Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Otú Ị Pụrụ Isi Mee Mkpebi Ndị Kwekọrọ n’Uche Chineke?

Olee Otú Ị Pụrụ Isi Mee Mkpebi Ndị Kwekọrọ n’Uche Chineke?

Olee Otú Ị Pụrụ Isi Mee Mkpebi Ndị Kwekọrọ n’Uche Chineke?

OTU nwoke na United States ji akwụkwọ ndọrọ ego e dere puku dọla iri abụọ na ise na ya gaa n’ụlọ akụ̀. O bu n’uche itinye ego ahụ n’ụlọ akụ̀ ruo oge a kara aka. Ma, onye na-arụ ọrụ n’ụlọ akụ̀ ahụ tụụrụ ya aro ka o jiri ego ahụ zụọ aka òkè n’ụlọ akụ̀ ma gwa ya na ọ ga-emesịrịrị rite uru na ya. Nwoke ahụ nabatara aro ahụ. N’oge na-adịghị anya, ọnụ ahịa aka òkè ahụ ọ zụrụ dara ma mee ka ihe dị ukwuu n’ego ahụ funahụ ya.

Ahụmahụ a na-egosi na ime mkpebi ziri ezi adịghị mfe. Olee maka mkpebi dị iche iche anyị na-eme ná ndụ? Ọtụtụ mkpebi pụrụ ime ka anyị nwee ihe ịga nke ọma ma ọ bụ kpatara anyị ọdachi—ha na-emesịkwa kpatara anyị ọnwụ ma ọ bụ chebe anyị. Oleezi otú anyị pụrụ isi nwee obi ike na mkpebi ndị anyị na-eme ziri ezi?

“Nke A Bụ Ụzọ”

Kwa ụbọchị, anyị na-eme mkpebi banyere ihe anyị ga-eri, uwe anyị ga-eyi, ebe anyị ga-eje, na ihe ndị ọzọ. A pụrụ ile mkpebi ụfọdụ anya dị ka obere mkpebi, ma a pụrụ inwe ihe ndị dị njọ ga-esi na ha pụta. Dị ka ihe atụ, mkpebi mmadụ mere ise siga na nke mbụ ya pụrụ ime ka ise siga rie onye ahụ ahụ́ ná ndụ ya nile. Anyị ekwesịtụghị ileghara ihe ndị ga-esi n’ihe ndị anyị lere anya dị ka obere mkpebi pụta anya.

Ebee ka anyị pụrụ ịchọta nduzi mgbe anyị na-eme mkpebi, ọbụna ndị yiri obere mkpebi? Lee otú ọ ga-esi magbuo onwe ya inwe ọkachamara kwesịrị ntụkwasị obi ga na-adụ anyị ọdụ mgbe anyị na-achọ ime mkpebi ndị tara akpụ! Ị pụrụ ịchọta onye ndụmọdụ dị otú ahụ. Otu akwụkwọ ochie nke nwere ozi ga-abara anyị uru taa kwuru, sị: “Ntị gị abụọ ga-anụkwa okwu n’azụ gị, sị, Nke a bụ ụzọ, jeenụ ije n’ime ya; mgbe unu na-eche ihu n’aka nri, na mgbe unu na-eche ihu n’aka ekpe.” (Aịsaịa 30:21) Okwu ònye ka ebe a na-ekwu banyere ya? Oleekwa otú ị pụrụ isi jide n’aka na nduzi ya kwesịrị ka a tụkwasị ya obi?

Okwu ahụ na-emesi obi ike e dere n’elu dị na Bible, bụ́ nke ọtụtụ nde mmadụ mụrụla ma chọpụta na o sitere n’aka Jehova Chineke, bụ́ Onye Okike anyị. (2 Timoti 3:16, 17) Jehova maara ihe nile banyere anyị, n’ihi ya ọ bụ ya ga-enye anyị nduzi kasị mma. Ọ pụkwara ịhụ ihe ga-eme n’ọdịnihu, ebe ọ bụ na ọ “na-egosi ikpeazụ site na mbụ, na-egosikwa ihe nke a na-emeghị eme site na mgbe ochie; na-asị, Ndụmọdụ m ga-eguzosi ike.” (Aịsaịa 46:10) Otu ọbụ abụ gosipụtara ntụkwasị obi o nwere n’Okwu Jehova site n’ikwu, sị: “Okwu Gị bụ oriọna dịịrị ụkwụ m, ọ bụkwa ìhè dịịrị okporo ụzọ m.” (Abụ Ọma 119:105) Ma, olee otú Jehova si enyere anyị aka inwe ihe ịga nke ọma n’ụwa nke oge a jupụtara ná nsogbu? Olee otú anyị pụrụ isi mee mkpebi ndị kwekọrọ n’uche Chineke?

