Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịmata Ihe Mere Chineke Ji Kwe Ka Nhụjuanya Dịrị Gbanwere Ndụ M

Ịmata Ihe Mere Chineke Ji Kwe Ka Nhụjuanya Dịrị Gbanwere Ndụ M

Akụkọ Ndụ

Ịmata Ihe Mere Chineke Ji Kwe Ka Nhụjuanya Dịrị Gbanwere Ndụ M

DỊ KA HARRY PELOYAN SI KỌỌ

Gịnị mere Chineke ji kwere ka nhụjuanya dịrị? Ajụjụ ahụ anọwo na-enye m nsogbu n’obi kemgbe m dị obere. Ndị mụrụ m na-arụsị ọrụ ike, na-akwụwa aka ọtọ, ma na-achọ ka ihe na-adịrị ezinụlọ ha mma. Ma papa m adịghị aga chọọchị, mama m na-agakwa nanị mgbe ọ masịrị ya. N’ihi ya, ha azalighị m ajụjụ ahụ.

ECHESIRI m echiche ike banyere ajụjụ ahụ karịsịa n’oge a na-alụ Agha Ụwa nke Abụọ nakwa mgbe o bisịrị bụ́ mgbe m rụrụ ọrụ n’Òtù Ndị Agha Mmiri nke U.S. ruo afọ atọ. Mgbe agha ahụ biri, a gwara m ka m sonye n’ụgbọ mmiri e zigara ka ọ gaa buga ihe enyemaka na China. Anọrọ m ebe ahụ ihe fọrọ nke nta ka o ruo otu afọ ma hụ nnukwute ahụhụ ndị mmadụ na-ata.

Ndị China bụ ndị maara ihe, ha na-arụsikwa ọrụ ike. Ma ihe na-esiri nnọọ ọtụtụ n’ime ha ike n’ihi ịda ogbenye tinyekwara ime ihe ike Agha Ụwa nke Abụọ kpatara. Ihe kasị wute m bụ ọmarịcha ụmụaka, bụ́ ndị ọtụtụ n’ime ha na-adịghị eri ihe ndị na-edozi ahụ́ ma na-eyi nkịrịka ákwà, ha na-abịakwa arịọ anyị arịrịọ mgbe ụgbọ anyị kwụsịrị n’ikperé mmiri.

Gịnị Mere Ndị Mmadụ Ji Ata Ahụhụ?

A mụrụ m na 1925 ma zụlite m na California nke dị na U.S.A. Ahụtụbeghị m ebe ndị mmadụ na-ata ahụhụ otú a. Ya mere, ajụrụ m onwe m ugboro ugboro, sị, ‘Ọ bụrụ na e nwere Onye Okike nke pụrụ ime ihe nile, gịnị mere ọ ga-eji kwe ka ọtụtụ mmadụ na-ata ụdị ahụhụ a, karịsịa ụmụaka na-enweghị ihe ha mere?’

Echekwara m na ọ bụrụ na Chineke dị adị, gịnị mere o ji hapụ ụdị mbibi a, mgbukpọ, ọnwụ, nakwa nhụjuanya bụ́ nke mekpọworo ụmụ mmadụ ọnụ eri ọtụtụ narị afọ—karịsịa n’oge ahụ a na-alụ Agha Ụwa nke Abụọ, bụ́ mgbe e gburu ihe karịrị nde mmadụ iri ise. Ọzọkwa, n’oge nile a lụrụ agha ahụ, gịnị mere ndị ụkọchukwu ji gbaa ndị nọ n’otu okpukpe ume igbu ibe ha nanị n’ihi na ha esighị n’otu mba?

