Ka Aka Unu Dị Ike
Ka Aka Unu Dị Ike
“Ka aka unu dị ike, unu ndị na-anụ n’ụbọchị ndị a okwu ndị a n’ọnụ ndị amụma ahụ.”—ZEKARAỊA 8:9.
1, 2. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji nwee mmasị n’akwụkwọ Hagaị na Zekaraịa?
N’AGBANYEGHỊ na e dere amụma Hagaị na Zekaraịa ihe dị ka puku afọ abụọ na narị ise gara aga, ha metụtara nnọọ ndụ gị. Akụkọ Bible ndị a kọrọ n’akwụkwọ abụọ a abụghị akụkọ ihe mere eme nkịtị. Ha so ‘n’ihe nile e dere tupu oge ha eruo iji nye anyị ntụziaka.’ (Ndị Rom 15:4) Ihe ka ọtụtụ n’ime ihe ndị anyị na-agụ na ha na-eme ka anyị na-eche banyere ihe ndị nọworo nnọọ na-eme kemgbe e guzobere Alaeze ahụ n’afọ 1914.
2 Pọl onyeozi kwuru banyere ọnọdụ ndị ohu Chineke nọrọ na ya ogologo oge gara aga na ihe ndị dakwasịrị ha, sị: “Ihe ndị a nọgidekwara na-adakwasị ha dị ka ihe atụ, e dekwara ha ede ka ha bụrụ ihe ịdọ aka ná ntị nye anyị bụ́ ndị ọgwụgwụ nke usoro ihe dị iche iche bịakwasịworo.” (1 Ndị Kọrint 10:11) N’ihi ya, ị pụrụ ịjụ, sị, ‘Olee uru akwụkwọ Hagaị na Zekaraịa bara n’oge anyị?’
3. Na gịnị ka Hagaị na Zekaraịa lekwasịrị anya?
3 Dị ka isiokwu bú ụzọ si kwuo, amụma Hagaị na Zekaraịa kwuru banyere oge ndị Juu laghachiri n’ala Chineke nyere ha n’oge a tọhapụsịrị ha n’agbụ na Babilọn. Ndị amụma abụọ ahụ lekwasịrị anya n’ọrụ iwughachi ụlọ nsọ ahụ. Ndị Juu tọrọ ntọala ụlọ nsọ ahụ n’afọ 536 T.O.A. Ọ bụ ezie na ụfọdụ ndị Juu meworo okenye lekwasịrị anya n’otú ụlọ ahụ dị na mbụ, ihe ka ọtụtụ ná ndị Juu ‘tiri mkpu ọṅụ.’ Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na ihe dị ịrịba ama ọbụna karịa nke ahụ emewo n’oge anyị a. N’ụzọ dị aṅaa?—Ezra 3:3-13.
4. Olee ihe merenụ n’oge na-adịghị anya ka Agha Ụwa Mbụ bisịrị?
4 Oge na-adịghị anya ka Agha Ụwa Mbụ bisịrị, a tọhapụrụ ndị Jehova e tere mmanụ n’agbụ nke Babilọn Ukwu ahụ. Nke ahụ bụ ihe gbara ọkpụrụkpụ na-egosi na Jehova na-akwado ha. Tupu mgbe ahụ, ọ bịara yie ka ndị ndú okpukpe na ndị enyi ha bụ́ ndị ọchịchị hà emewo ka ọrụ nkwusa na nke izi ihe nke Ndị Mmụta Bible na-arụ kwụsị. (Ezra 4:8, 13, 21-24) Ma, Jehova Chineke wepụrụ ihe ndị na-egbochi ọrụ nkwusa na nke ime ndị na-eso ụzọ ahụ. N’ime ọtụtụ iri afọ ndị gafeworonụ kemgbe afọ 1919, ọrụ Alaeze ahụ agawo n’ihu, ọ dịbeghịkwa ihe nweworo ike igbochi ya.
5, 6. Olee ihe gbara ọkpụrụkpụ a rụzuru bụ́ nke Zekaraịa 4:7 na-ekwu banyere ya?
5 Anyị nwere obi ike na ọrụ nkwusa na nke izi ihe ndị ohu Jehova na-erube isi na-arụ ga-anọgide na-aga n’ihu site ná nkwado Jehova. Anyị na-agụ na Zekaraịa 4:7, sị: “Ọ ga-ewepụtakwa nkume nke elu n’itiri ya oké mkpu, sị, Amara, amara.” Olee ihe gbara ọkpụrụkpụ a rụzuru n’oge anyị nke ebe a na-ekwu banyere ya?