Tinye Ụkpụrụ Bible n’Ọrụ

Jehova Chineke nyere Ndị Kraịst ụkpụrụ ya ka ha wee nwee ike ime mkpebi ndị ziri ezi. A pụrụ iji ịmụ ụkpụrụ Bible na iji ha na-eme ihe tụnyere ịmụ asụsụ na ịsụ ya asụ. Ozugbo ị mụtachara asụsụ ahụ, ị na-amatakarị mgbe mmadụ na-asụtaghị ya n’ihi na ihe ọ sụrụ adabachaghị gị adaba ná ntị. O nwere ike ị gaghị ekwuli kpọmkwem ihe mere ihe ahụ ọ sụrụ ji ghara izi ezi, ma, ị ma na ọ sụtaghị ya. Mgbe ị mụtara ụkpụrụ Bible ruo n’ókè nke iji ha na-eme ihe ná ndụ gị, ị pụrụ ịdị na-ama mgbe mmadụ mere mkpebi na-ezighị ezi, nke na-ekwekọghị n’ụkpụrụ Bible.

Were dị ka ihe atụ mkpebi nwa okorobịa nwere ike ime banyere ụdị isi ọ ga-akpụ. O nweghị iwu Bible megidere otu ụdị ịkpụ isi kpọmkwem. N’agbanyeghị nke ahụ, tụlee otu ụkpụrụ Bible. Pọl onyeozi dere, sị: “Achọrọ m ka ụmụ nwanyị jiri uwe a haziri nke ọma na-achọ onwe ha mma n’imeru ihe n’ókè na uche zuru okè, ọ bụghị n’ụdị dị iche iche nke ịkpa isi na ọlaedo ma ọ bụ nkume pel ma ọ bụ ejiji dị nnọọ oké ọnụ, kama n’ụzọ kwesịrị ụmụ nwanyị ndị na-ekwupụta na ha na-asọpụrụ Chineke, ya bụ, site n’ezi ọrụ.” (1 Timoti 2:9, 10) Pọl na-ede banyere ụmụ nwanyị n’ebe a, ma ụkpụrụ ahụ dịịrị ma ndị nwoke ma ndị nwanyị. Gịnị bụ ụkpụrụ ahụ? Ọdịdị anyị kwesịrị igosipụta imeru ihe n’ókè na uche zuru okè. N’ihi ya, nwa okorobịa ahụ pụrụ ịjụ onwe ya, sị, ‘Ụdị isi m kpụrụ, ọ̀ ga-egosi na m na-emeru ihe n’ókè dị ka Onye Kraịst?’

Oleekwa ụkpụrụ dị n’okwu ndị na-esonụ Jems onyeozi dere, bụ́ nke pụrụ inyere onye na-eto eto aka? O dere, sị: “Ndị na-akwa iko, ùnu amaghị na ịbụ ndị enyi nke ụwa bụ ịbụ ndị iro nke Chineke? Ya mere, onye ọ bụla chọrọ ịbụ enyi nke ụwa na-edebe onwe ya n’ọnọdụ ịbụ onye iro nke Chineke.” (Jems 4:4) Ndị Kraịst na-akpọ ịbụ enyi nke ụwa asị, nke bụ́ ịbụ onye iro nke Chineke. Ụdị isi ndị ọgbọ ya na-enwekarị mmasị ịkpụ, ọ̀ ga-eme ka o yie enyi Chineke ka ọ bụ enyi nke ụwa? Nwa okorobịa nke na-atụle ụdị isi ọ ga-akpụ pụrụ iji ụdị ụkpụrụ ahụ dabeere na Bible mee mkpebi ziri ezi. Ee, ụkpụrụ Bible na-enyere anyị aka ime mkpebi ndị ziri ezi. Mgbe ime mkpebi ndị dabeere n’ụkpụrụ Chineke makwaara anyị ahụ́, ọ na-adịziri anyị mfe ime mkpebi ndị amamihe dị na ha bụ́ ndị na-agaghị akpatara anyị ọdachi.

