Ịnọgidesi Ike Na-ejere Kraịst Bụ́ Eze Ozi
Ịnọgidesi Ike Na-ejere Kraịst Bụ́ Eze Ozi
“Ọ bụkwa ya ka e nyere ọchịchị, na ebube, na alaeze, ka ndị nile dị iche iche na mba nile na ndị nile na-asụ asụsụ dị iche iche wee fee Ya.”—DANIEL 7:14.
1, 2. Olee otú anyị si mara na ọchịchị Alaeze Kraịst erughị ebe nile n’afọ 33 O.A.?
OLEE onye ọchịchị nke pụrụ ịnwụrụ ndị ọ na-achị ma dịghachi ndụ iji chịwakwa dị ka eze? Oleekwa eze nke pụrụ ibi n’ụwa ma mee ka ndị ọ na-achị tụkwasị ya obi ma na-akwado ọchịchị ya, ma mesịa gaa eluigwe, sizie ebe ahụ na-achị ha? Ọ bụ nanị Jizọs Kraịst pụrụ ime nke a, ọbụna mee karị. (Luk 1:32, 33) Na Pentikọst 33 O.A., mgbe Kraịst nwụsịrị, bilite n’ọnwụ, ma rịgoro n’eluigwe, Chineke ‘mere ya onyeisi nke ihe nile n’ebe ọgbakọ ahụ dị.’ (Ndị Efesọs 1:20-22; Ọrụ 2:32-36) Kraịst si otú a malite ịchị, ma ọchịchị ya erughị ebe nile. Ndị mbụ ọ nọ na-achị bụ Ndị Kraịst e ji mmụọ nsọ tee mmanụ, bụ́ ndị mejupụtara Izrel ime mmụọ, “Izrel nke Chineke.”—Ndị Galeshia 6:16; Ndị Kọlọsi 1:13.
2 Ka ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ iri atọ ka Pentikọst nke afọ 33 O.A. gasịrị, Pọl onyeozi mesiri ya ike na ọchịchị Alaeze Kraịst erubeghị ebe nile, kama nke ahụ, Ọ nọ “n’aka nri Chineke, malite mgbe ahụ gaa n’ihu na-echere ruo mgbe a ga-edebe ndị iro ya dị ka ihe mgbakwasị maka ụkwụ ya.” (Ndị Hibru 10:12, 13) Ka ọ na-eruzi ná ngwụsị nke narị afọ mbụ Oge Anyị, Jọn onyeozi katarala ahụ́ hụrụ ka Eze Eluigwe na Ala, bụ́ Jehova, na-echi Kraịst Jizọs Eze nke Alaeze eluigwe ahụ e hiwere ọhụrụ. (Mkpughe 11:15; 12:1-5) Taa, anyị pụrụ ịtụle ọtụtụ ihe àmà ndị na-egosi na Kraịst malitere ịchị dị ka Eze Mezaịa n’eluigwe na 1914. *
3. (a) Olee akụkụ ọhụrụ nke ozi ọma ahụ bụ́ nke pụtaworo ìhè kemgbe 1914? (b) Olee ajụjụ ndị anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị?
