Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Zere Okpukpe Ụgha!

Zere Okpukpe Ụgha!

Zere Okpukpe Ụgha!

“‘Sinụ n’etiti ha pụọ, kewapụkwanụ onwe unu,’ ka Jehova na-asị, ‘kwụsịkwanụ ibitụ ihe na-adịghị ọcha aka.’”—2 NDỊ KỌRINT 6:17.

1. Olee ọnọdụ ọtụtụ ndị nọ na ya n’ụzọ ime mmụọ?

ỌTỤTỤ ndị nwere obi eziokwu amaghị ihe bụ́ eziokwu banyere Chineke na ọdịnihu nke ụmụ mmadụ. N’ihi amaghị eziokwu banyere ihe ndị a na-enye ha ezigbo nsogbu n’obi, ha na-anọ nnọọ ná mgbagwoju anya ma ghara ịma ihe ha ga-eme. Ọtụtụ nde mmadụ bụ ohu nke nkwenkwe ụgha, ememe okpukpe, na ememe ndị na-akpasu Onye Okike iwe. O nwere ike ịbụ na i nwere ndị agbata obi na ndị ikwu kweere na hel nke na-ere ọkụ, n’Atọ n’Ime Otu, n’anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi, ma ọ bụ n’ozizi ụgha ọzọ.

2. Gịnị ka ndị ndú okpukpe meworo, gịnịkwa ka ọ rụpụtaworo?

2 Olee ihe kpatara ọchịchịrị ime mmụọ a jupụtara ebe nile? Ọ bụ ihe na-eju anya ikwu na ọ bụ okpukpe—okpukpe na ndị ndú okpukpe ziworo ozizi ndị megidere echiche Chineke. (Mak 7:7, 8) N’ihi ya, e duhiela ọtụtụ ndị ikwere na ha na-efe ezi Chineke ahụ, ebe ihe ha na-emekwanụ bụ ịkpasu ya iwe. Ọ bụ okpukpe ụgha kpatara nnọọ ọnọdụ ọjọọ a.

3. Ònye bụ onye kasị akwado okpukpe ụgha, oleekwa otú e si kọwaa onye ahụ na Bible?

3 Ọ dị onye a na-adịghị ahụ anya na-akwado okpukpe ụgha. Mgbe Pọl onyeozi na-ekwu banyere ya, o kwuru, sị: “Chi nke usoro ihe a [emewo] ka uche ndị na-ekweghị ekwe kpuo ìsì, ka ìhè nke ozi ọma ahụ dị ebube banyere Kraịst ahụ, onye bụ́ onyinyo Chineke, wee ghara inwupụta.” (2 Ndị Kọrint 4:4) “Chi nke usoro ihe a” adịghị onye ọzọ ọ bụ ma ọ́ bụghị Setan bụ́ Ekwensu. Ọ bụ ya bụ onye bụ́ isi na-akwalite okpukpe ụgha. Pọl dere, sị: “Setan n’onwe ya anọgidewo na-enwogha onwe ya ịbụ mmụọ ozi nke ìhè. Ya mere ọ bụghị oké ihe ma ọ bụrụ na ndị ozi ya anọgidekwa na-enwogha onwe ha ịbụ ndị ozi nke ezi omume.” (2 Ndị Kọrint 11:14, 15) Setan na-eme ka ihe ọjọọ yie ezi ihe ma na-aghọgbu ndị mmadụ ikwere ụgha.

4. Gịnị ka Iwu Chineke nyere Izrel oge ochie kwuru banyere ndị amụma ụgha?

4 Ka a sịkwa ihe mere Bible ji katọsie okpukpe ụgha ike! Dị ka ihe atụ, Iwu Mozis dọrọ nnọọ ndị Chineke họpụtara aka ná ntị ka ha zere ndị amụma ụgha. ‘A ga-eme ka onye ọ bụla na-akwalite ozizi ma ọ bụ ofufe nke chi ụgha nwụọ n’ihi ikwu okwu ịgbakụta Jehova azụ.’ E nyere ndị Izrel iwu ‘ikpochapụ ihe ọjọọ n’etiti ha.’ (Deuterọnọmi 13:1-5) Ee, Jehova na-ele okpukpe ụgha anya dị ka ihe ọjọọ.—Ezikiel 13:3.

