Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Mụ Onwe M Nọnyeere Unu”

“Mụ Onwe M Nọnyeere Unu”

“Mụ Onwe M Nọnyeere Unu”

“Onye ozi Jehova, wee . . . sị, Mụ onwe m nọnyeere unu; ọ bụ ihe si n’ọnụ Jehova pụta.”—HAGAỊ 1:13.

1. Olee ihe na-ese onyinyo ihe ndị ga-eme n’oge anyị a ndị Jizọs kwuru banyere ha?

ANYỊ bi n’oge dị ịrịba ama n’akụkọ ihe mere eme. Dị ka mmezu nke amụma Bible na-egosi, anyị nọ “n’ụbọchị Onyenwe anyị” kemgbe afọ 1914. (Mkpughe 1:10) Ma eleghị anya, ị maara amụma Bible ndị na-egosi na anyị nọ n’ụbọchị Onyenwe anyị, marakwa na Jizọs ji ‘ụbọchị Nwa nke mmadụ’ bụ́ mgbe ọ ga na-achị achị n’Alaeze ahụ tụnyere ‘ụbọchị Noa’ na ‘ụbọchị Lọt.’ (Luk 17:26, 28) Bible si otú ahụ gosi na ihe ndị ahụ na-ese onyinyo ihe ndị ga-eme n’oge anyị. Ma, e nwere ihe ọzọ ihe a e buru n’amụma na-ese onyinyo ya, bụ́ nke anyị kwesịrị nnọọ ịtụle.

2. Ọrụ dị aṅaa ka Jehova nyere Hagaị na Zekaraịa?

2 Ka anyị tụlee ọnọdụ dịrị n’oge ndị amụma Hibru bụ́ Hagaị na Zekaraịa. Ozi dị aṅaa ka ndị amụma abụọ ahụ kwesịrị ntụkwasị obi ziri bụ́ nke metụtara ndị Jehova n’oge anyị? Hagaị na Zekaraịa bụ ‘ndị ozi Jehova’ o zigaara ndị Juu ka ha sichara n’ebe a dọọrọ ha n’agha na Babilọn lọta. E nyere ha ọrụ imesi ụmụ Izrel obi ike na Chineke ga-enyere ha aka ka ha na-ewughachi ụlọ nsọ ahụ. (Hagaị 1:13; Zekaraịa 4:8, 9) Ọ bụ ezie na akwụkwọ ndị a Hagaị na Zekaraịa dere etoghị ogologo, ha bụ akụkụ nke “Akwụkwọ Nsọ dum [nke] sitere n’ike mmụọ nsọ Chineke, baakwa uru maka izi ihe, maka ịdọ aka ná ntị, maka ime ka ihe guzozie, maka inye ọzụzụ n’ezi omume.”—2 Timoti 3:16.

Anyị Kwesịrị Ichebara Ha Echiche

3, 4. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji nwee mmasị n’ozi Hagaị na Zekaraịa?

3 N’ezie, ozi Hagaị na Zekaraịa baara ndị Juu biri n’oge ha uru, amụma ha mezukwara n’oge ahụ. Ma Olee ihe mere anyị pụrụ iji jide n’aka na akwụkwọ abụọ ahụ metụtara anyị taa? Anyị na-achọta ihe ga-enyere anyị aka inweta azịza ya ná Ndị Hibru 12:26-29. N’ebe ahụ, Pọl onyeozi hotara Hagaị 2:6, bụ́ nke na-ekwu na Chineke gaje “ime ka eluigwe na ụwa . . . mee mkpọtụ.” Nke ahụ ga-emesi ‘kwatuo ocheeze nke alaeze nile, kpochapụkwa ike nke alaeze nile nke mba nile.’—Hagaị 2:22.

