Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Anyị Kpebisiri Ike Ijere Jehova Ozi

Anyị Kpebisiri Ike Ijere Jehova Ozi

Akụkọ Ndụ

Anyị Kpebisiri Ike Ijere Jehova Ozi

DỊ KA RAIMO KUOKKANEN SI KỌỌ

Na 1939, Agha Ụwa nke Abụọ tiwapụrụ na Europe, ndị Soviet Union wakwasịkwara ala nna m bụ́ Finland. Papa m sonyeere ndị agha Finland ịga lụọ agha. N’oge na-adịghị anya, ụgbọelu ndị Russia ji na-alụ agha malitere ịtụ bọmbụ n’obodo anyị, mama m kpọgakwaara m mama ya, bụ́ onye bi n’ebe agha ahụ na-erughị.

NA 1971, anọ m na-eje ozi dị ka onye ozi ala ọzọ na Uganda, bụ́ nke dị n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Africa. Otu ụbọchị ka m na-aga ozi ụlọ n’ụlọ, ọtụtụ ndị egwu ji gbafere m. Anụrụ m ụda égbè ma gbara ọsọ lawa. Mgbe m hụrụ na ụda égbè ahụ adarutewala nso n’ebe m nọ, awụbara m n’ọwa mmiri a wara n’akụkụ ụzọ. Egbeere m igbere lawa ka mgbọ si n’isi m na-efefe.

Ọ dịghị ihe m pụrụ ime iji gbanahụ ihe ndị Agha Ụwa nke Abụọ kpatara, ma gịnị mere mụ na nwunye m ji tinye ndụ anyị n’ihe ize ndụ ma nọrọ n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Africa nke nọ n’ọgba aghara? Ihe kpatara ya bụ na anyị kpebisiri ike ijere Jehova ozi.

Otú E Si Gbaa M Ume Ikpebisi Ike Ife Jehova

A mụrụ m na 1934 na Helsinki, nke dị na Finland. Ọrụ papa m bụ ite ụlọ ágbá, otu ụbọchị, o nwetara ọrụ ite alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Finland ágbá. Ndịàmà ahụ gwara ya banyere ọmụmụ ihe ndị ha na-enwe n’ọgbakọ ha. Mgbe ọ lọtara, ọ kọọrọ mama m banyere ọmụmụ ihe ndị a. Mama m amaliteghị n’oge ahụ gawa ọmụmụ ihe ndị ahụ, kama ka e mesịrị, o sooro Onyeàmà ya na ya na-arụkọ ọrụ kwurịtawa banyere ihe ndị dị na Bible. N’oge na-adịghị anya, mama m malitere itinye ihe ọ mụtara n’ọrụ, e mekwara ya baptizim dị ka otu n’ime Ndịàmà Jehova na 1940.

Tupu mgbe ahụ, nne nne m akpọrọwo m laa n’ụlọ ya, bụ́ nke dị n’ime ime obodo ahụ. Ebe ahụ ka m nọrọ n’oge nile a lụrụ Agha Ụwa nke Abụọ. Mama m malitere isi na Helsinki na-edetara nwanne ya nwanyị nke ọ tọrọ na mama ya akwụkwọ banyere ihe Ndịàmà Jehova kweere na ha. Ha abụọ nwere mmasị ma na-akụziri m ihe ndị ha na-amụta. Ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị nke Ndịàmà Jehova na-abịa n’ụlọ nne nne m ma na-agba anyị ume, ma ekpebibeghị m mgbe ahụ ife Chineke.

Ọzụzụ Nyeere M Aka Ife Chineke Amalite

Mgbe agha ahụ biri na 1945, alaghachiri m Helsinki, mama m malitekwara ịkpọ m aga ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova. Mgbe ụfọdụ, ana m aga ekiri fim kama iso ya gaa ọmụmụ ihe. Ma, mama m na-akọrọ m ihe ndị e kwuru n’ọmụmụ ihe, ọ dị otu ihe ọ na-agụrụ m ka egwú: Amagedọn dị nnọọ nso. Ọ bịara doo m anya na Amagedọn dị nso n’ezie, amalitekwara m ịga ọmụmụ ihe nile. Ka m na-aghọtakwu eziokwu Bible, otú ahụkwa ka m na-enwekwu ọchịchọ iso eme ihe nile a na-eme n’ọgbakọ.

