Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

‘Gaanụ Mee Ndị Na-eso Ụzọ, Na-eme Ha Baptizim’

‘Gaanụ Mee Ndị Na-eso Ụzọ, Na-eme Ha Baptizim’

‘Gaanụ Mee Ndị Na-eso Ụzọ, Na-eme Ha Baptizim’

“Ya mere gaanụ mee ndị nke mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m, na-eme ha baptizim . . . , na-ezi ha ka ha debe ihe nile m nyeworo unu n’iwu.”—Matiu 28:19, 20.

1. Olee mkpebi mba Izrel mere mgbe ha gbakọtara n’ala ala Ugwu Saịnaị?

OTU mba kwere Chineke nkwa ihe dị ka puku afọ atọ na narị ise gara aga. Mgbe ndị Izrel gbakọtara n’ala ala Ugwu Saịnaị, ha kwupụtara n’ihu ọha, sị: “Ihe nile Jehova kwuru, anyị ga-eme ya.” Site mgbe ahụ gaa n’ihu, Izrel ghọrọ ndị a raara nye Chineke, ‘ihe nke aka ya.’ (Ọpụpụ 19:5, 8; 24:3) Ha tụrụ anya na ọ ga-echebe ha nakwa na ọgbọ ha nile ga-ebi n’ala nke “mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya.”—Levitikọs 20:24.

2. Mmekọrịta dị aṅaa ka ndị mmadụ na Chineke pụrụ inwe taa?

2 Otú ọ dị, dị ka ọbụ abụ bụ́ Esaf si kwuo, ndị Izrel “edebeghị ọgbụgba ndụ Chineke, ma ha jụrụ ijegharị n’iwu Ya.” (Abụ Ọma 78:10) Ha emezughị nkwa ndị nna ha ochie kwere Jehova. Chineke mesịrị kwụsị iso mba ahụ na-emekọ ihe, ihe ùgwù ahụ pụrụ nnọọ iche funahụrụ ha. (Eklisiastis 5:4; Matiu 23:37, 38) Ya mere, Chineke ‘chere ihu ya n’ebe ndị mba ọzọ nọ isite n’etiti ha wepụta otu ndị maka aha ya.’ (Ọrụ 15:14) N’ụbọchị ikpeazụ ndị a kwa, ọ na-achịkọta “oké ìgwè mmadụ, nke onye ọ bụla na-enweghị ike ịgụta ọnụ, ndị si ná mba na ebo na ndị na asụsụ nile pụta,” bụ́ ndị ji obi ụtọ na-ekwupụta, sị: “Nzọpụta anyị sitere n’aka Chineke anyị, bụ́ onye na-anọkwasị n’ocheeze ahụ, sitekwa n’aka Nwa Atụrụ ahụ.”—Mkpughe 7:9, 10.

3. Olee ihe mmadụ na-aghaghị ime ka ya na Chineke wee nwee ike ịdị na-emekọrịta ihe?

3 Ka mmadụ wee soro ná ndị ha na Chineke ga-enwe mmekọrịta dị otú ahụ dị oké ọnụ ahịa, onye ahụ aghaghị ịrara onwe ya nye Jehova ma gosipụta ya n’ihu ọha site n’ime baptizim n’ime mmiri. Nke a na-egosi na onye ahụ na-erube isi n’iwu doro anya Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya: “Ya mere gaanụ mee ndị nke mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m, na-eme ha baptizim n’aha nke Nna na nke Ọkpara na nke mmụọ nsọ, na-ezi ha ka ha debe ihe nile m nyeworo unu n’iwu.” (Matiu 28:19, 20) Ụmụ Izrel gere ntị ka a na-agụpụtara ha “akwụkwọ ọgbụgba ndụ ahụ.” (Ọpụpụ 24:3, 7, 8) Nke ahụ mere ka ha mata ihe Jehova chọrọ n’aka ha. N’otu aka ahụ taa, ọ dị oké mkpa ka mmadụ nweta ezi ihe ọmụma banyere uche Chineke dị ka ọ dị n’Okwu ya, bụ́ Bible, tupu e mee ya baptizim.

