Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Nne na Nna—Bụrụnụ Ezi Ihe Nlereanya Nye Ụmụ Unu

Ndị Nne na Nna—Bụrụnụ Ezi Ihe Nlereanya Nye Ụmụ Unu

Ndị Nne na Nna—Bụrụnụ Ezi Ihe Nlereanya Nye Ụmụ Unu

“NDỊ ọkà mmụta banyere akparamàgwà nweziri ike ịkwụsị nnyocha ha nọworo na-eme eri ọtụtụ narị afọ iji chọpụta ụzọ kasị mma isi zụlite nwatakịrị ka ọ bụrụ ezigbo nwa—ọ bụghị n’ihi na ha ahụla ya kama ọ bụ n’ihi na ọ dịghị adị.” Nke a ka e dere na magazin bụ́ TIME ka e nyochasịrị otu akwụkwọ na-ekwu banyere ụzọ e si azụ ụmụaka. Akwụkwọ ahụ kwuru na ụmụaka na-eṅomikarị ndị ọgbọ ha, ọ bụghị ndị mụrụ ha.

Ihe ịrụ ụka adịghị ya na nrụgide ndị ọgbọ na-akpa ike dị egwu. (Ilu 13:20; 1 Ndị Kọrint 15:33) Onye na-ede akwụkwọ akụkọ bụ́ William Brown kwuru, sị: “Otu ihe kasị ndị na-eto eto mkpa bụ ịdị ka ibe ha. . . . Nye ndị na-eto eto, ọnwụ ka ịgbapụ iche mma.” Mgbe ndị nne na nna na-emelighị ka ndị ezinụlọ ha na-enwe obi ụtọ na ọṅụ, ma ọ bụ ghara iwepụta oge zuru ezu iji soro ụmụ ha nọkọọ—bụ́ ihe ndị a na-ahụkarị n’ụwa a, bụ́ ebe ndị mmadụ na-adịghị enwe ohere—ihe ha na-eme bụ inye ndị ọgbọ ụmụ ha ohere imebi ụmụ ha.

Tụkwasị na nke a, “n’ụbọchị ikpeazụ” ndị a, ezinụlọ nọ nnọọ ná nsogbu n’ihi na dị ka Bible buru n’amụma, ndị mmadụ na-eji oge ha nile achụ ego, achọ ihe ụtọ nakwa ọdịmma onwe ha nanị. Ọ̀ ga-ejuzi anyị anya ịhụ ka ụmụaka na-aghọ “ndị na-enupụrụ ndị mụrụ ha isi, ndị na-enweghị ekele, ndị na-adịghị eguzosi ike n’ihe na ndị na-enweghị obi mmadụ”?—2 Timoti 3:1-3.

E ji okwu ahụ bụ́ “obi mmadụ” mee ihe n’ime Bible iji kọwaa ịhụnanya na-adị n’ime ezinụlọ. Ụdị ịhụnanya a bụ ihe nkekọ sitere n’okike bụ́ nke na-akpali ndị nne na nna ilekọta ụmụ ha, ọ na-emekwa ka ụmụ na ndị mụrụ ha na-enwe mmekọrịta chiri anya. Ma mgbe ndị nne na nna na-enweghị ịhụnanya miri emi n’ebe ụmụ ha nọ, ụmụaka na-agakwuru ndị ọzọ na-abụghị ndị òtù ezinụlọ ha maka nke a—ndị ha na-agakwukarị bụ ndị ọgbọ ha, bụ́ ndị ha nweziri ike iṅomi ụzọ ndụ na àgwà ha. Ma, ọ bụrụ na ndị nne na nna ekwere ka ụkpụrụ Bible na-eduzi ndụ ezinụlọ ha, ụdị ọnọdụ a agaghị adị.—Ilu 3:5, 6.

Ezinụlọ—Ndokwa Sitere n’Aka Chineke

Ka Chineke jikọtasịrị Adam na Iv dị ka di na nwunye, o nyere ha iwu a: “Mụọnụ ọmụmụ, baanụ ụba, jupụta ụwa.” Mgbe nke a gasịrị, a bịara nwee ezinụlọ nke nna, nne, na ụmụ mejupụtara. (Jenesis 1:28; 5:3, 4; Ndị Efesọs 3:14, 15) Iji nyere ndị nne na nna aka ịzụ ụmụ ha, Jehova kenyere akụkụ bụ́ isi nke ụzọ isi zụọ ụmụ n’ime ụmụ mmadụ. Ma, n’adịghị ka ụmụ anụmanụ, ụmụ mmadụ chọkwuru enyemaka iji zụọ ụmụ ha, n’ihi ya, Jehova nyere ha ụkpụrụ nduzi e dere ede. Ihe ndị e dere n’ime ya gụnyere ntụziaka banyere ụdị omume e kwesịrị ime nakwa banyere otú a ga-esi na-efe Chineke, tinyekwara ntụziaka banyere otú a ga-esi na-adọ ụmụaka aka ná ntị n’ụzọ kwesịrị ekwesị.—Ilu 4:1-4.