5. Olee ịdọ aka ná ntị anyị kwesịrị ịnabata taa?

5 Jizọs Kraịst na ndịozi ya kpọkwara okpukpe ụgha asị otú ahụ Jehova si kpọọ ya. Jizọs dọrọ ndị na-eso ụzọ ya aka ná ntị, sị: “Nọrọnụ na nche maka ndị amụma ụgha bụ́ ndị na-eyi ihe mgbokwasị atụrụ abịakwute unu, ma n’ime, ha bụ nkịta ọhịa agụụ ji.” (Matiu 7:15; Mak 13:22, 23) Pọl dere na “a na-ekpughe ọnụma Chineke site n’eluigwe megide asọpụrụghị Chineke na ajọ omume nile nke mmadụ ndị na-ekpuchi eziokwu ahụ.” (Ndị Rom 1:18) Ọ dị nnọọ mkpa ka ezi Ndị Kraịst ṅaa ntị n’ịdọ aka ná ntị ndị a ma zere onye ọ bụla na-ezochi eziokwu nke Okwu Chineke ma ọ bụ na-agbasa ozizi ụgha!—1 Jọn 4:1.

Si na “Babilọn Ukwu ahụ” Pụta

6. Olee otú e si kọwaa “Babilọn Ukwu ahụ” na Bible?

6 Tụlee otú akwụkwọ Bible bụ́ Mkpughe si kọwaa okpukpe ụgha. A kọwara ya dị ka nwanyị akwụna mmanya na-egbu nke nwere ike n’ahụ́ ọtụtụ alaeze na ndị bi na ha. Nwanyị ihe atụ a na-eso ọtụtụ ndị eze akwa iko, ọbara ndị na-efe Chineke ezi ofufe na-egbukwa ya dị ka mmanya. (Mkpughe 17:1, 2, 6, 18) E dekwasịrị ya aha kwekọrọ n’àgwà rụrụ arụ nke na-asọ oyi ọ na-akpa n’egedege ihu. Aha ahụ bụ “Babilọn Ukwu ahụ, nne nke ụmụ nwanyị akwụna na nke ihe arụ nke ụwa.”—Mkpughe 17:5.

7, 8. Olee otú okpukpe ụgha siworo gbaa akwụna, gịnị siwokwara na ya pụta?

7 Nkọwa ahụ Akwụkwọ Nsọ nyere Babilọn Ukwu ahụ kwekọrọ n’ihe okpukpe ụgha nile na-eme. Ọ bụ ezie na ọtụtụ puku okpukpe ndị e nwere n’ụwa anaghị akpọ onwe ha otu okpukpe zuru ụwa ọnụ, ha nwere nnọọ otu nzube ma na-eme otu ihe. Okpukpe ụgha, bụ́ nke a kpọrọ nwanyị na-akwa iko ná Mkpughe, nwere ikike dị ukwuu n’ahụ́ gọọmenti. Ebe okpukpe ụgha yiri nwanyị na-adịghị ekwesị ntụkwasị obi nye di ya, ọ gbawo akwụna site n’isoro ndị ọchịchị ụwa dị iche iche jikọọ aka. Jems onye na-eso ụzọ dere, sị: “Ndị na-akwa iko, ùnu amaghị na ịbụ ndị enyi nke ụwa bụ ịbụ ndị iro nke Chineke? Ya mere, onye ọ bụla chọrọ ịbụ enyi nke ụwa na-edebe onwe ya n’ọnọdụ ịbụ onye iro nke Chineke.”—Jems 4:4.

