Ihe Ndị Ga-enyere Gị Aka Iso Di Ma Ọ Bụ Nwunye Gị Na-ekwurịta Okwu
Ihe Ndị Ga-enyere Gị Aka Iso Di Ma Ọ Bụ Nwunye Gị Na-ekwurịta Okwu
‘EKWESỊGHỊ M ikwu ihe ahụ m kwuru.’ ‘Ihe m kwuru abụghị ihe m bu n’obi.’ Ọ̀ dịtụla mgbe i chere otú ahụ mgbe ị gbalịsịrị ịgwa di ma ọ bụ nwunye gị ihe dị gị n’obi? Nkwurịta okwu bụ nkà e kwesịrị ịmụta amụta. Dị ka nkà ọ bụla ọzọ, ọ na-adịrị nnọọ ụfọdụ ndị mfe ịmụta ya, ebe ọ na-aka esiri ndị ọzọ ike. N’agbanyeghị nke ahụ, ya bụrụgodị na ọ na-esiri gị ike, i nwere ike ịmụta ikwupụta echiche gị n’ụzọ dị mma, iso ndị ọzọ na-ekwurịta okwu nke ọma.
Mgbe ụfọdụ, omenala ndị mmadụ na-ekpebi otú ha si akpaso di ma ọ bụ nwunye ha àgwà. E nwere ike ịgwa ụmụ nwoke, sị, ‘Nwoke anaghị ekwu oké okwu.’ E nwere ike ịdị na-eleda ụmụ nwoke na-ekwu oké okwu anya n’ihi Jems 1:19) Ma, ndụmọdụ ahụ bụ maka ma ndị nwoke ma ndị nwanyị, ọ na-egosikwa na ọ bụghị nanị okwu ka mmadụ ji egosipụta ihe dị ya n’obi. Mmadụ abụọ nwere ike ịgwa ibe ha okwu ruo ogologo oge, ma gịnị ma ọ bụrụ na ha egeghị ibe ha ntị? O yighị ka hà ga-amata ihe dị ibe ha n’obi n’ezie. Dị ka akụkụ Akwụkwọ Nsọ ahụ dị n’elu gosiri, ige ntị dị nnọọ mkpa n’ezi nkwurịta okwu.
na a na-ewere ha ka ndị okwu ha na-abaghị uru. Ee, Bible kwuru, sị: “Onye ọ bụla aghaghị ịdị ngwa n’ịnụ ihe, ghara ịdị ngwa n’ikwu okwu.” (Ime Ka A Mata Echiche Gị n’Ekwughị Okwu
N’ebe ụfọdụ, a naghị enye ụmụ nwanyị a lụ alụ ohere ikwu echiche ha. Di agaghị etinye anya n’ihe a na-eme n’ezinụlọ. N’ọnọdụ dị otú ahụ, di na nwunye anaghị ama ihe bụ́ echiche ibe ha n’ihe ọ bụla. Ụfọdụ ụmụ nwanyị na-azụlite nnọọ nkà nke ịghọta ihe bụ́ mkpa di ha ma na-eme ihe ngwa ngwa iji gboo ha. N’ọnọdụ dị otú ahụ, di na nwunye na-eme ka a mata echiche ha n’ekwughị okwu. Otú ọ dị, ọtụtụ mgbe, ọ na-abụ otu onye na-achọpụta ihe dị ibe ya n’obi. Ọ bụ ezie na nwanyị nwere ike ịmụta ụzọ isi chọpụta ihe di ya na-eche, a naghị atụkarị di ya anya ịmụtakwa ịchọpụta ihe nwunye ya na-eche.
N’ezie, n’ebe ụfọdụ, ndị nwoke na-achọpụta mkpa nwunye ha ma na-agbalị igbo ha. Ma, ọbụna n’ebe ndị dị otú ahụ, ihe ga-aka mma n’ọtụtụ alụmdi na nwunye ma ọ bụrụ na ha emeziwanye ụzọ ha si ekwurịta okwu.