4 Mgbe Pọl hotasịrị ihe Hagaị kwuru, o kwuru ihe gaje ime “alaeze nile nke mba nile,” kwuokwa na Alaeze ahụ a na-apụghị ịkwatu akwatu, bụ́ nke Ndị Kraịst e tere mmanụ ga-enweta, ka alaeze nile nke mba nile elu. (Ndị Hibru 12:28) Ihe a e kwuru n’elu na-egosi na amụma Hagaị na Zekaraịa emezubeghị mgbe e dere akwụkwọ Ndị Hibru na narị afọ mbụ Oge Anyị. Taa, a ka nwere ihe fọdụrụ ná Ndị Kraịst e tere mmanụ, bụ́ ndị ha na Jizọs ga-eso chịa n’Alaeze Mezaịa ahụ. N’ihi ya, akwụkwọ Hagaị na Zekaraịa metụtara oge anyị.

5, 6. Olee ihe ndị mere ka Hagaị na Zekaraịa dee amụma ha?

5 Akwụkwọ Ezra kọrọ ihe ụfọdụ merenụ tupu Hagaị na Zekaraịa edee amụma ha. Mgbe ndị Juu si n’ebe a dọọrọ ha n’agha na Babilọn lọta n’afọ 537 T.O.A., Gọvanọ Zerubabel na Onyeisi Nchụàjà bụ́ Jọshụa (ma ọ bụ Jeshụa) lekọtara ọrụ ịtọ ntọala nke ụlọ nsọ ọhụrụ ahụ n’afọ 536 T.O.A. (Ezra 3:8-13; 5:1) Ọ bụ ezie na nke ahụ mere ka ndị Juu ṅụrịa nnọọ ọṅụ, n’oge na-adịghị anya, ha malitere ịtụ egwu. Ezra 4:4 kwuru na ndị mmegide bụ́ “ndị ala ahụ na-eme ka aka ndị Juda ghara ịdị ike, ha na-emekwa ka ha tụọ egwu n’iwu ụlọ.” Ndị iro ahụ, karịsịa ndị Sameria, boro ndị Juu ebubo ụgha. Ndị mmegide a kpaliri eze Peshia ịmachibido ọrụ iwu ụlọ nsọ ahụ iwu.—Ezra 4:10-21.

6 Ịnụ ọkụ n’obi ha nweburu maka iwu ụlọ nsọ ahụ bịara jụọ oyi. Ndị Juu ahụ lekwasịziri anya n’ọrụ nke aka ha. Otú ọ dị, n’afọ 520 T.O.A., afọ 16 a tọsịrị ntọala ụlọ nsọ ahụ, Jehova họpụtara Hagaị na Zekaraịa iji kpalie ha ịmaliteghachi iwu ụlọ nsọ ahụ. (Hagaị 1:1; Zekaraịa 1:1) Ndị ozi Chineke na ihe àmà doro anya ha nwere na Jehova ga-akwado ha kpaliri ndị Juu ahụ ịmaliteghachi ọrụ n’ụlọ nsọ ahụ ruo mgbe a rụsịrị ya n’afọ 515 T.O.A.—Ezra 6:14, 15.

7. Olee ọnọdụ e nwere n’oge a nke kwekọrọ n’ọnọdụ e nwere n’oge ndị amụma bụ́ Hagaị na Zekaraịa?

7 Ị̀ maara ihe ihe a nile pụtara nye anyị? Anyị nwere ọrụ anyị ga-arụ bụ́ ikwusa ‘ozi ọma nke alaeze.’ (Matiu 24:14) E tinyere mgbalị dị ukwuu n’ọrụ ahụ mgbe Agha Ụwa Mbụ bisịrị. Dị nnọọ ka a tọhapụrụ ndị Juu oge ochie n’agbụ na Babilọn, otú ahụ ka e si tọhapụ ndị Jehova nke oge a n’agbụ nke Babilọn Ukwu ahụ, bụ́ alaeze ụwa nke okpukpe ụgha. Ndị Chineke e tere mmanụ tinyesiri mgbalị ike n’ọrụ ime nkwusa, izi ihe, na idute ndị mmadụ n’ezi ofufe. Taa, a ka na-arụ ọrụ ahụ, ọbụna na-arụsikwu ya ike, ma eleghịkwa anya, i so na-arụ ya. Ugbu a bụ oge e kwesịrị iji rụọ ya, n’ihi na ọgwụgwụ nke ajọ usoro ihe a dị nnọọ nso! A ghaghị ịnọgide na-arụ ọrụ a Chineke kenyere anyị ruo mgbe Jehova ga-ebibi ndị ajọ mmadụ ‘n’oké mkpagbu ahụ.’ (Matiu 24:21) Nke ahụ ga-ekpochapụ ajọ omume ma mee ka ezi ofufe zuo ụwa nile.