6 Zekaraịa 4:7 na-ekwu banyere oge a ga-eme ka ezi ofufe nke Eze Kachasị Elu zuo okè n’akụkụ ụlọ nsọ ime mmụọ ya nke dị n’elu ala. Ụlọ nsọ ahụ bụ ndokwa Jehova mere maka ife ya ofufe dabere n’àjà ịjụrụ obi nke Kraịst Jizọs. N’eziokwu, oké ụlọ nsọ ime mmụọ ahụ adịwo adị kemgbe narị afọ mbụ O.A. Otú ọ dị, ezi ofufe a na-efe n’akụkụ ya nke dị n’elu ala ezubeghị okè. Ọtụtụ nde ndị na-efe Chineke ofufe na-eje ozi ugbu a n’akụkụ ụlọ nsọ ime mmụọ ahụ nke dị n’elu ala. A ga-eme ka ndị a na ọtụtụ ìgwè mmadụ a ga-akpọlite n’ọnwụ zuo okè n’oge Ọchịchị Puku Afọ nke Jizọs Kraịst. N’ọgwụgwụ puku afọ ahụ, ọ bụ nanị ndị na-efe Chineke ezi ofufe ga-afọdụ n’ụwa nke a ga-eme ka ọ dị ọcha.
7. Ọrụ dị aṅaa ka Jizọs na-arụ n’ime ka ezi ofufe zuo okè n’oge anyị, oleekwa ihe mere nke ahụ kwesịrị iji gbaa anyị ume?
7 Gọvanọ Zerubabel na Jọshụa Onyeisi Nchụàjà nọ ya mgbe e wuchara ụlọ nsọ ahụ n’afọ 515 T.O.A. Zekaraịa 6:12, 13 buru amụma banyere ọrụ yiri nke ahụ nke Jizọs ga-arụ n’ime ka ezi ofufe zuo okè, sị: “Otú a ka Jehova nke usuu nile nke ndị agha kwuru, sị, Lee, otu onye nke Ihe opupu bụ aha ya; ọ bụkwa n’ọnọdụ ya ka ọ ga-esi puo, ọ ga-ewukwa ụlọ nsọ Jehova: . . . ọ bụkwa ya onwe ya ga-eburu ebube nile, nọdụ na-achị n’ocheeze ya; otu onye nchụàjà ga-adịkwa n’ocheeze ya.” Ebe ọ bụ na Jizọs, bụ́ onye nọ n’eluigwe na-eme ka usoro ndị eze sitere n’eriri Devid na-epu, na-akwado ọrụ Alaeze ahụ a na-arụ n’ụlọ nsọ ime mmụọ ahụ, ì chere na ọ dị onye pụrụ igbochi ọrụ ahụ? N’ezie, ọ dịghị onye ọ bụ! Ọ̀ bụ na nke a ekwesịghị ịgba anyị ume ịga n’ihu n’ozi anyị, n’ekweghị ka nchegbu nke ndụ a na-adị kwa ụbọchị dọpụ uche anyị na ya?
Ihe Ndị Ka Mkpa
8. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji bute ọrụ ụlọ nsọ ime mmụọ ahụ ụzọ ná ndụ anyị?
8 Iji nweta nkwado na ngọzi Jehova, anyị aghaghị ibute ọrụ ụlọ nsọ ime mmụọ ahụ ụzọ ná ndụ anyị. Anyị ekwesịghị ịdị ka ndị Juu ahụ sịrị, ‘Oge erubeghị,’ kama anyị aghaghị icheta na anyị bi “n’ụbọchị ikpeazụ.” (Hagaị 1:2; 2 Timoti 3:1) Jizọs buru amụma na ndị na-eso ụzọ ya na-ekwesị ntụkwasị obi ga-ekwusa ozi ọma nke Alaeze ahụ ma mee ndị na-eso ụzọ. Anyị aghaghị ịkpachara anya ka anyị ghara ileghara ihe ùgwù a e nyeworo anyị nke ikwusa ozi ọma anya. Ọrụ nkwusa na izi ihe a nke mmegide ndị ụwa kwụsịtụrụ ruo nwa oge, maliteghachiri n’afọ 1919, ọ gwụbeghịkwa. Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na a ga-arụcharịrị ya!