Ana m enwekarị mmasị ịga mgbakọ dị iche iche. Na 1948, agara m mgbakọ distrikti e nwere n’ebe dị nnọọ nso n’ebe nne nne m bi, bụ́ ebe m gara ezumike n’oge okpomọkụ nke afọ ahụ. Otu enyi m na-aga ime baptizim ná mgbakọ ahụ, ọ gwakwara m ka m soro ya mee baptizim. Agwara m ya na ejighị m ákwà ịsa ahụ́, ọ gwara m na m nwere ike iji nke ya mee ma ya mechaa. Ekwetara m ime otú ahụ, e mekwara m baptizim na June 27, 1948, mgbe m dị afọ iri na atọ.

Mgbe e mechisịrị mgbakọ ahụ, ụfọdụ ndị enyi mama m gwara ya na mụ emeela baptizim. Mgbe mụ na mama m hụrụ, ọ chọrọ ịma ihe mere m ji were nzọụkwụ a dị mkpa n’ebughị ụzọ mee ka ya mara. Agwara m ya na mụ aghọtala ozizi ndị bụ́ isi dị na Bible nakwa na m maara na m ga-aza Jehova ajụjụ banyere otú m si bie ndụ.

Ekpebisikwuru M Ike Ijere Jehova Ozi

Ụmụnna nọ n’ọgbakọ anyị nyeere m aka ime ka m kpebisikwuo ike ijere Jehova ozi. Ha na-eso m eje ozi ụlọ n’ụlọ, na-ekenyekwa m ihe omume n’ọmụmụ ihe, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ n’izu nile. (Ọrụ 20:20) Ekwuru m okwu ihu ọha mbụ m mgbe m dị afọ iri na isii. N’oge na-adịghị anya ka nke ahụ gasịrị, a họpụtara m dị ka ohu ọmụmụ Bible n’ọgbakọ anyị. Ihe a nile m na-eme n’ozi Jehova nyeere m aka itozu okè. Ma, m ka kwesịrị ịkwụsị ịtụ ụjọ mmadụ.

N’oge a, anyị na-eji nnukwu kaadị e dere ihe akpọsa okwu ihu ọha a ga-ekwu ná mgbakọ distrikti. Nke ọ bụla nwere kaadị abụọ ndị e jiri eriri jikọta, a na-ekonye ya n’ubu, otu nọrọ n’ihu nke ọzọ anọrọ n’azụ. Nke a mere ụfọdụ ndị ji na-akpọ anyị ndị uwe kaadị.

N’otu oge, ka m nya kaadị m ji eme mkpọsa n’otu okporo ámá dị nnọọ jụụ, ahụrụ m ụmụ klas m ka ha na-abịa n’ihu m. Ụjọ jidere m mgbe m lere ha anya ná mkpụrụ anya, mgbe ha bịaruru nso. Ekpegaara m Jehova ekpere ka o mee ka m nwee obi ike, mgbe m kpesịrị, ebuuru m kaadị m ji eme mkpọsa kwụrụ otu ebe. Imeri ụjọ mmadụ n’oge ahụ kwadebere m maka ule ka ukwuu bụ́ nke metụtara ịnọpụ iche dị ka Onye Kraịst.

Mgbe e mesịrị, ndị ọchịchị nyere mụ na ndị na-eto eto ndị ọzọ bụ́ Ndịàmà iwu ka anyị bịa deba aha maka ịga agha. Anyị gara n’ogige ndị agha dị ka e nyere anyị iwu ime, ma anyị jiri nkwanye ùgwù jụ iyi uwe agha. Ndị na-arụ ọrụ n’ebe ahụ jichiri anyị n’ebe ahụ, mgbe nke ahụ gasịrị, otu ụlọikpe mara anyị ikpe ịga mkpọrọ ọnwa isii. Anyị nọkwara ọnwa asatọ n’ụlọ mkpọrọ, bụ́ oge anyị gaara eji gaa agha. Ya mere, ná ngụkọta, anyị nọrọ ọnwa iri na anọ n’ụlọ mkpọrọ n’ihi nnọpụiche anyị.