8. Gịnị mere anyị pụrụ iji nwee obi ike na Chineke ga-akwado ọrụ anyị?

8 Dị ka amụma Hagaị na Zekaraịa na-egosi, anyị ji n’aka na Jehova ga na-akwado ma na-agọzi anyị ka anyị ji obi anyị dum na-arụ ọrụ a. N’agbanyeghị mgbalị ụfọdụ ndị meworo iji mechie ndị ohu Chineke ọnụ ma ọ bụ iji machibido ọrụ ahụ e nyere ha ịrụ iwu, ọ dịbeghị gọọmenti nweworo ike ịkwụsị ọrụ nkwusa ahụ. Cheedị echiche banyere otú Jehova siworo gọzie ọrụ Alaeze ahụ site n’ime ka ọ na-amụba amụba kemgbe a lụsịrị Agha Ụwa Mbụ ruo nnọọ n’oge anyị. Ma, a ka nwere ọrụ dị ukwuu a ga-arụ.

9. Ọnọdụ dị aṅaa e nwere n’oge ochie ka anyị kwesịrị ichebara echiche, n’ịhị gịnịkwa?

9 Olee otú ihe anyị mụtara n’akwụkwọ Hagaị na Zekaraịa ga-esi kpalikwuo anyị irube isi n’iwu ahụ Chineke nyere anyị ikwusa ozi ọma na izi ihe? Ka anyị tụlee ụfọdụ n’ime ihe ndị anyị pụrụ ịmụta n’akwụkwọ Bible abụọ ndị a. Dị ka ihe atụ, tụlee ihe ole na ole metụtara owuwu nke ụlọ nsọ ahụ bụ́ nke ndị Juu ahụ e mere ka ha laghachi n’ala ha gaje ịrụ. Dị ka anyị kwurula, ndị Juu ahụ si na Babilọn lọghachi Jeruselem anọgideghị n’ọrụ iwu ụlọ nsọ ahụ. Ha kwụsịrị ọrụ ahụ mgbe ha tọsịrị ntọala ya. Echiche dị aṅaa hiere ụzọ ka ha bịara nwee? Gịnịkwa ka anyị pụrụ ịmụta site na nke ahụ?

Inwe Echiche Ziri Ezi

10. Olee echiche hiere ụzọ ndị Juu bịara nwee, gịnịkwa si n’ime ya pụta?

10 Ndị Juu ahụ e mere ka ha laghachi n’ala ha nọ na-asị: ‘Oge erubeghị.’ (Hagaị 1:2) Mgbe ha bidoro ọrụ iwu ụlọ nsọ ahụ, ma tọọ ntọala ya n’afọ 536 T.O.A., ha anọghị na-asị na ‘oge erubeghị.’ Ma, n’oge na-adịghị anya, ha kwere ka mmegide nke ndị agbata obi ha na nke ndị ọchịchị gbochie ha ịrụ ọrụ ahụ. Ndị Juu malitere ilekwasị anya karị n’iwu ụlọ nke aka ha nakwa n’ịhụ na ahụ́ ruru ha ala. N’ihi ọdịiche dị n’etiti ụlọ nke aka ha e ji ezi osisi machie na ụlọ nsọ ahụ ha na-ewuchaghị ewucha, Jehova jụrụ, sị: “Ọ̀ bụ oge unu nwere, unu onwe unu, ibi n’ụlọ unu a machitere osisi, mgbe ụlọ a bụ mkpọmkpọ ebe?”—Hagaị 1:4.