Anyị pụrụ ịchọta ọtụtụ ụkpụrụ n’ime Okwu Chineke. N’ezie, ọ pụrụ ịbụ na anyị agaghị achọta akụkụ Akwụkwọ Nsọ nke kwuru kpọmkwem banyere nsogbu anyị. N’agbanyeghị nke ahụ, anyị pụrụ ịgụ banyere otú ụfọdụ ndị siworo rube isi ná nduzi Chineke na otú ndị ọzọ si leghara ịdọ aka ná ntị Chineke anya. (Jenesis 4:6, 7, 13-16; Deuterọnọmi 30:15-20; 1 Ndị Kọrint 10:11) Ịgụ akụkọ ndị dị otú ahụ na ịtụle ihe ndị si na ha pụta ga-enyere anyị aka ịghọta ụkpụrụ Bible ndị pụrụ inyere anyị aka ime mkpebi ndị ga-amasị Chineke.

Were ụka dị nkenke nke Jizọs Kraịst na onyeozi ya bụ Pita kparịtara dị ka ihe atụ. Ndị ikom na-anakọta [ụtụ] mkpụrụ ego drakma abụọ jụrụ Pita, sị: “Ọ̀ bụ na onye ozizi unu adịghị atụ ụtụ mkpụrụ ego drakma abụọ ahụ?” Pita zara ya, sị: “Ee.” Ntakịrị oge ka e mesịrị, Jizọs jụrụ Pita, sị: “Ọ̀ bụ n’aka ole ndị ka ndị eze nke ụwa na-anata ụtụ ahịa ma ọ bụ ụtụ isi? N’aka ụmụ ha ka ọ̀ bụ n’aka ndị bịara abịa?” Mgbe Pita sịrị: “N’aka ndị bịara abịa,” Jizọs sịrị ya: “Ya mere, n’ezie ụmụ ha anaghị atụ ụtụ. Ma ka anyị wee ghara ime ka ha sụọ ngọngọ, gaa n’oké osimiri, tụnye nko azụ, werekwa azụ mbụ pụtaranụ, mgbe i meghekwara ọnụ ya, ị ga-ahụ otu mkpụrụ ego steta. Were nke ahụ nye ha maka mụ na gị.” (Matiu 17:24-27) Olee ụkpụrụ Bible ndị dị n’akụkọ a?

Jizọs duziri echiche Pita site n’ịjụ ya ajụjụ dị iche iche: Dị ka Ọkpara Chineke, Jizọs ekwesịghị ịtụ ụtụ isi. Ọ bụ ezie na Pita aghọtaghị ya otú ahụ na mbụ, Jizọs ji obiọma nyere ya aka ịghọta ya. Mgbe ndị ọzọ mehiere ihe, anyị pụrụ ikpebi iji ịhụnanya mesoo ha ihe site n’iṅomi Jizọs kama iji iwe na-ekwu ihe ndị ha mejọrọ ma ọ bụ na-akatọ ha.

Pita ghọtaziri ihe mere ha ji atụ ụtụ isi ahụ—iji ghara ime ka ndị ọzọ sụọ ngọngọ. Nke a bụ ụkpụrụ ọzọ anyị pụrụ ịmụta n’ihe ndekọ a. Ichebara akọnuche ndị ọzọ echiche dị nnọọ mkpa karịa isi ọnwụ n’ihe ndị ruuru anyị.

