Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ije Ozi n’Ọgbakọ Na-asụ Asụsụ Mba Ọzọ

Ije Ozi n’Ọgbakọ Na-asụ Asụsụ Mba Ọzọ

Ije Ozi n’Ọgbakọ Na-asụ Asụsụ Mba Ọzọ

JỌN onyeozi dere, sị: “M wee hụ mmụọ ozi ọzọ ka ọ na-efegharị n’etiti eluigwe, o nwekwara ozi ọma ebighị ebi ịkpọsa dị ka ozi obi ụtọ nye ndị bi n’elu ụwa, nyekwa mba na ebo na asụsụ na ndị ọ bụla.” (Mkpughe 14:6) N’imezu ọhụụ amụma a, a na-ekwusa ozi ọma nke Alaeze Chineke n’ụwa nile n’asụsụ dị iche iche. Ọ bụ ndị si mba ọzọ kwabata bụ́ ndị bi n’ebe dị nnọọ anya site n’ala nna ha na-asụ ọtụtụ n’ime asụsụ ndị a. Ndị a kwa na-anụ ozi ọma ahụ site n’ọnụ Ndịàmà Jehova na-anụ ọkụ n’obi bụ́ ndị mụtaworo asụsụ ọzọ.

Ì so ná Ndịàmà ahụ na-eje ozi n’ọgbakọ na-asụ asụsụ mba ọzọ? Ka ị̀ na-eche echiche ime otú ahụ? Iji nwee ihe ịga nke ọma ná mgbalị gị, ọ dị gị mkpa inwe ọchịchọ inyere ndị ọzọ aka na ile ihe anya otú kwesịrị ekwesị. Ebe ebumnobi obi gị bụ inyere ndị ọzọ aka ịmụta eziokwu sitere n’Okwu Chineke, i nwere ihe kasị mma ga-akpali gị—ịhụnanya maka Chineke na ndị mmadụ. (Matiu 22:37-39; 1 Ndị Kọrint 13:1) Ọchịchọ inyere ndị mba ọzọ ma ọ bụ ndị obodo ọzọ aka ịmata Chineke ga-akpali anyị ịmụ asụsụ ha karịa nanị ịchọ imete ha enyi, iri nri ha, na ịmata omenala ha. Ịmụ asụsụ ọzọ ò yiri gị ihe ga-esi ike? Ya bụrụ otú ahụ, inwe echiche ziri ezi ga-enyere gị aka. James, bụ́ onye mụrụ asụsụ Japanese na-ekwu, sị: “Ekwela ka asụsụ ahụ menye gị ụjọ.” Ịghọta na o nweela ndị ọzọ bu gị ụzọ mụtarala ya pụrụ inyere gị aka ịnọgide ma na-ele ihe anya n’ụzọ kwesịrị ekwesị. Oleezi otú ị pụrụ isi mụta asụsụ ọhụrụ? Gịnị ga-enyere gị aka inwe ihe ịga nke ọma n’ọgbakọ na-asụ asụsụ ahụ? Gịnịkwa ka ị na-aghaghị ime iji mee ka mmekọrịta gị na Jehova nọgide na-esi ike?

Ịmụ Asụsụ Ahụ

E nwere ọtụtụ ụzọ isi mụọ asụsụ. Ndị nkụzi nwere ụzọ dị iche iche ha si akụzi ihe, ụmụ akwụkwọ nwekwara ụzọ dị iche iche ha si amụta ihe. Otú ọ dị, nye ihe ka ọtụtụ n’ụmụ akwụkwọ, ịga ihe ọmụmụ ole na ole onye nkụzi maara nke a na-akọ kụziri na-eme ka ịmụta asụsụ ahụ dịrị ha mfe karị ma mee ka ha mụta ya ngwa ngwa karị. Ịgụ Bible na akwụkwọ ndị dabeere na Bible n’asụsụ ọhụrụ gị na ige teepu ndị dị n’asụsụ ahụ ga-enyere gị aka ịmụta okwu ndị ọhụrụ na ịmụtakwu okwu ndị a na-eji eme ihe n’ọgbakọ. Ihe ndị a na-eme na redio, na TV, nakwa na vidio ndị dị mma ga-emekwa ka ị mata asụsụ na omenala ndị ahụ. A bịa n’oge ị ga-eji na-amụ asụsụ ahụ, ịmụ ya obere obere kwa ụbọchị na-arụpụta ihe karịa ịdị na-eji ogologo oge amụ ya ma ghara ịdị na-amụchi ya anya.