11. N’ihi gịnị ka Jehova ji dụọ ndị Juu nke oge Hagaị ọdụ?

11 Ee, ndị Juu ahụ gbanwere ihe ha weere dị ka ihe ka ha mkpa. Kama ibute nzube Jehova bụ́ ka e wuo ụlọ nsọ ahụ ụzọ, ndị Chineke lekwasịrị onwe ha nakwa ụlọ nke aka ha anya. Ha leghaara owuwu nke ebe a na-anọ efe Chineke ofufe anya. Okwu Jehova e dekọrọ na Hagaị 1:5 gbara ndị Juu ahụ ume ‘ịtụkwasị obi ha n’ụzọ nile ha.’ Ihe Jehova na-agwa ha bụ ka ha chetụgodị echiche banyere ihe ha na-eme ma tụlee nsogbu ndị ha na-enwe n’ihi ebuteghị ọrụ iwu ụlọ nsọ ahụ ụzọ ná ndụ ha.

12, 13. Olee otú Hagaị 1:6 si kọwaa ọnọdụ ndị Juu, oleekwa ihe amaokwu ahụ pụtara?

12 Dị ka ị pụrụ ịtụ anya ya, ndị Juu ịghara iwere ọrụ iwu ụlọ nsọ ahụ dị ka ihe ka mkpa ná ndụ ha metụtara ha n’otu n’otu. Tụlee ihe a Chineke kwuru na Hagaị 1:6: “Unu aghawo ọtụtụ mkpụrụ, ma nke nta ka unu webatara; unu na-eri ihe, ma ọ dịghị afọ juworo unu; unu na-aṅụ ihe ọṅụṅụ, ma ọ dịghị nṅụju afọ unu ṅụjuworo; unu yiri uwe, ma ọ dịghị okpomọkụ na-ekpo mmadụ; ọzọ, onye na-arụta ụgwọ ọrụ na-arụta ụgwọ ọrụ itinye n’akpa puru epu.”

13 N’agbanyeghị na ndị Juu nọ n’ala ahụ Chineke nyere ha, ala ahụ anaghị emepụta ihe otú ha gaara achọ. Jehova kwụsịrị ịgọzi ha, dị ka o buru ụzọ dọọ ha aka ná ntị. (Deuterọnọmi 28:38-48) Ebe Jehova na-adịghịzi akwado ndị Juu ahụ, ha ghara mkpụrụ, ma, ọ bụ nke nta ka ha wetara n’ubi, ha enweghị nri ga-ezuru ha. Ebe ha na-enweghịzi ngọzi Jehova, ha enweghị ike iyikwasị onwe ha uwe ga-eme ka ahụ́ kpoo ha ọkụ. Ọ bịaziri yie ka ego ha na-arụta n’ọrụ ọ̀ na-abanye n’akpa pukasịrị epukasị, ha abaraghị ndị rụtara ha uru ọ bụla. Gịnịkwanụ ka okwu ahụ e kwuru bụ́ ‘Ha na-aṅụ ihe ọṅụṅụ, ma ọ dịghị nṅụju afọ ha ṅụjuworo,’ pụtara? Nke ahụ enweghị ike ịpụta na mmanya igbu ha gaara egosi na Chineke na-agọzi ha; Chineke katọrọ mmanya ogbugbu. (1 Samuel 25:36; Ilu 23:29-35) Kama nke ahụ, okwu ahụ bụ ihe ọzọ na-egosi na ha enwekwaghị ngọzi Chineke. Mmanya ọ bụla ha ga-emepụta agaghị ebu ibu, ọ gaghị ezu ezu ma ya fọdụ igbuwe ha egbuwe.

14, 15. Gịnị ka anyị na-amụta na Hagaị 1:6?

