Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nanị Ihe Ga-emeri Ọnwụ!

Nanị Ihe Ga-emeri Ọnwụ!

Nanị Ihe Ga-emeri Ọnwụ!

OTU nwoke a na-akpọ Lazarọs na ụmụnne ya ndị nwanyị bụ́ Meri na Mata bi n’obodo Betani, nke dị kilomita atọ site na Jeruselem. Otu ụbọchị mgbe enyi ha bụ́ Jizọs na-anọghị ya, Lazarọs dara oké ọrịa. Ụmụnne ya nwanyị chegburu nnọọ onwe ha banyere ya. Ha zigaara Jizọs ozi. Ụbọchị ole na ole ka Jizọs natasịrị ozi ahụ, ọ gawara ịhụ Lazarọs. Mgbe Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya na-aga n’ụzọ, ọ gwara ha na ya na-aga ịkpọte Lazarọs n’ụra. Na mbụ, ndị na-eso ụzọ Jizọs ghọtahiere ya, ma ọ kọwaara ha ihe o kwuru site n’ikwu, sị: “Lazarọs anwụwo.”—Jọn 11:1-14.

Mgbe Jizọs rutere n’ili Lazarọs, ihe mbụ o mere bụ ikwu ka a kwapụ nkume e ji kpuchie ọnụ ili ahụ. Mgbe o kpesịrị ekpere otú ndị ọzọ ga-anụ ya, o ji oké olu sị: “Lazarọs, pụta!” Lazarọs pụtakwara. A kpọlitere nwoke ahụ nwụrụ kemgbe ụbọchị anọ n’ọnwụ.—Jọn 11:38-44.

Ihe ndekọ banyere Lazarọs na-egosi na mbilite n’ọnwụ bụ nnọọ ihe ga-emeri ọnwụ. Ma mkpọlite a a kpọlitere Lazarọs n’ọnwụ n’ụzọ ọrụ ebube, ò mere eme n’ezie? Bible kọrọ ya dị ka ihe mere eme. Gụọ ebe e dekọrọ ya na Jọn 11:1-44, ị ga-ahụ otú e si kọọ ihe nile merenụ. Ị̀ ga-asị na o meghị eme? Ọ bụrụ na i lee ya anya otú ahụ, ọ ga-eme ka i chewe na ọrụ ebube nile e dekọrọ na Bible, gụnyere mbilite n’ọnwụ Jizọs Kraịst n’onwe ya, emeghị eme. Bible na-ekwukwa, sị: “Ọ bụrụ na a kpọlitebeghị Kraịst, okwukwe unu abaghị uru.” (1 Ndị Kọrint 15:17) Mbilite n’ọnwụ bụ ozizi bụ́ isi nke Akwụkwọ Nsọ. (Ndị Hibru 6:1, 2) Ma, gịnị ka okwu ahụ bụ́ “mbilite n’ọnwụ” pụtara?

Gịnị Ka “Mbilite n’Ọnwụ” Pụtara?

N’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, okwu ahụ bụ́ “mbilite n’ọnwụ” pụtara ugboro 40. E si n’okwu Grik pụtara n’ụzọ nkịtị “ibili ọtọ ọzọ” sụgharịta ya. Okwu Hibru nke ya na ya kwekọrọ pụtara “ịtụte onye nwụrụ anwụ.” Ma, mgbe mmadụ nwụrụ, olee ihe a ga-akpọlite? O nweghị ike ịbụ ahụ́ onye ahụ bụ́ nke na-ere ma ghọọ ájá. Ihe a ga-akpọlite abụghị ahụ́ onye ahụ nwere tupu ya anwụọ, kama ọ ga-abụ onye ahụ n’onwe ya. N’ihi ya, mbilite n’ọnwụ na-agụnye ime ka mmadụ bụrụghachi onye ọ bụbu—nweekwa àgwà o nweburu, chetaghachi ihe ndị o mere mgbe ọ dị ndụ ma nwee ihe nile e jibu mara ya.

Ọ gaghị esiri Jehova Chineke, bụ́ onye na-echeta ihe nile, ike icheta otú onye ahụ nwụrụ anwụ dịbu. (Aịsaịa 40:26) Ebe Jehova bụ Onye na-enye ndụ, ọ pụrụ ịkpọlite otu onye ahụ n’ọnwụ ma nye ya ahụ́ ọhụrụ. (Abụ Ọma 36:9) Ọzọkwa, Bible na-ekwu na ọ na-agụ Jehova Chineke ‘agụụ’—na-agụsi ya agụụ ike—ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ. (Job 14:14, 15) Anyị pụrụ inwe nnọọ obi ụtọ na ọ bụghị nanị na Jehova nwere ike ịkpọlite ndị nwụrụ, kama, na ọ chọkwara ime ya!