3 Kemgbe 1914, ozi ọma ahụ enweela akụkụ ọhụrụ na-akpali nnọọ mmasị. Kraịst anọwo na-arụsi ọrụ ike dị ka eze nke Alaeze eluigwe Chineke ọ bụ ezie na ọ na-achị “n’etiti ndị iro [ya].” (Abụ Ọma 110:1, 2; Matiu 24:14; Mkpughe 12:7-12) Ọzọkwa, gburugburu ụwa, ndị na-akwadosi ọchịchị ya ike ji obi ha na-erubere ya isi site n’ikere òkè n’ọrụ nkụzi Bible zuru ụwa ọnụ bụ́ nke a na-enwebeghịkwa ụdị ya kemgbe ụwa. (Daniel 7:13, 14; Matiu 28:18) Ndị Kraịst e ji mmụọ nsọ tee mmanụ, ya bụ “ụmụ nke alaeze ahụ,” na-eje ozi dị ka “ndị nnọchiteanya nọ n’ọnọdụ Kraịst.” Ìgwè “atụrụ ọzọ” na-amụba amụba nke Kraịst, bụ́ ndị na-eje ozi dị ka ndị ozi nke Alaeze Chineke, na-akwadosi ha ike. (Matiu 13:38; 2 Ndị Kọrint 5:20; Jọn 10:16) Ya bụrụgodị otú ahụ, ọ dị anyị mkpa n’otu n’otu inyocha onwe anyị iji mara ma ànyị na-erubere Kraịst isi n’ezie. Ànyị kwụsiri nnọọ ike n’akụkụ ya? Olee otú anyị pụrụ isi gosi na anyị na-akwado Eze nke na-achị n’eluigwe? Ka anyị burugodị ụzọ tụlee ihe ndị mere anyị ga-eji kwụsie ike n’akụkụ Kraịst.
Eze nke Na-akpali Ndị Mmadụ Ịkwụsi Ike n’Akụkụ Ya
4. Gịnị ka Jizọs mere dị ka Onye A Họpụtara Ịbụ Eze mgbe o jere ozi n’ụwa?
4 Ihe mere anyị ji akwụsi ike n’akụkụ Kraịst bụ n’ihi ihe o meere anyị nakwa n’ihi àgwà ya ndị magburu onwe ha. (1 Pita 1:8) Mgbe ọ nọ n’ụwa, Jizọs dị ka Onye A Họpụtara Ịbụ Eze, gosiri n’ụzọ dị nta ihe ọ ga-eme n’ụwa nile ma ya chịwa dị ka Eze mgbe oge Chineke ruru. O nyere ndị agụụ ji nri. Ọ gwọrọ ndị ọrịa, ndị ìsì, ndị nwere nkwarụ, ndị ntị chiri na ndị ogbi. Ọbụna ọ kpọlitere ụfọdụ ndị nwụrụ anwụ. (Matiu 15:30, 31; Luk 7:11-16; Jọn 6:5-13) Tụkwasị na nke ahụ, ịma banyere otú Jizọs si bie ndụ n’ụwa na-enyere anyị aka ịmata àgwà ndị o nwere dị ka Onye ga-achị ụwa n’ọdịnihu—nke kasị pụta ìhè n’ime ha bụ ụdị ịhụnanya o nwere bụ́ nke kpaliri ya ịchụ onwe onye n’àjà. (Mak 1:40-45) A kọrọ na Napoléon Bonaparte kwuru banyere nke a, sị: “Aleksanda, Siza, Charlemagne, na mụ onwe m guzobere alaeze ukwu dị iche iche, ma n’elu gịnị ka anyị dabeere nchepụta nile nke oké ọgụgụ isi anyị? Ọ bụ n’ime ihe n’ike. Ọ bụ nanị Jizọs Kraịst mere ntọala alaeze ya n’elu ịhụnanya, n’oge a kwa, ọtụtụ nde ndị mmadụ ga-achọ ịnwụ maka Kraịst.”
5. N’ihi gịnị ka ụdị onye Jizọs bụ ji adọrọ mmasị ndị mmadụ?
5 N’ihi na Jizọs nwere obi dị nwayọọ, dịkwa umeala n’obi, ozizi ya na-ewuli elu na obiọma ya mere ka ndị nọ ná nsogbu na ndị a na-ebogbu n’ibu nwee ume ọhụrụ. (Matiu 11:28-30) Ahụ́ na-eru ụmụaka ala ma ya na ha nọrọ. Ndị ikom nwere nghọta ma dị umeala n’obi ghọrọ ndị na-eso ụzọ ya. (Matiu 4:18-22; Mak 10:13-16) N’ihi na ọ bụ onye na-echebara ndị ọzọ echiche ma na-akwanyere ha ùgwù, ọtụtụ ndị inyom na-atụ egwu Chineke, bụ́ ndị ọtụtụ n’ime ha jiri oge, ike, na ihe onwunwe ha lekọta ya ka ọ na-eje ozi ya, kwụsiri ike n’akụkụ ya.—Luk 8:1-3.