Anyị na-ezukọ ọnụ kwa ụbọchị n’ogige ndị dị n’ụlọ mkpọrọ ahụ iji tụlee Bible. N’ọnwa ndị ahụ anyị nọrọ n’ụlọ mkpọrọ, ọtụtụ n’ime anyị gụzuru Bible ugboro abụọ. Mgbe anyị nọzuru oge a sị na anyị ga-anọ, ihe ka ọtụtụ n’ime anyị kpebisikwuru ike ijere Jehova ozi. Ọtụtụ n’ime ìgwè Ndịàmà ahụ na-eto eto ka ji ikwesị ntụkwasị obi na-ejere Jehova ozi ruo taa.

Alaghachikwuuru m ndị mụrụ m mgbe a tọhapụrụ m. Obere oge ka nke ahụ gasịrị, amatara m Veera, bụ́ onye nkwusa na-anụ ọkụ nke e mere baptizim ọhụrụ. Anyị lụrụ na 1957.

Otu Uhuruchi nke Gbanwere Ndụ Anyị

N’otu uhuruchi ka anyị na ụfọdụ ụmụnna ndị si n’alaka ụlọ ọrụ na-akparịta ụka, otu n’ime ha jụrụ anyị ma ànyị ga-enwe mmasị ịrụ ọrụ ilekọta sekit. Ka anyị kpesịrị ekpere n’abalị ahụ nile, akpọrọ m alaka ụlọ ọrụ ma gwa ha na anyị nwere mmasị. Ịbanye n’ozi oge nile pụtara na m ga-ahapụ ọrụ m bụ́ nke a na-akwụ m ezigbo ụgwọ na ya, ma anyị kpebisiri ike ibute Alaeze ahụ ụzọ ná ndụ anyị. Mgbe anyị malitere ọrụ njegharị na December 1957, adị m afọ 23, Veera dịkwa afọ 19. Ruo afọ atọ, ọ tọrọ anyị ụtọ ileta na ịgba ọgbakọ ndị Jehova dị na Finland ume.

Ná ngwụsị nke afọ 1960, anatara m akwụkwọ ịga nara ọzụzụ na Watchtower Bible School of Gilead nke dị na Brooklyn, New York. Anyị mmadụ atọ si Finland gara nara ọzụzụ pụrụ iche banyere otú e si ahazi alaka ụlọ ọrụ, bụ́ nke were ọnwa iri, maka ụzọ isi na-elekọta alaka ụlọ ọrụ. Anyị hapụrụ ndị nwunye anyị n’alaka ụlọ ọrụ dị na Finland.

Tupu ọzụzụ ahụ agwụ, a gwara m ka m gaa hụ Nathan H. Knorr n’ọfịs ya. Ọ bụ ya na-elekọta ọrụ Ndịàmà Jehova n’ụwa nile n’oge ahụ. Nwanna Knorr kenyere mụ na nwunye m ịga ozi ala ọzọ na Malagasy Republic, bụ́ ebe a na-akpọzi Madagascar. Edegaara m Veera akwụkwọ ozi na-ajụ ya ihe o chere banyere ọrụ ahụ, ọ zaghachikwara ozugbo, sị, “Ọ dị mma.” Mgbe m lọghachiri Finland, anyị mere ngwa kwadebe ịga Madagascar.