Jizọs Kraịst na-arụkwa ọrụ dị mkpa n’ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ. Mgbe ọ gafetụrụ ihe dị ka otu afọ Jizọs malitere ozi ya, ọ sịrị: “Dị nnọọ ka Nna m na-akpọlite ndị nwụrụ anwụ ma na-eme ka ha dị ndụ, otú ahụ ka Ọkpara ya na-emekwa ka ndị ọ chọrọ dị ndụ.” (Jọn 5:21) Ihe banyere Lazarọs ọ́ dịghị egosi na Jizọs Kraịst nwere ikike ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ nakwa na ọ chọrọ ime otú ahụ?

Gịnịkwanụ banyere echiche ahụ bụ́ na ọ dị ihe dị anyị n’ime nke na-adịgide ndụ mgbe anyị nwụsịrị? N’ezie, ozizi nke mbilite n’ọnwụ na echiche nke anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi ma ọ bụ mmụọ na-emegiderịta onwe ha. Olee mkpa mbilite n’ọnwụ dị ma ọ bụrụ na ọ dị ihe dị anyị n’ime nke na-adịgide ndụ mgbe anyị nwụsịrị? Nwanne Lazarọs bụ́ Mata ekweghị na mgbe nwanne ya nwoke nwụrụ na ọ gara biri n’ógbè ndị mmụọ. O kweere ná mbilite n’ọnwụ. Mgbe Jizọs mesiri ya obi ike, sị: “Nwanne gị nwoke ga-ebili,” Mata kwuru, sị: “Amaara m na ọ ga-ebili n’oge mbilite n’ọnwụ n’ụbọchị ikpeazụ.” (Jọn 11:23, 24) Mgbe a kpọlitesịkwara Lazarọs n’ọnwụ, ọ dịghị ihe ọ bụla ọ kọrọ merenụ mgbe ọ nwụsịrị. Ọ nwụrụ nnọọ anwụ. Bible na-ekwu, sị: “Ndị nwụrụ anwụ adịghị ama ihe ọ bụla. . . . Ọ dịghị ọrụ, ma ọ bụ iche echiche, ma ọ bụ ihe ọmụma, ma ọ bụ amamihe, dị [na Shiol, ili nkịtị nke ihe a kpọrọ mmadụ NW], ebe gị onwe gị na-ala.”—Eklisiastis 9:5, 10.

Ma, dị ka Bible si kwuo, mbilite n’ọnwụ bụ nanị ihe ga-emeri ọnwụ. Ma n’ime ndị nile nwụrụ anwụ, ole ndị ka a ga-akpọlite n’ọnwụ, oleekwa ebe ha ga-ebi mgbe a kpọlitesịrị ha?

Ole Ndị Ka A Ga-akpọlite n’Ọnwụ?

Jizọs kwuru, sị: “Ndị nile nọ n’ili ncheta ga-anụ olu [Jizọs] wee pụta.” (Jọn 5:28, 29) N’ikwekọ ná nkwa a, a ga-akpọlite ndị nile nọ n’ili ncheta—ndị Jehova na-echeta. Ma ajụjụ anyị ga-atụle ugbu a bụ, N’ime ndị nile nwụrụ anwụ, ole ndị n’ezie ka Chineke na-echeta bụ́ ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ?

E depụtara aha ndị ikom na ndị inyom jeere Chineke ozi n’ikwesị ntụkwasị obi n’isi nke 11 nke akwụkwọ Bible bụ́ Ndị Hibru. A ga-akpọlite ha na ndị ohu Chineke kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ ndị nwụrụ n’oge na-adịbeghị anya n’ọnwụ. Oleekwanụ banyere ndị mere ajọ omume, ma eleghị anya n’ihi enweghị ihe ọmụma banyere Chineke? Hà so ná ndị Chineke na-echeta? Ee, ọtụtụ n’ime ha so, n’ihi na Bible na-ekwe nkwa, sị: “A gaje inwe mbilite n’ọnwụ nke ma ndị ezi omume ma ndị ajọ omume.”—Ọrụ 24:15.

Otú ọ dị, ọ bụghị ndị nile nwụrụ anwụ ka a ga-akpọlite n’ọnwụ. Bible na-ekwu, sị: “Ọ bụrụ na anyị elezie anya nọgide na-eme mmehie mgbe anyị nwetasịworo ezi ihe ọmụma nke eziokwu ahụ, ọ dịkwaghị àjà ọ bụla fọrọ maka mmehie, kama e nwere nnọọ ikpe na-atụ egwu nke a na-atụ anya ya.” (Ndị Hibru 10:26, 27) Ụfọdụ mere mmehie a na-agaghị agbaghara agbaghara. Ha anọghị na Hedis (ili nkịtị nke ihe a kpọrọ mmadụ) kama, ha nọ na Gehena, nke bụ́ ihe atụ nke mbibi ebighị ebi. (Matiu 23:33) Otú ọ dị, anyị aghaghị ịkpachara anya ka anyị ghara iji aka anyị kpebie onye a ga-akpọlite n’ọnwụ na onye a na-agaghị akpọlite. Ọ bụ Chineke ga-ekpebi ya. Ọ maara onye nọ na Hedis na onye nọ na Gehena. Ihe a chọrọ anyị n’aka bụ ibi ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’uche Chineke.

