Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịda Ogbenye—Nsogbu nke Zuru Ụwa Ọnụ Taa

Ịda Ogbenye—Nsogbu nke Zuru Ụwa Ọnụ Taa

Ịda Ogbenye—Nsogbu nke Zuru Ụwa Ọnụ Taa

VICENTE * na-ejikarị trọk ebu ngwongwo n’okporo ámá dị na São Paulo, Brazil. Ọ na-atụtụkọ katọn, pan ndị a tụfuru atụfu, na plastik. Chi jiwe, ya atụkọta ibe katọn n’okpuru trọk ya ma hie ụra. O yiri ka ọ dịghịdị anụ ụzụ ụgbọala ndị na-agbafe n’okporo ámá ebe ahụ ọ na-arahụ. Ọ dị mgbe o nwere ọrụ, ụlọ, na ezinụlọ—ma ọ dịghịzi nke n’ime ha o nwere. Ugbu a, ọ bụ n’okporo ámá ka ọ na-adọga ịkpata ihe ọ na-eri.

Ọ dị mwute na ọtụtụ nde ndị mmadụ gburugburu ụwa bụ ndị ogbenye ọnụ ntụ dị ka Vicente. Ná mba ndị ka na-emepe emepe, ọtụtụ ndị na-ehi n’okporo ámá ma ọ bụ ná nkịrịka ụlọ. A na-ahụkarị ka ndị ngwụrọ, ndị ìsì na ụmụ nwanyị na-enye nwa ara, na-arịọ arịrịọ. Mgbe ọ bụla ụgbọala kwụsịrị n’okporo ụzọ, ụmụaka na-agbara ọsọ aga ere swit na ihe ndị ọzọ iji nweta obere ego.

Ọ na-esi ike ịkọwa ihe mere e ji kwere ka ndị mmadụ na-ada ogbenye otú a. Magazin ndị Britian, bụ́ The Economist kwuru, sị: “Ọ dịtụbeghị mgbe ụmụ mmadụ nwetụrụla ụdị ihe ọmụma ha nwere ugbu a n’ihe banyere nkà ọgwụ, nkà na ụzụ na ọgụgụ isi dị mkpa iji kwụsị ịda ogbenye.” Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ihe ọmụma ndị dị otú a abaworo ọtụtụ ndị uru. Ọmarịcha ụgbọala ọhụrụ na-ejupụta n’okporo ámá ndị dị n’obodo ukwu dị iche iche dị n’ọtụtụ mba ndị na-emepe emepe. Ihe juru n’ụlọ ahịa bụ ngwá eletrọniks ọgbara ọhụrụ ndị bụ́ ọkpọka, a dịghịkwa achọ ndị ga-azụ ha achọ. Nnukwu ụlọ ahịa abụọ dị na Brazil mere mkpọsa ngwá ahịa pụrụ iche iji ree ngwá ahịa ha. Nnukwu ụlọ ahịa ndị a ghere oghe ehihie na abalị site na December 23 ruo 24, 2004. Otu n’ime ụlọ ahịa ndị ahụ kpọrọ ndị egwú iji mee ndị bịara ịzụ ihe obi ụtọ. Ihe omume ahụ dọtara mmasị ihe fọrọ nke nta ka o ruo narị puku ndị ahịa ise!

N’agbanyeghị nke ahụ, ihe ka ukwuu ná ndị mmadụ adịghị erite uru n’akụ̀ na ụba nke ndị ọgaranya. Nnukwute ọdịiche e nwere n’etiti ndị ọgaranya na ndị ogbenye emewo ka ọtụtụ ndị kwubie na e kwesịrị ime ihe ngwa ngwa iji kpochapụ ịda ogbenye. Magazin ndị Brazil bụ́ Veja kwuru, sị: “Ihe bụ́ isi ụwa ga-elebara anya n’afọ a [2005] kwesịrị ịbụ ịlụso ịda ogbenye ọgụ.” Veja kọkwara na a na-eme ndokwa inwe usoro ihe omume yiri nke United States hiwere mgbe ha chọrọ ime ka mee ka ọnọdụ akụ̀ na ụba Europe dịghachi mma mgbe Agha Ụwa nke Abụọ gasịrị. Ma na nke ugbu a, a na-achọ ihiwe ya iji nyere obodo ndị kasị daa ogbenye aka, karịsịa n’Africa. Otú ọ dị, ọ bụ ezie na nkwa ndị a na-enye echiche na ihe ga-adị mma, magazin ahụ gbakwụnyere, sị: “E nwekwara ọtụtụ ihe mere a ga-eji na-enyo atụmatụ a enyo ma ọ̀ ga-arụpụta ihe dị mma. Ihe pụrụ ime ka ihe ka ọtụtụ ná mba dị iche iche na-ala azụ iwepụta ego iji kwado atụmatụ a bụ n’ihi na ego ahụ adịghị erute ndị e bu n’uche nye ya aka.” Ọ dị nnọọ mwute ikwu na n’ihi nrụrụ aka na igbu oge, akụkụ ka ukwuu n’ego ahụ gọọmenti na òtù ụlọ ọrụ mba nile nakwa nke ndị mmadụ n’otu n’otu na-enye adịghị erute ndị e nyere ya aka.

Jizọs maara na a ga na-enwe ndị dara ogbenye. Ọ sịrị: “Unu na ndị ogbenye nọ mgbe nile.” (Matiu 26:11) Nke a ọ̀ pụtara na ọ dịtụghị mgbe a ga-akwụsị inwe ndị dara ogbenye n’ụwa? È nwere ihe a pụrụ ime iji mezie ọnọdụ ahụ? Gịnị ka Ndị Kraịst pụrụ ime iji nyere ndị ogbenye aka?

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 2 A gbanwewo aha ahụ.