4. Gịnị ka mmadụ ga-emerịrị tupu ya eruo eruo ime baptizim? (Gụnye igbe dị n’elu.)

4 O doro anya na Jizọs chọrọ ka ndị na-eso ụzọ ya nwee ihe gbara ọkpụrụkpụ mere ha ga-eji nwee okwukwe tupu a na-eme ha baptizim. Ntụziaka o nyere ụmụazụ ya abụghị nanị ka ha gaa mee ndị na-eso ụzọ kamakwa ka ha zie ndị ha zutere ‘ka ha debe ihe nile o nyeworo ha n’iwu.’ (Matiu 7:24, 25; Ndị Efesọs 3:17-19) Ya mere, ndị ruru eru ka e mee ha baptizim na-abụkarị ndị mụworo Bible ruo ọnwa ụfọdụ ma ọ bụ ọbụna ruo otu afọ ma ọ bụ abụọ, n’ihi ya, mkpebi ha mere ka e mee ha baptizim abụghị mkpebi e mere ọkụ ọkụ ma ọ bụkwanụ nke onye na-amaghị nke a na-akọ. Mgbe a na-akwadebe ime ha baptizim, ndị ahụ a na-aga ime baptizim na-aza ee n’ajụjụ abụọ dị oké mkpa a na-ajụ ha. Ebe ọ bụ na Jizọs mesiri ya ike na ‘Ee anyị kwesịrị ịbụ Ee, Ee e anyị abụrụkwa Ee e,’ ọ ga-abụ ihe ga-enyere anyị nile aka ma ọ bụrụ na anyị ejiri nlezianya tụlee ihe ajụjụ abụọ a a na-ajụ ndị a na-aga ime baptizim pụtara.—Matiu 5:37.

Nchegharị na Nraranye

5. Olee ihe abụọ gbara ọkpụrụkpụ ajụjụ mbụ a na-ajụ ndị a na-aga ime baptizim na-eme ka ha pụta ìhè?

5 Ajụjụ mbụ a na-ajụ onye a na-aga ime baptizim na-ajụ ma ò chegharịwo n’otú o sibu ebi ndụ ma rara onwe ya nye Jehova ime uche ya. Ajụjụ a na-eme ka ihe abụọ mmadụ na-aghaghị ime tupu e mee ya baptizim pụta ìhè, ha bụ nchegharị na nraranye.

6, 7. (a) Olee ihe mere nchegharị ji dị ndị nile a na-aga ime baptizim mkpa? (b) Mgbanwe ndị dị aṅaa ka mmadụ na-aghaghị ime mgbe o chegharịrị?

6 N’ihi gịnị ka mmadụ ga-eji chegharịa tupu ya ekwuo ka e mee ya baptizim? Pọl onyeozi kọwara, sị: “Anyị nile n’otu mgbe mere omume n’ikwekọ n’ọchịchọ anụ ahụ́ anyị.” (Ndị Efesọs 2:3) Anyị nọbu na-akpa àgwà dị ka ndị ụwa, na-ebi ndụ dị ka ụkpụrụ ha si dị tupu anyị abịa nwee ezi ihe ọmụma banyere ihe bụ́ uche Chineke. Ọ bụ Setan, bụ́ chi nke usoro ihe a, nọbu na-atụrụ anyị ihe anyị na-eme. (2 Ndị Kọrint 4:4) Ebe ọ bụ na anyị amatala uche Chineke, anyị kpebisiri ike ịdị na-ebi ndụ “ọ bụkwaghị maka ọchịchọ mmadụ, kama maka uche Chineke.”—1 Pita 4:2.

