Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Iru Ihe Ndị A Chọrọ Tupu E Mee Mmadụ Baptizim Dị Ka Onye Kraịst

Iru Ihe Ndị A Chọrọ Tupu E Mee Mmadụ Baptizim Dị Ka Onye Kraịst

Iru Ihe Ndị A Chọrọ Tupu E Mee Mmadụ Baptizim Dị Ka Onye Kraịst

“Gịnị na-egbochi ime m baptizim?”—ỌRỤ 8:36.

1, 2. Olee otú Filip si malite ịkpanyere onye ahụ na-arụrụ ndị ọchịchị Etiopia ọrụ ụka, oleekwa ihe gosiri na nwoke ahụ nwere mmasị n’ezi ofufe?

OTU afọ ma ọ bụ abụọ ka Jizọs nwụsịrị, otu onye na-arụrụ ndị ọchịchị ọrụ nọ na-aga ebe ndịda n’okporo ụzọ si Jeruselem gawa Geza. Ọ ka ga-eji ịnyịnya mee njem na-agwụ ike nke ga-ewe ya otu puku kilomita na narị ise ma eleghị anya. Nwoke a ji okpukpe ya kpọrọ ihe esilarị Etiopia mee ogologo njem gaa Jeruselem ịga fee Jehova ofufe. Ka ọ na-alọta, o ji amamihe jiri oge ya na-eme ihe nke ọma site n’ịgụ Okwu Chineke—nke a gosiri na ọ bụ nwoke nwere okwukwe n’ezie. Jehova hụrụ nwoke a nwere obi eziokwu, O sitere n’aka otu mmụọ ozi ya duzie Filip onye na-eso ụzọ ka ọ gaa zie ya ozi ọma.—Ọrụ 8:26-28.

2 Ọ dịịrị Filip mfe ịmalite ịkpanyere ya ụka n’ihi na onye ahụ na-arụrụ ndị ọchịchị Etiopia ọrụ nọ na-agụpụta ihe ahụ ọ na-agụ n’olu dara ụda, dị ka ndị oge ahụ na-eme. N’ihi ya, Filip matara na ihe ọ na-agụ sitere n’akwụkwọ mpịakọta Aịzaịa. Nanị otu ajụjụ Filip jụrụ nwoke ahụ kpaliri mmasị ya: “Ị̀ maara n’ezie ihe ị na-agụ?” Nke a dugara n’ikwurịta ihe dị n’Aịsaịa 53:7, 8. Filip “kpọsaara ya ozi ọma banyere Jizọs.”—Ọrụ 8:29-35.

3, 4. (a) N’ihi gịnị ka Filip ji mee onye Etiopia ahụ baptizim n’egbughị oge? (b) Olee ajụjụ ndị anyị ga-atụlezi?

3 N’oge na-adịghị anya, onye Etiopia ahụ ghọtara òkè Jizọs na-ekere n’imezu nzube Chineke, ọ ghọtakwara mkpa ọ dị ka e mee ya baptizim dị ka onye na-eso ụzọ Kraịst. Mgbe ọ hụrụ otu mmiri, ọ jụrụ Filip, sị: “Gịnị na-egbochi ime m baptizim?” N’ezie, ọnọdụ ya pụrụ nnọọ iche. Nwoke ahụ amalitelarị ife Chineke dị ka onye na-eso ụzọ ndị Juu. Eleghị anya ọ ga-adị anya tupu ya enweta ohere ọzọ dị otú ahụ a ga-eji mee ya baptizim. Nke ka mkpa bụ na nwoke a ghọtara ihe Chineke chọrọ ya n’aka, ọ chọkwara iji obi ya nile mee ya. Filip ji obi ụtọ kwere ime ihe onye Etiopia ahụ rịọrọ, mgbe e mesịkwara ya baptizim, ọ “nọgidere na-agara onwe ya na-aṅụrị ọṅụ.” Obi abụọ adịghị ya na ọ ghọrọ onye nkwusa na-anụ ọkụ n’obi n’obodo ya.—Ọrụ 8:36-39.