8 Njikọ aka nke okpukpe ụgha na ọchịchị akpataworo ụmụ mmadụ ọtụtụ nhụjuanya. Onye Africa na-enyocha ndọrọ ndọrọ ọchịchị bụ́ Dr. Xolela Mangcu kwuru na “e gbuola ọtụtụ ndị n’ụwa n’ihi aka okpukpe na-etinye n’ọchịchị.” Otu akwụkwọ akụkọ kwuru n’oge na-adịbeghị anya, sị: “Esemokwu ndị a kasị awụfu ọbara na ha na ndị kasị dị njọ e nwere taa . . . metụtara okpukpe.” E gbuwo ọtụtụ nde mmadụ n’agha ndị okpukpe kwadoro. Babilọn Ukwu ahụ akpagbuodịla ma gbuo ezi ndị ohu Chineke, ọbara ha ana-egbu ya ka mmanya n’ụzọ ihe atụ.—Mkpughe 18:24.

9. Olee otú akwụkwọ Mkpughe si gosi asị Jehova kpọrọ okpukpe ụgha?

9 Ihe ga-eme Babilọn Ukwu ahụ na-egosi nnọọ na Jehova kpọrọ okpukpe ụgha asị. Mkpughe 17:16 na-ekwu, sị: “Mpi iri ahụ ị hụkwara, na anụ ọhịa ahụ, ndị a ga-akpọ nwanyị akwụna ahụ asị ma mee ka ọ laa n’iyi na ka ọ gbara ọtọ, ha ga-erichapụkwa uru ahụ́ ya ma kpọọ ya ọkụ kpam kpam.” Otu nnukwu anụ ọhịa buru ụzọ dọkasịa ya ma rizie uru ahụ́ ya. Mgbe nke ahụ gasịrị, a kpọrọ ihe ọ bụla fọrọ n’ahụ́ ya ọkụ. N’imezu ihe a e kwuru, n’oge na-adịghị anya, ndị ọchịchị ụwa ga-ebibi okpukpe ụgha. Chineke ga-eme ka ha mezuo ya. (Mkpughe 17:17) A ga-ebibirịrị Babilọn Ukwu ahụ, bụ́ alaeze ụwa nke okpukpe ụgha. “Ọ dịghịkwa mgbe a ga-ahụ ya ọzọ.”—Mkpughe 18:21.

10. Olee otú anyị kwesịrị isi na-ele okpukpe ụgha anya?

10 Olee otú ndị na-efe ezi ofufe kwesịrị isi na-ele Babilọn Ukwu ahụ anya? Bible nyere iwu a doro anya: “Sinụ n’ime ya pụta, ma ọ bụrụ na unu achọghị iso ya kere òkè ná mmehie ya, nakwa ma ọ bụrụ na unu achọghị ịnata ụfọdụ n’ime ihe otiti ya.” (Mkpughe 18:4) Ndị chọrọ ịdị ndụ aghaghị isi n’okpukpe ụgha pụta tupu oge agafee. Mgbe Jizọs Kraịst nọ n’ụwa, o kwuru na n’ụbọchị ikpeazụ, ọtụtụ ndị ga-azọrọ na ha na-erubere ya isi. (Matiu 24:3-5) Ọ ga-agwa ndị dị otú ahụ, sị: “Ọ dịghị mgbe m maara unu! Sinụ n’ebe m nọ pụọ, unu ndị ọrụ mmebi iwu.” (Matiu 7:23) Jizọs Kraịst ahụ e chirila Eze ugbu a enweghị ihe jikọrọ ya na okpukpe ụgha.

Olee Otú Anyị Ga-esi Zere Okpukpe Ụgha?

11. Gịnị ka anyị kwesịrị ime iji zere okpukpe ụgha?

11 Ezi Ndị Kraịst na-ezere okpukpe ụgha, na-ajụ ozizi ụgha ya. Nke a pụtara na anyị ga-ezere ịdị na-ege ihe omume okpukpe na redio ma ọ bụ na-ele ya na telivishọn, zerekwa ịgụ akwụkwọ okpukpe ndị na-akụzi ihe ndị na-abụghị eziokwu banyere Chineke na Okwu ya. (Abụ Ọma 119:37) Ọ ga-abụkwa ihe amamihe dị na ya izere nnọkọ oriri na ọṅụṅụ òtù okpukpe ụgha ọ bụla haziri. Ọzọkwa, anyị agaghị akwado okpukpe ụgha n’ụzọ ọ bụla. (1 Ndị Kọrint 10:21) Anyị izere ihe ndị ahụ ga-eme ka mmadụ ghara iburu anyị “dị ka anụ oriri ya site na nkà ihe ọmụma na aghụghọ efu dị ka ọdịnala mmadụ si dị, dị ka ihe ndị mbụ nke ụwa si dị, ọ bụghị dị ka Kraịst si dị.”—Ndị Kọlọsi 2:8.

