Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọ̀ Bụ Chineke Ka Na-achịkwa Ihe Ndị Na-eme n’Ụwa?

Ọ̀ Bụ Chineke Ka Na-achịkwa Ihe Ndị Na-eme n’Ụwa?

Ịkpọ òkù . . .

Ọ̀ Bụ Chineke Ka Na-achịkwa Ihe Ndị Na-eme n’Ụwa?

ỌDACHI ndị na-emere onwe ha, ọrịa ndị na-egbu mmadụ, nrụrụ aka nke ndị nọ n’ọkwá dị elu, iyi ọha egwu, agha, mpụ. Ọ dịghị ụbọchị na-agafenụ anyị aghara ịnụ akụkọ banyere ihe ndị a. Ma ihe ndị dị otú a hà emetụla gị n’onwe gị ma ọ bụ na ha emetụtabeghị gị, ha na-eme ka ndị mmadụ na-eche ebe ụwa a na-eche ihu, nakwa ma ọ̀ dị mgbe ihe ga-aka mma.

Iji zaa ajụjụ ndị dị otú a, n’ihe karịrị narị ala abụọ gburugburu ụwa, Ndịàmà Jehova ga-ekwu okwu ihu ọha pụrụ iche, bụ́ nke bịara n’ezi oge, nke isiokwu ya bụ: “Ọ̀ Bụ Chineke Ka Na-achịkwa Ihe Ndị Na-eme n’Ụwa?” Ọ ga-atụle ihe Chineke kwuru banyere ajụjụ ndị a dị oké mkpa, nakwa ihe ndị Chineke kwere ná nkwa n’ime Okwu ya na-adịghị agha agha, bụ́ Bible. Ajụjụ ndị ahụ bụ:

Chineke ò nwere mmasị n’ihe ndị na-eme n’ụwa?

Gịnị ka o chere banyere ọnọdụ nke ụmụ mmadụ?

Ọ̀ na-eche banyere ọdịmma gị?

N’ọtụtụ ebe, a ga-ekwu okwu ahụ na Sunday, April 30, 2006, n’Ụlọ Nzukọ Alaeze Ndịàmà Jehova. Ndịàmà nọ n’ógbè unu ga-enwe obi ụtọ ịgwa gị oge na ebe a ga-ekwu okwu ihu ọha a.

E ji obi ụtọ na-akpọ gị òkù ka ị bịa gere okwu a na-agba ume dabeere na Bible n’efu, bụ́ nke ga-enye azịza na-eju afọ maka ajụjụ bụ́: Ọ̀ Bụ Chineke Ka Na-achịkwa Ihe Ndị Na-eme n’Ụwa?