4 Ọ bụ ezie na nraranye na baptizim abụghị ihe ndị e ji egwuri egwu ma ọ bụ ihe ndị a na-eme ọkụ ọkụ, ihe atụ nke onye ahụ na-arụrụ ndị ọchịchị Etiopia ọrụ gosiri na e nwere oge mgbe e mere ndị mmadụ baptizim nanị obere oge ka ha nụsịrị eziokwu nke Okwu Chineke. * Ya mere, o kwesịrị ekwesị ka a tụlee ajụjụ ndị na-esonụ: Olee otú mmadụ kwesịrị isi kwadebe maka baptizim? Afọ ole ka mmadụ ga-agba tupu ya eruo eruo ime baptizim? Olee ọganihu mmadụ kwesịrị inwe n’ụzọ ime mmụọ tupu a na-eme ya baptizim? Karịsịa ihe nile, n’ihi gịnị ka Jehova ji chọọ ka ndị ohu ya na-ewere nzọụkwụ a?

Nkwa Anyị Ji Obi Anyị Dum Kwe Jehova

5, 6. (a) Olee otú ndị Chineke nke oge gara aga si gosi na ha hụrụ Jehova n’anya? (b) Ụdị mmekọrịta chiri anya dị aṅaa ka anyị na Jehova pụrụ inwe ozugbo e mere anyị baptizim?

5 Mgbe a napụtasịrị ụmụ Izrel n’Ijipt, Jehova kwere ha nkwa na ya ga-ewere ha dị ka ‘ihe nke aka ya,’ ịhụ ha n’anya na ichebe ha nakwa ime ka ha ghọọ “mba dị nsọ.” Ka ha wee nwee ike ịbụ ihe nke aka Chineke, ha aghaghị igosipụta na ha hụkwara Chineke n’anya dị ka ọ hụrụ ha. Ha gosipụtara nke a site n’ikweta na ha ga-eme ‘ihe nile Jehova kwuru’ nakwa site n’iso ya gbaa ndụ. (Ọpụpụ 19:4-9) Na narị afọ mbụ, Jizọs nyere ụmụazụ iwu ka ha gaa mee ka ndị nke mba nile bụrụ ndị na-eso ụzọ ya, ka ha na-emekwa ndị nabatara ihe ndị ha na-akụzi baptizim. Ihe ga-eme ka mmadụ na Chineke na-emekọ ihe bụ ma ọ bụrụ na onye ahụ enwee okwukwe na Jizọs Kraịst ma mee baptizim.—Matiu 28:19, 20; Ọrụ 2:38, 41.

6 Akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị a na-egosi na Jehova na-agọzi ndị ji obi ha kwe nkwa ijere ya ozi ma na-emezu nkwa ahụ. Nye Ndị Kraịst, nraranye na baptizim bụ ihe ndị dị mkpa na-eweta ngọzi Jehova. Anyị kpebisiri ike ịgbaso ụzọ ya na ịchọ nduzi ya. (Abụ Ọma 48:14) N’ihi nke a, Jehova na-ejide anyị n’aka n’ụzọ ihe atụ ma na-eduzi anyị n’ụzọ anyị kwesịrị ije ije na ya.—Abụ Ọma 73:23; Aịsaịa 30:21; 41:10, 13.

7. Olee ihe mere nraranye na baptizim ji bụrụ ihe mmadụ ga-eme n’onwe ya?

7 Ihe ga-akpali anyị ime ihe ndị ahụ kwesịrị ịbụ ịhụnanya anyị nwere n’ebe Jehova nọ na ọchịchọ nke ijere ya ozi. Ọ dịghị onye kwesịrị ime baptizim n’ihi na onye ọzọ gwara ya na ọ mụọla ihe ogologo oge ma ọ bụkwanụ n’ihi na ndị enyi ya na-eme baptizim. Dị ka o kwesịrị ịdị, ndị nne na nna na ndị ọzọ tozuru okè n’ọgbakọ Ndị Kraịst pụrụ ịgba mmadụ ume ka o chee echiche banyere ịrara onwe ya nye Chineke na ime baptizim. Pita onyeozi gbara ndị gere ya ntị n’ụbọchị Pentikọst ume ‘ka e mee ha baptizim.’ (Ọrụ 2:38) Ka o sina dị, nraranye bụ ihe anyị ga-eme n’onwe anyị, ọ dịghịkwa onye ga-emere anyị ya. Ọ bụ anyị ga-ekpebi ma ànyị ga-eme uche Chineke.—Abụ Ọma 40:8.