Mgbe Chineke na-agwa ndị bụ́ nna okwu kpọmkwem, ọ sịrị: “Okwu ndị a, nke mụ onwe m na-enye gị n’iwu taa, ga-adịkwasịkwa n’obi gị: ị ga-ejisikwa ike izi ha ụmụ gị, ị ga-ekwukwa okwu banyere ha mgbe ị na-anọdụ n’ụlọ gị, na mgbe ị na-eje ije n’ụzọ, na mgbe ị na-edina ala, na mgbe ị na-ebili ọtọ.” (Deuterọnọmi 6:6, 7; Ilu 1:8, 9) Rịba àmà na ndị nne na nna ga-ebu ụzọ mee ka iwu Chineke dịrị n’obi ha. N’ihi gịnị ka nke a ji dị mkpa? Ọ bụ n’ihi na ụdị nkụzi nke na-akpali ndị ọzọ ime ihe abụghị nanị nke sitere n’elu ọnụ kama nke sitere n’obi. Ọ bụ nanị mgbe ndị nne na nna sitere n’obi ha zie ụmụ ha ihe, ka ha pụrụ iru n’obi ụmụ ha. Ndị nne na nna dị otú a ga na-esetịpụrụ ụmụ ha, bụ́ ndị na-adị ngwa ịchọpụta omume ihu abụọ, ezi ihe nlereanya.—Ndị Rom 2:21.

A gwara ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst ka ha malite n’oge ụmụ ha bụ ụmụ ọhụrụ “na-azụpụta ha n’ọzụzụ na ịdụ ọdụ nke Onyenwe anyị.” (Ndị Efesọs 6:4, Union Igbo Bible; 2 Timoti 3:15) Ọ̀ pụrụ ikwe omume ịzụlite nwata site n’oge ọ ka bụ nwa ọhụrụ? Eenụ! Otu nne dere, sị, “Mgbe ụfọdụ, ọ na-adị anyị bụ́ ndị nne na nna ka ụmụ anyị etorubeghị ime ihe ọ bụla. Anyị na-eleda nkà ha nwere anya. Ụmụaka nwere nkà dị iche iche. Anyị bụ́ ndị nne na nna kwesịrị ịgba ha ume iji nkà ha na-eme ihe.” Ee, ụmụaka na-enwe mmasị ịmụ ihe, ọ bụrụkwa na ndị nne na nna na-atụ egwu Chineke akụziere ha ihe, ha ga-amụtakwa otú e si ahụ n’anya. Ụkpụrụ nduzi ndị nne na nna tọọrọ ụmụ ha ga-eme ka obi ruo ụmụ ha ala. N’ihi ya, ndị nne na nna na-azụlite ụmụ ha nke ọma na-abụ ndị ha na ụmụ ha na-enwe mmekọrịta chiri anya, na-enwe ezigbo nkwurịta okwu, na-abụkwa ndị nkụzi nwere ndidi ma na-akwụsi ike, ma na-eme ka ụmụ ha soro ndị ji ihe ime mmụọ kpọrọ na-akpakọrịta. *

Chebe Ụmụ Gị

Otu onyeisi ụlọ akwụkwọ praịmarị nke ọnọdụ ụmụaka na-enye nsogbu n’obi, bụ́ onye bi na Germany dere ihe na-esonụ n’akwụkwọ ozi o degaara ndị nne na nna: “Ezi ndị nne na nna, anyị ga-achọ ịgba unu ume ka unu tinyekwuo mgbalị n’iji aka unu zụlite ụmụ unu kama ịhapụrụ telivishọn ma ọ bụ ndị agamevu ọrụ a dịịrị unu nke bụ́ ịzụlite ụmụ unu ịghọ ndị na-akpa ezi àgwà.”