Ole Ndị Ka A Ga-akpọlite n’Ọnwụ Ịga Eluigwe?

Mbilite n’ọnwụ nke kasị dị ịrịba ama bụ nke Jizọs Kraịst. “E mere ka ọ nwụọ n’anụ ahụ́, ma bụrụ onye e mere ka ọ dị ndụ na mmụọ.” (1 Pita 3:18) Ọ dịtụbeghị mmadụ a kpọlitere n’ọnwụ otú ahụ. Jizọs n’onwe ya kwuru, sị: “Ọ dịghị onye ọ bụla rịgowooro n’eluigwe ma e wezụga onye ahụ nke si n’eluigwe rịdata, bụ́ Nwa nke mmadụ.” (Jọn 3:13) N’ezie, Nwa nke mmadụ bụ onye mbụ a kpọlitere n’ọnwụ dị ka mmụọ. (Ọrụ 26:23) E nwere ndị ọzọ a ga-akpọlitekwa otú ahụ. Akwụkwọ Nsọ na-ekwu, sị: “Onye ọ bụla n’usoro nke ya: Kraịst mkpụrụ mbụ, e mesịakwa ndị bụ́ ndị nke Kraịst ahụ n’oge ọnụnọ ya.”—1 Ndị Kọrint 15:23.

A ga-akpọlite ọnụ ọgụgụ mmadụ dị nta—“ndị bụ́ ndị nke Kraịst ahụ”—n’ọnwụ ibi n’eluigwe maka nzube pụrụ iche. (Ndị Rom 6:5) Ha ga-eso Kraịst chịa “ụwa dị ka ndị eze.” (Mkpughe 5:9, 10) Ọzọkwa, ha ga-arụ ọrụ dị ka ndị nchụàjà n’ihi na ha ga-eso wepụ ihe ọjọọ ndị mmehie ụmụ mmadụ ketara n’aka nwoke mbụ ahụ, bụ́ Adam, kpatara. (Ndị Rom 5:12) Ọnụ ọgụgụ ndị ahụ ga-eso Kraịst bụrụ eze na ndị nchụàjà bụ 144,000. (Mkpughe 14:1, 3) Olee ụdị ahụ́ ha ga-enwe mgbe a kpọlitere ha n’ọnwụ? Bible kwuru na ha ga-enwe “ahụ́ nke mmụọ.” Nke a ga-eme ka o kwe ha omume ibi n’eluigwe.—1 Ndị Kọrint 15:35, 38, 42-45.

Olee mgbe mbilite n’ọnwụ nke ịga eluigwe ga-amalite? Ndị Kọrint nke Mbụ 15:23 na-ekwu na ọ bụ “n’oge ọnụnọ [Kraịst].” Ihe ndị na-eme n’ụwa kemgbe afọ 1914 na-eme ka o doo anya na ma ọnụnọ Kraịst ma “ngwụsị nke usoro ihe a” malitere n’afọ ahụ. (Matiu 24:3-7) N’ihi ya, e nwere ihe mere anyị ga-eji kwere na mbilite n’ọnwụ nke Ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi ịga eluigwe amalitela, ọ bụ ezie na ụmụ mmadụ anaghị ahụ ya anya. Nke ahụ pụtara na a kpọlitela ndịozi na Ndị Kraịst oge mbụ n’ọnwụ gaa n’eluigwe. Oleekwanụ banyere Ndị Kraịst dị ndụ ugbu a bụ́ ndị ji n’aka na Chineke kpọrọ ha iso Kraịst chịa n’eluigwe? A na-akpọlite ha n’ọnwụ “n’otu ntabi anya,” ma ọ bụ ozugbo ha nwụrụ. (1 Ndị Kọrint 15:52) Ebe ọ bụ na a ga-ebu ụzọ kpọlite ìgwè nta ahụ dị mmadụ 144,000 n’ọnwụ tupu a kpọlite ọnụ ọgụgụ a na-akpọghị aha bụ́ ndị ga-ebi n’ụwa, a kpọrọ nke ha “mbilite n’ọnwụ bu ụzọ” na “mbilite n’ọnwụ mbụ.”—Ndị Filipaị 3:11; Mkpughe 20:6.