7 Ụzọ ndụ ọhụrụ a na-eweta ọtụtụ ngọzi. Ngọzi kasịnụ ọ na-eweta bụ na ọ na-eme ka mmadụ nwee ike iso Jehova na-enwe mmekọrịta dị oké ọnụ ahịa, bụ́ nke Devid ji tụnyere mmadụ ịbụ onye a kpọrọ òkù ka ọ bata “n’ụlọikwuu” na “n’ugwu nsọ” Chineke—ọ bụ nnọọ ihe ùgwù na-enweghị atụ. (Abụ Ọma 15:1) Ọ bụ ihe ezi uche dị na ya na Jehova agaghị akpọbata onye ọ bụla ọ hụrụ kama ọ bụ nanị ndị “na-eje ije n’izu okè, [ndị] na-arụkwa ọrụ ezi omume, [ndị] na-ekwukwa eziokwu n’obi [ha].” (Abụ Ọma 15:2) N’ihi ụdị ndụ anyị biri tupu anyị anata eziokwu ahụ, ọ pụrụ ịchọ ka anyị mee mgbanwe ụfọdụ—ma n’àgwà anyị ma n’ọdịdị anyị—iji nwee ike ime ihe ndị a a chọrọ anyị n’aka. (1 Ndị Kọrint 6:9-11; Ndị Kọlọsi 3:5-10) Ihe ga-akwali anyị ime mgbanwe ndị dị otú ahụ bụ nchegharị—igosipụta na otú anyị sibu na-ebi ndụ wutere anyị ma kpebisie ike ime ihe ga-atọ Jehova ụtọ. Nke a na-eduga n’ịgbanwe otú anyị sibu ebi ndụ kpamkpam—ịhapụ ụzọ ndụ ụwa nke mmadụ ịchọ ọdịmma onwe ya nanị ma gbasoo ụzọ ndụ nke ime ihe na-atọ Chineke ụtọ.—Ọrụ 3:19.

8. Olee otú anyị si arara onwe anyị nye Jehova, gịnịkwa jikọrọ nraranye na baptizim?

8 Akụkụ nke abụọ nke ajụjụ mbụ a na-ajụ ndị a na-aga ime baptizim na-ajụ ma hà ararawo onwe ha nye Jehova ime uche ya. Nraranye bụ ihe dị oké mkpa nke mmadụ na-aghaghị ime tupu e mee ya baptizim. A na-eme nke a site n’ekpere, bụ́ nke anyị ji ekwupụta ọchịchọ anyị inyefe Jehova ndụ anyị site n’aka Kraịst. (Ndị Rom 14:7, 8; 2 Ndị Kọrint 5:15) Sitezie mgbe ahụ gaa n’ihu, Jehova na-aghọ Nna anyị Ukwu na Onye Nwe anyị, dịkwa ka Jizọs, ọ ga na-atọzi anyị ụtọ ime uche Chineke. (Abụ Ọma 40:8; Ndị Efesọs 6:6) Ọ bụ nanị otu ugboro ka anyị na-ekwe Jehova nkwa a sitere n’obi. Otú ọ dị, ebe ọ bụ na ọ bụ nanị anyị na Jehova na-ama mgbe anyị raara onwe anyị nye ya, ikwupụta nke a n’ihu ọha n’ụbọchị a na-aga ime anyị baptizim na-eme ka ndị ọzọ mata na anyị ejiriwo obi anyị rara onwe anyị nye Nna anyị nke eluigwe.—Ndị Rom 10:10.

9, 10. (a) Olee ihe ime uche Chineke gụnyere? (b) Olee otú ọbụna ndị na-arụrụ ndị Nazi ọrụ si ghọta nrara anyị rara onwe anyị nye Chineke?

9 Gịnị ka ịgbaso ihe nlereanya Jizọs nke ime uche Chineke gụnyere? Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla chọrọ iso m n’azụ, ya jụ onwe ya ma bulie osisi ịta ahụhụ ya, nọgidekwa na-eso m.” (Matiu 16:24) N’ebe a, o kwuru ihe atọ anyị na-aghaghị ime. Nke mbụ, anyị ‘ga-ajụ’ onwe anyị. Ọ pụtara na anyị ga-ajụ ọchịchọ ọdịmma onwe onye nanị bụ́ nke e ji mara ụmụ mmadụ na-ezughị okè ma na-agbaso ndụmọdụ na nduzi Chineke. Nke abụọ, anyị ‘ga-ebuli osisi ịta ahụhụ anyị.’ N’oge Jizọs, osisi ịta ahụhụ nọchiri anya ihere na nhụjuanya. Dị ka Ndị Kraịst, anyị maara na anyị pụrụ ịta ahụhụ n’ihi ozi ọma ahụ mgbe ụfọdụ. (2 Timoti 1:8) N’agbanyeghị na ụwa pụrụ ịkwa anyị emo ma ọ bụ kwutọọ anyị, dị ka Kraịst, anyị “na-eleda ihere anya,” na-enwe obi ụtọ n’ihi na anyị maara na anyị na-eme ihe na-atọ Chineke ụtọ. (Ndị Hibru 12:2) Nke ikpeazụ bụ na anyị ‘ga-anọgide na-eso’ Jizọs.—Abụ Ọma 73:26; 119:44; 145:2.