Ikwupụta Echiche Gị Dị Ezigbo Mkpa
Mmadụ ikwupụta echiche ya nwere ike ime ka a ghara ịghọtahie onye ahụ. Mgbe a ka hiwere mba Izrel ọhụrụ, ebo Ruben, Gad, na ọkara nke ebo Manase bụ́ ndị bi n’akụkụ ọwụwa anyanwụ nke Osimiri Jọdan wuru “ebe ịchụàjà ukwu n’ile ya anya” n’akụkụ Jọdan. Ebo ndị nke ọzọ ghọtahiere ihe ahụ ha mere. Ebe ebo ndị nke bi n’akụkụ ọdịda anyanwụ chere na ụmụnna ha ndị bi n’ofe Jọdan agbahapụla ofufe Jehova, ha kwadoro ịga lụso ndị ahụ ha chere bụ́ ndị nnupụisi agha. Ma, tupu ha agawa agha ahụ, ha zipụrụ ndị nnọchianya ije gwa ebo ndị ahụ bi n’ebe ọwụwa anyanwụ okwu. Amamihe dị nnọọ n’ihe ahụ ha mere! Ha chọpụtara na ebe ịchụàjà ahụ abụghị maka isure ihe nsure ọkụ ma ọ bụ ịchụ àjà ndị megidere iwu Chineke. Kama nke ahụ, ebo ndị ahụ bi n’ebe ọwụwa anyanwụ nọ na-atụ egwu na n’ọdịnihu ebo ndị nke ọzọ ga-agwa ha, sị: “Unu enweghị òkè n’ime Jehova.” Ebe ịchụàjà ahụ ga-agba akaebe na ha onwe ha kwa na-efe Jehova. (Joshua 22:10-29) Ha kpọrọ ebe ịchụàjà ahụ Ihe Àmà, ma eleghị anya n’ihi na ọ bụ ihe na-agba akaebe na ha weere Jehova dị ka ezi Chineke ahụ.—Joshua 22:34.
Nkọwa ha nyere juru agbụrụ ndị nke ọzọ ahụ afọ, ha kwụsịkwara ime atụmatụ ịlụso ebo abụọ na ọkara ahụ agha. Ee, nkwurịta okwu doro anya gbochiri agha. Ka e mesịrị, mgbe Izrel nupụụrụ di ihe atụ ha, bụ́ Jehova Chineke, isi, ọ gwara ha na ya ga-eji obi ebere ‘gwa ha okwu nke ga-aba ha n’obi.’ (Hosea 2:14) Lee ezi ihe nlereanya nke a bụụrụ ndị di na nwunye! Ee, gbalịa ịdị na-agwa di ma ọ bụ nwunye gị okwu ga-aba ya n’obi ka o wee nwee ike ịghọta ihe dị gị n’obi. Nke a dị mkpa karịsịa mgbe iwe ji ya. Pattie Mihalik, bụ́ onye nta akụkọ nọ na United States, kwuru, sị: “Ụfọdụ pụrụ ikwu na okwu anaghị efu ego, ma okwu na-adịkwa oké ọnụ ahịa mgbe ụfọdụ. Ọ bụ ezie na ọ na-esiri ụfọdụ ndị ike ikwupụta otú ihe dị ha n’obi, ma ihe ndị na-esi na mmadụ ikwu ihe dị ya n’obi apụta pụrụ ịba uru karịa ego e tinyere n’ụlọ akụ̀.”