Ole Ndị Ka A Ga-akpọlite n’Ọnwụ Ibi n’Ụwa?

Dị ka Akwụkwọ Nsọ si kwuo, a ga-akpọlite ihe ka ọtụtụ ná ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ ibi n’ụwa. (Abụ Ọma 37:29; Matiu 6:10) Mgbe Jọn onyeozi na-akọwa ọhụụ dị ebube ọ hụrụ banyere ndị a kpọlitere n’ọnwụ, o dere, sị: “Oké osimiri hapụkwara ndị nwụrụ anwụ nọ n’ime ya, ọnwụ na Hedis hapụkwara ndị nwụrụ anwụ nọ n’ime ha, e kpekwara ha ikpe n’otu n’otu dị ka omume ha si dị. A tụbakwara ọnwụ na Hedis n’ime ọdọ ọkụ ahụ. Ọdọ ọkụ ahụ pụtara ọnwụ nke abụọ.” (Mkpughe 20:11-14) Chineke na-echeta ndị nọ na Hedis ma ọ bụ Shiol—nke bụ́ ili nkịtị nke ihe a kpọrọ mmadụ. A ga-akpọlitecha ha nile n’ọnwụ. (Abụ Ọma 16:10; Ọrụ 2:31) A ga-ekpekwa onye nke ọ bụla n’ime ha ikpe dabere n’ihe o mere mgbe a kpọlitesịrị ya. Gịnịzi ga-eme ọnwụ na Hedis? A ga-atụba ha n’ime “ọdọ ọkụ ahụ.” Nke a pụtara na ọnwụ nke ụmụ mmadụ ketara n’aka Adam agaghị egbukwa ha ọzọ.

Ndị ọ bụla ndị ha hụrụ n’anya nwụnahụrụ ga-enwe nnọọ obi ụtọ mgbe ha matara na Chineke kwere nkwa ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ! Nwanyị ahụ di ya nwụrụ n’obodo Nen aghaghị inwewo obi ụtọ dị ukwuu mgbe Jizọs kpọlitere nanị otu nwa nwoke o nwere! (Luk 7:11-17) Bible kwuru banyere nne na nna nke otu nwata nwanyị dị afọ 12, bụ́ onye Jizọs kpọlitere n’ọnwụ, sị: “Ozugbo ahụkwa ha wee jupụta n’oké obi ụtọ.” (Mak 5:21-24, 35-42; Luk 8:40-42, 49-56) N’ụwa ọhụrụ Chineke kwere ná nkwa, obi ga-adị anyị ụtọ ịnabataghachi ndị anyị hụrụ n’anya nwụrụ anwụ.

Olee mmetụta ịmara eziokwu banyere mbilite n’ọnwụ pụrụ inwe n’ebe anyị nọ ugbu a? The World Book Encyclopedia na-ekwu, sị: “Ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ na-atụ ọnwụ egwu, ha anaghịkwa achọ iche ya n’echiche.” N’ihi gịnị? N’ihi na nye ha, ọnwụ bụ ihe omimi—ihe a na-amaghị ama na ihe a ga-atụ ụjọ ya. Ịmata eziokwu banyere ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ na inwe olileanya maka mbilite n’ọnwụ pụrụ ime ka obi sie anyị ike ma ọ bụrụ na anyị anọrọ n’ọnụ “onye iro ikpeazụ, [bụ́] ọnwụ.” (1 Ndị Kọrint 15:26) Ihe ọmụma a na-emekwa ka ọ dịkwuoro anyị mfe idi mwute anyị na-enwe mgbe ọnwụ gburu ezigbo enyi anyị ma ọ bụ onye ikwu anyị.

Olee mgbe mbilite n’ọnwụ ibi n’ụwa ga-amalite? Taa, ụwa jupụtara n’ime ihe ike, esemokwu, mwụfu ọbara na mmetọ. N’ezie, ya bụrụ na a kpọlite ndị nwụrụ anwụ ibi n’ụwa dị otú a, obi ụtọ ọ bụla ha pụrụ inwe agaghị adịte aka. Otú ọ dị, Onye Okike anyị ekwela nkwa ibibi ụwa a Setan na-achị, n’isi nso. (Ilu 2:21, 22; Daniel 2:44; 1 Jọn 5:19) Nzube Chineke maka ụwa ga-emezu n’oge na-adịghị anya. Mgbe ahụ, n’ụwa ọhụrụ nke udo nke Chineke kwere nkwa iweta, a ga-akpọlite ọtụtụ ijeri mmadụ nọ n’ụra ọnwụ ugbu a n’ọnwụ.

[Foto dị na peeji nke 7]

A ga-akpọlite ihe ka ọtụtụ ná ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ ibi n’ụwa