Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’iwu ahụ dị n’Ọpụpụ 23:19, nke bụ́: “Esila nwa ewu n’ime mmiri ara nke nne ya”?

Iwu a nke so n’Iwu Mozis, bụ́ nke pụtara ugboro atọ n’ime Bible, pụrụ inyere anyị aka ịghọta otú Jehova si ele ihe ziri ezi anya. Ọ pụkwara inyere anyị aka ịghọta na o nwere ọmịiko ma dị nro. O mekwara ka ọ pụta ìhè na Jehova kpọrọ ofufe ụgha asị.—Ọpụpụ 34:26; Deuterọnọmi 14:21.

Isi nwa ewu ma ọ bụ nwa anụmanụ ọzọ n’ime mmiri ara nne ya ga-abụ imegide ndokwa ndị Jehova mere site n’okike. Chineke nyere nne ewu mmiri ara iji zụọ nwa ọhụrụ ya na ime ka nwa ọhụrụ ahụ too. Dị ka otu ọkà mmụta si kwuo, isi nwa anụ a mụrụ ọhụrụ n’ime mmiri ara nne ya ga-abụ egosighị “nkwanye ùgwù maka mmekọrịta Chineke doro nsọ bụ́ nke o mere ka ọ dịrị n’etiti nne na nwa ya.”

Ọzọkwa, ụfọdụ na-ekwu na isi nwa anụ a mụrụ ọhụrụ ná mmiri ara nne ya nwere ike ịbụ ememe ndị ọgọ mmụọ na-eme iji mee ka mmiri zoo. Ya bụrụ otú ahụ, ọ pụrụ ịbụ na ihe mere e ji nye iwu ahụ bụ iji chebe ụmụ Izrel pụọ n’ememe okpukpe na-enweghị isi na nke na-egosipụta obi ịta mmiri, bụ́ nke mba ndị gbara ha gburugburu na-eme. Iwu Mozis machibidoro ụmụ Izrel ijegharị n’ụkpụrụ nile nke mba ndị gbara ha gburugburu.—Levitikọs 20:23.

N’ikpeazụ, iwu a e nyere ụmụ Izrel gosiri na Jehova nwere obi ọmịiko. N’eziokwu, Iwu ahụ nwekwara ọtụtụ iwu ndị ọzọ yiri ya, bụ́ ndị megidere ịrụsa ụmụ anụmanụ arụrụala na mmadụ ime ihe megidere iwu na-achịkwa okike. Dị ka ihe atụ, Iwu ahụ gụnyere iwu ndị megidere ịchụ anụmanụ a mụrụ ọhụrụ n’àjà ọ gwụkwala ma ya na nne ya anọruola abalị asaa ma ọ dịkarịa ala, igbu anụmanụ na nwa ya n’otu ụbọchị, nakwa ịga n’akwụ nnụnụ chịkọrọ ma nne nnụnụ ma àkwá ya ma ọ bụ ụmụ ya.—Levitikọs 22:27, 28; Deuterọnọmi 22:6, 7.

O doro anya na Iwu ahụ abụghị usoro iwu dị mgbagwoju anya. Otu n’ime uru Iwu ahụ bara bụ na ụkpụrụ ndị dị na ya na-enyere anyị aka ibi ndụ kwesịrị nnọọ ekwesị, bụ́ nke na-eme ka àgwà Jehova ndị magburu onwe ha pụta ìhè.—Abụ Ọma 19:7-11.

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 31]

© Timothy O’Keefe/Index Stock Imagery