6. Olee mmetụta dị nro Jizọs gosipụtara mgbe Lazarọs nwụrụ?
6 Kraịst gosipụtara na ya nwere nnọọ mmetụta dị nro mgbe ezigbo enyi ya bụ́ Lazarọs nwụrụ. Újú Meri na Mata nọ na-eru metụrụ nnọọ Jizọs n’ahụ́ ruo n’ókè nke na ọ sụrụ ude, ‘anya mmiri agbaakwa ya n’anya.’ Nke ahụ ‘nyere ya nsogbu n’obi’ ma kpatara ya obi mgbawa na iru újú n’agbanyeghị na ọ maara na ya ga-eme ka Lazarọs dịghachi ndụ n’oge na-adịghị anya. Ịhụnanya na ọmịiko kpaliziri Jizọs iji ikike Chineke nyere ya mee ihe ma kpọlite Lazarọs n’ọnwụ.—Jọn 11:11-15, 33-35, 38-44.
7. N’ihi gịnị ka Jizọs ji ruo eruo ka anyị kwụsie ike n’akụkụ ya? (Leekwa igbe dị na peeji nke 31.)
7 Otú Jizọs si nnọọ hụ ihe ziri ezi n’anya ma kpọ ihu abụọ na ajọ omume asị na-eme ka anyị na-akwanyere ya ùgwù. Ugboro abụọ o ji obi ike chụpụ ndị anyaukwu na-ere ihe n’ụlọ nsọ. (Matiu 21:12, 13; Jọn 2:14-17) Tụkwasị na nke ahụ, mgbe ọ bụ mmadụ n’ụwa, ọ tara ụdị ahụhụ dị iche iche, bụ́ nke mere ka ọ ghọta n’onwe ya nrụgide na nsogbu ndị anyị na-eche ihu. (Ndị Hibru 5:7-9) Jizọs makwaara otú ọ na-adị mmadụ ma a kpọ ya asị ma kpee ya ikpe na-ezighị ezi. (Jọn 5:15-18; 11:53, 54; 18:38–19:16) N’ikpeazụ, o ji obi ike kwere ịnwụ ọnwụ ahụhụ iji mezuo uche Nna ya ma nye ndị ọ ga-achị ndụ ebighị ebi. (Jọn 3:16) Àgwà ndị dị otú a Kraịst nwere hà adịghị akwali gị ịnọgide na-akwụsi ike n’akụkụ ya ma na-ejere ya ozi? (Ndị Hibru 13:8; Mkpughe 5:6-10) Gịnị ka a chọrọ ka mmadụ mee tupu ya abụrụ onye Kraịst bụ́ Eze ga-achị?
Iru Eru Ịbụ Onye Kraịst Ga-achị
8. Gịnị ka a chọrọ n’aka ndị Kraịst ga-achị?
8 Chebara ihe a e ji tụnyere mmadụ iru eru ịbụ onye Kraịst ga-achị echiche: Ọ bụrụ na mmadụ chọrọ ịghọ nwa amaala nke mba ọzọ, e nwere ihe ụfọdụ bụ́ isi a na-achọkarị ya n’aka. A pụrụ ịchọ ka ndị ahụ chọrọ ịghọ ụmụ amaala nke mba ọzọ bụrụ ndị na-akpa àgwà ọma ma nwee ezigbo ahụ́ ike. N’otu aka ahụ, ndị Kraịst ga-achị kwesịrị inwe nnọọ àgwà ọma. Mmekọrịta ha na Chineke kwesịkwara isi ike.—1 Ndị Kọrint 6:9-11; Ndị Galeshia 5:19-23.