Ígwè Teliskop

Mgbe Agha Ụwa nke Abụọ ahụ malitere na 1939, e gbuokwa ọtụtụ mmadụ, echere m na ọ pụrụ ịbụ na Chineke adịghị. Ya mere, Mgbe m na-amụ ihe ọmụmụ sayensị n’ụlọ akwụkwọ dị elu, a gwara onye ọ bụla n’ime anyị bụ́ ụmụ akwụkwọ ka ọ rụọ ngwá ọrụ ọ bụla masịrị ya e ji amụ banyere sayensị. Ebe ọ bụ na m nwere mmasị ná nkà mmụta banyere mbara igwe, ahọọrọ m ịrụ nnukwute teliskop bụ́ nke nwere enyo dị sentimita iri abụọ n’obosara.

Iji rụọ teliskop a, azụtara m ugegbe dị ihe karịrị sentimita abụọ na ọkara n’ọkpụrụkpụ nakwa sentimita iri abụọ n’obosara. Abịaziri m were ihe e ji awa enyo waa ya ka ọ dị gburugburu. Mgbe m mesịrị nke ahụ, amalitere m ọrụ siri ike bụ́ iji aka na-akwọ ya n’ebe ga-eme ka azụ ugegbe ahụ gbalitetụ elu. Nke a wekọọrọ oge nile m kwesịrị iji zuru ike n’oge agụmakwụkwọ were ọnwa isii. Mgbe m mezichara enyo ahụ, akwụnyere m ya n’ọnụ ogologo paịpụ ma kwụnye ya ugegbe anya ndị a pụrụ iji hụ ihe dị iche iche.

N’otu abalị ihu eluigwe gbachapụrụ agbachapụ mgbe ọnwa na-adịghị agba, ebuuru m teliskop ahụ m rụcharala pụọ n’èzí na nke mbụ ya, ma jiri ya hụ kpakpando na mbara ala ndị dị n’usoro mbara igwe anyị. Ọ tụrụ m n’anya mgbe m hụrụ ọnụ ọgụgụ nke ihe ndị dị n’eluigwe nakwa otú e si hazie ihe nile n’usoro. Ya mere, ọ tụkwuru m n’anya mgbe m hụrụ na ụfọdụ ihe ndị m chere na ha bụ “kpakpando” bụ n’ezie ụyọkọ kpakpando dị ka Milky Way anyị, nke ọ bụla n’ime ha nwekwara ọtụtụ ijeri kpakpando.

Echere m, sị, ‘Ihe ndị a nile enweghị ike ịpụta n’onwe ha. Ọ dịghị ihe ọ bụla a haziri ahazi nke pụtara n’onwe ya. A haziri nnọọ eluigwe na ala nke ọma nke na o yiri ka ọ̀ bụ onye ụbụrụ na-aghọ nnọọ nkọ mere ya. O nwedịrị ike ịbụ na e nwere Chineke.’ Ihe m ji teliskop ahụ hụ mere ka m kwụsịtụ iche na Chineke adịghị.

Ajụziri m onwe m, sị: ‘Ọ bụrụ n’ezie na e nwere Chineke nke nwere ike na amamihe zuru ezu iji kee eluigwe na ala a dị ịtụnanya, ọ̀ bụ na o nweghị ike imezi ọnọdụ ọjọọ a nke ụwa nọ na ya? Gịnị mere o jidị kwe ka nhụsianya a malite?’ Mgbe m jụrụ ndị ji okpukpe kpọrọ ihe ajụjụ ndị a, ha enyelighị m azịza na-eju afọ.

Mgbe m gụsịrị akwụkwọ sekọndrị ma gaa mahadum ruo ọtụtụ afọ, esonyeere m Ndị Agha Mmiri U.S. na 1943. Otú ọ dị, ndị ụkọchukwu anyị nwere n’òtù ndị agha ahụ apụghị nnọọ ịza ajụjụ m. Ndị ji okpukpe kpọrọ ihe na-ekwukarị ihe dị ka, “Onyenwe anyị na-arụ ọrụ n’ụzọ dị omimi.”