9, 10. Na gịnị ka ngọzi Jehova dabeere, gịnịkwa ka nke ahụ pụtara nye anyị?
9 Ruo ókè anyị nọgidere jiri ịnụ ọkụ n’obi na-arụ ọrụ ahụ, otú ahụ ka a ga-esi gọzie anyị—n’ìgwè nakwa n’otu n’otu. Tụlee Hagaị 2:19) Mmekọrịta ha na Jehova ga-adịghachi mma otú ọ dịbu. Ugbu a tụlee ngọzi ndị Chineke kwere ha ná nkwa: “Mkpụrụ udo ga-adị; osisi vaịn ga-amị mkpụrụ ya, ala emeekwa ihe omume ya, eluigwe ga-enyekwa igirigi ha; M ga-emekwa ka ndị nke a fọdụrụ keta ihe ndị a nile.”—Zekaraịa 8:9-13.
nkwa Jehova kwere bụ́ nke pụrụ imesi anyị obi ike. Ozugbo ndị Juu ji obi ha dum laghachi n’ofufe Chineke ma jiri ịdị uchu maliteghachi ọrụ ịtọ ntọala ụlọ nsọ ahụ, Jehova kwuru, sị: “Site n’ụbọchị taa ka M ga na-agọzi unu.” (10 Dị nnọọ ka Jehova gọziri ndị Juu ma n’ụzọ ime mmụọ ma n’ụzọ ihe onwunwe, otú ahụ ka ọ ga-agọzi anyị ka anyị ji obi ụtọ na ịdị uchu na-arụ ọrụ o nyere anyị. Ngọzi ndị a gụnyere inwe udo n’etiti onwe anyị, obi iru ala, inwe ọganihu, na ito eto n’ụzọ ime mmụọ. Ma, o doro anya na iji nọgide na-enweta ngọzi Chineke, anyị aghaghị ịrụ ọrụ n’ụlọ nsọ ime mmụọ ahụ n’ụzọ Jehova chọrọ ka e si na-arụ ya.
11. Olee otú anyị pụrụ isi chebara ndụ anyị echiche?
11 Ugbu a bụ oge anyị kwesịrị ‘ịtụkwasị obi anyị n’ụzọ nile anyị.’ (Hagaị 1:5, 7) Anyị kwesịrị ịnọrọ ọdụ ma chebara ihe ndị anyị weere dị ka ihe ndị ka mkpa ná ndụ echiche. Ngọzi Jehova na-agọzi anyị taa na-adabere n’ókè otuto anyị na-ewetara aha ya hà, nakwa n’anyị ịga n’ihu n’ọrụ anyị na-arụ n’ụlọ nsọ ime mmụọ ya. I kwesịrị ịjụ onwe gị, sị: Ihe ndị m weere dị ka ihe ndị ka mkpa ná ndụ hà agbanweela? Àna m anụrụ Jehova, eziokwu ya na ọrụ ya, ọkụ n’obi ugbu a otú m nụrụ mgbe m mere baptizim? Mmasị m nwere ná ndụ ntụsara ahụ́, ọ̀ na-emetụta oge m ji ejere Jehova na Alaeze ya ozi? Egwu mmadụ—nchegbu banyere ihe ndị ọzọ ga-eche—ọ̀ na-egbochi m n’ụzọ ụfọdụ?’—Mkpughe 2:2-4.
12. Ọnọdụ dị aṅaa dị n’etiti ndị Juu ka e kwuru banyere ya na Hagaị 1:6, 9?
12 Anyị achọghị ka Chineke kwụsị ịgọzi anyị n’ihi na anyị leghaara ọrụ nke ibuli aha ya elu anya. Cheta na dị ka Hagaị 1:9 si kwuo, mgbe ndị Juu ahụ e mere ka ha laghachi n’ala ha jisịrị ịnụ ọkụ n’obi malite ọrụ n’ụlọ nsọ ahụ, ha ‘gbara ọsọ, onye ọ bụla ọ gbakwuru ụlọ nke aka ya.’ Mkpa ha na ọrụ ha na-arụ kwa ụbọchị bịaziri ka ha mkpa. N’ihi ya, ha ‘webatara ihe dị nta,’ ha enweghị ezi nri na mmanya ga-ezuru ha, ha enweghịkwa uwe ga-eme ka ahụ́ kpoo ha ọkụ. (Hagaị 1:6) Jehova kwụsịrị ịgọzi ha. Ọ̀ dị ihe anyị pụrụ ịmụta na nke a?