Ịkwadebe nke Ọma Maka Baptizim

8, 9. (a) Olee ihe mere na Akwụkwọ Nsọ akwadoghị ka a na-eme ụmụ ọhụrụ baptizim? (b) Olee ọganihu ime mmụọ ndị na-eto eto kwesịrị inwe tupu e mee ha baptizim?

8 Ụmụaka hà pụrụ ịrara onwe ha nye Jehova na-adabere n’ezi ihe ọmụma ha nwere? Akwụkwọ Nsọ ekwughị afọ ole mmadụ ga-agba tupu e mee ya baptizim. Ma, o doro anya na ụmụ ọhụrụ apụghị ịghọ ndị kwere ekwe, gosipụta okwukwe ha nwere, ma ọ bụ rara onwe ha nye Chineke. (Ọrụ 8:12) Ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Augustus Neander kwuru banyere Ndị Kraịst nke narị afọ mbụ n’akwụkwọ ya bụ́ General History of the Christian Religion and Church, sị: “Na mbụ, ọ bụ nanị ndị toruru ogo mmadụ ka a na-eme baptizim, n’ihi na ha ghọtara na baptizim na okwukwe nwere njikọ chiri anya.”

9 A bịa n’ihe banyere ndị na-eto eto, ụfọdụ na-aghọta ihe ndị bụ́ isi banyere Chineke na uche ya ma nwee ọchịchọ ibi ndụ kwekọrọ n’uche Chineke n’oge ha ka dị obere, ebe ndị ọzọ na-eme otú ahụ mgbe ha toruwere ogo mmadụ. Otú ọ dị, tupu e mee onye na-eto eto baptizim, o kwesịrị ka ya na Jehova na-emekọrịta ihe, o kwesịrị ịghọta isi ihe ndị Akwụkwọ Nsọ na-akụzi nke ọma. O kwesịkwara ịghọta ihe nraranye pụtara nke ọma, dị nnọọ ka ndị toworo eto.

10. Olee ihe mmadụ ga-ebu ụzọ mee tupu ya arara onwe ya nye Jehova, e meekwa ya baptizim?

10 Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya ntụziaka ka ha na-akụziri ndị ọhụrụ ihe nile o nyere n’iwu. (Matiu 28:20) Ya mere, ndị ọhụrụ ahụ ga-ebugodị ụzọ nweta ezi ihe ọmụma banyere eziokwu ahụ, bụ́ nke ga-enyere ha aka inwe okwukwe na Jehova nakwa n’Okwu ya. (Ndị Rom 10:17; 1 Timoti 2:4; Ndị Hibru 11:6) Mgbe eziokwu Akwụkwọ Nsọ metụziri onye ahụ n’obi, ọ ga-akpali ya ichegharị ma hapụ otú o sibu ebi ndụ. (Ọrụ 3:19) Onye ahụ na-eruzi n’ókè nke ịchọ ịrara onwe ya nye Jehova, e meekwa ya baptizim dị ka Jizọs nyere n’iwu.

11. N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ka anyị na-agachi ozi ọma anya tupu e mee anyị baptizim?

11 Ihe ọzọ dị mkpa mmadụ ga-eme tupu ya eruo ịbụ onye e mere baptizim bụ ikwusa ozi ọma Alaeze ahụ. Nke a bụ ọrụ bụ́ isi Jehova nyere ndị ya n’ụbọchị ikpeazụ ndị a. (Matiu 24:14) Ndị nkwusa a na-emebeghị baptizim pụrụ inwe ọṅụ nke ịkọrọ ndị ọzọ banyere okwukwe ha. Ikere òkè n’ọrụ a na-akwadebekwa ha maka ozi ubi nke ha ga na-eji ịnụ ọkụ n’obi na-ejechi anya mgbe e mesịrị ha baptizim.—Ndị Rom 10:9, 10, 14, 15.

Ọ̀ Dị Ihe Na-egbochi Gị Ime Baptizim?

12. Olee ihe pụrụ igbochi ụfọdụ ime baptizim?

12 Ụfọdụ pụrụ ịla azụ ime baptizim n’ihi na ha achọghị iburu ibu ọrụ ndị dị na ya. Ha ghọtara na ha ga-emerịrị mgbanwe ndị pụtara ìhè ná ndụ ha ka ndụ ha wee nwee ike ikwekọ n’ụkpụrụ Jehova. Ma ọ bụ ha na-atụ ụjọ na ọ ga-esiri ha ike ime ihe ndị Chineke chọrọ ha n’aka mgbe e mesịrị ha baptizim. Ụfọdụ pụdịrị iche, sị, “Enwere m ike imeta ihe a ga-eji chụpụ m n’ọgbakọ otu ụbọchị.”