Agara M n’Ihu Ịchọ Azịza Nye Ajụjụ M

Mgbe m hapụsịrị China, m ka nọgidere na-ajụ ihe mere Chineke ji kwere ka nhụjuanya dịrị. Ajụjụ ndị ahụ ekweghị apụ m apụ n’obi, karịsịa mgbe m hụrụ ebe e liri ndị agha n’agwaetiti dị iche iche ebe ndị anyị kwụsịtụrụ ka anyị si n’Oké Osimiri Pacific na-ala. Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime ndị e liri n’ili ndị ahụ bụ ụmụ okorobịa nwụchuru ọnwụ.

Mgbe m lọghachiri United States ma kwụsị ịrụ n’òtù ndị agha mmiri, abanyere m Mahadum Harvard nke dị na Cambridge, Massachusetts, iji gụchapụ otu afọ fọdụụrụ m. Agụsịrị m akwụkwọ n’afọ sochirinụ ma nweta akara ugo mmụta, ma alaghachighị m California. Ekpebiri m ịnọtụkwu n’Ụsọ Oké Osimiri nke Ebe Ọwụwa Anyanwu United States iji nweta azịza nye ajụjụ m. Ebu m n’obi ịga New York City, bụ́ ebe e nwere ọtụtụ okpukpe, ka m nwee ike ịga ụfọdụ okpukpe iji hụ ihe a na-akụzi.

Na New York, nwanne nwanyị mama m bụ́ Isabel Kapigian, gwara m ka m bịa nọrọ n’ụlọ ya. Ya na ụmụ ya nwanyị abụọ bụ́ Rose na Ruth, bụ Ndịàmà Jehova. Amalitere m ịdị na-aga okpukpe ndị ọzọ n’ihi na echere m na mụ agaghị enwe mmasị na nkwenkwe Ndịàmà Jehova, ana m ajụkwa ndị mmadụ ajụjụ ma na-agụ akwụkwọ okpukpe ha. Ana m ajụkarị ha ihe mere Chineke ji kwe ka nhụjuanya dịrị, ma ha amaghị azịza ya dịkwa ka m na-amaghị. Ekwubiri m na o nwere ike Chineke adịdịghị.

Ịchọta Azịza

Ajụziri m nwanne mama m na ụmụ ya ma m nwere ike ịgụ akwụkwọ okpukpe ha iji mata ihe Ndịàmà Jehova chere banyere okwu a. Mgbe m gụrụ akwụkwọ ha, achọpụtara m ozugbo na Ndịàmà Jehova dị nnọọ iche n’okpukpe ndị ọzọ. E jiri Bible zaa ajụjụ ndị ahụ, azịza ndị ha nyekwara juru m nnọọ afọ. N’oge na-adịghị anya, a zara m ajụjụ m banyere ihe mere Chineke ji kwere ka nhụjuanya dịrị.

Ọ bụghị nanị nke ahụ, achọpụtara m na Ndịàmà Jehova na-akwado azịza ha ndị dabeere na Bible site n’ibi ndụ kwekọrọ n’ihe ha kweere. Dị ka ihe atụ, ajụrụ m nwanne mama m ihe ụmụ okorobịa Ndịàmà Jehova nọ na Germany mere n’oge Agha Ụwa nke Abụọ. Hà sonyeere ndị agha Germany, hà kwuru “Heil Hitler!,” ma kelee ọkọlọtọ swastika? Ọ zara na ha emeghị otú ahụ. Nakwa na a kpọgara ha n’ogige ịta ahụhụ bụ́ ebe a nọrọ gbuo ọtụtụ n’ime ha n’ihi na ha ekweghị eme ihe ndị ọzọ na-eme. Ọ kọwara na Ndịàmà Jehova nọ ebe nile n’oge ahụ a na-alụ agha etinyeghịkwa aka n’agha. Ọbụna ná mba ndị e nwere ọchịchị onye kwuo uche ya, e tinyere ụmụ okorobịa Ndịàmà Jehova n’ụlọ nga n’ihi na ha ekweghị eje agha.