14 Ihe anyị kwesịrị ịmụta n’ihe ndị ahụ abụghị otú anyị ga-esi rụọ ụlọ ma ọ bụ chọọ ya mma. Ogologo oge tupu a dọrọ ndị Juu n’agha, Emọs onye amụma baara ndị Izrel bụ́ ndị aka ji akụ̀ mba maka ‘ụlọ ha jiri ọdụ wuo’ na maka ‘ndina ha na-edina n’elu ihe ndina ọdụ.’ (Emọs 3:15; 6:4) Ọmarịcha ụlọ ndị ahụ ha rụrụ na oche ndị ha ji chọọ ha mma anọteghị aka. Ndị iro ha meriri ha n’agha kwakọọrọ ihe ndị ahụ. N’agbanyeghị nke ahụ, ka ọtụtụ afọ gasịrị na ka ha nọsịrị afọ 70 ná ndọrọ n’agha, ọtụtụ ndị Chineke amụtaghị ihe ọ bụla n’ihe a. Ànyị ga-amụta ihe na ya? O kwesịrị ekwesị ka onye ọ bụla n’ime anyị jụọ onwe ya, sị: ‘N’eziokwu, oge hà aṅaa ka m na-etinye n’ịrụ ụlọ m na n’ịchọ ya mma? Gịnịkwanụ banyere ime ndokwa ịgakwu akwụkwọ iji nwetakwuo ọkwá n’agbanyeghị na nke ahụ pụrụ iwe m nnọọ ọtụtụ afọ, ma mee ka m leghara ihe ndị dị mkpa n’ofufe m na-efe Chineke anya?’—Luk 12:20, 21; 1 Timoti 6:17-19.

15 Ihe anyị gụrụ na Hagaị 1:6 kwesịrị ime ka anyị mata na ngọzi Chineke dị anyị mkpa ná ndụ. Ndị Juu oge ochie hụsiri anya n’ihi na ha enwetaghị ngọzi Chineke. Ma ànyị bara ọgaranya ma ọ bụ daa ogbenye, ọ bụrụ na Jehova akwụsị ịgọzi anyị, ọ ga-akpatara anyị ọdachi ime mmụọ. (Matiu 25:34-40; 2 Ndị Kọrint 9:8-12) Ma, olee otú anyị pụrụ isi nweta ngọzi ahụ?

Jehova Na-eji Mmụọ Ya Enyere Anyị Aka

16-18. Gịnị ka Zekaraịa 4:6 pụtara n’oge ochie?

16 E si n’ike mmụọ nsọ mee ka onye amụma ibe Hagaị bụ́ Zekaraịa detuoro anyị ihe Jehova ji nnọọ gbaa ụfọdụ ndị kwesịrị ntụkwasị obi ume ma gọzie ha. Nke ahụ na-egosi otú ọ ga-esikwa gọzie anyị taa. Anyị na-agụ, sị: “Ọ bụghị site n’usuu ndị agha, ọ bụghịkwa site n’ike, kama ọ bụ site na Mmụọ m, ka Jehova nke usuu ndị agha siri.” (Zekaraịa 4:6) Ma eleghị anya, ị nụwo ka e hotara amaokwu a ugboro ugboro, ma gịnị ka ọ pụtara nye ndị Juu dịrị ndụ n’oge Hagaị na Zekaraịa, n’ihi ya kwa, gịnị ka ọ pụtaara anyị?

17 Cheta na okwu Hagaị na Zekaraịa kwuru n’ike mmụọ nsọ nwere mmetụta dị egwu n’oge ahụ. Ihe ndị amụma ahụ kwuru mere ka ndị Juu kwesịrị ntụkwasị obi nweghachi ume. Hagaị malitere ibu amụma n’ọnwa nke isii nke afọ 520 T.O.A. Zekaraịa malitere nke ya n’ọnwa nke asatọ nke afọ ahụ. (Zekaraịa 1:1) Dị ka ị pụrụ ịhụ na Hagaị 2:18, e ji ịdị uchu maliteghachi ịtọ ntọala nke ụlọ nsọ ahụ n’ọnwa nke itoolu. Ya mere, a kpaliri ndị Juu ime ihe, ha rubekwaara Jehova isi, nwee obi ike na ọ ga-akwado ha. Ihe e kwuru na Zekaraịa 4:6 na-ekwu banyere nkwado Chineke.