13, 14. Olee otú anyị pụrụ isi tinye ndụmọdụ dị na Hagaị 1:6, 9 n’ọrụ, n’ihi gịnịkwa ka nke ahụ ji dị mkpa?
13 Ọ̀ bụ na i kwetaghị na iji nọgide na-enweta ngọzi Chineke, anyị aghaghị ịkwụsị ịchụso ihe nke aka anyị ruo n’ókè nke ileghara ofufe Jehova anya? Otú ahụ ka ọ dịkwa ma ihe na-adọpụ uche anyị ọ̀ bụ ịchụso ihe onwunwe, atụmatụ achụmnta ego zụọ taa
baa echi, ịchụso atụmatụ maka ịgụtụkwu akwụkwọ iji nweta ezigbo ọrụ n’usoro ihe a, ma ọ bụ ihe omume ndị anyị ji emezu ihe ndị na-agụ anyị.14 E nwere ike ihe ndị dị otú ahụ n’onwe ha adịghị njọ. Otú ọ dị, ị́ hụghị na ihe ndị ahụ bụ nnọọ ‘ọrụ nwụrụ anwụ’ ma e jiri ha tụnyere ndụ ebighị ebi? (Ndị Hibru 9:14) N’ụzọ dị aṅaa? Ha bụ ọrụ nwụrụ anwụ, bụrụ ihe efu, na ihe na-adịghị amịpụta mkpụrụ ma a bịa n’ofufe anyị na-efe Chineke. Mmadụ ịnọgide na-arụ ọrụ ndị dị otú ahụ pụrụ ime ka ọ kwụsị iso Chineke na-emekọrịta ihe. Ihe dị otú ahụ mere ụfọdụ Ndị Kraịst e tere mmanụ n’oge ndịozi. (Ndị Filipaị 3:17-19) O mewo ụfọdụ ndị n’oge anyị a. Ma eleghị anya, ọ dị ụfọdụ ndị ị maara e ji nke nta nke nta dọpụ uche ha n’ebe ọrụ Ndị Kraịst na n’ebe ọgbakọ dị; ugbu a, ha adịghị eche echiche ịlaghachi n’ozi Jehova. N’ezie, anyị nwere nnọọ olileanya na ndị dị otú ahụ ga-alaghachikwute Jehova, ma nke bụ́ eziokwu bụ na ịchụso ‘ọrụ nwụrụ anwụ’ pụrụ ime ka Jehova kwụsị ịgọzi anyị. Ị maara na nke ahụ ga-ajọgbu onwe ya. Nke ahụ pụtara na onye ahụ agaghịzi enwe udo na ọṅụ mmụọ nsọ Chineke na-enye. Leekwa ihe jọgburu onwe ya ọ ga-abụ ịgharazi iso n’òtù ụmụnna na-ahụ n’anya nke Ndị Kraịst!—Ndị Galeshia 1:6; 5:7, 13, 22-24.
15. Olee otú Hagaị 2:14 si gosi mkpa ofufe anyị dị?
15 Okwu a abụghị obere okwu. Tụlee Hagaị 2:14 iji hụ otú Jehova si lee ndị Juu anya bụ́ ndị leghaara ụlọ ofufe ya anya iji jiri osisi machite ụlọ nke ha, ma hà mere otú ahụ n’ụzọ nkịtị ma ọ bụ n’ụzọ ihe atụ. O kwuru, sị: “Otú a ka ndị nke a dị, ọ bụkwa otú a ka mba nke a dị n’ihu m; (ọ bụ ihe si n’ọnụ Jehova pụta); ọ bụkwa otú a ka ọrụ ọ bụla nke aka ha dị; ọzọ, ihe ha na-eweta nso n’ebe ahụ, ihe rụrụ arụ ka ọ bụ.” Jehova anaraghị àjà ọ bụla ndị Juu chụrụ n’ebe ịchụàjà ahụ dịrị nwa oge na Jeruselem iji mezuo iwu, ebe ọ bụ na ha leghaara ezi ofufe anya.—Ezra 3:3.