Mgbe ahụ, nwanne mama m gwara m ka m gụọ Jọn 13:35, bụ́ nke na-ekwu, sị: “Mmadụ nile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ma ọ bụrụ na unu enwee ịhụnanya n’etiti onwe unu.” Ezi Ndị Kraịst aghaghị inwe ịhụnanya nke bụ́ akara e ji amata ha n’ebe ọ bụla ha bi. Ha agatụghị akwado akụkụ ọ bụla n’agha, na-egbu ibe ha n’ihi na ha esighị n’otu mba! Ọ jụrụ m, sị: “Ì chere na Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya kwadoro akụkụ nke ọ bụla n’agha ndị a lụrụ na Rom, ma gbuo ibe ha?”

Ọ gwakwara m ka m gụọ 1 Jọn 3:10-12. Ebe ahụ sịrị: “Ụmụ Chineke na ụmụ Ekwensu pụtara ìhè site n’eziokwu a: Onye ọ bụla nke na-adịghị anọgide na-eme ezi omume esiteghị na Chineke, otú ahụ ka ọ dịkwa onye na-adịghị ahụ nwanna ya n’anya. . . . Anyị kwesịrị inwe ịhụnanya maka ibe anyị; ọ bụghị dị ka Ken, onye sitere n’ajọ onye ahụ ma gbuo nwanne ya.”

Ihe Bible nwere ikwu n’okwu a doro nnọọ anya. Ezi Ndị Kraịst na-ahụ ibe ha n’anya, n’agbanyeghị ebe ha bi. N’ihi ya, ha ekwesịghị igbu ụmụnna ha ma ọ bụ onye ọ bụla ọzọ. Ọ bụ ya mere Jizọs ji kwuo banyere ụmụazụ ya, sị: “Ha abụghị akụkụ nke ụwa, dị nnọọ ka m na-abụghị akụkụ nke ụwa.”—Jọn 17:16.

Ihe Mere E Ji Kwere Ka Nhụjuanya Dịrị

N’oge na-adịghị anya, aghọtara m na Bible gwara anyị ihe mere Chineke ji kwere ka nhụjuanya dịrị. Ọ kọwara na mgbe Chineke kere nne na nna anyị mbụ, o kere ha dị ka ndị zuru okè ma tinye ha n’ogige bụ́ paradaịs. (Jenesis 1:26; 2:15) O nyekwara ha onyinye mara nnọọ mma nke bụ́ nnwere onwe ime nhọrọ. Ma ha kwesịrị iji nnwere onwe ahụ e nyere ha mee ihe n’ụzọ ziri ezi. Ọ bụrụ na ha erubere Chineke na iwu ya isi, ha ga-anọgide bụrụ ndị zuru okè n’ime paradaịs. Ha ga-agbasawanye ókè ala nke paradaịs ahụ ruokwa mgbe ụwa nile ghọrọ paradaịs. Ụmụ ha ga-abụkwa ndị zuru okè, nke na ka oge na-aga, ụwa a ga-aghọ paradaịs dị ebube ebe ụmụ mmadụ zuru okè, ma nwee obi ụtọ ga-ebi.—Jenesis 1:28.

Otú ọ dị, ọ bụrụ na Adam na Iv ahọrọ ime ihe masịrị ha n’adabereghị na Chineke, mgbe ahụ ọ gaghịzi ekwe ka ha nọgide na-ezu okè. (Jenesis 2:16, 17) N’ụzọ dị nnọọ mwute, nne na nna anyị mbụ jiri nnwere onwe ha mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi ma họrọ ime ihe masịrị ha n’adabereghị na Chineke. Ọ bụ mmụọ ozi e kere eke, onye a bịara mara dị ka Setan bụ́ Ekwensu, kpaliri ha inupụrụ Chineke isi. Ọ chọsiri nnọọ ike ime ihe masịrị ya, chọọkwa ka a na-efe ya ofufe e kwesịrị ife nanị Chineke.—Jenesis 3:1-19; Mkpughe 4:11.