18 Mgbe ndị Juu laghachiri n’ala ha n’afọ 537 T.O.A., ha enweghị usuu ndị agha. N’agbanyeghị nke ahụ, Jehova chebere ha ma duo ha ka ha si Babilọn na-alọta. Mmụọ ya nọkwa na-eduzi ha mgbe ha malitere ọrụ n’ụlọ nsọ ahụ n’oge na-adịghị anya ha laghachiri n’ala ha. Ozugbo ha ji ịdị uchu maliteghachi ọrụ ahụ, ọ ga-eji mmụọ nsọ ya kwado ha.

19. Olee onye dị ike mmụọ Chineke meriri?

19 Site n’ọhụụ asatọ ndị Zekaraịa hụrụ, e mesiri ya obi ike na Jehova ga-anọnyere ndị ya, bụ́ ndị ga-eji ikwesị ntụkwasị obi rụọ ọrụ ụlọ nsọ ahụ ruo ná ngwụsị. Ọhụụ nke anọ, bụ́ nke e dekọrọ n’isi nke 3, gosiri na Setan gbalịsiri ike iguzogide mgbalị ndị Juu mere iwuchapụ ụlọ nsọ ahụ. (Zekaraịa 3:1) O doro anya na Setan agaghị enwe obi ụtọ ịhụ ka Jọshụa Onyeisi Nchụàjà na-ejere ndị ahụ ozi n’ụlọ nsọ ọhụrụ. N’agbanyeghị na Ekwensu na-agbasi mbọ ike igbochi ndị Juu iwu ụlọ nsọ ahụ, mmụọ Jehova ga-arụ ọrụ dị ukwuu n’iwepụ ihe mgbochi ọ bụla nakwa n’inye ndị Juu ike ịga n’ihu ruo mgbe e wusịrị ụlọ nsọ ahụ.

20. Olee otú mmụọ nsọ si nyere ndị Juu aka imezu ihe Chineke chọrọ?

20 O yiri ka à ga-asị na e nwere ihe mgbochi a na-apụghị imeri emeri nke sitere n’aka ndị ọchịchị, bụ́ ndị machibidoro ọrụ ahụ iwu. Otú ọ dị, Jehova kwere nkwa na a ga-ewepụ ihe a yiri “oké ugwu” nakwa na ọ ga-aghọ “ebe dị larịị.” (Zekaraịa 4:7) O mezukwara nkwa ya! Eze Daraịọs nke Mbụ mere nchọpụta ma chọta akwụkwọ iwu nke Saịrọs ji nye ndị Juu ikike iwughachi ụlọ nsọ ahụ. N’ihi ya, Daraịọs kagburu mmachibido iwu ahụ ma nye ikike ka e site n’akpa ego eze nye ndị Juu ego iji nye aka n’ịhụ maka mmefu ndị a ga-eme n’ọrụ ahụ. Lee nnọọ otú ọnọdụ sizi gbanwee! Mmụọ Chineke ọ̀ rụrụ ọrụ na nke a? O doro anyị anya na ọ rụrụ. E wuchara ụlọ nsọ ahụ n’afọ 515 T.O.A., n’afọ nke isii nke ọchịchị Daraịọs nke Mbụ.—Ezra 6:1, 15.

21. (a) N’oge ochie, olee otú Chineke si mee ka “mba nile mee mkpọtụ,” oleekwa otú “ihe a na-achọsi ike” si pụta? (b) Olee otu ọ ga-esi mezuo n’oge a?