Ịmụtakwu Otú Ị Ga-esi Na-ekwu Ihe Dị Gị n’Obi
Ụfọdụ pụrụ ikwu, sị: ‘Alụmdi na nwunye anyị mebiri site ná mmalite.’ Ndị ọzọ nwere ike ikwubi, sị: ‘Alụmdi na nwunye anyị enwekwaghị mmekwata.’ Ha nwere ike iche na ọ gaghị ekwe omume imeziwanye ụzọ ha si ekwurịta okwu mgbe ha lụsịrị. Ma, cheedị banyere ndị bi n’ebe ndị ikwu na-ahọtara mmadụ di ma ọ bụ nwunye. Ọtụtụ ndị bi n’ebe ndị
dị otú ahụ na-emesị malite ikwurịta okwu nke ọma n’alụmdi na nwunye ha.Otu di na nwunye n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa bara n’alụmdi na nwunye ndị ọzọ haziiri ha. A gwara onye akaebe ka ọ gaa ebe dị anya chọtara nwoke ahụ nwanyị. N’agbanyeghị nke ahụ, di na nwunye ahụ, bụ́ ndị dịrị ndụ ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ puku afọ anọ gara aga, kwurịtara okwu nke ọma. Nwoke ahụ, bụ́ Aịzik, zutere onye akaebe ahụ na onye ahụ na-aga ịbụ nwunye ya n’ọhịa. Nwoke ahụ nke rụrụ ọrụ dị ka onye akaebe “kọọrọ Aịzik akụkọ banyere ihe nile o mere.” Akụkọ Bible nke kwuru banyere alụmdi na nwunye ahụ gara n’ihu kwuo, sị: “Aịzik wee mee ka Ribeka bata n’ụlọikwuu Sera, bụ́ nne ya [nke a nọchiri anya agbamakwụkwọ ha]; o wee kuru Ribeka, o wee ghọọ nwunye ya; Aịzik wee hụ ya n’anya.”—Jenesis 24:62-67.
Rịba ama na Aịzik buru ụzọ nụ akụkọ nke ihe merenụ “wee” kuru Ribeka dị ka nwunye ya. Onye akaebe ahụ bụ ohu a tụkwasịrị obi nke na-efe Jehova Chineke, bụ́ onye Aịzik na-efe. Aịzik nwere ezi ihe mere ọ ga-eji tụkwasị nwoke a obi. Mgbe nke ahụ gasịrị, Aịzik ‘hụrụ Ribeka, bụ́ onye ọ lụrụla, n’anya.’
Aịzik na Ribeka hà mụtara otú e si enwe ezi nkwurịta okwu? Mgbe nwa ha bụ́ Ịsọ lụsịrị ụmụ ndị inyom Het abụọ, ọ kpatara nnukwu nsogbu n’ezinụlọ ha. Ribeka “wee [nọgide na-asị]” Aịzik: “Ike ndụ agwụsịwo m site n’ihu ụmụ ndị inyom Het: ọ bụrụ na Jekọb [nwa ha nke nta] lụrụ nwunye sitere n’ụmụ ndị inyom Het . . . , uru gịnị ka ndụ baara m?” (Jenesis 26:34; 27:46) O doro anya na o mere ka a mata kpọmkwem ihe na-ewute ya.
Aịzik gwara Jekọb, bụ́ ejima Ịsọ, ka ọ ghara ịlụ nwanyị n’etiti ụmụ ndị inyom Kenan. (Jenesis 28:1, 2) Ribeka ekwuola otú ọ dị ya. Di na nwunye a enweela ike ịgwa ibe ha ihe dị ha n’obi banyere otu okwu metụtara ezinụlọ ha nke chọrọ nnọọ nlezianya, ha setịpụkwaara anyị ezi ihe nlereanya anyị ga-agbaso taa. Ma gịnị ma ọ bụrụ na di na nwunye ekwekọrịtaghị? Gịnị ka ha pụrụ ime?
Mgbe Unu Na-ekwekọrịtaghị
Ọ bụrụ na gị na di ma ọ bụ nwunye gị arụrịta nnọọ ụka, akwụsịla ịtụpụrụ ya ọnụ. Nke ahụ ga-apụta nnọọ otu ihe: Obi adịghị gị mma, ị chọghịkwa ka obi dị ya mma. N’agbanyeghị nke ahụ, di gị ma ọ bụ nwunye gị nwere ike gharadị ịghọtacha ihe ị chọrọ na ihe dị gị n’obi.
