Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị Pụrụ Inwe Obi Ụtọ nke Ịghọta Bible Na-enye

Ị Pụrụ Inwe Obi Ụtọ nke Ịghọta Bible Na-enye

Ị Pụrụ Inwe Obi Ụtọ nke Ịghọta Bible Na-enye

IHE ndị dị na Bible bụ eziokwu ndị dị oké ọnụ ahịa sitere n’aka Chineke. Bible na-agwa anyị ihe bụ́ nzube nke ndụ, ihe mere ụmụ mmadụ ji na-ata ahụhụ, nakwa ihe ga-abụ ọdịnihu nke ihe a kpọrọ mmadụ. Ọ na-akụziri anyị ụzọ e si enweta obi ụtọ, ụzọ e si mete ndị enyi, nakwa ụzọ e si edozi nsogbu. Karịsịa, anyị na-amụta banyere Onye Okike anyị na Nna anyị nke eluigwe bụ́ Jehova. Ihe ọmụma ndị dị otú a na-atọ anyị ụtọ ma na-eme ka ndụ anyị nwee nzube.

Bible ji inweta ihe ọmụma banyere Chineke tụnyere iri nri. Jizọs kwuru, sị: “Ọ bụghị nanị n’achịcha ka mmadụ ga-esi dị ndụ, kama ọ bụ n’okwu ọ bụla nke na-esi n’ọnụ Jehova apụta.” (Matiu 4:4; Ndị Hibru 5:12-14) Dị nnọọ ka nri na-edozi ahụ́ dị anyị mkpa kwa ụbọchị iji nọgide na-adị ndụ, otú ahụkwa ka ọ dị mkpa ka anyị na-agụ Okwu Chineke mgbe nile iji nweta ndụ ebighị ebi Chineke kwere ná nkwa.

Iri nri na-atọ anyị ụtọ n’ihi na Jehova kere anyị ka anyị na-anụ ụtọ nri nakwa n’ihi na iri nri na-egbo otu n’ime mkpa anyị ndị bụ́ isi. Otú ọ dị, anyị nwere mkpa ọzọ bụ́ isi, bụ́ nke anyị na-aghaghị igbo ma ọ bụrụ na anyị chọrọ inwe obi ụtọ. Jizọs kwuru, sị: “Obi ụtọ na-adịrị ndị maara mkpa nke ime mmụọ ha.” (Matiu 5:3) Anyị pụrụ inwe obi ụtọ n’ihi na anyị pụrụ igbo mkpa a site n’ịghọta Okwu Chineke.

Ọ bụ eziokwu na ụfọdụ ndị chere na ọ na-esi ike ịghọta Bible. Dị ka ihe atụ, i nwere ike ịchọ ka e nyere gị aka ịghọta akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị na-ekwu banyere omenala ndị ị na-amaghị ma ọ bụ akụkụ Akwụkwọ Nsọ ebe ndị e ji okwu ihe atụ mee ihe na ha. E nwekwara amụma ndị e ji ihe ndị na-anọchi anya ihe ọzọ mee ihe na ha, bụ́ ndị a pụrụ ịghọta nanị site n’ịga n’akụkụ Bible ndị ọzọ ha na ya na-ekwu otu ihe. (Daniel 7:1-7; Mkpughe 13:1, 2) N’agbanyeghị ihe ndị a, ị pụrụ ịghọta Bible. Olee otú ị pụrụ isi jide n’aka na ọ pụrụ ikwe omume ịghọta Bible?

Onye Ọ Bụla Pụrụ Inweta Obi Ụtọ nke Ịghọta Bible Na-enye

Bible bụ Okwu Chineke. Chineke na-esi na ya agwa anyị ihe bụ́ uche ya. Chineke ọ̀ ga-enye anyị akwụkwọ nke anyị na-apụghị ịghọta ihe ọ na-ekwu ma ọ bụ nke nanị ndị gụrụ oké akwụkwọ ga-aghọta? Ee e, Jehova apụghị ime omume obi ọjọọ dị otú ahụ. Kraịst Jizọs kwuru, sị: “Olee nna ọ bụ n’etiti unu, onye, ọ bụrụ na nwa ya nwoke arịọ ya azụ, nke ga-enye ya agwọ n’ọnọdụ azụ, ma eleghị anya? Ma ọ bụ nke ga-enye ya akpị ma ọ bụrụ na ọ rịọ ya àkwá? Ya mere, ọ bụrụ na unu, ọ bụ ezie na unu bụ ndị ajọ omume, maara ụzọ isi nye ụmụ unu ezi onyinye, lee ka Nna unu nke nọ n’eluigwe ga-esi nye ndị na-arịọ ya mmụọ nsọ karị!” (Luk 11:11-13) N’ihi ya, ị pụrụ ijide n’aka na i nwere ike ịghọta Bible nakwa na ọ bụrụ na i ji ezi obi rịọ Chineke, Ọ ga-enyere gị aka ịghọta Okwu ya. N’ezie, ọbụna ụmụntakịrị pụrụ ịghọta ozizi ndị bụ́ isi nke Bible.—2 Timoti 3:15.

Ọ bụ ezie na ọ na-achọ mgbalị iji ghọta Bible, ịghọta ya pụrụ ịgba anyị ume. Mgbe Jizọs bilitesịrị n’ọnwụ, o mere ka mmadụ abụọ n’ime ndị na-eso ụzọ ya hụ ya anya, ọ gwakwara ha banyere amụma ndị dị na Bible. Luk dere, sị: “N’ibidokwa n’ihe Mozis dere na n’akwụkwọ ndị amụma nile, ọ kọwaara ha ihe ndị metụtara ya onwe ya n’ime Akwụkwọ Nsọ dum.” Gịnị siri na nke a pụta? N’abalị ụbọchị ahụ, ka ha na-eche banyere ihe ndị ahụ Jizọs gwara ha, ndị ahụ na-eso ụzọ gwarịtara ibe ha, sị: “Ọ̀ bụ na obi ekporoghị anyị ọkụ ka ọ nọ na-agwa anyị okwu n’okporo ụzọ, ka ọ nọ na-emepere anyị Akwụkwọ Nsọ nke ọma?” (Luk 24:13-32) Ịghọta Okwu Chineke mere ka ha nwee obi ụtọ n’ihi na o mere ka okwukwe ha nwere ná nkwa ndị Chineke kwere sikwuo ike ma mee ka ha nwee olileanya na ọdịnihu ga-aka mma.

Kama ịbụ ibu arụ, ịghọta Okwu Chineke na-atọ ụtọ ma na-aba uru, dị nnọọ ka nri na-edozi ahụ́ si atọ ụtọ. Gịnị ka ị na-aghaghị ime iji ghọta Bible otú a? Isiokwu na-esonụ na-egosi ụzọ ị pụrụ isi nwee obi ụtọ n’inweta “ihe ọmụma Chineke.”—Ilu 2:1-5.

[Foto dị na peeji nke 4]

Dị ka nna na-ahụ n’anya, Jehova na-enye anyị mmụọ nsọ iji nyere anyị aka ịghọta Bible