Mmadụ ịhapụrụ telivishọn ma ọ bụ ndị agamevu nwa ya pụtara nnọọ mmadụ ịhapụ nwa ya ka e jiri mmụọ nke ụwa zụlite ya. (Ndị Efesọs 2:1, 2) Mmụọ nke ụwa a na-emegide mmụọ nke Chineke. Ọ dị nnọọ ka oké ifufe nke na-eburu echiche nke “ụwa, nke anụ ahụ́, nke ndị mmụọ ọjọọ” na-ebuba ha n’uche na n’obi nke ndị na-amaghị nke a na-akọ ma ọ bụ ndị nzuzu. (Jems 3:15) Ụdị echiche a, bụ́ nke dị ka ata, na-emechaa mebie obi. Jizọs kọwara otú echiche anyị ga-adị mgbe e jiri echiche ọjọọ metọọ ya, na-asị: “Ezi mmadụ na-ewepụta ezi ihe site n’ezi akụ̀ nke obi ya, ma ajọ mmadụ na-ewepụta ajọ ihe site n’ajọ akụ̀ ya; n’ihi na ọnụ ya na-ekwu okwu site n’ihe jupụtara n’obi ya.” (Luk 6:45) N’ihi ya, Bible gbara anyị ume, sị: “Karịa ihe ndebe gị nile chebe obi gị; n’ihi na site na ya ka mpụta nile nke ndụ dị.”—Ilu 4:23.

N’ezie, ụmụaka ga-emekwa nke ha ji bụrụ ụmụaka, ụfọdụ n’ime ha bụ ndị isi ike na ndị na-adịghị ekwe ekwe. (Jenesis 8:21) Gịnị ka ndị nne na nna pụrụ ime? Bible na-ekwu, sị: “Uche gbagọrọ agbagọ bụ ihe e kekọtaworo n’obi nwata; ma mkpanaka nke ịdọ aka ná ntị ga-eme ka ọ dị anya n’ebe ọ nọ.” (Ilu 22:15) Ụfọdụ na-ele nke a anya dị ka mmeso obi ọjọọ nke oge ya gafeworo. N’ezie, Bible na-akatọ ụdị ọ bụla nke ime ihe ike. Ọ na-akatọkwa ịkpọ mmadụ iyi. Ọ bụ ezie na mgbe ụfọdụ, “mkpanaka,” na-agụnye inye ahụhụ nkịtị, ọ na-anọchi anya ikike ịzụ ụmụ bụ́ nke e nyere ndị nne na nna, nke ha ji ịhụnanya na-arụ nke ọma maka ọdịmma ebighị ebi nke ụmụ ha.—Ndị Hibru12:7-11.

Ka Ọ Na-atọ Gị Ụtọ Isoro Ụmụ Gị Na-enwekọ Ntụrụndụ Ọnụ

A naghị agbagha ya agbagha na egwuregwu na ntụrụndụ dị ụmụaka mkpa iji too nke ọma. Ndị nne na nna maara ihe na-eji ohere ọ bụla dapụtaranụ eme ka mmekọrịta ha na ụmụ ha sikwuo ike, site n’isoro ha na-enwekọ ntụrụndụ ọnụ mgbe ọ bụla o kwere mee. Ya mere, ọ bụghị nanị na ndị nne na nna pụrụ iduzi ụmụ ha n’ịhọrọ ụdị ntụrụndụ dị mma, kama ha pụkwara igosi ụmụ ha ókè ha nweruru mmasị ná mkpakọrịta nke ha na ha.

Otu nna bụ́ Onyeàmà kwuru na ya na nwa ya nwoke na-egwurikarị egwu mgbe ọ bụla ya lọtara ọrụ. Otu nne chetara na iti draft na-atọ ụmụ ya ụtọ. Otu nwanyị chetara mgbe ezinụlọ ya na-agbakọ ịnyịnya ígwè ọnụ. Ụmụaka ndị a nile etoruwo ogo mmadụ ugbu a, ma ịhụnanya ha nwere n’ebe ndị nne na nna ha nọ nakwa n’ebe Jehova nọ ka siri nnọọ ike, na-esikwu ike ọbụna karị.