21 Na Hagaị 2:5, onye amụma ahụ chetaara ndị Juu ọgbụgba ndụ ha na Chineke gbara n’Ugwu Saịnaị mgbe ‘ugwu ahụ nile mara jijiji nke ukwuu.’ (Ọpụpụ 19:18) N’oge Hagaị na Zekaraịa, Jehova gaje ime ka mkpọtụ ọzọ mee, dị ka a kọwara ya n’ụzọ ihe atụ n’amaokwu nke 6 na nke 7. Alaeze Ukwu nke Peshia ga-agba aghara, ma ọrụ iwu ụlọ nsọ ahụ ga-aga n’ihu ruo mgbe a rụchara ya. Ndị na-abụghị ndị Juu, “ihe a na-achọsi ike nke mba nile,” ga-emesị sonyere ndị Juu n’inye Chineke otuto n’ụlọ nsọ ahụ. N’oge anyị a, Chineke ejiriwo ọrụ nkwusa anyị dị ka Ndị Kraịst ‘mee nnọọ ka mba nile mee mkpọtụ,’ “ihe a na-achọsi ike nke mba nile” apụtawokwa ma sonyere ihe ahụ fọdụrụ e tere mmanụ n’ofufe Chineke. N’eziokwu, ndị e tere mmanụ na atụrụ ọzọ ahụ na-emeju ụlọ Jehova n’ebube taa. Ndị dị otú ahụ na-efe ezi ofufe ji okwukwe na-echere mgbe Jehova ‘ga-eme ka eluigwe na ụwa mee mkpọtụ’ n’ụzọ ọzọ. Nke ahụ ga-abụ iji kwatuo ma kpochapụ ike nke alaeze nile nke mba nile.—Hagaị 2:22.

22. Olee otú e si na-eme ka mba nile ‘mee mkpọtụ,’ gịnịkwa si na ya apụta, oleekwa ihe ka ga-eme n’ọdịnihu?

22 A na-echetara anyị ọgba aghara e nwerela n’ihe dị iche iche ndị “eluigwe na ụwa na oké osimiri na ala kpọrọ nkụ” sere onyinyo ha. Otu n’ime ha bụ na a chụdatara Setan bụ́ Ekwensu na ndị mmụọ ọjọọ ya n’ụwa. (Mkpughe 12:7-12) Ọzọkwa, nkwusa nke ndị Chineke tere mmanụ na-ebute ụzọ na ya emewo nnọọ ka ihe ndị dị n’ụwa nke usoro ihe dị ugbu a mee mkpọtụ. (Mkpughe 11:18) N’agbanyeghị nke ahụ, “oké ìgwè mmadụ” nke ihe ahụ a na-achọsi ike nke mba nile esonyeworo Izrel ime mmụọ ahụ n’ijere Jehova ozi. (Mkpughe 7:9, 10) Oké ìgwè mmadụ na Ndị Kraịst e tere mmanụ na-arụkọ ọrụ ọnụ n’ikwusa ozi ọma na n’isi nso Chineke ga-eme ka mba nile mee mkpọtụ n’Amagedọn. Nke ahụ ga-eme ka ezi ofufe zuo ụwa nile ọnụ.

Ì Chetara?

• Ole mgbe, ọ bụkwa n’ọnọdụ ndị dị aṅaa ka Hagaị na Zekaraịa jere ozi?

• Olee otú ị pụrụ isi tinye ozi Hagaị na Zekaraịa n’ọrụ?

• N’ihi gịnị ka Zekaraịa 4:6 ji agba gị ume?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto ndị dị na peeji nke 20]

Ihe Hagaị na Zekaraịa dere na-eme ka obi sie anyị ike na Chineke ga-akwado anyị

[Foto dị na peeji nke 23]

“Ọ̀ bụ oge unu nwere, unu onwe unu, ibi n’ụlọ unu a machitere osisi, mgbe ụlọ a bụ mkpọmkpọ ebe?”

[Foto dị na peeji nke 24]

Ndị ohu Jehova na-ekere òkè n’ikwusara ‘ihe a na-achọsi ike nke mba nile’ ozi ọma