Ọṅụ na Nkụda Mmụọ Ndị Anyị Nwere

Na January 1962, anyị ji ụgbọelu gaa Antananarivo, nke bụ́ isi obodo Madagascar. Anyị yi okpu e ji ajị anụ mee na kootu mgbe anyị hapụrụ Finland n’oge oyi. Na Madagascar nke na-ekpo ezigbo ọkụ, anyị kwụsịrị iyi ụdị uwe anyị na-eyi na Finland. Ụlọ mbụ anyị biri na ya bụ obere ụlọ nke nwere nanị otu ọnụ ụlọ a na-anọ ehi ụra. Di na nwunye ọzọ bụ́ ndị ozi ala ọzọ nọrịị anọ n’ebe ahụ, n’ihi ya mụ na Veera na-ehi ụra na veranda ụlọ ahụ.

Anyị malitere ịmụ French, nke bụ́ asụsụ e ji eme ihe na Madagascar. Nke a siiri anyị ike n’ihi na anyị na onye nkụzi anyị bụ́ Nwanna Nwanyị Carbonneau adịghị asụ otu asụsụ. Ọ na-eji Bekee akụziri anyị French, ma Veera adịghị asụ Bekee. N’ihi ya, ana m eji Finnish atụgharịrị Veera ihe ndị Nwanna Nwanyị Carbonneau kụziri. Anyị chọpụtaziri na Veera na-aghọta ihe ụfọdụ nke ọma n’asụsụ Swedish, n’ihi ya, ana m eji Swedish akọwara ya okwu ndị e ji eme ihe na French na otú e si eji ha eme ihe. N’oge na-adịghị anya, anyị bịara mụtawa French, anyị malitekwara ịmụ asụsụ Malagasy nke bụ́ asụsụ ndị ógbè ahụ na-asụ.

Onye mbụ m duziiri ọmụmụ Bible na Madagascar bụ otu nwoke na-asụ nanị Malagasy. Ana m asapeta amaokwu Bible na Bible m e dere n’asụsụ Finnish, mgbe ahụkwa anyị na-achọ amaokwu ndị ahụ na Bible nke ya bụ́ nke e dere n’asụsụ Malagasy. Ana m akọwatụrụ ya akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị ahụ obere, ma n’oge na-adịghị anya, eziokwu Bible ndị nwoke na-amụta bịara metụwa ya n’obi, o nwekwara ọganihu ruo n’ime baptizim.

Na 1963, Milton Henschel bụ́ onye si n’isi ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Brooklyn letara Madagascar. Obere oge ka ọ bịasịrị, e hiwere alaka ụlọ ọrụ ọhụrụ na Madagascar, a họpụtakwara m dị ka onye na-elekọta alaka ụlọ ọrụ ahụ, tinyere ọrụ m na-arụ dị ka onye nlekọta sekit na onye nlekọta distrikti. Jehova gọziri anyị n’ụba n’oge a nile. Site na 1962 ruo 1970, ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa Alaeze nọ na Madagascar sitere ná mmadụ iri asatọ na ise ruo narị mmadụ anọ na iri isii na itoolu.

Mgbe anyị lọtara ozi ọma n’otu ụbọchị n’afọ 1970, anyị hụrụ akwụkwọ e dotere n’ọnụ ụzọ ụlọ anyị bụ́ nke kwuru na a chọrọ ịhụ ndị ozi ala ọzọ nile nke Ndịàmà Jehova n’ọfịs onye ọchịchị ógbè ahụ. Mgbe anyị rutere ebe ahụ, otu nwoke na-arụ n’ebe ahụ gwara anyị na gọọmenti enyewo iwu ka anyị si n’obodo ahụ pụọ ozugbo. Mgbe m jụrụ ihe m mere e ji agbara m ụgbọ nwa mkpi, onye ahụ na-arụ n’ebe ahụ gwara m, sị: “Maazị Kuokkanen, ọ dịghị ihe ọjọọ i mere.”

