Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

E Ji “Ọbara Dị Oké Ọnụ Ahịa” Napụta Anyị

E Ji “Ọbara Dị Oké Ọnụ Ahịa” Napụta Anyị

“Anyị Aghaghị Irubere Chineke Isi Dị Ka Onye Na-achị Achị Karịa Mmadụ”

E Ji “Ọbara Dị Oké Ọnụ Ahịa” Napụta Anyị

ỤZỌ kasịnụ Jehova siworo gosipụta ịhụnanya ya bụ site n’izite Ọkpara ọ mụrụ nanị ya inye ndụ mmadụ ya zuru okè dị ka ihe mgbapụta. N’ihi na anyị bụ ụmụ mmadụ na-ezughị okè, nnapụta dị otú ahụ dị anyị ezi mkpa, ebe ọ bụ na ọ dịghị mmadụ na-ezughị okè nke pụrụ ‘ịgbapụta nwanne ya ma ọlị, ọ gaghị enye Chineke ihe mgbapụta ya: ka o wee dịgide ndụ ruo mgbe ebighị ebi.’ (Abụ Ọma 49:6-9) Anyị na-ekele nnọọ Chineke na o “nyere Ọkpara ọ mụrụ nanị ya, ka e wee ghara ibibi onye ọ bụla nke na-egosipụta okwukwe na ya, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi”!—Jọn 3:16.

Olee otú ihe mgbapụta ahụ si anapụta anyị? Ka anyị tụlee ụzọ anọ anyị si nwere onwe anyị n’ihi ịhụnanya a dị ukwuu Jehova Chineke gosipụtara.

Ntọhapụ Site n’Ihe Mgbapụta

Nke mbụ, àjà Jizọs chụrụ pụrụ ịnapụta anyị ná mmehie anyị ketara eketa. A mụrụ anyị nile n’ime mmehie. Ee, anyị bụ ndị mmehie ọbụna tupu anyị emebie iwu Jehova. N’ụzọ dị aṅaa? Ndị Rom 5:12 na-ekwu, sị: “Mmehie sitere n’otu mmadụ [Adam] bata n’ụwa, ọnwụ esitekwa ná mmehie.” Ebe anyị bụ ụmụ Adam bụ́ onye mmehie, anyị ketara ezughị okè ya. Otú ọ dị, ihe mgbapụta ahụ e nyere mere ka o kwe omume ịnapụta anyị n’aka mmehie anyị ketara eketa. (Ndị Rom 5:16) Jizọs ‘detụrụ ọnwụ ire maka mmadụ nile,’ nyere ụmụ Adam aka buru ntaramahụhụ sitere ná mmehie.—Ndị Hibru 2:9; 2 Ndị Kọrint 5:21; 1 Pita 2:24.

Nke abụọ, ihe mgbapụta ahụ pụrụ ịtọhapụ anyị n’ọnwụ nke mmehie ahụ kpatara. “Ụgwọ ọrụ nke mmehie na-akwụ bụ ọnwụ.” (Ndị Rom 6:23) Ntaramahụhụ maka mmehie bụ ọnwụ. Ọnwụ ịchụàjà Ọkpara Chineke nwụrụ mere ka ụmụ mmadụ na-erube isi nwee ike ịdị ndụ ebighị ebi. N’eziokwu, “onye na-egosipụta okwukwe n’Ọkpara ahụ nwere ndụ ebighị ebi; onye na-enupụrụ Ọkpara ahụ isi agaghị ahụ ndụ.”—Jọn 3:36.

Rịba ama na a pụrụ ịnapụta anyị n’ihe ndị mmehie ahụ kpatara nanị ma anyị gosipụta okwukwe n’Ọkpara Chineke. Nke a na-agụnye ime mgbanwe ná ndụ anyị na ime ka o kwekọọ n’uche Chineke. Anyị aghaghị ịkwụsị ihe ọjọọ ọ bụla anyị na-emebu ma mee ihe iji mee ihe na-atọ Chineke ụtọ. Pita onyeozi kwuru na anyị kwesịrị ‘ichegharị, chigharịakwa ka e wee hichapụ mmehie anyị.’—Ọrụ 3:19.

