mmụọ na ndị ọkà ihe ọmụma nweta—dochie anya ihe ndị Jizọs kụziri.—1 Ndị Kọrint 1:19-21; 3:18-20.

Ndị ndú okpukpe webatakwara ozizi na-adịghị ekwe nghọta bụ́ ozizi Atọ n’Ime Otu, bụ́ nke bugoro Jizọs n’ọkwá ọ na-adịtụbeghị mgbe o kwere na ya ruru. Ozizi a ha na-ezi meziri ka ndị mmadụ hapụ Onye Jizọs gwara ha ka ha na-efe mgbe nile—Nna ya, bụ́ Jehova. (Matiu 5:16; 6:9; Jọn 14:28; 20:17) Hans Küng na-ede, sị: “Mgbe ọ bụla Jizọs kwuru banyere Chineke, onye o bu n’uche bụ Chineke oge ochie nke nna nna anyị hà bụ́ Ebreham, Aịzik na Jekọb: Yahweh . . . Nye ya, ọ bụ ya bụ nanị Chineke e nwere.” Ozugbo ha nụrụ aha ahụ bụ́ Yahweh, ma ọ bụ, Jehova, bụ́ otú e si akpọpụta aha ahụ na Bekee, mmadụ ole taa maara na ọ bụ Chineke nke Jizọs, onye bụ́kwa Nna ya, ka a na-ekwu okwu ya?

Ndị ndú okpukpe agbahapụwo kpamkpam iwu Jizọs nyere bụ́ ka a ghara itinye aka n’ihe ọ bụla metụtara ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Onye edemede bụ́ Trevor Morrow na-ekwu na n’oge Jizọs, Galili “bụ ebe ndị nwere mmụọ ịhụ mba n’anya juru.” Ọtụtụ ndị Juu hụrụ mba ha n’anya jiri ngwá agha lụọ ọgụ iji chịwa onwe ha na iji nwere onwe ha ikpe okpukpe masịrị ha. Jizọs ọ̀ gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha lụọ ọgụ ndị dị otú ahụ? Ee e. Kama nke ahụ, ọ gwara ha, sị: “Unu abụghị akụkụ nke ụwa.” (Jọn 15:19; 17:14) Otú ọ dị, kama ịnọpụ iche, ndị ndú chọọchị chepụtara ihe onye edemede Ireland bụ́ Hubert Butler, kọwara dị ka “ozizi banyere ibu agha na ndọrọ ndọrọ ọchịchị.” O dere, sị: “Iso Ụzọ Kraịst nke na-etinye aka ná ndọrọ ndọrọ ọchịchị fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mgbe nile ka ọ na-akwado agha. Mgbe ndị ọnụ na-eru n’okwu n’ọchịchị na ndị ndú okpukpe nwere nkwekọrịta, ihe na-emekarị bụ na ndị ndú okpukpe na-agọzi ndị agha iji gosi ekele maka ihe ùgwù ndị ndị ọchịchị nyere ha.”

Ndị Ozizi Ụgha Agọnahụ Jizọs

Pọl onyeozi dọrọ aka ná ntị na a ga-enwe ndị ga-esi n’ezi Iso Ụzọ Kraịst pụọ. O kwuru na mgbe ya nwụsịrị, “nkịta ọhịa,” bụ́ ndị sitere ná ndị na-asị na ha bụ Ndị Kraịst, ‘ga-ekwu ihe ndị gbagọrọ agbagọ iji dọrọ ndị ahụ na-eso ụzọ iso ha n’azụ.’ (Ọrụ 20:29, 30) Ha ‘ga-ekwupụta n’ihu ọha na ha maara Chineke,’ ma n’eziokwu, ha ‘ga-agọnarị ya site n’ọrụ ha.’ (Taịtọs 1:16) Pita onyeozi dọkwara aka ná ntị na ndị ozizi ụgha “ga-eji ụzọ nzuzo webata ịrọ òtù nke na-ebibi ihe, ha ga-agọnarịkwa ọbụna onye nwe ha nke zụtara ha.” O kwuru na àgwà ọjọọ ha ga-eme ka ndị mmadụ ‘kwujọọ’ “ụzọ nke eziokwu.” (2 Pita 2:1, 2) Ọkà mmụta bụ́ onye Gris bụ́ W. E. Vine kwuru na isi otú a ajụ Kraịst pụtara “ịgọnahụ Nna ahụ na Ọkpara ahụ site n’isi n’ezi ofufe dapụ nakwa site n’ịgbasa ozizi dị ize ndụ.”