Gịnị na-akwali anyị ime mkpebi ndị na-egosi na anyị na-akwanyere akọnuche ndị ọzọ ùgwù? Ọ bụ ịhụnanya anyị nwere n’ebe ndị agbata obi anyị nọ. Jizọs Kraịst kụziri na ịhụ onye agbata obi anyị n’anya dị ka onwe anyị dị nnọọ mkpa nke na ọ bụ ya na-esote nke kasị mkpa bụ́ iji mkpụrụ obi anyị dum hụ Chineke n’anya. (Matiu 22:39) Otú ọ dị, anyị bi n’ụwa nke onye ọ bụla na-eche banyere onwe ya nanị, ọchịchọ ime mmehie dị n’ime anyị na-emekwa ka anyị na-achọ nanị ọdịmma nke anyị. N’ihi ya, ọ bụrụ na mmadụ ga-ahụ onye agbata obi ya n’anya dị ka onwe ya, ọ ga-eme ka uche ya dị ọhụrụ.—Ndị Rom 12:2.

Ọtụtụ emewo mgbanwe dị otú ahụ, ha na-echebakwara ndị ọzọ echiche mgbe ha na-eme mkpebi, ma ọ bụ nnukwu mkpebi ma ọ bụ nke obere. Pọl dere, sị: “Otú ọ dị, ụmụnna m, a kpọrọ unu maka nnwere onwe; nanị ka unu ghara iji nnwere onwe a mere ihe mkpali maka anụ ahụ́, kama site n’ịhụnanya bụrụnụ ohu ibe unu.” (Ndị Galeshia 5:13) Olee otú anyị pụrụ isi mee nke ahụ? Tụlee ihe banyere otu nwa agbọghọ kwagara n’obodo na-emepeghị emepe iji nyere ndị mmadụ aka ịmụta Okwu Chineke. Ka ọ na-ekwusara ndị mmadụ ozi ọma, ọ chọpụtara na uwe ndị ọ na-eyi bụzi okwu a kpụ n’ọnụ n’ebe ahụ, n’agbanyeghị na uwe ndị ahụ kwesịrị ekwesị n’obodo ndị mepere emepe. Uwe na ejiji ya kwesịrị ekwesị, ma o kpebiri iyiwezi ndị nke dị ọnụ ala karị “ka e wee ghara ikwujọ okwu Chineke.”—Taịtọs 2:5.

Olee ihe ị gaara eme ma ọ bụrụ gị bụ onye na-aghaghị ime mkpebi banyere ejiji gị ma ọ bụ ihe ọzọ metụtara ihe ndị masịrị gị? Jehova ga-enwe nnọọ obi ụtọ mgbe mkpebi ndị ị na-eme na-egosi na ị na-echebara akọnuche ndị ọzọ echiche.

Tụlee Ihe Mkpebi Gị Ga-arụpụta n’Ọdịnihu

E wezụga ụkpụrụ Bible na akọnuche ndị ọzọ, gịnị ka anyị pụrụ ichebara echiche mgbe anyị na-eme mkpebi? Ọ bụ ezie na ụkpụrụ Ndị Kraịst siri ike mgbaso, Chineke nyere ha nnọọ ohere ịhọrọ ihe ha chọrọ n’emebighị iwu ya. (Matiu 7:13, 14) Ọ dị anyị mkpa iche echiche banyere otú mkpebi ndị anyị na-eme ga-esi metụta mmekọrịta anyị na Chineke na uche anyị, nakwa otú ọ ga-esi metụta anyị n’ụzọ anụ ahụ́, n’ọdịnihu.

Ka e were ya na ị chọtara ọrụ. Ikekwe ọ dịghị ihe dị njọ ma ọ bụ ihe na-ekwesịghị ekwesị dị n’ọrụ ahụ. Ọ gaghị egbochi gị ịga ọmụmụ ihe na mgbakọ. Ego a ga na-akwụ gị ga-ebukwa ibu otú ị na-echetụbeghị n’echiche. Onye nwe ọrụ ahụ anaghị eji ọrụ gị egwu egwu, ọ chọkwara ka i jiri oge gị nile na-arụrụ ya ọrụ. E wezụga nke ahụ, i nwere mmasị n’ụdị ọrụ ahụ. Ò nwere ihe kwesịrị ime ka ị jụ ọrụ ahụ? Gịnị ma ọ bụrụ na ị hụ na ọrụ ahụ nwere ike iri gị isi? A gwara gị na a gaghị amanye gị ịrụ ọrụ ma a gbasaa ọrụ. Ma, ị̀ ga-arụ ọrụ karịa otú i kwesịrị ịrụ iji rụchapụ ọrụ i ji n’aka? Ị̀ ga na-arụzi ọrụ mgbe mgbe ma a gbasachaa ọrụ? Nke ahụ ọ̀ pụrụ ime ka ị ghara inwe ohere ịnọnyere ezinụlọ gị ma mesịa mee ka i legharawa akụkụ ụfọdụ nke ozi ị na-ejere Chineke anya bụ́ ndị ị na-ekwesịtụghị ileghara anya?