Ịmụ asụsụ dị ka ịmụ otú e si egwu mmiri. Ị gaghị amụta otú e si egwu mmiri site nanị n’ịgụ ya n’akwụkwọ. Ị ghaghị ịba n’ime mmiri ma gwuwe ya egwuwe. Ọ bụ otú ahụ ka ọ dị n’ịmụ asụsụ. Ọ ga-esi ike ịmụta asụsụ site nanị n’ịmụ ya amụ n’asụghị ya asụ. Ọ dị mkpa ka gị na ndị ọzọ na-ekwurịta okwu mgbe ọ bụla o kwere gị—gee ha ntị, na-akpakwuru ha, gbalịsiekwa ike ịdị na-asụ asụsụ ahụ! Ihe omume dị iche iche nke Ndị Kraịst bụ ohere dị mma maka nke a. Ugboro ugboro, ị pụrụ iji ihe ị mụtara mee ihe ozugbo n’ozi ubi. Midori, bụ́ onye na-amụ asụsụ Chinese kwuru, sị: “Ọ pụrụ ịdị na-amapụ obi, ma ndị nwe ụlọ na-ahụ na anyị bụ́ Ndịàmà na-agbasi mbọ ike. Nke a pụrụ imetụ ha n’obi. Nanị ihe anyị ga-ekwu n’asụsụ ha bụ, ‘Obi dị m ụtọ ịhụ gị,’ ihu ha abụrụ sọ ọchị!”

Ọmụmụ ihe Ndị Kraịst na-enyekwa nnọọ aka. Mgbe ọ bụla ị gara ọmụmụ ihe, gbalịa ịza, ya dịkarịa ala otu ajụjụ. N’agbanyeghị otú nke ahụ pụrụ isi siere gị ike ná mmalite, ekwela ka ọ kụda gị obi. Ọgbakọ chọrọ ka ị mụta asụsụ ahụ! Monifa, bụ́ onye na-amụ asụsụ Korean, kwuru, sị: “Ana m ekele otu nwanna nwanyị ekele dị ukwuu bụ́ onye na-anọ m n’akụkụ n’ọmụmụ ihe ma na-edere m ihe okwu ụfọdụ pụtara. Obi ụtọ ya na otú o si eji ndidi akwado m na-enyere m nnọọ aka.” Ka ị na-amụtakwu ọtụtụ okwu, ị ga-amalite iche echiche n’asụsụ ọhụrụ ahụ—na-ejikọta okwu na ihe ha pụtara kama ịsụgharị okwu otu otu n’obi gị.

Ihe mbụ ị ga-achọ ịmụta kwesịrị ịbụ ‘ikwu okwu dị mfe nghọta.’ (1 Ndị Kọrint 14:8-11) Ọ bụ ezie na ndị mmadụ nwere ike ha agaghị atụchawa ihe ọ bụla i kwuru, ịkpọjọ okwu na iji ire mba ọzọ asụ asụsụ ndị mmadụ nwere ike ime ka ha kwụsị ige ntị n’ihe ị na-agwa ha. Ige ntị n’otú e si akpọpụta okwu na n’ụtọasụsụ ná mmalite ga-eme ka ịkpọjọ okwu ghara ịmara gị ahụ́, bụ́ nke ga-esiri gị ike ịkwụsị. Mark, bụ́ onye mụrụ Swahili, na-atụ aro, sị: “Gwa ndị ma asụsụ ahụ nke ọma ka ha na-akpọziri gị okwu ndị ị kasị akpọjọ, na-ekelekwa ha maka ime otú ahụ!” Ma, i kwesịrị ichebara oge na ume ndị ahụ na-enyere gị aka ịmụta asụsụ ahụ ji enyere gị aka echiche. Ọ bụ ezie na ị pụrụ ịgwa mmadụ ka o lee ihe i dere, gbalịa iji okwu ndị ị mabu ma ọ bụ ndị i nyochaworo na-akwadebe okwu na azịza gị. Nke a ga-eme ka ị mụta asụsụ ahụ ngwa ngwa karị ma nyere gị aka iji obi ike na-asụ ya.

