Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Ga-enyere Gị Aka Ịghọta Bible?

Gịnị Ga-enyere Gị Aka Ịghọta Bible?

Gịnị Ga-enyere Gị Aka Ịghọta Bible?

“I ZONAHỤWO ndị maara ihe na ndị nwere ọgụgụ isi ihe ndị a nke ọma, i kpughewokwa ha nye ụmụ ọhụrụ.” (Luk 10:21) Okwu ndị a Jizọs gwara Nna ya nke eluigwe gosiri na ka anyị wee ghọta Bible, anyị aghaghị inwe ezi àgwà. Jehova ekpughewo amamihe ya n’echiche bụ́ na o nyewo ụmụ mmadụ akwụkwọ nke ọ bụ nanị ndị dị umeala n’obi ma dị njikere ịmụta ihe ga-aghọtali.

Ọ na-esiri ihe ka ọtụtụ n’ime anyị ike ịdị umeala n’obi. Nganga bụ àgwà anyị nile bu pụta ụwa. Tinyekwara nke ahụ, anyị bi “n’ụbọchị ikpeazụ,” n’etiti “ndị hụrụ onwe ha n’anya, . . . ndị isi ike, ndị nganga fụliri elu.” (2 Timoti 3:1-4) Àgwà ndị a na-egbochi anyị ịghọta Okwu Chineke. Ọ dị mwute ikwu na ndị na-akpa àgwà ndị a, bụ́ ndị gbara anyị gburugburu, na-eme ka anyị na-akpatụ àgwà ndị a. Oleezi otú ị pụrụ isi zụlite àgwà a chọrọ iji ghọta Bible?

Idozi Obi na Uche

Onye ndú nke ndị Chineke n’oge ochie, bụ́ Ezra, “doziri obi ya ịchọ iwu Jehova.” (Ezra 7:10) È nwere ụzọ ụfọdụ anyị pụrụ isi dozie obi anyị? Eenụ. Anyị pụrụ ịmalite site n’ile Akwụkwọ Nsọ anya n’ụzọ kwesịrị ekwesị. Pọl onyeozi degaara Ndị Kraịst ibe ya akwụkwọ, sị: “Mgbe unu natara okwu Chineke, bụ́ nke unu nụrụ n’ọnụ anyị, unu nakweere ya, ọ bụghị dị ka okwu ụmụ mmadụ, kama, dị nnọọ ka ọ bụ n’eziokwu, dị ka okwu Chineke.” (1 Ndị Tesalonaịka 2:13) Ọ bụ ezie na e ji ndị mmadụ dee Akwụkwọ Nsọ, ọ bụ Jehova gwara ha ihe ha dere. Ịghọta eziokwu a dị oké mkpa ga-eme ka ọ dịrị anyị mfe ịnakwere ihe anyị na-agụ.—2 Timoti 3:16.

Ekpere bụ ụzọ ọzọ anyị si edozi obi anyị. Ebe ọ bụ na e ji ike mmụọ nsọ dee Bible, ọ bụkwa site n’ike mmụọ nsọ ka anyị pụrụ ịghọta ihe ndị dị n’ime ya. Anyị aghaghị ikpe ekpere ka Chineke nye anyị mmụọ nsọ ya. Nke a bụ ihe dị ọbụ abụ ahụ oké mkpa, bụ́ onye dere, sị: “Mee ka m ghọta ihe, m ga-echebekwa iwu Gị; m ga-ewerekwa obi m nile debe ya.” (Abụ Ọma 119:34) Anyị ekwesịghị ikpe ekpere nanị ka e nye anyị ọgụgụ isi iji ghọta ihe e dere na Bible kama anyị kwesịkwara ikpe ekpere ka anyị nwee ezi obi iji kwere na ya. Iji ghọta ihe Bible na-ekwu, anyị kwesịrị ịdị njikere ikwere n’ihe bụ́ eziokwu.

Ka ị na-atụgharị uche otú ị ga-esi nwee àgwà ziri ezi, tụlee uru ịmụ Bible ga-abara gị. Anyị nwere nnọọ ọtụtụ ihe ndị magburu onwe ha mere anyị kwesịrị iji na-agụ Okwu Chineke, ma ihe kasị mkpa mere anyị ji kwesị ịdị na-agụ ya bụ na ọ na-eme ka anyị bịaruo Chineke nso. (Jems 4:8) Anyị na-aghọta ụdị onye Jehova bụ ka anyị na-agụ banyere otú o si mee ihe n’ọnọdụ ndị dị iche iche, otú o si ewere ndị hụrụ ya n’anya dị ka ndị dị oké ọnụ ahịa, nakwa otú o si emeso ndị jụrụ ijere ya ozi ihe. Isi ihe mere anyị ji kwesị ịdị na-agụ Bible kwesịrị nnọọ ịbụ iji mara Chineke nke ọma karị, si otú a mekwuo ka mmekọrịta anyị na ya na-esiwanye ike.