10 Ọ bụ ihe na-enye obi ụtọ na ụfọdụ ndị, bụ́ ndị na-emegide Ndịàmà Jehova, maara na Ndịàmà Jehova na-eji obi ha dum arara onwe ha nye Chineke ijere ya ozi. Dị ka ihe atụ, n’ogige ịta ahụhụ dị na Buchenwald nke Nazi Germany, a na-agwa Ndịàmà na-ajụghị okwukwe ha ka ha bịanye aka n’akwụkwọ na-ekwu, sị: “M ka bụ Onye Mmụta Bible kwụsịrị ike. Ọ dịghị ihe ga-eme ka m mebie iyi m ṅụụrụ Jehova.” N’ezie, nke a bụ nnọọ otú ndị ohu Chineke nile raara onwe nye ya ma na-ekwesị ntụkwasị obi si ele nrara ha raara onwe ha nye Jehova anya!—Ọrụ 5:32.

Ịbụ Onye A Maara Dị Ka Otu n’Ime Ndịàmà Jehova

11. Olee ihe ùgwù onye e mere baptizim na-enwe?

11 Ajụjụ nke abụọ a na-ajụ onye a na-aga ime baptizim na-ajụ ya ma ọ̀ ghọtara na baptizim ọ na-aga ime ga-eme ka a mata ya dị ka otu n’ime Ndịàmà Jehova. Mgbe e mesịrị ya baptizim, ọ na-aghọ onye ozi a họpụtara ahọpụta nke a kpọkwasịrị aha Jehova. Nke a bụ ma nnukwu ihe ùgwù ma nnukwu ibu ọrụ. Ọ na-emekwa ka onye ahụ e mere baptizim nwee olileanya na a ga-azọpụta ya ma ọ bụrụ na ọ nọgide na-ekwesị ntụkwasị obi nye Jehova.—Matiu 24:13.

12. Olee ibu ọrụ na-eso ihe ùgwù nke ịbụ onye a kpọkwasịrị aha Jehova?

12 N’ezie, ọ bụ nnukwute ihe ùgwù mmadụ ịbụ onye a kpọkwasịrị aha Chineke pụrụ ime ihe nile, bụ́ Jehova. Maịka onye amụma kwuru, sị: “Ndị nile dị iche iche na-ejegharị, onye ọ bụla n’aha nke chi ya, anyị onwe anyị ga na-ejegharịkwa n’aha Jehova, bụ́ Chineke anyị, ruo mgbe nile ebighị ebi.” (Maịka 4:5) Ka o sina dị, ihe ùgwù a nwere nnukwu ibu ọrụ ya na ya so. Anyị aghaghị ịgbalịsi ike ibi ndụ anyị n’ụzọ ga-ewetara Jehova, bụ́ onye a kpọkwasịrị anyị aha ya, nsọpụrụ. Dị ka Pọl chetaara Ndị Kraịst nọ na Rom, ọ bụrụ na mmadụ adịghị eme ihe ọ na-ekwusa, “a na-ekwulu aha Chineke.”—Ndị Rom 2:21-24.

13. N’ihi gịnị ka ndị ohu Jehova raara onwe ha nye ji nwee ibu ọrụ nke ịgba àmà banyere Chineke ha?

13 Mgbe mmadụ ghọrọ otu n’ime Ndịàmà Jehova, ọ na-enwetakwa ibu ọrụ nke ịgba àmà banyere Chineke. Jehova kpọrọ mba Izrel a raara nye ya ka ha bụrụ ndị àmà ya iji nwee ike mee ka a mara na ya bụ Chineke na-adịru ebighị ebi. (Aịsaịa 43:10-12, 21) Ma mba ahụ arụghị ọrụ a e nyere ha, Jehova mesịkwara jụ ha kpamkpam. Taa, ezi Ndị Kraịst nwere ihe ùgwù nke ịgbara Jehova àmà. Anyị na-eme nke ahụ n’ihi na anyị hụrụ ya n’anya, ya ana-agụsikwa anyị agụụ ike ịhụ na e doro aha ya nsọ. Oleezi otú anyị ga-esi gbachie nkịtị mgbe anyị maara eziokwu banyere Nna anyị nke eluigwe na nzube ya? Ọ na-adị anyị ka ọ dịrị Pọl onyeozi mgbe o kwuru, sị: “E mewo ka m nwee mkpa. N’ezie, ahụhụ dịịrị m ma ọ bụrụ na akpọsaghị m ozi ọma!”—1 Ndị Kọrint 9:16.