Gịnị ka Jizọs ga-eme ma ọ bụrụ na ndị sị na ha na-eso ụzọ ya amara ụma jụ ‘ịnọgide n’okwu ya’ nakwa ime ihe ndị ọzọ ọ chọrọ ka ha na-eme? Ọ dọrọ aka ná ntị, sị: “Onye ọ bụla nke na-agọnarị m n’ihu mmadụ, m ga-agọnarịkwa ya n’ihu Nna m nke nọ n’eluigwe.” (Matiu 10:33) N’ezie, Jizọs anaghị agọnahụ onye mejọrọ ihe n’agbanyeghị otú o si na-achọsi ike ime ihe ziri ezi. Dị ka ihe atụ, ọ bụ ezie na Pita onyeozi gọnahụrụ Jizọs ugboro atọ, o chegharịrị, Jizọs gbaghakwaara ya. (Matiu 26:69-75) Otú ọ dị, Jizọs na-agọnahụ ndị mmadụ ma ọ bụ òtù ndị bụ́ nkịta ọhịa ma yiri awụrụ atụrụ—ndị na-eme ka a ga-asị na ha na-eme ihe Kraịst kwuru ma mara ụma nọgide na-ajụ ihe ndị ọ kụziri. Jizọs kwuru banyere ndị nkụzi ụgha dị otú ahụ, sị: “Unu ga-amata ndị ahụ site ná mkpụrụ ha.”—Matiu 7:15-20.

Ndịozi Anwụọ, Ọtụtụ Ndị Amalite Ịgbahapụ Ezi Ofufe

Olee mgbe Ndị Kraịst ụgha malitere ịgọnahụ Kraịst? Ha malitere ime nke a obere oge ka Jizọs nwụsịrị. Ya onwe ya dọrọ aka ná ntị na Setan bụ́ Ekwensu ga-agha “ata,” ma ọ bụ Ndị Kraịst ụgha, n’egbughị oge n’etiti “ezi mkpụrụ,” ma ọ bụ ezi Ndị Kraịst, nke Jizọs ghara n’oge ọ na-eje ozi ya. (Matiu 13:24, 25, 37-39) Pọl onyeozi dọrọ aka ná ntị na ndị nkụzi na-eduhie eduhie amalitelarịị ọrụ n’oge ya. Ọ sịrị na ihe bụ́ isi mere ha ji hapụ ịkụzi ihe ndị Jizọs Kraịst kụziri bụ n’ihi na ha enweghị ezi “ịhụnanya maka eziokwu ahụ.”—2 Ndị Tesalonaịka 2:10.

N’oge ndịozi Jizọs Kraịst nọ ndụ, ha gbochiri ọtụtụ ndị ịgbahapụ ezi ofufe. Otú ọ dị, mgbe ndịozi nwụsịrị, ndị ndú okpukpe jiri ‘ọrụ ọ bụla dị ike na ihe ịrịba ama na ihe àmà dị ebube, nke bụ́ ụgha, na aghụghọ ajọ omume ọ bụla’ mee ihe iji duhie ọtụtụ ndị ma mee ka ha gbahapụ eziokwu nke Jizọs na ndịozi ya kụziri. (2 Ndị Tesalonaịka 2:3, 6-12) Onye ọkà ihe ọmụma bụ́ onye England bụ́ Bertrand Russell dere na ka oge na-aga, ọgbakọ Ndị Kraịst ghọrọ òtù okpukpe nke “ga-agbagwoju ma Jizọs ma Pọl anya.”