Ihe Ndị Na-egbochi Mmadụ Inwe Echiche Ziri Ezi Banyere Bible

Olee ihe ndị nwere ike igbochi anyị ịghọta Okwu Chineke? Otu n’ime ha bụ ịnakwere echiche nke ụmụ mmadụ ndị anyị chere na anyị kwesịrị irubere isi. Dị ka ihe atụ, i nwere ike iji nkwenkwe na echiche ụfọdụ ndị kpọrọ oké ihe. Ya mere, gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na ndị dị otú a adịghị akwado eziokwu nke Okwu Chineke ma ọ bụkwanụ ha adịghị ewere ya dị ka ihe dị mkpa? N’ọnọdụ ndị dị otú a, ọ pụrụ ịbụrụ anyị ihe ịma aka ịghọta ihe Bible na-akụzi n’ezie. N’ihi ya, Bible na-agba anyị ume ka anyị jiri nlezianya na-enyocha ihe a kụziiri anyị.—1 Ndị Tesalonaịka 5:21.

Nne Jizọs, bụ́ Meri, chere ụdị ihe ịma aka yiri nke a ihu. A zụlitere ya n’ọdịnala ndị Juu. Ọ na-eji nlezianya eme ihe ndị Iwu Mozis sịrị ka e mee, ihe ịrụ ụka adịghịkwa ya na ọ na-aga n’ụlọ nzukọ. Ka e mesịrị, ọ chọpụtara na Chineke enweghịzikwa mmasị n’ụdị ofufe ndị mụrụ ya kụziiri ya. N’ihi ya, Meri nabatara ihe Jizọs kụziri ma soro ná ndị mbụ mejupụtara ọgbakọ Ndị Kraịst. (Ọrụ 1:13, 14) Nke a adịghị egosi na ọ na-enupụrụ ndị mụrụ ya ma ọ bụ ọdịnala ha isi; kama nke a na-egosi na ọ hụrụ Chineke n’anya. Iji rite uru site na Bible, anyị aghaghị ibu ụzọ rubere Chineke isi tupu onye ọ bụla ọzọ, dị ka Meri mere.

Ọ dị mwute na ọtụtụ ndị ejighị eziokwu Bible kpọrọ ihe. Ụfọdụ kpebisiri ike ijigide nkwenkwe okpukpe bụ́ ndị dabeere n’ozizi ụgha. Ndị ọzọ na-egosi site n’okwu na n’ụzọ ndụ ha na ha ejighị eziokwu ahụ kpọrọ ihe. N’ihi ya, ịnakwere eziokwu Bible chọrọ ịchụ ihe ụfọdụ n’àjà: Ọ pụrụ ime ka gị na ndị enyi gị, ndị agbata obi gị, ndị ọrụ ibe gị, ọbụna ndị ezinụlọ gị, ghara ịdị ná mma. (Jọn 17:14) Ka o sina dị, nwoke ahụ maara ihe bụ́ Solomọn dere, sị: “Zụta eziokwu, erekwala ya.” (Ilu 23:23) Ọ bụrụ na iwere eziokwu dị ka ihe dị oké ọnụ ahịa, Jehova ga-enyere gị aka ịghọta Bible.

Ihe ọzọ na-egbochi mmadụ ịghọta ihe Bible na-ekwu bụ adịghị njikere itinye ihe ndị Bible kwuru n’ọrụ. Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ọ bụ unu ka e nyere ikike ịghọta ihe nzuzo ndị dị nsọ nke alaeze eluigwe, ma e nyeghị ndị ahụ ikike ya. N’ihi na obi ndị a adịkwaghị anabata ihe, ha ejiriwokwa ntị ha nụ ihe ma ha azaghachighị ihe ọ bụla.” (Matiu 13:11, 15) Ihe ka ọtụtụ ná ndị Jizọs ziri ozi ọma anabataghị ya, ha adịghịkwa njikere ịgbanwe. Nke a dị nnọọ iche n’onye ahịa ahụ Jizọs ji mee ihe atụ! Mgbe ọ hụrụ nkume pel dị nnọọ oké ọnụ ahịa, onye ahịa ahụ lara ma jiri ọsọ ọsọ ree ihe nile o nwere iji zụta ya. Ịghọta eziokwu Bible kwesịkwara ịdị oké ọnụ ahịa otú ahụ nye anyị.—Matiu 13:45, 46.