Tụlee otú Jim si mee mkpebi dị oké mkpa banyere ọrụ ya. Ọ rụsiri ọrụ ike, e buliekwa ya n’ọkwá. O mesịrị ghọọ onyeisi ụlọ ọrụ ha dị n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa, bụrụ onyeisi nke alaka ụlọ ọrụ ha dị na United States, sorokwa ná ndị isi nke ụlọ ọrụ ha dị na Europe. Otú ọ dị, mgbe e nwere nsogbu akụ̀ na ụba na Japan, ọ chọpụtara na ọ baghị nnọọ uru iji oge ya nile achụ ego na ọkwá. Ego ọ tara ahụhụ kpata funahụrụ ya n’otu ntabi anya. Ike ụwa gwụrụ ya. Ọ jụrụ onwe ya, sị, ‘Olee otú ọnọdụ m ga-adị afọ iri na-abịanụ?’ Ọ chọpụtaziri na nwunye ya na ụmụ ya na-achụso ihe ndị ka mkpa ná ndụ karịa ya. Ha anọwo na-eso Ndịàmà Jehova kemgbe ọtụtụ afọ. Jim chọkwara inwe obi ụtọ na afọ ojuju ahụ ndị ezinụlọ ya na-enwe. N’ihi ya, ọ malitere ịmụ Bible.

N’oge na-adịghị anya, Jim hụrụ na ụzọ o si ebi ndụ gbochiri ya ibi ndụ nwere nzube dị ka Onye Kraịst. Ime njem mgbe nile si Eshia gaa United States ma si United States gaa Europe mere ka ọ ghara inwe oge zuru ezu iji mụọ Bible na iso ndị kwere ekwe ibe ya na-akpakọ. O nwere mkpebi ọ na-aghaghị ime: ‘M̀ ga-anọgide na-ebi ụdị ndụ m nọworo na-ebi kemgbe afọ 50, ka m̀ ga-amalite ibi ụdị ndụ ọhụrụ?’ Ka o kpesịrị ekpere ma tụlee ihe ndị ga-esi ná mkpebi ya pụta n’ọdịnihu, o kpebiri ịhapụ ọrụ nile ọ na-arụ ma e wezụga otu, ka o wee nwee oge iji na-efe Jehova. (1 Timoti 6:6-8) Mkpebi ya mere ka o nwekwuo obi ụtọ ma mee ka ọ na-ejechi ozi Ndị Kraịst anya.

Mkpebi ị na-eme dị mkpa, ma hà bụ nnukwu mkpebi ma hà bụ ndị obere. Mkpebi i mere taa pụrụ ime ka i nwee ihe ịga nke ọma ma ọ bụ kpatara gị ọdachi, ọbụna mee ka ị dị ndụ ma ọ bụ kpatara gị ọnwụ n’ọdịnihu. Ị pụrụ ime mkpebi ndị amamihe dị na ha ma ọ bụrụ na i chebara ụkpụrụ Bible, akọnuche ndị ọzọ, na ihe ndị ga-esi na ha pụta n’ọdịnihu echiche. Na-eme mkpebi ndị kwekọrọ n’uche Chineke.

[Foto dị na peeji nke 13]

Ihe ndị yiri obere mkpebi pụrụ ịkpata ọdachi

[Foto dị na peeji nke 14]

Olee otú ụkpụrụ Bible pụrụ isi nyere ya aka ime mkpebi amamihe dị na ya?

[Foto dị na peeji nke 15]

Jizọs ji ọmịiko gwa Pita okwu