Nọgide Na-aga n’Ihu

Monifa kwuru, sị: “Ịmụ asụsụ ọzọ bụ nnọọ ọrụ kasị sie ike m rụtụrụla. Ọ dị mgbe ọ na-adị m ka m kwụsị. Ma m na-echeta otú ndị m na-amụrụ Bible na-esi enwe nnọọ obi ụtọ mgbe m ji asụsụ Korean m dị mfe nghọta kọwaa eziokwu Bible gbara ọkpụrụkpụ na obi ụtọ ụmụnna na-enwe mgbe m mụtara ihe ọhụrụ, n’agbanyeghị otú ọ hà.” Isi ihe dị na ya bụ, ekwela ka ike gwụ gị ngwa ngwa. Ihe i ji na-amụ ya bụ ka i wee nwee ike ịkụziri ndị ọzọ eziokwu ndị dị n’Akwụkwọ Nsọ bụ́ ndị na-azọpụta ndụ. (1 Ndị Kọrint 2:10) N’ihi ya, ịmụta iji asụsụ ọzọ kụzie Bible na-achọ mmadụ ịnọgide na-eme mgbalị ruo ogologo oge. Ka ị na-aga n’ihu, zere ịdị na-atụ ọganihu gị n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ site n’iji onwe gị na-atụnyere ndị ọzọ n’ụzọ na-adịghị mma. Ndị na-amụ asụsụ ọhụrụ na-enwe ọganihu n’ọ̀tụ̀tụ̀ dịgasị iche iche na n’ụzọ dị iche iche. Otú ọ dị, ọ dị gị mkpa ịdị na-ama otú i nwerurula ọganihu. (Ndị Galeshịa 6:4) Joon, bụ́ onye mụwarala asụsụ Chinese na-ekwu, sị: “Ịmụ asụsụ dị ka ịrị steepụ. Kpọmkwem mgbe ọ dị gị ka ọ dịghị ihe ị na-amụta, ị na-achọpụta na mberede na i nweela ọganihu.”

Ịmụ asụsụ ọhụrụ bụ ọrụ mmadụ na-arụ ná ndụ ya nile. N’ihi ya, jiri obi ụtọ na-amụ ya, atụla anya na ị ga-ekwutecha ihe nile. (Abụ Ọma 100:2) Ị ga-ekwuhierịrị okwu. O so n’ihe ndị na-eme ka ị mụta asụsụ ahụ. Mgbe otu Onye Kraịst malitere ikwusa ozi ọma n’asụsụ Italian, ọ jụrụ otu onye nwe ụlọ, sị, “Ị̀ maara ázị́zà nke ndụ?” Ihe ọ chọrọ ikwu bụ “nzube nke ndụ.” Otu Onyeàmà malitere ịsụ asụsụ Polish ọhụrụ gwara ọgbakọ ka ha bụọ nkịta kama ikwu ka ha bụọ abụ. Site n’ịgbanwetụ otú e si akpọ otu okwu, otu onye na-amụ asụsụ Chinese gbara ndị na-ege ya ntị ume ka ha nwee okwukwe n’akpa akwụkwọ Jizọs kama ịgwa ha ka ha nwee okwukwe n’àjà mgbapụta Jizọs. Otu ihe dị mma na ya bụ na ịkpọjọ okwu na-eme ka ị ghara ichefu ebe ndị a gbaziri gị olu.

Iso Ọgbakọ Na-emekọrịta Ihe

Ọ bụghị nanị ndịrịta iche nke asụsụ na-ekewa ndị mmadụ. Omenala, agbụrụ, na esemokwu mba na mba na-esokarị ekewa ụmụ mmadụ. Otú ọ dị, a pụrụ imeri ihe mgbochi ndị a emeri. Otu ọkà mmụta na-amụ banyere òtù okpukpe ndị na-asụ Chinese na Europe kwuru na Ndịàmà Jehova “zuru ụwa ọnụ.” O kwuru na n’etiti Ndịàmà, “ebe mmadụ si enweghị ihe o mere, ha na-elekwa asụsụ anya dị ka nanị ihe ha na-eji aghọta Okwu Chineke.” N’ezie, iji ụkpụrụ ndị dị na Bible na-eme ihe na-enyere ezi Ndị Kraịst aka ịghara ikwe ka mba dị iche iche ha si na ha kewaa ha. Nye ndị yikwasịworo ‘mmadụ ọhụrụ, e nweghị onye Grik ma ọ bụ onye Juu ma ọ bu onye mba ọzọ.’—Ndị Kọlọsi 3:10, 11.

Ndị nile nọ n’ọgbakọ kwesịrị ime ihe iji na-akwalite ịdị n’otu. Nke a na-achọ mmadụ ịdị njikere ịnabata echiche ndị ọzọ, mmetụta ha, na ụzọ ha si eme ihe. Ị pụrụ izere ndịrịta iche ikewa gị na ndị ọzọ site n’ịghara isi ọnwụ ime ihe otú ị chọrọ. (1 Ndị Kọrint 1:10; 9:19-23) Mụta irite uru n’akụkụ ndị kasị mma nke omenala nile. Cheta, ịhụnanya nke achọghị ọdịmma onwe bụ ihe bụ́ isi na-eme ka anyị na ndị ọzọ na-emekọrịta ihe nke ọma ma dịrị nnọọ n’otu.