Ihe Ndị Na-eme Ka O Siere Ụfọdụ Ndị Ike Ikwe Ka A Kụziere Ha Ihe

Otu nnukwute ihe na-eme ka o siiri ụfọdụ ike ịghọta Bible bụ n’ihi na ha adịghị njikere ikwe ka ndị ọzọ kụziere ha ihe. O nwere ike isiri mmadụ ike ịnakwere echiche nke onye o chere na ya karịrị. Ma ndịozi Jizọs Kraịst bụ ndị “na-agụghị oké akwụkwọ na ndị nkịtị.” (Ọrụ 4:13) Pọl kọwara ihe kpatara nke a mgbe o dere, sị: “Unu na-ahụ ọkpụkpọ ọ kpọrọ unu, ụmụnna m, na ọ bụghị ọtụtụ ndị maara ihe n’ụzọ anụ ahụ́ ka a kpọrọ, ọ bụghị ọtụtụ ndị dị ike, ọ bụghị ọtụtụ ndị si n’usoro ọmụmụ ndị eze; kama Chineke họọrọ ihe nzuzu nke ụwa, ka o wee menye ndị amamihe ihere.” (1 Ndị Kọrint 1:26, 27) Ọ bụrụ na ọ na-esiri gị ike ịdị umeala n’obi mgbe onye ị ka na-akụziri gị ihe, cheta na ọ bụ Chineke ji onye ahụ na-akụziri gị ihe. Olee ihe ùgwù karịrị ịbụ onye ‘Onye Nkụzi Ukwu’ anyị, bụ́ Jehova ziri ihe?—Aịsaịa 30:20; 54:13.

Otu n’ime ndị o siiri ike ịnakwere ntụziaka ndị ha ka n’ọkwá nyere ha bụ ọchịagha Siria bụ́ Neeman. Ọ gara ịhụ onye amụma Jehova bụ́ Ịlaịsha mgbe ọ chọrọ ka a gwọọ ya ekpenta ya. Ma ọ bụ otu odibo ka e dunyere ka ọ gaa gwa Neeman ihe Chineke chọrọ ka o mee ka ahụ́ dị ya mma. Ozi ahụ na otú e si zie ya Neeman mere ka o siere ya ike iji obi umeala nakwere ntụziaka ahụ, bụ́ nke mere o ji jụ na mbụ ime ihe onye amụma Chineke gwara ya mee. Ka e mesịrị, Neeman gbanwere àgwà ya, a gwọkwara ya. (2 Ndị Eze 5:9-14) Anyị na-eche ihe ịma aka yiri nke ahụ ihu mgbe anyị na-agụ Bible. Anyị pụrụ ịmụta na ọ bụrụ na anyị chọrọ ka a gwọọ anyị n’ụzọ ime mmụọ nakwa n’ụzọ anyị si eme omume, anyị kwesịrị ịgbaso ụzọ ndụ ọhụrụ. Ànyị ga-egosipụta umeala n’obi site n’ikwe ka mmadụ kụziere anyị ihe anyị kwesịrị ime? Ọ bụ nanị ndị dị njikere ka a kụziere ha ihe pụrụ ịghọta Bible.

E nwere otu àgwà ọma nke otu nwoke nọ n’ọkwá ọchịchị, bụ́ onye nọ n’okpuru Kandes bụ́ eze nwanyị ndị Etiopia, gosipụtara. Ọ nọ n’ụgbọ ịnyịnya ya na-alaghachi Africa mgbe onye na-eso ụzọ bụ́ Filip gakwuuru ya. Filip jụrụ nwoke ahụ ma ọ̀ na-aghọta ihe ọ na-agụ. Onye ọchịchị ahụ ji obi umeala zaghachi, sị: “Olee nnọọ otú m ga-esi mara, ma ọ́ bụghị ma mmadụ ò duziri m?” E mere nwoke ahụ baptizim ka ọ ghọtasịrị Okwu Chineke. Mgbe e mesịrị ya baptizim, ọ “nọgidere na-agara onwe ya na-aṅụrị ọṅụ.”—Ọrụ 8:27-39.

Ndịàmà Jehova n’ozuzu bụ ụmụ mmadụ nkịtị. Kwa izu, ha na-eduzi ọmụmụ Bible n’ebe obibi nke ihe karịrị nde mmadụ isii. Ebe ọ bụ na Bible na-akụzi ụzọ kasị mma isi bie ndụ, na-akọwakwa ihe bụ́ nanị olileanya dịịrị ihe a kpọrọ mmadụ, ma na-egosi anyị otú anyị pụrụ isi mara onye Chineke bụ, ọtụtụ nde ndị mmadụ achọpụtawo na ịmụ Bible na ịghọta ihe ọ na-ekwu na-eweta obi ụtọ dị ukwuu. Ọ bụ ihe pụrụ inye gị obi ụtọ.

[Foto dị na peeji nke 7]

O siiri Neeman ike ịnakwere ntụziaka odibo Ịlaịsha

[Foto dị na peeji nke 7]

Ịghọta Bible na-eme ka anyị nwee obi ụtọ