9. Olee otú anyị pụrụ isi gosi na anyị kwụsiri ike n’akụkụ Kraịst?
9 Jizọs Kraịst chọkwara ka ndị ọ ga-achị kwụsie ike n’akụkụ ya ma na-akwadosi Alaeze ya ike. O kwesịkwara ekwesị ka ọ chọọ ihe ndị dị otú a. Ha na-egosi na ha kwụsiri ike n’akụkụ Kraịst site n’ibi ndụ kwekọrọ n’ihe ndị ọ kụziri mgbe ọ nọ n’ụwa dị ka Onye A Họpụtara Ịbụ Eze. Dị ka ihe atụ, ha na-ebute ihe ndị metụtara Alaeze ahụ na uche Chineke ụzọ karịa ihe onwunwe. (Matiu 6:31-34) Ha na-agbalịsikwa ike ibi ndụ dị ka Kraịst ọbụna ma à sị na ihe na-esiri ha ezigbo ike. (1 Pita 2:21-23) Ọzọkwa, ndị Kraịst na-achị na-agbaso ihe nlereanya ya site n’ibute ụzọ n’imere ndị ọzọ ihe ọma.—Matiu 7:12; Jọn 13:3-17.
10. Olee otú mmadụ pụrụ isi gosipụta na ya kwụ n’akụkụ Kraịst (a) n’ime ezinụlọ na (b) n’ime ọgbakọ?
10 Ụmụazụ Jizọs na-egosikwa na ha kwụsiri ike n’akụkụ Kraịst site n’igosipụta àgwà ya n’ime ezinụlọ ha. Dị ka ihe atụ, ndị di na-egosi na ha kwụ n’akụkụ Eze eluigwe ha site n’imeso ndị nwunye ha na ụmụ ha ihe dị ka Kraịst si emeso ọgbakọ ya. (Ndị Efesọs 5:25, 28-30; 6:4; 1 Pita 3:7) Ndị nwunye na-egosi na ha kwụ n’akụkụ Kraịst site n’omume ha dị ọcha nakwa site n’igosipụta “mmụọ dị jụụ na nke dị nwayọọ.” (1 Pita 3:1-4; Ndị Efesọs 5:22-24) Ụmụaka na-akwadosi Kraịst ike mgbe ha na-agbaso ihe nlereanya ya nke irube isi. Mgbe Jizọs na-eto eto, ọ nọgidere na-erubere ndị mụrụ ya isi n’agbanyeghị na ha ezughị okè. (Luk 2:51, 52; Ndị Efesọs 6:1) Ndị Kraịst na-achị na-agbalịsi ike ịkwado ya site ‘n’igosi mmetụta maka onye ọzọ, na-enwe mmetụta ụmụnna,’ nakwa site ‘n’inwe obi ọmịiko.’ Ha na-agbalịsi ike ịdị ka Kraịst, “na-adị umeala n’obi, ghara ịkwụghachi ihe ọjọọ maka ihe ọjọọ, nkwujọ maka nkwujọ.”—1 Pita 3:8, 9; 1 Ndị Kọrint 11:1.
Ndị Kraịst Ga-achị Ga-erube Isi n’Iwu Ya
11. Olee iwu ndị Kraịst ga-achị ga na-erube isi na ha?
11 Dị nnọọ ka ndị chọrọ ịbụ ụmụ amaala nke mba ọzọ na-erube isi n’iwu nke mba ahụ, ndị Kraịst ga-achị na-erube isi ‘n’iwu nke Kraịst’ site n’ibi ndụ kwekọrọ n’ihe nile Jizọs kụziri na ihe ndị o nyere n’iwu. (Ndị Galeshia 6:2) Ha na-eji obi ha nile ebi ndụ kwekọrọ ‘n’iwu nke eze ahụ’ banyere ịhụnanya. (Jems 2:8) Gịnị ka iwu ndị a gụnyere?
12, 13. Olee otú anyị si anọgide jiri obi anyị nile na-erube isi ‘n’iwu nke Kraịst’?