14, 15. (a) Olee otú nzukọ Jehova si enyere anyị aka ito eto n’ụzọ ime mmụọ? (b) Olee ndokwa ndị e mere iji nyere anyị aka n’ụzọ ime mmụọ?

14 Ajụjụ nke abụọ ahụ na-echetakwara onye ahụ a na-aga ime baptizim na o nwere ibu ọrụ nke iso nzukọ Jehova ji mmụọ nsọ ya na-eduzi na-arụkọ ọrụ. Anyị agaghị ejeliri Chineke ozi nanị anyị, enyemaka, nkwado, na agbamume nke “òtù ụmụnna dum” dị anyị mkpa. (1 Pita 2:17; 1 Ndị Kọrint 12:12, 13) Nzukọ Chineke na-enyere anyị aka n’ụzọ dị ukwuu ito eto n’ụzọ ime mmụọ anyị. Ọ na-ewepụta ụbara akwụkwọ ndị dabeere na Bible bụ́ ndị na-enyere anyị aka inwekwu ezi ihe ọmụma, iji amamihe edozi nsogbu ndị bịara anyị, na ime ka anyị na Chineke na-emekọrịta ihe n’ụzọ chiri anya. Dị ka nne nke na-ahụ na o nyejuru ụmụ ya afọ ma lekọta ha nke ọma, “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche” na-ewepụta ụbara nri ime mmụọ n’oge kwesịrị ekwesị ka anyị wee mee ka mmekọrịta anyị na Jehova kakwuo mma.—Matiu 24:45-47; 1 Ndị Tesalonaịka 2:7, 8.

15 Ná nzukọ ndị Jehova na-enwe kwa izu, ha na-enweta ọzụzụ na agbamume ndị dị ha mkpa iji bụrụ Ndịàmà Jehova kwesịrị ntụkwasị obi. (Ndị Hibru 10:24, 25) Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke na-akụziri anyị otú e si ekwu okwu n’ihu ọha, Nzukọ Ije Ozi ana-akụzikwara anyị otú anyị ga-esi zie ndị mmadụ ozi ọma n’ụzọ na-arụpụta ihe. Anyị na-ahụ na mmụọ Jehova na-eduzi ọgbakọ ya site ná nzukọ ndị anyị na-enwe nakwa site na mgbe anyị na-amụ akwụkwọ ndị dabeere na Bible n’onwe anyị. Site ná ndokwa ndị a a na-eme mgbe nile, Chineke na-eme ka anyị mata ihe ize ndụ ndị dịnụ, a na-azụ anyị ịbụ ndị ozi na-arụpụta ihe, ma na-enyere anyị aka ịmụrụ anya n’ụzọ ime mmụọ.—Abụ Ọma 19:7, 8, 11; 1 Ndị Tesalonaịka 5:6, 11; 1 Timoti 4:13.

Ihe Na-akpali Mmadụ Ime Mkpebi Ahụ

16. Gịnị na-akpali anyị ịrara ndụ anyị nye Jehova?

16 Ya mere, ajụjụ abụọ ahụ a na-ajụ ndị a na-aga ime baptizim na-echetara ha ihe baptizim ime mmiri pụtara na ibu ọrụ ọ na-eweta. Oleekwanụ ihe kwesịrị ịkpali ha ikpebi ka e mee ha baptizim? Anyị na-aghọ ndị na-eso ụzọ e mere baptizim, ọ bụghị n’ihi na a manyere anyị amanye, kama ọ bụ n’ihi na Jehova ‘na-adọta’ anyị. (Jọn 6:44) Ebe ọ bụ na “Chineke bụ ịhụnanya,” ọ na-eji ịhụnanya achị eluigwe na ụwa, ọ naghị achị ha ná mmanye. (1 Jọn 4:8) Ihe na-adọta anyị n’ebe Jehova nọ bụ àgwà ndị magburu onwe ha o nwere na ụzọ o si emeso anyị ihe. Jehova nyere anyị Ọkpara ọ mụrụ nanị ya, nyekwa anyị olileanya kasị mma e nwere. (Jọn 3:16) Nke a na-akpalizi anyị inyefe ya ndụ anyị, ya bụ, ịrara ndụ anyị nye ya.—Ilu 3:9; 2 Ndị Kọrint 5:14, 15.