Ọtụtụ ọgbakọ ndị na-asụ asụsụ mba ọzọ na-amalite dị ka obere ìgwè nke ihe ka ọtụtụ n’ime ha bụ ndị na-amụ asụsụ ọhụrụ, nakwa ndị ka malitere ịmụ ụkpụrụ Bible ọhụrụ. N’ihi ya, a na-enwekarị nghọtahie n’ìgwè ndị dị otú ahụ karịa ka a na-enwe n’ọgbakọ nwere ọtụtụ ndị nkwusa na nke kwụsirila ike. N’ihi ya, Ndị Kraịst tozuru okè kwesịrị ịgbalị iwusi ndị ọzọ ike. Iji ịhụnanya na obiọma na-ekwu okwu ma na-eme ihe na-eme ka e nwee ọnọdụ dị mma bụ́ nke ga-eme ka ndị ọhụrụ nwee ọganihu n’ijere Jehova ozi.

Ndị wepụtara onwe ha inye aka n’ọgbakọ na-asụ asụsụ mba ọzọ ekwesịtụghị ịtụ anya ka ndị ọzọ mee ihe ha na-apụghị ime. Rick, onye bụ́ okenye n’ọgbakọ dị otú ahụ, na-akọwa, sị: “Ụfọdụ ndị ghọrọ Ndịàmà ọhụrụ nwere ike ha agaghị amacha otú e si arụ ọrụ ndị dị n’ọgbakọ otú ndị nọ n’ọgbakọ ndị na-asụ asụsụ obodo ahụ maara. Ma, ha na-anụkarị nnọọ ọkụ n’obi ma nwee ịhụnanya dị ukwuu. Ọtụtụ ndị ọhụrụ na-abatakwa n’eziokwu.” Ịnọ ya mgbe nile na iwepụta onwe gị n’ụzọ nile i nwere ike ga-enyere ọgbakọ aka, ọbụnadị mgbe ị ka na-amụ asụsụ ahụ amụ. Mmadụ nile pụrụ inye aka mee ka ọgbakọ na-enwe ọganihu ime mmụọ site n’ịrụkọ ọrụ ọnụ.

Ịnọgide Na-adị Ike n’Ụzọ Ime Mmụọ

Otu nwanna nwoke bụ́ onye bịara ọhụrụ n’ọgbakọ na-asụ asụsụ mba ọzọ nụpeere ka otu nwanna nwanyị na-enyere nwa ya aka ịkwadebe azịza nwa ahụ ga-aza. Nwatakịrị ahụ rịọrọ nne ya, sị, “Mama, gwanụ m nke na-etoghị ogologo ka nke a.” Nne ya zara ya, sị: “Mba, nwa m. Anyị kwesịrị ịhapụrụ ndị ka na-amụ asụsụ anyị ndị nke na-etoghị ogologo.”

Ọ pụrụ ịdị na-ewute onye toro eto ịnọ n’enweghị ike iso ndị ọzọ kwurịta okwu n’ụzọ na-aga were were ruo ihe karịrị otu ọnwa ma ọ bụ ọbụna otu afọ, ọ pụkwara ịkpatara ya ike ọgwụgwụ n’ụzọ ime mmụọ. Janet, bụ́ onye asụsụ Spanish na-aga were were n’ọnụ ugbu a, na-echeta, sị: “Okwu ndị m na-akpọjọ na-akụdakarị m obi.” Hiroko, bụ́ onye mụrụ Bekee, na-echeta mgbe o kwuru n’obi ya, sị: ‘Ọbụna nkịta na nwamba nọ n’ókèala a na-aghọta asụsụ Bekee karịa m.’ Kathie kwukwara, sị: “Tupu m gafee ọgbakọ Spanish, enwere m ọtụtụ ndị nletaghachi na ndị m na-amụrụ Bible, ma ugbu a, enweghịzi m otu. Ọ dị m ka ọ dịghị ihe m na-arụpụta.”