Setan si otú a ghọọ “chi nke usoro ihe a.” (2 Ndị Kọrint 4:4) Bible kwuru, sị: “Ụwa dum dị n’ike aka nke ajọ onye ahụ.” (1 Jọn 5:19) Jizọs kpọrọ Setan “onye na-achị ụwa.” (Jọn 14:30) Nnupụisi Setan na nke nne na nna anyị mbụ kpataara mmadụ nile ezughị okè, ime ihe ike, ọnwụ, iru újú, nakwa nhụjuanya.— Ndị Rom 5:12.

‘Ọ Bụghị Mmadụ Nwe Ime Ka Nzọụkwụ Ya Guzosie Ike’

Iji gosi ihe emeghị iwu Onye Okike nyere ga-arụpụtara ezinụlọ mmadụ, kemgbe ọtụtụ puku afọ, Chineke ekwewo ka ha nweta ihe ndị si n’ileghara iwu ya anya pụta. Ogologo oge a nile enyewo mmadụ nile ohere zuru ezu ikweta na ihe a Bible kwuru bụ eziokwu: “Ọ bụghị n’aka ya onwe ya ka ụzọ mmadụ dị: ọ bụghị onye ọ bụla nke na-eje ije nwe ime ka nzọụkwụ ya guzosie ike. Dọọ m aka ná ntị Jehova.”—Jeremaịa 10:23, 24

Ugbu a, ka ọtụtụ narị afọ nile a gafeworo, anyị pụrụ ịhụ na ịchịisi n’adabereghị n’ebe Chineke nọ akpatawo ọdachi. Ya mere, Chineke zubere ịgharazi ikwe ka ụmụ mmadụ nọgide na-anwa ịchị onwe ha n’adabereghị n’ebe ọ nọ, nakwa n’ejighị iwu ya eme ihe, bụ́ nke wetawooro ha ọtụtụ nhụjuanya.

Ọdịnihu Dị Ebube

Amụma Bible gosiri na n’oge na-adịghị anya, Chineke ga-eweta usoro ihe obi ọjọọ a ná njedebe: “Ọ fọdụrụ nwa mgbe, onye na-emebi iwu agaghị adịkwa . . . Ma ndị dị umeala n’obi ga-enweta ala; ịba ụba nke udo ga-atọkwa ha ụtọ.”—Abụ Ọma 37:10, 11.

Amụma dị na Daniel 2:44 kwuru, sị: “Ma n’ụbọchị ha, bụ́ eze ndị a [ụdị ọchịchị nile dị ugbu a], ka Chineke nke eluigwe ga-eme ka otu alaeze bilie, nke a gaghị emebi emebi ruo mgbe ebighị ebi, ọ bụkwa ọbụbụeze ya ka a na-agaghị ahapụrụ ndị ọzọ; ọ ga-etipịa alaeze ndị a nile mee ka ha gwụsịa, ma ya onwe ya ga-eguzosi ike ruo mgbe ebighị ebi.” A gaghị ekwe ka ụmụ mmadụ chịa ọzọ. Alaeze Chineke ga-achị ụwa nile. N’okpuru ọchịchị ya, a ga-eme ka ụwa nile ghọọ paradaịs, ụmụ mmadụ ga-etozu okè iji na-ebi ndụ n’obi ụtọ ruo mgbe ebighị ebi. Bible kwere nkwa, sị: “[Chineke] ga-ehichapụkwa anya mmiri ọ bụla n’anya ha, ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru újú ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ. Ihe mbụ agabigawo.” (Mkpughe 21:4) Legodị nnọọ ọdịnihu magburu onwe ya Chineke kwadebeworo anyị!