Ezi Iso Ụzọ Kraịst Amaliteghachi

Ihe ndị a e kwuru banyere Iso Ụzọ Kraịst doro nnọọ anya. Kemgbe ndịozi nwụsịrị, ndị sị na ha na-eso ụzọ Kraịst adịghịzi eme ihe kwekọrọ n’ihe Kraịst kụziri. Otú ọ dị, nke ahụ apụtaghị na Jizọs emezughị nkwa o kwere ụmụazụ ya nke bụ́ ịnọnyere ha “ụbọchị nile ruo ọgwụgwụ nke usoro ihe.” (Matiu 28:20) Anyị pụrụ ijide n’aka na kemgbe o kwuru ihe a, e nweela ndị kwesịrị ntụkwasị obi “na-akụzi ihe banyere Jizọs Kraịst ma na-eme omume dị ka Kraịst.” Jizọs Kraịst emezuwo nkwa o kwere ịkwado ndị dị otú ahụ ka ha na-agbalị igosipụta ịhụnanya e ji mara ezi Ndị Kraịst na ịnọgide n’eziokwu ndị Kraịst kụziri.

Ọzọkwa, Jizọs kwere nkwa na n’ụbọchị ikpeazụ nke usoro ihe a, na ya ga-achịkọta ndị na-eso ụzọ ya kwesịrị ntụkwasị obi n’otu ọgbakọ Ndị Kraịst nke a ga-amata nke ọma bụ́ nke ọ ga-eji mezuo uche ya. (Matiu 24:14, 45-47) O ji ọgbakọ ahụ eme ihe ugbu a iji chịkọta “oké ìgwè mmadụ” bụ́ nke ndị ikom, ndị inyom, na ụmụaka mejupụtara, bụ́ “ndị si ná mba na ebo na ndị na asụsụ nile pụta,” ọ na-akpọkọtakwa ha n’okpuru ịchịisi ya dị ka “otu ìgwè atụrụ” nọ n’okpuru “otu onye ọzụzụ atụrụ.”—Mkpughe 7:9, 14-17; Jọn 10:16; Ndị Efesọs 4:11-16.

Ya mere, jụ òtù ọ bụla nke mebiworo aha Kraịst ma tee Iso Ụzọ Kraịst unyí kemgbe puku afọ abụọ gara aga. Ma ọ́ bụghị ya, dị ka Jizọs Kraịst gwara Jọn onyeozi, ị pụrụ “ịnata ụfọdụ n’ime ihe otiti [ha]” mgbe Chineke ga-emezu ihe o kpere n’ikpe n’isi ha n’ọdịnihu. (Mkpughe 1:1; 18:4, 5) Kpebisie ike iso ná ndị Maịka onye amụma kwuru banyere ha mgbe o kwuru na “n’ikpeazụ nke ụbọchị ndị a,” ndị na-efe ezi ofufe—ndị na-agbasochi ihe Jizọs kụziri anya—ga-ege ntị ná ntụziaka Chineke ma na-eje ije ‘n’okporo ụzọ nile’ nke ezi ofufe ahụ e weghachiri eweghachi. (Maịka 4:1-4) Ndị bipụtara magazin a ga-enwe obi ụtọ inyere gị aka ịchọta ndị ahụ na-efe ezi ofufe.

[Foto ndị dị na peeji nke 5]

Gịnị mere ezi Ndị Kraịst adịghị etinye aka n’agha?

[Ebe E Si Nweta Foto]

Ndị agha, n’aka ekpe: Foto U.S. National Archives; onye agha ji ngwá agha e ji awụ ọkụ: Foto U.S. Army

[Foto ndị dị na peeji nke 7]

Ihe abụọ bụ́ isi Jizọs chọrọ ka ezi Ndị Kraịst na-eme bụ, ha ‘inwe ịhụnanya n’etiti onwe ha’ na ha ‘ịnọgide n’okwu ya’