13. N’oge Jizọs, gịnị gbochiri ụfọdụ ndị ịghọ ụmụazụ Jizọs?

13 N’oge Jizọs, ụfọdụ kwere ka ọchịchọ onwe ha na ezinụlọ ha gbochie ha ịghọ ndị na-eso ụzọ Jizọs. Otu odeakwụkwọ kwuru na ya ga-eso Jizọs ebe ọ bụla Ọ na-eje. Ma Jizọs kọwaara ya na ọtụtụ mgbe na ya adịghịdị enwe ebe ya na-ehi ụra. Mgbe Jizọs kpọrọ otu onye ọzọ na-ege ya ntị ka ọ ghọọ onye na-eso ụzọ ya, nwoke a gwara ya na ya ga-ebu ụzọ gaa “lie” nna ya. O yiri ka o chere na ọ ga-akara ya mma ịnọ n’ụlọ chere ka nna ya nwụọ karịa isowe Jizọs ma lie nna ya mgbe ọ bụla ọ nwụrụ. Onye nke ikpeazụ Jizọs kpọrọ kwuru na ya ga-ebu ụzọ ‘sị ndị ezinụlọ ya ka e mesịa.’ Jizọs kọwara mmadụ iyigharị ihe otú ahụ dị ka ‘ile anya n’ihe dị n’azụ.’ Ya mere, o yiri ka ndị na-eyigharị ihe otú ahụ ga-ahụrịrị ihe ha ga-akụdo aka gbahapụ ibu ọrụ ha dị ka Ndị Kraịst.—Luk 9:57-62.

14. (a) Gịnị ka Pita, Andru, Jems, na Jọn mere mgbe Jizọs kpọrọ ha òkù ka ha bịa ghọọ ndị na-akụta mmadụ? (b) Gịnị mere anyị ekwesịghị ịla azụ mgbe a kpọrọ anyị ka anyị bịa nyara yok Jizọs?

14 Ihe Pita, Andru, Jems, na Jọn mere dị nnọọ iche. Mgbe Jizọs kpọrọ ha òkù ka ha bịa sowe ya ma ghọọ ndị na-akụta mmadụ, Bible kwuru, sị: “Ozugbo ahụ, ka ha gbahapụrụ ụgbụ ha, ha sooro ya.” (Matiu 4:19-22) N’ihi mkpebi ahụ ha mere n’egbughị oge, ha ji anya ha hụ mmezu nke ihe ahụ Jizọs mesịrị gwa ha: “Nyaranụ yok m, mụtakwanụ ihe n’aka m, n’ihi na enwere m obi dị nwayọọ, m dịkwa umeala n’obi, unu ga-enwetakwara mkpụrụ obi unu ume ọhụrụ. N’ihi na yok m adịghị egbu mgbu, ibu m dịkwa mfe.” (Matiu 11:29, 30) Ọ bụ ezie na baptizim na-eweta yok nke ibu ọrụ, Jizọs mesiri anyị obi ike na ọ dịghị egbu mgbu, nakwa na ọ dị mfe obubu ma na-enye ume ọhụrụ.

15. Olee otú ihe mere Mozis na Jeremaịa si egosi na anyị pụrụ inwe obi ike na Chineke ga-enyere anyị aka?

15 Otú ọ dị, mmadụ iche na ya erughị eru ibu ibu ọrụ ndị ha na baptizim so aga abụghị ihe ọhụrụ. Ná mmalite, ma Mozis ma Jeremaịa chechara na ha erughị eru ịrụ ọrụ Jehova nyere ha. (Ọpụpụ 3:11; Jeremaịa 1:6) Olee otú Chineke si mesie ha obi ike? Ọ gwara Mozis, sị: “Mụ na gị ga-anọ.” O kwere Jeremaịa nkwa, sị: “Gị ka M nọnyeere ịnapụta gị.” (Ọpụpụ 3:12; Jeremaịa 1:8) Anyị onwe anyị pụrụ inwe obi ike na Chineke ga-enyere anyị aka. Ịhụ Chineke n’anya na ịtụkwasị ya obi ga-enyere anyị aka ịkwụsị inwe obi abụọ ma ànyị ga-ebili ndụ kwekọrọ ná nrara anyị raara onwe anyị nye ya. Jọn onyeozi dere, sị: “Egwu ọ bụla adịghị n’ịhụnanya, kama ịhụnanya zuru okè na-achụpụ egwu n’èzí.” (1 Jọn 4:18) Ụjọ pụrụ ịtụ nwatakịrị ma nanị ya soro na-aga ije, ma obi na-esi ya ike ma ọ bụrụ na nna ya sekpụ ya n’aka na-aga. N’otu aka ahụ, ọ bụrụ na anyị atụkwasị Jehova obi kpamkpam, ọ na-ekwe nkwa ime ka ‘okporo ụzọ anyị nile zie ezie,’ ka anyị so ya na-aga.—Ilu 3:5, 6.