12. Olee otú mmadụ pụrụ isi si n’okpukpe ụgha pụta?

12 Gịnị ma ọ bụrụ na onye chọrọ ịghọ Onyeàmà Jehova ka nọ n’okpukpe ụgha? Mgbe mgbe, ide akwụkwọ ozi iji gwa okpukpe ahụ na mmadụ esokwaghị ha na-abụ ihe akaebe na-egosi na onye ahụ achọkwaghị ka a gụọ ya n’onye nọ n’okpukpe ụgha. Ọ dị mkpa karịsịa ka onye ahụ gbalịsie ike izere kpamkpam ihe ọ bụla ga-eme ka okpukpe ụgha metọọ ya. Ihe onye ahụ na-achọ ịghọ Onyeàmà na-eme kwesịrị igosi ndị okpukpe ahụ na mmadụ nile na ọ dịghịkwa ihe jikọrọ ya na okpukpe ahụ.

13. Olee ndụmọdụ Bible nyere banyere mkpa ọ dị izere okpukpe ụgha?

13 Pọl onyeozi dere, sị: “Unu na ndị na-ekweghị ekwe ekekọtala onwe unu n’ụzọ na-ekwekọghị ekwekọ. N’ihi na olee mkpakọrịta ezi omume na mmebi iwu nwere? Ma ọ bụ olee òkè ìhè na ọchịchịrị nwere? Ọzọkwa, olee nkwekọ dị n’etiti Kraịst na Belial? Ma ọ bụ olee òkè onye kwere ekwe na onye na-ekweghị ekwe nwere? Oleekwa nkwekọrịta ụlọ nsọ Chineke na arụsị nwere? . . . ‘Ya mere sinụ n’etiti ha pụọ, kewapụkwanụ onwe unu,’ ka Jehova na-asị, ‘kwụsịkwanụ ibitụ ihe na-adịghị ọcha aka.’” (2 Ndị Kọrint 6:14-17) Anyị na-erube isi n’okwu ndị a site n’izere okpukpe ụgha. Ndụmọdụ ahụ Pọl nyere ọ̀ pụtara na anyị ga-ezerekwa ndị na-efe ofufe ụgha?

“Nọgidenụ Na-eje Ije n’Amamihe”

14. Ànyị ga-ezerecha nnọọ ndị na-efe ofufe ụgha? Kọwaa.

14 Ndị na-efe ezi ofufe hà kwesịrị ịkwụsị iso ndị na-efe ofufe ụgha emekọrịta ihe ọ bụla? Ànyị kwesịrị izerecha nnọọ ndị na-anọghị n’okpukpe anyị? Azịza ya bụ ee e. Iwu nke abụọ kasịnụ kwuru, sị: “Ị ghaghị ịhụ onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị.” (Matiu 22:39) Anyị na-egosi nnọọ ndị agbata obi anyị ịhụnanya mgbe anyị na-ezi ha ozi ọma Alaeze ahụ. Anyị na-egosikwa na anyị hụrụ ha n’anya mgbe anyị na-amụrụ ha Bible ma na-agwa ha mkpa ọ dị izere okpukpe ụgha.

