Melito nke Sadis Ọ̀ Kwadoro Eziokwu Bible?
Melito nke Sadis Ọ̀ Kwadoro Eziokwu Bible?
KWA afọ, ezi Ndị Kraịst na-echeta Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị n’ụbọchị kwekọrọ na Naịsan 14 na kalenda ndị Hibru. Ha na-erubere iwu Jizọs nyere isi, nke bụ́: “Nọgidenụ na-eme nke a iji na-echeta m.” Ọ bụ n’ụbọchị ahụ n’ezie n’afọ 33 O.A. ka Jizọs hiwere Ncheta ọnwụ ịchụàjà ya, mgbe o mesịrị Ememe Ngabiga. Ọ nwụkwara tupu ụbọchị ahụ agwụ.—Luk 22:19, 20; 1 Ndị Kọrint 11:23–28.
Na narị afọ nke abụọ O.A., ụfọdụ malitere ịgbanwe oge na otú e si echeta ọnwụ Jizọs. N’Eshia Maịnọ, a nọgidere na-echeta ọnwụ Jizọs n’ụbọchị ahụ ọ nwụrụ. Otú ọ dị, otu akwụkwọ kwuru na “ihe a na-emekarị na Rom na Aleksandria bụ icheta mbilite n’ọnwụ ya na Sunday na-esote ụbọchị ọnwụ ya,” na-akpọ ya Ememe Ngabiga nke Mbilite n’Ọnwụ. Òtù a na-akpọ ndị Quartodeciman (Ndị Ụbọchị nke Iri na Anọ) kwuru na e kwesịrị ịnọgide na-echeta ọnwụ Jizọs Kraịst na Naịsan 14. Melito nke Sadis kweere ihe yiri nke ahụ. Ònye bụ Melito? Olee ụzọ o si kwado eziokwu a sitere na Bible na eziokwu ndị ọzọ?
Onye ‘Hụrụ Ụzọ’
Eusebius nke Sesaria kwuru n’akwụkwọ ya bụ́ Ecclesiastical History na Polycrates nke Efesọs degara akwụkwọ ozi na Rom ná ngwụsị nke narị afọ nke abụọ na-ekwu na e kwesịrị ịnọgide na-echeta “ụbọchị nke iri na anọ nke Ememe Ngabiga ahụ dị ka e kwuru n’Oziọma, ghara ịgbanwe ihe ọ bụla na ya, kama na-eme ya dị ka iwu nke okpukpe anyị si kwuo.” Dị ka akwụkwọ ozi a si kwuo, Melito—bụ́ Bishọp nke Sardis, nke bi na Lydia—bụ otu n’ime ndị kwadoro Naịsan 14 dị ka ụbọchị kwesịrị ncheta. Akwụkwọ ozi ahụ kwukwara na ndị ha na Melito dịkọrọ ndụ weere ya dị ka otu n’ime ‘ndị hụrụ ụzọ nwụrụla anwụ.’ Polycrates kwuru na Melito alụghị nwanyị nakwa na o “biri ndụ ya nile n’ime Mmụọ Nsọ, e liekwa ya na Sadis, ya ana-eche mgbe a ga-akpọ ya òkù site n’eluigwe, ya Mkpughe 20:1-6.
ebiliekwa n’ọnwụ.” Nke a pụrụ ịpụta na Melito so ná ndị kweere na a gaghị enwe mbilite n’ọnwu ruo mgbe Kraịst bịaghachiri.—N’ihi ya, o yiri ka Melito ọ̀ bụ nwoke nwere obi ike na onye kwụsiri ike. N’ezie, o degaara Marcus Aurelius, bụ́ onye chịrị Rom malite n’afọ 161 ruo 180 O.A. akwụkwọ a na-akpọ Apology, bụ́ otu n’ime akwụkwọ ndị mbụ e dere iji gbachitere Ndị Kraịst. Melito atụghị ụjọ ịgbachitere Iso Ụzọ Kraịst na ịkatọ ndị ikom dị obi ọjọọ ma nwee anyaukwu. Ndị dị otú ahụ gbalịrị ime ka eze nye iwu dị iche iche ka ha wee gbakwasị ụkwụ na ha kpagbuo Ndị Kraịst ma zukọrọ ngwongwo ha.
Melito ji obi ike degara eze ukwu akwụkwọ, sị: “Nanị otu ihe anyị na-arịọ gị bụ ka i jiri aka gị nyochaa ndị e ji maka ha akpa aghara dị otú ahụ [Ndị Kraịst], ma jiri ezi obi kpebie ma hà kwesịrị ọnwụ na ntaramahụhụ ka è kwesịrị ichebe ha ma sị onye ọ bụla akpala ha aka. Ma, ya bụrụ na iwu ọhụrụ a, bụ́ nke na-ekwesịdịghịrị ajọ ndị iro, esighị gị n’aka, anyị na-arịọsikwu gị ike ka ị ghara ilefuru nkwakọrọ ndị na-akpagbu anyị na-akwakọrọ ngwongwo anyị n’ụzọ megidere iwu anya.”
Iji Akwụkwọ Nsọ Agbachitere Iso Ụzọ Kraịst
Melito nwere mmasị dị ukwuu n’ọmụmụ Akwụkwọ Nsọ. Anyị enweghị ihe ndekọ zuru ezu nke akwụkwọ nile o dere, ma isiokwu nke akwụkwọ ya ụfọdụ gosiri mmasị o nwere n’isiokwu ndị dị na Bible. Ụfọdụ n’ime ha bụ On Christian Life and the Prophets, On the Faith of Man, On Creation, On Baptism and Truth and Faith and Christ’s Birth, On Hospitality, The Key, na On the Devil and the Apocalypse of John.