Chineke Kwere Nkwa Ịkwado Ha
16. Dabere n’ọhụụ ndị Zekaraịa hụrụ, olee ihe ndị Juu ga-ejide n’aka?
16 Chineke ji ọhụụ asatọ Zekaraịa hụrụ mesie ndị Juu na-erube isi, bụ́ ndị rụrụ ọrụ n’iwughachi ụlọ nsọ ya, obi ike na ya ga-akwado ha. Ọhụụ nke mbụ mere ka obi sie ndị Juu ike na a ga-arụcha ụlọ nsọ ahụ nakwa na Jeruselem na Juda ga-enwe ihe ịga nke ọma ma ọ bụrụhaala na ha ejiri nrubeisi rụọ ọrụ ahụ ha ji n’aka. (Zekaraịa 1:8-17) N’ọhụụ nke abụọ, e kwere nkwa na a ga-akwatu ọchịchị nile na-emegide ezi ofufe. (Zekaraịa 1:18-21) N’ọhụụ ndị nke ọzọ, e mere ka obi sie ha ike na Chineke ga-echebe ha ka ha na-arụ ọrụ iwu ihe ahụ, na a ga-enwe ụbara mmadụ ndị si n’ọtụtụ mba ga-enubata n’ụlọ ofufe Jehova ma a rụchaa ya, na ha ga-anọ n’ezi udo na ntụkwasị obi, na ha ga-emeri ihe ndị na-egbochi ọrụ ahụ Chineke nyere ha bụ́ ndị yiri ka a pụghị imeri ha emeri, na a ga-ewepụ ajọ omume, nakwa na ndị mmụọ ozi ga na-elekọta ma na-echebe ha. (Zekaraịa 2:5, 11; 3:10; 4:7; 5:6-11; 6:1-8) Ebe ọ bụ na Chineke mesiri ndị na-erube isi n’ime ndị Juu ahụ obi ike na ya ga-akwado ha, ha gbanwere ụzọ ndụ ha ma lekwasị anya kpọmkwem n’ọrụ ahụ Chineke ji maka ya tọhapụ ha n’agbụ.
17. N’ihi otú e si mesie anyị obi ike, gịnị ka anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị?
17 N’otu aka ahụ, mmesi e mesiri anyị obi ike na ezi ofufe ga-emesị nwee mmeri kwesịrị
ịkpali anyị ịrụsi ọrụ ike, kpaliekwa anyị ichesi echiche ike banyere ụlọ ofufe Jehova. Jụọ onwe gị, sị: ‘Ọ bụrụ na m kweere na ugbu a bụ oge ịrụ ọrụ ikwusa ozi ọma Alaeze ahụ na ime ndị na-eso ụzọ, ihe mgbaru ọsọ m na ụzọ m si ebi ndụ hà kwekọrọ n’ihe ahụ m kweere? Àna m etinye oge kwesịrị ekwesị n’ịmụ Okwu amụma Chineke, na-etinye uche m na ya, ma soro Ndị Kraịst ibe m na ndị ọzọ m na-ezute na-ekwurịta ya?’18. Dị ka Zekaraịa isi 14 si kwuo, gịnị ga-eme n’ọdịnihu?
18 Zekaraịa kwuru banyere mbibi a ga-ebibi Babilọn Ukwu ahụ nakwa agha Amagedọn nke ga-esochi ya. Anyị na-agụ, sị: “Ọ ga-abụ otu ụbọchị nke Jehova maara; ọ bụghị ehihie, ọ bụghịkwa abalị: ma ọ ga-eru, na ìhè ga-adị na mgbe anyasị.” Ee, ụbọchị Jehova ga-abụ n’ezie ụbọchị gbara ọchịchịrị, nke na-atụ oyi nye ndị iro ya nọ n’ụwa! Ma, ọ ga-abụ oge ndị ji ikwesị ntụkwasị obi na-efe Jehova ga-anọgide na-enweta ìhè na ngọzi ya. Zekaraịa kọwakwara otú ihe nile nọ n’ụwa ọhụrụ ahụ ga-esi na-ekwupụta ịdị nsọ Jehova. Ezi ofufe a na-efe Chineke n’oké ụlọ nsọ ime mmụọ ya ga-abụ nanị ofufe dị n’ụwa. (Zekaraịa 14:7, 16-19) Lee nkwa siri ike nke ahụ bụ! Anyị ga-ahụ mmezu nke ihe ndị e buru n’amụma, hụkwa ka e gosipụtara oruru o ruuru Jehova ịbụ eze. Ụbọchị Jehova ga-abụ nnọọ ụbọchị pụrụ iche!