Ndụ Dị Iche

Inweta azịza na-eju afọ nye ajụjụ m mere ka m gbanwee ụzọ m si ebi ndụ. Site mgbe ahụ gaa n’ihu, achọsiri m ike ijere Chineke ozi na inyere ndị ọzọ aka ịghọta ihe mere Chineke ji kwere ka nhụjuanya dịrị. Aghọtara m otú ihe e dere na 1 Jọn 2:17 dịruru ná mkpa, bụ́ nke kwuru, sị: “Ụwa [usoro ihe dị ugbu a nke Setan na-achị] na-agabiga, otú ahụkwa ka ọ dị ọchịchọ ya, ma onye na-eme uche Chineke na-anọgide ruo mgbe ebighị ebi.” Achọsiri m ike ịdị ndụ ebighị ebi n’ime ụwa ọhụrụ Chineke. Ekpebiziri m ịnọrọ na New York ma malite iso ọgbakọ Ndịàmà Jehova nke dị n’ebe ahụ na-amụ ihe, enwetara m ọtụtụ ahụmahụ ndị dị ụtọ ka m na-akụziri ndị ọzọ ihe m mụtara.

Na 1949, amatara m Rose Marie Lewis. Ya na mama ya, bụ́ Sadie, na ụmụnne ya ndị nwanyị isii, bụcha Ndịàmà Jehova. Rose bụ onye ọsụ ụzọ oge nile nke na-ejere Chineke ozi. O nwere ọtụtụ àgwà ndị mara mma, ọ dọkwaara mmasị m ozugbo. Anyị lụrụ na June 1950 ma nọrọ na New York. Anyị nwere obi ụtọ n’ihe anyị na-eme, na-aṅụrịkwa ọṅụ n’ihi olileanya nke ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa ọhụrụ Chineke.

Na 1957, mụ na Rose Marie banyere ozi oge nile n’isi ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Brooklyn, New York. Ka ọ na-erule June 2004, alụmdi na nwunye anyị nke obi ụtọ jupụtara na ya eruola afọ iri ise na anọ, anyị jiri afọ iri anọ na asaa n’ime ya jee ozi n’isi ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Brooklyn. Afọ ndị ahụ anyị jiri jeere Jehova ozi ma sorokwa ọtụtụ puku ndị kwere ekwe ibe anyị rụkọọ ọrụ bụụrụ anyị afọ obi ụtọ.

Nhụjuanya Kasịnụ M Nwetara

Ọ dị mwute ikwu na, ná mmalite December 2004, a chọpụtara na Rose Marie nwere akpụ cancer n’otu n’ime akpa ume ya. Ndị dọkịta kwuru na e kwesịrị ịwapụ ya ngwa ngwa n’ihi na ọ na-eto n’ike n’ike. A wara ya ahụ́ ahụ ná ngwụsị December, otu izu ka a wasikwara ya ahụ́, dọkịta wara Rose ahụ́ batara n’ọnụ ụlọ Rose nọ na ya n’ụlọ ọgwụ ahụ mgbe m nọ n’ebe ahụ, ma kwuo, sị: “Rose Marie, lawa! Ị gbakeela!”

Otú ọ dị, nanị ụbọchị ole na ole ka anyị lọtasịrị, afọ na akụkụ ahụ́ ndị ọzọ malitere igbu Rose Marie mgbu. Ahụ́ mgbu a akwụsịghị, n’ihi ya, ọ gaghachiri n’ụlọ ọgwụ ahụ ka e lekwuo ya ahụ́. A chọpụtara na n’ihi ihe ụfọdụ, ọbara nọ na-akpụkọ n’akụkụ ahụ́ ndị dị oké mkpa. Nke a na-egbochikwa ikuku oxygen ịbanye n’akụkụ ahụ́ ndị a. Ndị dọkịta ahụ mere ihe nile ha nwere ike ime iji gwọta ya, ma o nweghị isi. Nanị otu izu ka e mesịrị, na January 30, 2005, ọdachi kasị njọ m nwetụrụla ná ndụ m dakwasịrị m. Ezigbo nwunye m, bụ́ Rose Marie nwụrụ.