Ọ pụrụ ịdị mkpa ka gị na di ma ọ bụ nwunye gị kwurịta ya. Ya bụrụ okwu na-akpasu iwe, o nwere ike ọ gaghị adị mfe iji nwayọọ kwurịta ya. Ọ dị mgbe nne na nna Aịzik, bụ́ Ebreham na Sera, nwere nsogbu tara akpụ otú ahụ. N’ihi na Sera bụ nwanyị aga, o mere ihe kwekọrọ n’omenala oge ahụ ma nye Ebreham ohu ya nwanyị, bụ́ Hega, ka ọ lụwa iji mụtara ya nwa. Hega mụtaara Ebreham otu nwa nwoke aha ya bụ Ishmael. Otú ọ dị, Sera n’onwe ya mesịrị tụrụ ime ma mụtara Ebreham nwa nwoke, bụ́ Aịzik. Mgbe a na-achọ ịnapụ Aịzik ara, Sera chọpụtara na Ishmael nọ na-akwa nwa ya nwoke emo. N’ihi ya, Sera chere na ihe nwere ike ime nwa ya ma gwa Ebreham ka ọ chụpụ ohu nwanyị a na Ishmael. Ee, Sera kwuru hoo haa ihe dị ya n’obi. Ma ihe ọ rịọrọ Ebreham ka o mee dị nnọọ njọ n’anya Ebreham.
Olee otú e si dozie okwu ahụ? Bible na-ekwu, sị: “Chineke wee sị Ebreham, Ka ọ ghara ịjọ njọ n’anya gị n’ihi nwa okoro a, na n’ihi ohu gị nwanyị: ihe nile Sera na-asị gị mee, gee ntị n’olu ya; n’ihi na ọ bụ n’ime Aịzik ka a ga-akpọrọ gị mkpụrụ.” Ebreham ṅara ntị ná ntụziaka ahụ Jehova Chineke nyere ya ma mee ihe ọ gwara ya mee.—Jenesis 16:1-4; 21:1-14.
Ị pụrụ ikwu, sị: ‘Ee, ya bụrụ na Chineke ga-esi n’eluigwe gwa anyị okwu, ọ ga-adịrị anyị mfe ikwekọrịta!’ Nke ahụ na-eweta anyị n’ihe ọzọ dị mkpa ga-enyere anyị aka idozi nsogbu n’alụmdi na nwunye anyị. Ndị di na nwunye nwere ike ige Chineke ntị. Olee otú ha ga-esi mee nke ahụ? Ọ bụ site n’ịgụkọ Okwu Chineke ọnụ na ịnabata ihe ọ na-ekwu dị ka ntụziaka sitere n’aka Chineke.—1 Ndị Tesalonaịka 2:13.
Taịtọs 2:3-5) Ihe ahụ ọ chọpụtara pụrụ ịbara anyị nile uru. Gị na di ma ọ bụ nwunye gị kwesịrị ịdị na-agụchi Okwu Chineke anya. Site n’ime otú ahụ, unu ga ‘na-anụ’ okwu Chineke ka ọ na-agwa unu otú unu ga-esi na-akpa àgwà kwa ụbọchị. (Aịsaịa 30:21) Ma ọ dị otu ihe ị ga-akpachara anya ka ị ghara ime: Ejila Bible mere ụtarị ị na-eji apịa di ma ọ bụ nwunye gị, mgbe nile, gị ana-agwa ya akụkụ Akwụkwọ Nsọ ọ na-adịghị etinye n’ọrụ. Kama nke ahụ, gbalịanụ ịhụ otú unu abụọ pụrụ isi tinye ihe ndị unu na-agụ n’ọrụ.