Oge E Kwesịrị Ịkwanyere Ùgwù

16. N’ihi gịnị ka baptizim ji gụnye imikpu mmadụ n’ime mmiri kpamkpam?

16 Tupu a na-eme mmadụ baptizim, a na-ebu ụzọ ekwu okwu dabeere n’Akwụkwọ Nsọ iji kọwaa otú baptizim Ndị Kraịst si dị mkpa. Ná mmechi nke okwu ahụ, a na-agwa ndị a na-aga ime baptizim ka ha kwupụta okwukwe ha n’ihu ọha site n’ịza ajụjụ abụọ a na-ajụ ndị a na-aga ime baptizim. (Ndị Rom 10:10; lee igbe dị na peeji nke 22.) A na-emikpuzi ndị ahụ na-aga ime baptizim n’ime mmiri, n’ịgbaso ihe nlereanya Jizọs n’onwe ya setịpụrụ. Bible na-egosi na mgbe e mesịrị Jizọs baptizim, o “siri na mmiri ahụ pụta” ma ọ bụ “si na mmiri na-apụta.” (Matiu 3:16; Mak 1:10) O doro anya na Jọn Onye Na-eme Baptizim mikpuru Jizọs n’ime mmiri kpamkpam. * Imikpu anyị ná mmiri kpamkpam bụ ihe kwesịrị ekwesị na-egosi mgbanwe ndị pụtara ìhè anyị mere ná ndụ anyị—n’ụzọ ihe atụ, anyị na-anwụ ná ndụ anyị na-ebibu ma maliteghachi ndụ ọhụrụ n’ozi Chineke.

17. Olee otú ma ndị a na-aga ime baptizim ma ndị na-ekiri ndị a na-aga ime baptizim pụrụ isi kwanyere oge baptizim ùgwù?

17 Baptizim bụ ma ihe a na-echebasiri echiche ike ma ihe na-eweta ọṅụ. Bible gosiri na Jizọs nọ na-ekpe ekpere mgbe Jọn mikpuru Ya n’Osimiri Jọdan. (Luk 3:21, 22) Taa, ndị a na-aga ime baptizim kwesịrị ịkwanyere baptizim ùgwù kwesịrị ya n’ikwekọ n’ihe nlereanya a Jizọs setịpụrụ. Ebe ọ bụkwanụ na Bible na-agba anyị ume ịdị na-eji ejiji kwesịrị ekwesị kwa ụbọchị, anyị kwesịrị itinye ndụmọdụ a n’ọrụ karịsịa n’ụbọchị a na-eme anyị baptizim! (1 Timoti 2:9) Ndị na-ekiri ndị ahụ a na-aga ime baptizim pụkwara igosi nkwanye ùgwù site n’ige ntị nke ọma ka okwu baptizim na-aga n’ihu ma nọrọ jụụ n’oge a na-eme baptizim.—1 Ndị Kọrint 14:40.

Ngọzi Ndị Na-abịara Ndị Na-eso Ụzọ E Mere Baptizim

18, 19. Olee ihe ùgwù na ngọzi ndị baptizim na-eweta?