N’eziokwu, ndị nne na nna bụ́ ndị na-egosipụta site n’okwu ọnụ na n’omume na ha hụrụ ụmụ ha n’anya ma chọọ isoro ha nọrọ na-akụziri ụmụ ha ezigbo ihe ndị ha na-agaghị echefu echefu ná ndụ ha. Dị ka ihe atụ, ọtụtụ n’ime ndị gụsịrị akwụkwọ n’otu klas nke Watchtower Bible School of Gilead kọrọ na ihe mere ha ji nwee ọchịchọ nke ịbanye n’ozi oge nile bụ n’ihi ihe nlereanya na agbamume nke ndị mụrụ ha. Lee ka nke ahụ si bụụrụ ụmụ ahụ ihe nketa dị oké ọnụ ahịa, bụrụkwa ngọzi nye ndị mụrụ ha! N’eziokwu, ọ bụghị ụmụaka nile ga-enwe ike ịbanye n’ozi oge nile mgbe ha tolitere, ma ha nile ga-erite uru site n’ọzụzụ nke ndị nne na nna ha na-atụ egwu Chineke, bụ́ ndị ghọọrọ ha ezi ndị enyi na ezi ihe nlereanya. Ha ga-asọpụkwara ndị mụrụ ha.—Ilu 22:6; Ndị Efesọs 6:2, 3.

Ndị Nne Ma Ọ Bụ Nna Nanị Ha Na-azụ Ụmụ Pụrụ Inwe Ihe Ịga nke Ọma

Taa, e nwere ọtụtụ ndị nne ma ọ bụ nna nanị ha na-azụ ụmụ. Ọ bụ ezie na mmadụ ịbụ onye nanị ya na-azụ ụmụ na-eweta ihe ịma aka dị ukwuu, ma a pụrụ inwe ihe ịga nke ọma. Ihe nlereanya nke Yunis, bụ́ onye Juu ghọrọ Onye Kraịst na narị afọ mbụ pụrụ ịgba ndị nne ma ọ bụ nna nanị ha na-azụ ụmụ ume. Di Yunis bụ onye na-ekweghị ekwe, o yikwara ka ọ kwadoghị Yunis n’ihe ndị metụtara ezi ofufe. N’agbanyeghị nke ahụ, Yunis setịpụrụ ezi ihe nlereanya n’ịkụziri Timoti ihe. Ọzụzụ ọma o nyere Timoti site ná mgbe ọ bụ nwa ọhụrụ, tinyere ọzụzụ Timoti nwetara n’aka nne nne ya, bụ́ Lọịs, mere nnọọ ka ndị ọgbọ Timoti ghara imebi ya.—Ọrụ 16:1, 2; 2 Timoti 1:5; 3:15.

Taa, ọtụtụ ndị na-eto eto bụ́ ndị tolitere n’ezinụlọ e nwere nne ma ọ bụ nna na-ekweghị ekwe ma ọ bụ ndị nanị nne ma ọ bụ nna zụlitere nwere ụdị àgwà ọma ahụ onye na-eto eto bụ́ Timoti nwere. Dị ka ihe atụ, ọ bụ nne nanị ya na-azụ ụmụ zụlitere Ryan, bụ́ onye dị afọ 22 ugbu a nke na-ejekwa ozi oge nile, na nwanne ya nke nwoke na nke nwanyị tọrọ ya. Papa ha bụ onye aṅụrụma, ọ gbahapụkwara ezinụlọ ya mgbe Ryan dị afọ anọ. Ryan chetara, sị: “Mama m kpebisiri ike na ezinụlọ anyị ga-anọgide na-efe Jehova, o jikwara obi ya nile rụsie ọrụ ike iji hụ na o mezuru ihe ahụ o kwuru.”

Ryan kwuru, sị: “Dị ka ihe atụ, mama m hụrụ na ndị anyị na ha na-akpakọrịta bụ ndị nwere àgwà ọma. Ọ dịtụghị mgbe o kwere ka anyị na ndị Bible kọwara dị ka ndị mkpakọrịta ọjọọ, ma hà nọ n’ọgbakọ ma ọ bụ n’ụwa, na-akpakọrịta. Ọ kụzikwaara anyị ụzọ ziri ezi isi lee agụmakwụkwọ ụwa anya.” N’agbanyeghị na mama Ryan na-ejikarị ọrụ n’aka, ike a na-agwụkwa ya mgbe ụfọdụ ma o si ọrụ lọta, nke a adịghị egbochi ya igosi na ya hụrụ ụmụ ya n’anya. Ryan kwuru, sị: “Ọ na-enwekarị mmasị ịnọnyere anyị na iso anyị ekwurịta okwu. Ọ bụ onye nkụzi nwere ndidi ma na-akwụsi ike, na-eme ókè o nwere ike iji hụ na anyị na-enwechi ọmụmụ Bible ezinụlọ anya. Mama m adịghị achọ iji ntị anụ ihe ọ bụla ga-emebi ụkpụrụ Bible.”