Ngọzi Ndị Ga-adịgide Adịgide
19, 20. N’ihi gịnị ka Zekaraịa 14:8, 9 ji bụrụ ihe agbamume nye gị?
19 A rụchaa ihe ahụ dị ịtụnanya, a ga-atụba Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya n’abis nke bụ́ ọnọdụ arụghị ọrụ. (Mkpughe 20:1-3, 7) Mgbe ahụ ụmụ mmadụ ga-enweta ngọzi n’ụba n’oge Ọchịchị Puku Afọ Kraịst. Zekaraịa 14:8, 9 na-ekwu, sị: “Ọ ga-erukwa, n’ụbọchị ahụ, na mmiri na-enye ndụ ga-esi na Jeruselem rupụta; nkera ha ga-eruga n’oké osimiri Ihu anyanwụ, nkera ha ga-erugakwa n’oké osimiri Ọdịda anyanwụ: na mgbe okpomọkụ na na mgbe oyi ka ọ ga-adị. Jehova ga-aghọkwa eze elu ụwa nile: n’ụbọchị ahụ ka Jehova ga-adị otu, aha Ya ga-adịkwa otu.”
20 “Mmiri na-enye ndụ,” ma ọ bụ “osimiri nke mmiri nke ndụ,” bụ́ nke na-ese onyinyo ndokwa ndị Jehova mere maka ndụ, ga-anọgide na-esi n’ebe Alaeze Mezaịa ahụ si achị, na-erupụta. (Mkpughe 22:1, 2) Oké ìgwè mmadụ na-efe Jehova ofufe, bụ́ ndị lanahụrụ Amagedọn, ga-erite uru site n’ịbụ ndị a tọhapụrụ n’ikpe ọnwụ nke mmehie Adam kpatara. Ọbụna ndị nwụrụla anwụ ga-erite uru n’ihi na a ga-akpọlite ha n’ọnwụ. Otú ahụ ka ịchịisi ọhụrụ nke Jehova ga-esi bido n’elu ụwa nile. Mmadụ nile nọ n’ụwa ga-amara Jehova dị ka Eze Eluigwe na Ala na onye e kwesịrị ife nanị ya ofufe.
21. Gịnị ka anyị kwesịrị ikpebisi ike ime?
21 N’ihi ihe nile Hagaị na Zekaraịa buru n’amụma na ihe nile mezuworonụ, anyị nwere ezi ihe mere anyị ga-eji were ọrụ Chineke nyere anyị ịrụ n’akụkụ ụlọ nsọ ime mmụọ ya dị n’elu ala gaa n’ihu. Ka anyị na-atụ anya mgbe a ga-eme ka ezi ofufe zuo okè, ka anyị nile na-agbalịsi ike ibute ihe ndị metụtara Alaeze ahụ ụzọ. Zekaraịa 8:9 na-agba anyị ume, sị: “Ka aka unu dị ike, unu ndị na-anụ n’ụbọchị ndị a okwu ndị a n’ọnụ ndị amụma ahụ.”
Ì Chetara?
• Olee ọnọdụ dị n’oge ochie, nke e nwekwara taa nke mere ka akwụkwọ Hagaị na Zekaraịa baa uru n’oge anyị a?
• Gịnị ka akwụkwọ Hagaị na Zekaraịa na-akụziri anyị banyere ihe ndị ka mkpa ná ndụ?
• N’ihi gịnị ka ịtụle amụma Hagaị na Zekaraịa ga-eji mee ka anyị nwee obi ike banyere ọdịnihu?
[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]
[Foto dị na peeji nke 26]
Hagaị na Zekaraịa gbara ndị Juu ume iji obi ha dum rụọ ọrụ ma nweta ngọzi
[Foto ndị dị na peeji nke 27]
Ị̀ ‘na-agba ọsọ, gbakwuru ụlọ nke aka gị’?
[Foto dị na peeji nke 28]
Jehova kwere nkwa ịgọzi ndị ya, ọ gọziwokwa ha