Melito mere njem n’onwe ya gaa n’ala ndị a kpọrọ aha na Bible iji chọpụta akwụkwọ ole kpọmkwem mejupụtara Akwụkwọ Nsọ Hibru. O dere banyere nke a, sị: “N’ihi ya, mgbe m gara n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa bụ́ ebe e kwusara ihe ndị a na ebe e mere ha, mgbe m
matachakwara akwụkwọ ndị dị n’Agba Ochie nke ọma ma detuo ihe ndị m chọpụtara, eziteere m gị ya.” Akwụkwọ Nehemaịa na Esta adịghị n’akwụkwọ ndị ahụ o depụtara dị ka ndị dị “n’Agba Ochie,” n’agbanyeghị nke ahụ, ihe ndepụta ya bụ ihe ndepụta kasị ochie nke akwụkwọ ndị mejupụtara Akwụkwọ Nsọ Hibru nke ndị kpọrọ onwe ha Ndị Kraịst depụtara.N’oge Melito na-eme nchọpụta a, o depụtara amaokwu dị iche iche sitere n’Akwụkwọ Nsọ Hibru bụ́ ndị buru amụma banyere Jizọs. Akwụkwọ Melito, nke a kpọrọ Extracts, gosiri na Jizọs bụ Mezaịa ahụ a nọworo na-ele anya ya nakwa na Iwu Mozis na Ndị Amụma kwukwara ihe banyere Kraịst.
Ịgbachitere Uru Ihe Mgbapụta ahụ Bara
Ọtụtụ ndị Juu biri n’obodo ndị bụ́ isi n’Eshia Maịnọ. Ndị Juu bi na Sardis, bụ́ ebe Melito biri, mere Ememe Ngabiga nke ndị Hibru na Naịsan 14. Melito dere otu okwuchukwu a kpọrọ The Passover bụ́ nke gosiri na Iwu Mozis kwadoro Ememe Ngabiga ma gosi na Ndị Kraịst kwesịrị ịdị na-echeta Nri Anyasị nke Onyenwe anyị na Naịsan 14.
Ka Melito kwusịrị banyere Ọpụpụ isi 12 ma gosi na Ememe Ngabiga ahụ nọchiri anya àjà Kraịst, ọ kọwara ihe mere o ji bụrụ ihe na-ekwesịghị ekwesị Ndị Kraịst ime Ememe Ngabiga. Nke a bụ n’ihi na Chineke ewepụwo Iwu Mozis. O kwuziri ihe mere àjà Kraịst ji dị mkpa: Chineke tinyere Adam na paradaịs ka o wee bie ndụ obi ụtọ. Ma, nwoke mbụ ahụ nupụrụ isi n’iwu ahụ e nyere ya ka ọ ghara iri mkpụrụ osisi ịma ezi ihe na ihe ọjọọ. Ọ bụ ya mere e ji nwee mkpa maka ihe mgbapụta.
Melito kọwakwuru na e zitere Jizọs n’ụwa, ya anwụọkwa n’elu osisi iji gbapụta ndị kwere ekwe ná mmehie na ọnwụ. N’ụzọ na-akpali mmasị, Melito ji okwu Grik bụ́ xylon, nke pụtara “osisi,” mee ihe mgbe ọ na-ede banyere osisi e ji kpọgbuo Jizọs.—Ọrụ 5:30; 10:39; 13:29.
Ọ bụghị nanị n’Eshia Maịnọ ka a maara Melito. Tertullian, Clement nke Alexandria, na Origen maara ihe banyere akwụkwọ ndị o dere. N’agbanyeghị nke ahụ, ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Raniero Cantalamessa kwuru, sị: “Ọdịda Melito, bụ́ nke mesịrị mee ka akwụkwọ ndị o dere pụọ n’anya, bidoro mgbe a malitere ile ndị Quartodeciman anya dị ka ndị na-ezi ozizi nduhie—bụ́ mgbe a nabatachara Ememe Ngabiga Ụbọchị Sunday.” N’ikpeazụ, ihe nile Melito dere fọrọ nke nta ka ha fuchaa.
Ò Si n’Ezi Ofufe Dapụ?
Mgbe ndịozi nwụsịrị, ndapụ n’ezi ofufe bụ́ nke e buru n’amụma bilitere n’etiti ezi Iso Ụzọ Kraịst. (Ọrụ 20:29, 30) N’ụzọ doro anya, nke a metụtara Melito. Okwu ndị dị mgbagwoju anya o ji dee akwụkwọ ya yiri ihe odide ndị ọkà ihe ọmụma Gris na ndị Rom. Eleghị anya ọ bụ ihe mere Melito ji kpọọ Iso Ụzọ Kraịst “nkà ihe ọmụma anyị.” O lekwara njikọ e jikọrọ ihe ahụ a kpọrọ Iso Ụzọ Kraịst na Alaeze Ukwu Rom anya dị ka “ọganihu kasịnụ . . . e nwere.”
N’eziokwu, Melito aṅaghị ntị n’ịdọ aka ná ntị nke Pọl onyeozi bụ́: “Nọrọnụ na nche: eleghị anya a pụrụ inwe onye ga-eburu unu dị ka anụ oriri ya site na nkà ihe ọmụma na aghụghọ efu dị ka ọdịnala mmadụ si dị, dị ka ihe ndị mbụ nke ụwa si dị, ọ bụghị dị ka Kraịst si dị.” Ya mere, n’agbanyeghị na Melito gbachitetụụrụ eziokwu Bible, n’ọtụtụ akụkụ, ọ gbahapụrụ ya.—Ndị Kọlọsi 2:8.
[Foto dị na peeji nke 18]
Jizọs hiwere Nri Anyasị nke Onyenwe anyị na Naịsan 14