Mgbe o chere echiche laa azụ, Ryan ghọtara na onye kasị setịpụrụ ya na ụmụnne ya ndị tọrọ ya ihe nlereanya bụ mama ya, bụ́ onye hụrụ Chineke n’anya n’ezie ma hụkwa ụmụ ya n’anya. Ya mere, unu ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst—ma ùnu lụrụ di ma ọ bụ nwunye ma ọ bụ bụrụ ndị di ma ọ bụ nwunye ha nwụnahụrụ, ma ọ bụkwanụ bụrụ ndị di ma ọ bụ nwunye ha kwere ekwe ma ọ bụ ndị di ma ọ bụ nwunye ha na-ekweghị ekwe—unu adala mbà n’ihi nkụda mmụọ ma ọ bụ n’ihi ihe ndọghachi azụ ndị na-adịru nanị nwa oge, ka unu na-agbalịsi ike ịkụziri ụmụ unu ihe. Mgbe ụfọdụ, ụfọdụ ndị na-eto eto pụrụ ịpụ n’ọgbakọ, dị ka nwa mmefu ahụ mere. Ma ha pụrụ ịlọghachi, mgbe ha hụrụ na ọ dịghị ihe ọma dị n’ụwa, hụkwa obi ọjọọ jupụtara na ya. N’ezie, “onye ezi omume nke na-ejegharị n’izu okè ya, ndị ihe na-agara nke ọma ka ụmụ ya nke ga-anọchi ya ga-abụ.”—Ilu 20:7; 23:24, 25; Luk 15:11-24.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 9 Iji nwetakwuo nkọwa zuru ezu, lee akwụkwọ bụ́ Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ, peeji nke 55-59, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 11]

Ọ Bụ Chineke Ji Aka Ya Họrọ ỌNne na Nna Jizọs

Jehova jiri nlezianya họrọ nne na nna Jizọs mgbe o zitere Ọkpara ya ka a mụọ ya dị ka mmadụ. N’ụzọ na-akpali nnọọ mmasị, ọ họọrọ di na nwunye dị umeala n’obi ma na-atụ egwu Chineke bụ́ ndị na-azụtọghị Jizọs kama ha kụziiri ya Okwu Chineke, kụziekwara ya uru ịrụsi ọrụ ike bara nakwa mkpa ọ dị ibu ibu dịịrị ya. (Ilu 29:21; Abụ Ákwá 3:27) Josef kuziiri Jizọs ọrụ ịkwa nkà, a dịghịkwa agbagha ya agbagha na ma Josef ma Meri rịọrọ Jizọs, dị ka nwa mbụ ha, ka o nyere ha aka n’ịzụ ụmụ ha ndị ọzọ, bụ́ ndị ruru isii ma ọ dịkarịa ala.—Mak 6:3.

Ị pụrụ iji anya nke uche gị hụ ka ezinụlọ Josef na-ejikọ aka ọnụ n’oge Ememe Ngabiga na-akwadebe maka njem ha na-eme kwa afọ gaa Jeruselem—njem dị narị kilomita abụọ ma n’uje ma n’ụla n’ejighị usoro ime njem ọgbara ọhụrụ. N’eziokwu, ezinụlọ dị mmadụ itoolu ma ọ bụ karị aghaghị ịkwadebe nke ọma maka ogologo njem dị otú ahụ. (Luk 2:39, 41) N’agbanyeghị ihe ịma aka ndị njem a na-eweta, ihe ịrụ ụka adịghị ya na Josef na Meri weere ogologo njem ndị a ha na-eme gaa Jeruselem dị ka ihe dị mkpa, ikekwe ha na-eji ohere ndị ahụ akụziri ụmụ ha ihe ndekọ Bible ndị gara aga.

Mgbe ọ ka na-eto eto, Jizọs “nọgidekwara na-edo onwe ya n’okpuru” ndị mụrụ ya, n’oge nile “na-aga n’ihu n’amamihe na n’uto anụ ahụ́, nakwa n’inwe ihu ọma Chineke na nke ndị mmadụ.” (Luk 2:51, 52) N’ezie, Josef na Meri ruru eru ka Jehova tụkwasị ha obi. Ha bụụrụ nnọọ ndị nne na nna taa ihe nlereanya magburu onwe ya!—Abụ Ọma 127:3.