15. Olee ihe “abụghị akụkụ nke ụwa” pụtara?

15 Ọ bụ ezie na anyị na-ekwusara ndị agbata obi anyị ozi ọma, dị ka ndị na-eso ụzọ Jizọs, anyị “abụghị akụkụ nke ụwa.” (Jọn 15:19) Okwu ahụ bụ́ “ụwa” e jiri mee ihe ebe a pụtara ụmụ mmadụ ndị kewapụrụ onwe ha n’ebe Chineke nọ. (Ndị Efesọs 4:17-19; 1 Jọn 5:19) Anyị abụghị akụkụ nke ụwa n’ihi na anyị na-ezere àgwà, okwu, na omume ndị na-akpasu Jehova iwe. (1 Jọn 2:15-17) Ọzọkwa, n’ihi ụkpụrụ ahụ kwuru na “mkpakọrịta ọjọọ na-emebi àgwà bara uru,” anyị na-ezere iso ndị na-adịghị agbaso ụkpụrụ Ndị Kraịst akpachi anya. (1 Ndị Kọrint 15:33) Abụghị akụkụ nke ụwa pụtara ịnọ “n’enweghị ntụpọ n’ebe ụwa dị.” (Jems 1:27) N’ihi ya, abụghị akụkụ nke ụwa apụtaghị na anyị na ndị ọzọ agaghị emekọrịta ihe ọ bụla.—Jọn 17:15, 16; 1 Ndị Kọrint 5:9, 10.

16, 17. Olee otú Ndị Kraịst kwesịrị isi na-emeso ndị na-amaghị eziokwu Bible ihe?

16 Oleezi otú anyị ga-esi na-emeso ndị na-amaghị eziokwu Bible ihe? Pọl degaara ọgbakọ dị na Kọlọsi akwụkwọ, sị: “Nọgidenụ na-eje ije n’amamihe n’ebe ndị nọ n’èzí nọ, na-azụpụtaranụ onwe unu oge ahụ kwesịrị ekwesị. Kwenụ ka okwu unu dịrị n’amara mgbe nile, bụrụ ihe e ji nnu mee ka ọ dị ụtọ, ka unu wee mara otú unu kwesịrị isi azaghachi onye ọ bụla.” (Ndị Kọlọsi 4:5, 6) Pita onyeozi dere, sị: “Doonụ Kraịst nsọ dị ka Onyenwe anyị n’obi unu, na-adịnụ njikere mgbe nile ime ngọpụ n’ihu onye ọ bụla nke na-ajụ unu ihe mere unu ji nwee olileanya ahụ dị n’ime unu, ma jirinụ obi dị nwayọọ na nkwanye ùgwù miri emi na-eme nke ahụ.” (1 Pita 3:15) Pọl dụrụ Ndị Kraịst ọdụ “ịghara ikwu okwu ọjọọ banyere onye ọ bụla, ịghara inwe mmụọ ịlụ ọgụ, ka ha nwee ezi uche, na-egosi ịdị nwayọọ nile n’ebe mmadụ nile nọ.”—Taịtọs 3:2.

17 Dị ka Ndịàmà Jehova, anyị na-ezere ịkparị ndị ọzọ ma ọ bụ na-egosi ha na anyị ka ha. Anyị anatụghị eji okwu na-eweda mmadụ ala akọwa ndị nọ n’okpukpe ọzọ. Kama nke ahụ, anyị na-adị akọ, ọbụna ma ọ bụrụ na onye nwe ụlọ, onye agbata obi anyị, ma ọ bụ onye ọrụ ibe anyị emeso anyị omume obi ọjọọ ma ọ bụ kparịa anyị.—Ndị Kọlọsi 4:6; 2 Timoti 2:24.

“Nọgide Na-ejide Ụkpụrụ nke Okwu Na-enye Ezi Ndụ”