N’oge ahụ, ọ fọrọ obere ihe ka m ruo afọ iri asatọ. Ná ndụ m nile, ahụwo m ka ndị mmadụ na-ata ahụhụ, ma nke a dị iche. Mụ na Rose Marie bụ, dị ka Bible si kwuo ya, “otu anụ ahụ́.” (Jenesis 2:24) Ahụla m ka ndị ọzọ na-eru újú mgbe ndị ha hụrụ n’anya nwụrụ, erukwaala m újú mgbe ndị enyi m na ndị ikwu m nwụrụ. Ma o nweghị nke ọ bụla n’ime ha a pụrụ iji tụnyere mwute m nwere mgbe nwunye m nwụrụ, ọ dịtekwara aka. Ugbu a ka m ghọtara oké iru újú nke ọnwụ ndị a hụrụ n’anya nọworo na-akpatara ụmụ mmadụ eri ogologo oge.

Ka o sina dị, ịghọta ihe kpatara nhụjuanya nakwa otú ọ ga-esi kwụsị emewo ka m ghara inwe mwute gabiga ókè. Abụ Ọma 34:18 kwuru, sị: “Jehova nọ nso ndị obi ha tiwara etiwa, Ọ na-azọpụtakwa ndị a zọpịaworo n’ime mmụọ ha.” Isi ihe na-eme ka m na-edi ọnwụ a bụ na m maara na Bible kụziri na a ga-enwe mbilite n’ọnwụ, na ndị nọ n’ili ga-ebilite ma nwee ohere nke ibi n’ụwa ọhụrụ Chineke ruo mgbe ebighị ebi. Ọrụ 24:15 na-ekwu, sị: “A gaje inwe mbilite n’ọnwụ nke ma ndị ezi omume ma ndị ajọ omume.” Rose Marie hụrụ Chineke n’anya nke ukwuu. Amakwaara m na Chineke hụkwara ya n’anya nakwa na ọ ga-echeta ya, ma kpọlite ya mgbe oge ya ruru, nke m na-atụkwa anya na ọ ga-eme n’oge na-adịghị anya.—Luk 20:38; Jọn 11:25.

Ọ bụ ezie na ọnwụ nke onye a hụrụ n’anya na-akpata mwute dị ukwuu, ma ọṅụ nke ịnabataghachi onye a hụrụ n’anya mgbe o bilitere n’ọnwụ ga-akarị ya. (Mak 5:42) Okwu Chineke kwere nkwa, sị: “Ndị Gị ndị nwụrụ anwụ ga-adị ndụ . . . ala ga-amụpụtakwa ndị na-adịghị ndụ.” (Aịsaịa 26:19) Ọ pụrụ ịbụ na a ga-ebu ụzọ akpọlite ọtụtụ n’ime “ndị ezi omume” ahụ a kpọtụrụ uche n’Ọrụ 24:15. Nke ahụ ga-abụ nnọọ oge dị ebube! Rose Marie ga-esokwa ná ndị a ga-akpọlite. Ndị hụrụ ya n’anya ga-anabata ya n’ụzọ na-ekpo ọkụ n’ezie! Lee ka ọ ga-esi bụrụ nnọọ ihe na-eju afọ n’oge ahụ ibi n’ụwa a na-enwekwaghị nhụjuanya!

[Foto ndị dị na peeji nke 9]

Ahụrụ m ndị na-ahụju anya n’oge m nọ na China

[Foto ndị dị na peeji nke 10]

Anọwo m na-eje ozi n’isi ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Brooklyn kemgbe 1957

[Foto dị na peeji nke 12]

Alụrụ m Rose Marie na 1950

[Foto dị na peeji nke 13]

N’afọ 2000 mgbe anyị mere ememe ncheta nke afọ 50 anyị gbara akwụkwọ