Nke atọ, àjà Jizọs chụrụ na-eme ka anyị gharazie inwe obi amamikpe. Ndị nile raara onwe ha nye Jehova, e meekwa ha baptizim dị ka ndị na-eso ụzọ Ọkpara ya na-enwe obi iru ala. (Matiu 11:28-30) N’agbanyeghị ezughị okè anyị, anyị na-enweta ọṅụ dị ukwuu site n’iji akọnuche dị ọcha na-ejere Chineke ozi. (1 Timoti 3:9; 1 Pita 3:21) Mgbe anyị kwupụtara mmehie anyị ma hapụ ha, a na-emere anyị ebere, obi anyị na-akwụsịkwa ịma anyị ikpe.—Ilu 28:13.

Ọ Na-enyere Anyị Aka Ma Na-eme Ka Anyị Nwee Olileanya

Nke ikpeazụ bụ na igosi okwukwe n’ihe mgbapụta ahụ na-eme ka anyị kwụsị ịdị na-atụ ụjọ banyere mmekọrịta anyị na Chineke. Jọn onyeozi dere, sị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla emee mmehie, anyị nwere onye inyeaka nọ n’ebe Nna ahụ nọ, bụ́ Jizọs Kraịst.” (1 Jọn 2:1) Mgbe Pọl onyeozi na-ekwu banyere ọrụ Jizọs dị ka onye inyeaka, o dere, sị: “O nwekwara ike ịzọpụta ndị ahụ n’ụzọ zuru ezu bụ́ ndị na-abịaru Chineke nso site na ya, n’ihi na ọ na-adị ndụ mgbe nile ịrịọ arịrịọ maka ha.” (Ndị Hibru 7:25) Ya bụrụhaala na mmehie ka fọrọ anyị n’ahụ́, enyemaka nke Nnukwu Onye Nchụàjà bụ́ Jizọs Kraịst ga-adị anyị mkpa iji mee ka anyị na Chineke dị ná mma. Olee otú Jizọs si rụọrọ anyị ọrụ dị ka nnukwu onye nchụàjà?

Ụbọchị 40 a kpọlitesịrị Jizọs n’ọnwụ n’afọ 33 O.A., ọ rịgooro n’eluigwe, bụ́ ebe o chere uru “ọbara dị oké ọnụ ahịa” ya n’ihu Chineke. N’ihi ya, n’oge na-adịghị anya, Jizọs ga-atọhapụ ụmụ mmadụ na-erube isi n’aka mmehie na ọnwụ. * (1 Pita 1:18, 19) N’ihi ya, í cheghị na anyị kwesịrị ịhụ Jizọs Kraịst n’anya ma na-erubere ya isi?

Ọzọkwa, anyị kwesịrị ịhụ Jehova Chineke n’anya ma na-erubere ya isi. O ji ịhụnanya mee ndokwa ka a ‘tọhapụ anyị site n’ihe mgbapụta’ ahụ. (1 Ndị Kọrint 1:30) Ndụ anyị dị ugbu a nakwa olileanya ọ bụla anyị nwere ịdị ndụ ebighị ebi si ya n’aka. N’ihi ya, anyị nwere ezi ihe mere anyị ga-eji ‘rubere Chineke isi dị ka onye na-achị achị karịa mmadụ.’—Ọrụ 5:29.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 12 Lee 2006 Calendar of Jehovah’s Witnesses, March/April.

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 9]

Ị̀ MAARA?

• Jizọs rịgooro n’eluigwe site n’Ugwu Oliv.—Ọrụ 1:9, 12.

• Ọ bụ nanị ndịozi Jizọs kwesịrị ntụkwasị obi hụrụ mgbe ọ na-arịgo.—Ọrụ 1:2, 11-13.