18. Olee ọnọdụ ọjọọ ndị laghachiri n’okpukpe ụgha na-ahụ onwe ha na ya n’ụzọ ime mmụọ?

18 Lee ihe ọjọọ ọ ga-abụ mmadụ ịmụtacha eziokwu Bible ma mesịa laghachi n’okpukpe ụgha! Bible kọwara ihe ọjọọ ga-esi n’omume dị otú ahụ pụta mgbe ọ sịrị: “N’ezie ọ bụrụ na mgbe ha gbapụsịrị ná mmerụ nke ụwa site n’ezi ihe ọmụma banyere Onyenwe anyị na Onye Nzọpụta bụ́ Jizọs Kraịst, ha etinye aka ọzọ n’ihe ndị a kpọmkwem ma bụrụ ndị e meriri, ọnọdụ ikpeazụ ahụ adịworo ha njọ karịa nke mbụ. . . . Okwu ilu ahụ nke bụ́ eziokwu emewo n’ebe ha nọ: ‘Nkịta alaghachiwo n’agbọ ọ gbọrọ, nne ézì nke a sara ahụ́ alaghachiwokwa n’ịdagharị n’apịtị.’”—2 Pita 2:20-22.

19. N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ịnọ na nche iji zere ihe ọ bụla pụrụ imebi mmekọrịta anyị na Chineke?

19 Anyị aghaghị ịmụrụ anya iji zere ihe ọ bụla pụrụ imebi mmekọrịta anyị na Chineke. Ihe ndị pụrụ imebi ya dị nnọọ adị! Pọl onyeozi dọrọ aka ná ntị, sị: “Okwu sitere ná mkpali nke mmụọ nsọ na-ekwu kpọmkwem na n’oge ikpeazụ, ụfọdụ ga-esi n’okwukwe dapụ, na-aṅa ntị n’okwu nduhie ndị sitere ná mkpali nke mmụọ na ozizi ndị mmụọ ọjọọ.” (1 Timoti 4:1) Anyị bi “n’oge ikpeazụ.” Ndị na-ezereghị okpukpe ụgha pụrụ ịbụ “ndị ebili mmiri na-enugharị na ndị ifufe ozizi ọ bụla na-ebugharị site n’aghụghọ nke ụmụ mmadụ, site n’aghụghọ dị n’ichepụta njehie.”—Ndị Efesọs 4:13, 14.

20. Olee otú anyị pụrụ isi chebe onwe anyị ka mmetụta ọjọọ nke okpukpe ụgha ghara iru anyị ahụ́?

20 Olee otú anyị pụrụ isi chebe onwe anyị ka mmetụta ọjọọ nke okpukpe ụgha ghara iru anyị ahụ́? Chee echiche banyere ihe nile Jehova nyeworo anyị. Anyị nwere Okwu Chineke, bụ́ Bible. (2 Timoti 3:16, 17) Jehova enyewokwa anyị nri ime mmụọ n’ụba site n’aka “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche.” (Matiu 24:45) Ka anyị na-amụtakwu eziokwu ahụ, ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ịzụlite agụụ maka “nri siri ike [bụ́ nke] dịịrị ndị tozuru okè” ma nwee ọchịchọ ịdị na-ezukọta n’ebe anyị na-anọ amụta eziokwu ndị metụtara Chineke na Okwu ya? (Ndị Hibru 5:13, 14; Abụ Ọma 26:8) Ka anyị kpebisie ike irite uru zuru ezu n’ihe ndị Jehova nyeworo anyị ka anyị wee nwee ike ‘ịnọgide na-ejide ụkpụrụ nke okwu na-enye ezi ndụ’ nke anyị nụworo. (2 Timoti 1:13) Nke ahụ ga-enyere anyị aka izere okpukpe ụgha.

Gịnị Ka Ị Mụtara?

• Gịnị bụ “Babilọn Ukwu ahụ”?

• Olee ihe anyị na-aghaghị ime iji zere okpukpe ụgha?

• Olee ihe ndị nwere ike imebi mmekọrịta anyị na Jehova bụ́ ndị anyị kwesịrị izere?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 28]

Ị̀ maara ihe mere e ji jiri nwanyị akwụna mee ihe atụ nke “Babilọn Ukwu ahụ”?

[Foto dị na peeji nke 29]

A ga-ebibirịrị “Babilọn Ukwu ahụ”

[Foto dị na peeji nke 31]

Anyị na-eji “obi dị nwayọọ na nkwanye ùgwù miri emi” emeso ndị anyị na ha na-anọghị n’otu okpukpe ihe