Agwara m ya, sị: “Anyị anọwo afọ asatọ ebe a. Ebe a bụ ụlọ anyị. Anyị apụghị ịkwapụ otú ahụ n’enweghị ihe kpatara ya.” N’agbanyeghị mgbalị nile anyị mere, e nyere ndị ozi ala ọzọ nile bi n’obodo ahụ otu izu iji hapụ n’obodo ahụ. E mechiri alaka ụlọ ọrụ ahụ, otu nwanna nwoke bụ́ onye obodo ahụ malitekwara ilekọta ọrụ nkwusa ahụ. Tupu anyị ahapụ ezigbo ụmụnna anyị anyị hụrụ n’anya nọ na Madagascar, e kenyere anyị Uganda, bụ́ ebe ọhụrụ anyị ga-eje ozi.

Ịmaliteghachi n’Isi

Anyị rutere isi obodo Uganda bụ́ Kampala ụbọchị ole na ole ka anyị hapụsịrị Madagascar. Ozugbo anyị rutere, anyị malitere mụwa Luganda, nke bụ́ asụsụ na-ada ka uri na-atọ ụtọ ma sie ike mmụta. Ndị ozi ala ọzọ ndị ọzọ nyeere Veera aka ibu ụzọ mụta ka e si asụ Bekee, anyị jikwara asụsụ Bekee gbaa àmà n’ụzọ dị irè.

Okpomọkụ e nwere na Kampala kpataara Veera ọrịa. N’ihi ya, e kenyeziri anyị ọrụ na Mbarara, nke bụ́ obodo dị na Uganda nke nwere ihu igwe dị mma. Anyị bụ Ndịàmà mbụ e nwere n’ebe ahụ, anyị nwetakwara ahụmahụ na-agba ume n’ụbọchị mbụ anyị gara ozi ọma. Anọ m na-ezi otu nwoke ozi ọma mgbe nwunye ya siri na kichin pụta. Aha nwanyị ahụ bụ Margaret, ọ nọkwa na-ege ntị n’ihe m na-ekwu. Veera malitere mụwara Margaret Bible, o nwekwara ọganihu dị mma n’ịmụta banyere Chineke. E mere ya baptizim, ya aghọọkwa onye nkwusa Alaeze na-anụ ọkụ n’obi.

Ịlụ Ọgụ n’Okporo Ámá

Na 1971, agha obodo tisasịrị udo e nwere na Uganda. Otu ụbọchị, agha tiwapụrụ na gburugburu ebe obibi ndị ozi ala ọzọ dị na Mbarara. Ọ bụ n’oge ahụ ka m nwere ahụmahụ ahụ m kọrọ ná mmalite akụkọ a.

Veera alọrutelarị n’ebe anyị bi mgbe m lọtara ka m gberesịrị igbere mee ogologo njem n’ọwara mmiri, ka m na-ezo ka ndị agha ghara ịhụ m. Anyị jiri matarasị na oche rụọ “ebe nchebe” n’otu akụkụ nke ụlọ ahụ. Anyị apụtaghị èzí ruo otu izu, anyị nọ na-egere ihe na-akpọtụ n’obodo na redio. Mgbe ụfọdụ mgbọ na-ada n’ahụ́ ụlọ ka anyị makpu n’ebe nchebe anyị. Anyị adịghị amụnye ọkụ n’abalị, ka a ghara ịmata na anyị nọ n’ime ụlọ. N’otu oge, ndị agha bịara n’ọnụ ụzọ dị n’ihu ụlọ anyị ma tie mkpu. Anyị emegharịghị ahụ́ kama anyị nọ na-ekpeku Jehova ekpere n’ime obi anyị. Mgbe agha ahụ biri, ndị agbata obi anyị bịara kelee anyị maka otú e si chebe ha. Ha kweere na ọ bụ Jehova chebere anyị nile, anyị sokwara ha kweta na ọ bụ eziokwu.

Obodo ahụ dịgidere jụụ ruo otu ụtụtụ mgbe anyị nụrụ na redio na ọchịchị Uganda amachibidowo Ndịàmà Jehova iwu. Onye mara ọkwa ahụ kwuru na Ndịàmà Jehova nile kwesịrị ịlaghachi n’okpukpe ha nọbu na ya. Agbalịrị m iso ndị na-arụrụ gọọmenti ọrụ kwurịta banyere nke a, ma o nweghị isi. Agawaziri m n’ọfịs President Idi Amin ma rịọ ka m hụ ya. Onye na-anabata ndị ọbịa n’ebe ahụ gwara m na president enweghị ohere. Agaghachiri m ebe ahụ ọtụtụ ugboro, ma ọ dịtụghị mgbe mụ na President kwuru okwu. N’ikpeazụ, na July 1973, anyị hapụrụ Uganda.