17. Gịnị ka anyị na-araraghị onwe anyị nye?

17 Anyị araraghị onwe anyị nye ụkpụrụ ma ọ bụ ọrụ, kama anyị raara onwe anyị nye Jehova n’onwe ya. Ọrụ Chineke na-enye ndị ya ga-agbanwe, ma nrara ha raara onwe ha nye ya agaghị agbanwe. Dị ka ihe atụ, ọrụ o nyere Ebreham dị nnọọ iche na nke o nyere Jeremaịa. (Jenesis 13:17, 18; Jeremaịa 1:6, 7) N’agbanyeghị nke ahụ, ha abụọ rụrụ ọrụ Chineke nyere ha n’ihi na ha hụrụ Jehova n’anya ma chọọ ime uche ya n’ụzọ zuru ezu. N’oge ikpeazụ a, ụmụazụ Kraịst nile bụ́ ndị e mere baptizim na-agbalịsi ike ịrụzu ọrụ Kraịst nyere ha nke ikwusa ozi ọma Alaeze ahụ na ime ndị na-eso ụzọ. (Matiu 24:14; 28:19, 20) Iji obi anyị dum na-arụ ọrụ ahụ bụ ụzọ dị mma anyị pụrụ isi gosi na anyị hụrụ Nna anyị nke eluigwe n’anya, nakwa na anyị raara onwe anyị nye ya n’ezie.—1 Jọn 5:3.

18, 19. (a) Olee ihe anyị na-ekwupụta n’ihu ọha mgbe e mere anyị baptizim? (b) Gịnị ka a ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?

18 Obi abụọ adịghị ya na baptizim na-emeghere mmadụ ụzọ inweta ọtụtụ ngọzi, ma ọ bụghị ihe a ga-eji gwurie egwu. (Luk 14:26-33) Ọ bụ mkpebi kachasị mkpebi nile anyị na-eme. (Luk 9:62) Mgbe e mere anyị baptizim, n’ezie, anyị na-ekwupụta n’ihu ọha, sị: “Nke a bụ Chineke, bụ́ Chineke anyị, ruo mgbe nile ebighị ebi; Ya onwe ya ga na-edu anyị ruo n’ịnwụ ọnwụ.”—Abụ Ọma 48:14.

19 Isiokwu na-esonụ ga-atụlekwu ajụjụ ndị ọzọ pụrụ ibilite n’ihe metụtara baptizim ime mmiri. È nwere ezi ihe ndị pụrụ igbochi mmadụ ime baptizim? Afọ ndụ ò kwesịrị igbochi mmadụ ime baptizim? Olee otú mmadụ nile pụrụ isi kwanyere baptizim ùgwù?

Ị̀ Pụrụ Ịkọwa?

• Olee ihe mere o ji dị mkpa na Onye Kraịst ọ bụla ga-echegharị tupu e mee ya baptizim?

• Gịnị ka mmadụ ịrara onwe ya nye Chineke na-agụnye?

• Olee ibu ọrụ ndị ihe ùgwù nke ịbụ onye a kpọkwasịrị aha Jehova na-eweta?

• Gịnị kwesịrị ịkpali anyị ikpebi ka e mee anyị baptizim?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Igbe/Foto dị na peeji nke 22]

Ajụjụ Abụọ A Na-ajụ Ndị A Na-aga Ime Baptizim

Na-adabere n’àjà Jizọs Kraịst, ì chegharịwo ná mmehie gị, rarakwa onwe gị nye Jehova ime uche ya?

Ị̀ ghọtara na nraranye na baptizim gị na-eme ka a mara gị dị ka otu n’ime Ndịàmà Jehova n’isoro nzukọ Chineke nke mmụọ nsọ na-eduzi na-emekọ ihe?

[Foto dị na peeji nke 23]

Nraranye bụ nkwa sitere n’obi anyị kwere Jehova site n’ekpere

[Foto dị na peeji nke 25]

Ọrụ nkwusa anyị na-egosipụta nrara anyị raara onwe anyị nye Chineke