Onye Ọ Bụla Kwesịrị Inwe Aha
Onye Ọ Bụla Kwesịrị Inwe Aha
Ọ BỤ ihe ruuru onye ọ bụla inwe aha. Na Tahiti, a na-enye ọbụna nwa ọhụrụ a gbahapụrụ agbahapụ nke a na-amaghị nne na nna ya aha. Ụlọ ọrụ na-edekọ aha ụmụ ọhụrụ na-enye nwa ahụ a gbahapụrụ agbahapụ aha nke ya na aha nna ọ ga-aza.
Ma, e nwere otu onye a pụrụ ikwu na a napụrụ ya ihe a bụ́ isi ruuru ya, bụ́ ihe a na-enye ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mmadụ nile. Ọ bụ ihe na-eju anya ịmata na onye ahụ bụ “Nna, onye ezinụlọ ọ bụla n’eluigwe na n’ụwa sitere n’ebe ọ nọ nweta aha ya”! (Ndị Efesọs 3:14, 15) Leenụ, ọtụtụ ndị na-ajụ nnọọ iji aha Onye Okike eme ihe otú o si dịrị na Bible. Ha họọrọ iji utu aha ndị dị ka “Chineke,” “Onyenwe Anyị,” ma ọ bụ “Onye Na-adịru Ebighị Ebi” dochie anya ya. Gịnịzi bụ aha ya? Ọbụ abụ ahụ zara ajụjụ ahụ, sị: “Gị, Onye aha Gị bụ Jehova, nanị Gị, bụ Onye kachasị ihe nile elu n’elu ụwa nile.”—Abụ Ọma 83:18.
N’agbata afọ 1800 na 1850 mgbe ndị ozi ala ọzọ nke London Missionary Society bịara na Tahiti, ndị Polynesia na-efe chi dị iche iche. Nke ọ bụla nwere aha nke aka ya a na-akpọ ya, aha chi ha ndị bụ́ isi bụ Oro na Taaroa. Iji mee ka a mata ọdịiche dị n’etiti Chineke nke Bible na chi ndị ọzọ, ndị ozi ala ọzọ ahụ jiri nnọọ aha Chineke mee ihe ọtụtụ ugboro, jiri mkpụrụ akwụkwọ asụsụ Tahitian sụgharia ya ịbụ Iehova.
A bịara mara aha ahụ n’ebe nile ma jiri ya na-emekarị ihe n’okwu a na-ekwu kwa ụbọchị na n’akwụkwọ ozi. Eze Pomare nke Abụọ nke Tahiti, bụ́ onye chịrị n’oge na-adịghị anya ka afọ 1800 gasịrị, jiri aha Chineke mee ihe ọtụtụ ugboro n’akwụkwọ ozi ndị o dere. Akwụkwọ ozi e bipụtaghachiri n’ebe a gosiri nke ahụ. Akwụkwọ ozi a e dere na Bekee dị n’Ebe Ndebe Ihe Mgbe Ochie nke Tahiti na Àgwàetiti Ya. Akwụkwọ ozi a gosiri na ndị dịrị ndụ n’oge ahụ nabatara iji aha Chineke eme ihe. Ọzọkwa, aha Chineke pụtara ọtụtụ puku ugboro ná nsụgharị Bible Tahitian, bụ́ nke e dechara n’afọ 1835.
[Foto dị na peeji nke 32]
Eze Pomare nke Abụọ
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 32]
Eze na akwụkwọ ozi: Collection du Musée de Tahiti et de ses Îles, Punaauia, Tahiti