Ọ bụ n’ebe a ka àgwà ziri ezi dị oké mkpa. Mgbe obi dara Hiroko mbà, o chere n’ime onwe ya, sị: “Ya bụrụ na ndị ọzọ mụtalirị ya, aga m amụtali ya.” Kathie kwuru, sị: “Echere m banyere di m, bụ́ onye na-enwe nnọọ ọganihu ma na-arụ ọtụtụ ọrụ n’ọgbakọ. Nke ahụ mere ka m kara obi. Ọ ka na-esiri m ike, ma eji m nwayọọ nwayọọ na-amụta otú e si ekwusa ozi ọma na otú e si akụzi ihe, nke ahụ na-enyekwa m ọṅụ.” Di ya, bụ́ Jeff, kwukwara, sị: “Ọ na-ewute ewute ma ị́ ghọtaghị ihe nile a mara n’ọkwa ma ọ bụ ihe nile e kwuru ná nzukọ ndị okenye. Aghaghị m ikwu otú o si dịrị m ma weda onwe m ala jụọ ndị ọzọ, ma ụmụnna na-enwe obi ụtọ inyere m aka.”

Iji zere ike ịgwụ gị n’ụzọ ime mmụọ mgbe i so ọgbakọ na-asụ asụsụ mba ọzọ na-eje ozi, ị ghaghị iwere mmekọrịta gị na Jehova dị ka ihe kasị mkpa. (Matiu 5:3) Kazuyuki, bụ́ onye jere ozi ruo ọtụtụ afọ n’ebe a na-asụ Portuguese, na-ekwu, sị: “Ọ dị mkpa ka anyị na-eri nri ime mmụọ nke ọma. Ọ bụ ya mere ezinụlọ m ji amụ ihe ma na-akwado maka nzukọ n’asụsụ anyị nakwa n’asụsụ Portuguese.” Ụfọdụ na-aga ọmụmụ ihe n’ọgbakọ na-asụ asụsụ ha mgbe ụfọdụ. Ọzọkwa, izu ike nke ọma dị oké mkpa.—Mak 6:31.

Ịgbakọ Ihe Ọ Ga-efu

Ọ bụrụ na ị na-eche echiche ịgafe n’ọgbakọ na-asụ asụsụ ọzọ, ị ghaghị ịgbakọ ihe ime otú ahụ ga-efu gị. (Luk 14:28) N’akụkụ a, ihe ndị kasị mkpa ịtụle bụ ozi ị na-ejere Jehova na mmekọrịta gị na ya. Jiri ekpere tụlee ọnọdụ gị. Chebara nwunye ma ọ bụ dị gị na ụmụ gị echiche. Jụọ onwe gị, sị, ‘Ọnọdụ m, ihe ọmụma Bible m na ihe m ga-edili ọ̀ ga-ekwe m ịmalite ịmụ asụsụ bụ́ nke ga-ewe m ogologo oge?’ Ọ bụ ihe amamihe dị na ya ime ihe ga-akasị abara gị na ezinụlọ gị uru n’ozi unu na-ejere Jehova. N’ebe ọ bụla ị nọ, e nwere ọtụtụ ihe ị ga-arụpụta na ọṅụ dị ukwuu ị ga-enwe dị ka onye nkwusa Alaeze.

Ndị nwere ike ije ozi n’ọgbakọ na-asụ asụsụ mba ọzọ ga-enweta ngọzi dị ukwuu. Barbara, bụ́ onye ya na di ya gafere n’ọgbakọ Spanish, na-ekwu, sị: “Nke a bụ otu n’ime ihe ndị kasị nye m obi ụtọ m metụrụla ná ndụ m. Ọ dị m ka m maliteghachiri ịmụ eziokwu Bible. Obi dị m nnọọ ụtọ maka ohere ahụ e nyere m, karịsịa ebe anyị na-enweghị ike ịbụ ndị ozi ala ọzọ.”

N’ụwa nile, ọtụtụ puku mmadụ nọ n’afọ ndụ dị iche iche bụ́ ndị nkịtị na-anakwere ihe ịma aka nke ịmụ asụsụ ọzọ iji mee ka ozi ọma ahụ na-agbasa. Ọ bụrụ na i so n’ime ha, jiri ezi obi na-amụ ya ma na-ele ihe anya n’ụzọ ziri ezi. Nke kasị mkpa, tụkwasị Jehova obi maka ịgọzi mgbalị ndị ị na-eme.—2 Ndị Kọrint 4:7.

[Foto dị na peeji nke 18]

Ịga ihe ọmụmụ ole na ole onye nkụzi ma nke a na-akọ kụziri na-eme ka ịmụta asụsụ dị mfe karị ma mee ka a mụta ya ngwa ngwa karị

[Foto dị na peeji nke 20]

I kwesịghị ileghara mmekọrịta gị na Jehova anya ka ị na-amụ asụsụ ọzọ