Otu Onye Kraịst lụrụla di ruo ọtụtụ afọ kwuru, sị: “Ọtụtụ mgbe, mgbe nwa agbọghọ lụrụ di ọhụrụ bịakwutere m ka m nye ya ndụmọdụ banyere alụmdi na nwunye ya, m na-ajụ ya ma ya na di ya hà na-agụkọ Bible ọnụ. Ihe ka ọtụtụ n’ime ndị nwere nsogbu n’alụmdi na nwunye ha anaghị agụkọ Bible ọnụ.” (Ọ bụrụ na unu na-achọ ịmata otú unu ga-esi dozie otu nsogbu siri ike unu nwere, gịnị ma unu chọọ ihe banyere nsogbu ahụ unu nwere na Watch Tower Publications Index? * Ikekwe unu na-elekọta nne na nna merela agadi, ya ana-akpatakwa esemokwu n’alụmdi na nwunye unu. Kama ịrụwa ụka banyere ihe di gị ma ọ bụ nwunye gị kwesịrị ịdị na-eme na ihe ndị ọ na-ekwesịghị ịdị na-eme, gịnị ma unu abụọ nọdụ ọdụ tụlekọọ Index ahụ ọnụ? Burunụ ụzọ chọọ isiokwu bụ́ “Parents” (Nne na Nna). Unu nwere ike ịgụ akwụkwọ ndị a kpọtụrụ uche n’okpuru obere isiokwu ndị dị ka “caring for aged parents” (ilekọta ndị nne na nna merela agadi). Gụkọọnụ akwụkwọ Ndịàmà Jehova bipụtara bụ́ ndị kwuru banyere ya ọnụ. Uru gị na di ma ọ bụ nwunye gị ga-erite n’ihe ọmụma ndị ahụ dabeere na Bible pụrụ ịtụ unu n’anya, otu ihe ọmụma ahụ enyewokwara ọtụtụ Ndị Kraịst nwere obi eziokwu aka.
Ịchọ ihe n’akwụkwọ ndị a na ịgụ ebe ndị ha sịrị unu gụọ ga-enyere unu aka ile nsogbu unu anya n’ụzọ kwesịrị ekwesị. Unu ga-ahụ akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị gosiri ihe bụ́ echiche Chineke, ma ndị e hotara ehota ma ndị e zoro aka na ha. Chọtanụ ha na Bible, ma gụkọọnụ ha ọnụ. Ee, unu ga-anụ ihe Chineke kwuru banyere nsogbu ahụ unu nwere!
Nọgidenụ Na-agwa Ibe Unu Ihe Dị Unu n’Obi
Ọ̀ dịtụla mgbe ị nwara imepe ibo ụzọ a na-emepebeghị ruo oge ụfọdụ? Ibo ụzọ ahụ emee ụzụ ka ọ na-emepe n’ihi na ihe ndị ji ya ataala nchara. Ma gịnị ma ọ bụrụ na a na-emepe ụzọ ahụ mgbe nile ma na-atụ ihe ndị ahụ ji ya mmanụ nke ọma? Ọ gaara adị mfe mmepe. Otú ahụ ka ụzọ nke nkwurịta okwu dịkwa. Ọ bụrụ na unu na-agbalị iji ịhụnanya na-ekwu echiche unu mgbe nile dị ka Ndị Kraịst, ọ ga na-adịrị unu mfe ikwu ihe dị unu n’obi ọbụna mgbe unu nwere nnukwu nghọtahie.
Malitegodịnụ amalite. Ọ bụ ezie na nkwurịta okwu nwere ike isi ike na mbụ, rụọ ọrụ na ya. Ị ga-enwezi ike ime ka mmekọrịta nke gị na di ma ọ bụ nwunye gị dịkwuo mma, nke ahụ ga-emekwa ka unu nọgide na-aghọta ibe unu.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 22 Nke Ndịàmà Jehova bipụtara.
[Foto dị na peeji nke 7]
Mgbe unu na-ekwekọrịtaghị, ùnu ga-achọ nduzi Chineke?