Otu Afọ Aghọọ Afọ Iri

Ugbu a anyị na-ahapụ ụmụnna anyị ndị Uganda anyị hụrụ n’anya, anyị nweghachiri ụdị mwute ahụ anyị nwere mgbe a chụpụrụ anyị na Madagascar. Anyị buru ụzọ gaa Finland tupu anyị agawa Senegal bụ́ ebe ọhụrụ e kenyere anyị ọrụ. Mgbe anyị ruru Finland, a kagburu ozi e kenyere anyị na Senegal ma gwazie anyị ka anyị nọrọ na Finland. O yiri ka ọrụ anyị dị ka ndị ozi ala ọzọ agwụla. Na Finland, anyị jere ozi dị ka ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche ma mesịa laghachi n’ọrụ ilekọta sekit.

Na 1990, mmegide a na-emegide ọrụ ahụ na Madagascar belatara, isi ụlọ ọrụ dị na Brooklyn mekwara ihe tụrụ anyị n’anya site n’ịjụ anyị ma ànyị ga-enwe mmasị ịga Madagascar ma rụọ ọrụ otu afọ. Anyị chọrọ ịga ma anyị nwetara ihe ịma aka abụọ siri ike. Papa m merela agadi chọrọ nlekọta, Veera nọgidekwara na-arịa ọrịa. O wutere m nke ukwuu mgbe papa m nwụrụ na November 1990, ma anyị nwere olileanya ịgaghachi n’ọrụ ozi ala ọzọ anyị ebe ọ bụ na Veera agbakewala. Anyị laghachiri Madagascar na September 1991.

E zigara anyị ka anyị jee ozi ga-ewe otu afọ na Madagascar, ma o were afọ iri. N’oge ahụ anyị nọ na Madagascar, ọnụ ọgụgụ nke ndị nkwusa nọ n’obodo ahụ siri na puku mmadụ anọ gbagoruo puku mmadụ iri na otu na narị isii. Enwere m obi ụtọ dị ukwuu ije ozi dị ka onye ozi ala ọzọ. N’agbanyeghị nke ahụ, enwere m nkụda mmụọ mgbe ụfọdụ, na-eche na ma eleghị anya, m na-eleghara mkpa anụ ahụ́ na nke mmetụta uche nwunye m anya, bụ́ onye m hụrụ n’anya. Jehova nyere ma mụ ma nwunye m ike iji nọgide na-ejere ya ozi. N’ikpeazụ, na 2001, anyị lọghachiri Finland, bụ́ ebe anyị nọworo na-arụ ọrụ n’alaka ụlọ ọrụ dị na Finland. Anyị ka na-arụsị ọrụ ike iji na-akwado Alaeze ahụ, anyị jikwa obi ụtọ ka na-echeta ozi anyị jere n’Africa. Anyị kpebisiri ike ime ihe ọ bụla Jehova sịrị ka anyị mee n’agbanyeghị ebe ọ bụla o kenyere anyị ọrụ.—Aịsaịa 6:8.

[Map dị na peeji 12]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

FINLAND

EUROPE

[Map dị na peeji 14]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

AFRICA

MADAGASCAR

[Map dị na peeji 15]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

AFRICA

UGANDA

[Foto dị na peeji nke 14]

Ụbọchị anyị gbara akwụkwọ

[Foto ndị dị na peeji nke 14, 15]

Site n’ọrụ sekit na Finland, 1960 . . .

. . . ruo n’ọrụ ozi ala ọzọ na Madagascar, 1962

[Foto dị na peeji nke 16]

Mụ na Veera taa