18 Ozugbo anyị raara onwe anyị nye Chineke, e meekwa anyị baptizim, anyị na-esonye n’otu ezinụlọ pụrụ iche. Ngọzi mbụ na-abịara anyị bụ na Jehova na-aghọ Nna anyị na Enyi anyị. Anyị na Chineke adịghị ná mma tupu e mee anyị baptizim; anyị na ya na-adị ná mma mgbe e mesịrị anyị baptizim. (2 Ndị Kọrint 5:19; Ndị Kọlọsi 1:20) Site n’àjà Kraịst, anyị na-abịaru Chineke nso, ọ na-abịarukwa anyị nso. (Jems 4:8) Malakaị onye amụma kọwara na Jehova na-aṅa ndị na-eji aha ya eme ihe na ndị a kpọkwasịrị aha ya ntị, ọ na-edebakwa aha ha n’akwụkwọ ncheta ya. Chineke na-ekwu, sị: ‘Ha ga-abụkwa nke m, M ga-enwekwa ọmịiko n’ahụ́ ha, dị ka mmadụ si enwe ọmịiko n’ahụ́ nwa ya nke na-efe ya.’—Malakaị 3:16-18.

19 Baptizim na-emekwa ka anyị sonye n’òtù ụmụnna zuru ụwa ọnụ. Mgbe Pita onyeozi jụrụ Jizọs ngọzi ndị na-eso ụzọ Kraịst ga-enweta n’ihi àjà ndị ha chụrụ, Jizọs kwere nkwa, sị: “Onye ọ bụla nke hapụwokwara ụlọ ma ọ bụ ụmụnne ndị ikom ma ọ bụ ụmụnne ndị inyom ma ọ bụ nna ma ọ bụ nne ma ọ bụ ụmụ ma ọ bụ ala n’ihi aha m ga-enweta ihe karịrị nke ahụ ọtụtụ ugboro, ọ ga-eketakwa ndụ ebighị ebi.” (Matiu 19:29) Mgbe ọtụtụ afọ gasịrị, Pita dere banyere “òtù ụmụnna dum” “n’ụwa.” Òtù ụmụnna na-ahụ n’anya nyeere Pita n’onwe ya aka, ha pụkwara inyere anyị aka.—1 Pita 2:17; 5:9.

20. Olee atụmanya magburu onwe ya nke baptizim na-eme ka anyị nwee?

20 Ọzọkwa, Jizọs kwuru na ndị na-eso ya ga-enweta “ndụ ebighị ebi.” Ee, nraranye na baptizim na-eme ka anyị na-atụ anya inweta “ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie”—ndụ ebighị ebi n’ime ụwa ọhụrụ Chineke. (1 Timoti 6:19) Olee ntọala ọzọ ka ya mma anyị pụrụ ịtọrọ onwe anyị na ezinụlọ anyị maka ọdịnihu? Atụmanya a magburu onwe ya ga-enyere anyị aka ‘ijegharị n’aha Jehova, bụ́ Chineke anyị, ruo mgbe nile ebighị ebi.’—Maịka 4:5.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 4 E mekwara ndị Juu na ndị na-eso ụzọ ndị Juu dị puku atọ bụ́ ndị gere ntị n’ihe Pita kwuru n’ụbọchị Pentikọst baptizim n’egbughị oge. Dị ka ọnaozi Etiopia ahụ, o doro anya na ha amaralarị ozizi na ụkpụrụ ndị bụ́ isi dị n’Okwu Chineke.—Ọrụ 2:37-41.

^ par. 16 Dị ka akwụkwọ bụ́ Expository Dictionary of New Testament Words nke Vine dere si kwuo, okwu Grik ahụ bụ́ baʹpti·sma (baptizim) pụtara “ịbụ onye e mikpuru ná mmiri, mmiri erikpuo onye ahụ, ya esizie n’ime mmiri bilite.”

Ị̀ Pụrụ Ịkọwa?

• Olee otú anyị kwesịrị isi gosi Jehova na anyị hụrụ ya n’anya, n’ihi gịnịkwa?

• Olee ọganihu ime mmụọ mmadụ kwesịrị inwe tupu e mee ya baptizim?

• Olee ihe mere na anyị ekwesịghị ikwe ka ụjọ nke imeta ihe a ga-eji chụpụ anyị n’ọgbakọ ma ọ bụ ịnakwere ibu ọrụ gbochie anyị ime baptizim?

• Ngọzi ndị dị aṅaa ka ndị na-eso ụzọ Jizọs Kraịst pụrụ inwe?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 26]

“Gịnị na-egbochi ime m baptizim?”

[Foto ndị dị na peeji nke 29]

Baptizim bụ ma ihe a ga-echebasiri echiche ike ma ihe na-eweta ọṅụ