12 Ndị Kraịst na-achị ezughị okè, ha na-emehiekwa ihe mgbe ụfọdụ. (Ndị Rom 3:23) N’ihi ya, ha kwesịrị ịnọgide na-azụlite “mmetụta ụmụnna nke ihu abụọ na-adịghị ya” ka ha wee ‘na-enwe ịhụnanya siri ike n’ebe ibe ha nọ site n’obi.’ (1 Pita 1:22) “Ọ bụrụ na onye ọ bụla nwere ihe mere ọ ga-eji mee mkpesa megide ibe ya,” Ndị Kraịst na-eji obi ha etinye iwu nke Kraịst n’ọrụ site ‘n’ịnọgide na-anagiderịta ibe ha ma na-agbaghara ibe ha kpam kpam.’ Irube isi n’iwu a na-enyere ha aka ileghara emezighị emezi nke ndị ọzọ anya ma mee ka ha chọta ezi ihe mere ha ga-eji na-ahụ ibe ha n’anya. Ọ̀ dịghị amasị gị iso ndị na-eyikwasị onwe ha ịhụnanya, nke bụ́ “ihe nkekọ zuru okè,” iji gosi na ha ji obi ha nile na-akwado Eze anyị na-ahụ n’anya anọkọ?—Ndị Kọlọsi 3:13, 14.
13 Ọzọkwa, Jizọs kọwara na ịhụnanya o gosiri Jọn 13:34, 35) Ọ bụrụ na ndị anyị hụrụ n’anya bụ nanị ndị hụrụ anyị n’anya, anyị emeghị “oké ihe.” Ọ bụrụ na ọ bụ nanị ndị hụrụ anyị n’anya ka anyị hụrụ n’anya, ịhụnanya anyị agaghị ezu ezu. Jizọs gbara anyị ume iṅomi ịhụnanya Nna ya site n’inwe ịhụnanya ụkpụrụ na-achịkwa ọbụna n’ebe ndị iro anyị nọ, bụ́ ndị kpọrọ anyị asị ma na-akpagbu anyị. (Matiu 5:46-48) Ịhụnanya a ga-akpalikwa ndị Alaeze ahụ ga-achị ịnọgidesi ike na-eji obi ha nile na-arụ ọrụ ahụ bụ́ isi e kenyere ha. Olee ọrụ ọ bụ?
karịrị nnọọ ịhụnanya ndị mmadụ na-enwe n’ebe ibe ha nọ. (Ule E Ji Ama Ma Ndị Kraịst Ga-achị Hà Kwụsikwara Ike n’Akụkụ Ya
14. Olee ihe mere ọrụ nkwusa ji dị oké mkpa?
14 Ugbu a, ndị Alaeze Chineke ga-achị nwere ọrụ dị oké mkpa nke ‘ịgba àmà nke ọma banyere alaeze Chineke.’ (Ọrụ 28:23) Ọ dị nnọọ oké mkpa ka e mee nke ahụ n’ihi na Alaeze Mezaịa ga-eme ka o doo anya na ọ bụ Jehova kwesịrị ịbụ eze. (1 Ndị Kọrint 15:24-28) Mgbe anyị na-ekwusa ozi ọma, anyị na-enye ndị na-anụ ya ohere ịghọ ndị Alaeze Chineke ga-achị. Ọzọkwa, ihe Kraịst bụ́ Eze ga-eji kpee ụmụ mmadụ ikpe bụ ihe ha mere mgbe ha nụrụ ozi ọma ahụ. (Matiu 24:14; 2 Ndị Tesalonaịka 1:6-10) Ya mere, ụzọ bụ́ isi anyị si egosi na anyị kwụ n’akụkụ Kraịst bụ site n’irube isi n’iwu o nyere ka a gwa ndị ọzọ banyere Alaeze ahụ.—Matiu 28:18-20.
15. Olee ihe mere e ji ele ikwesị ntụkwasị obi Ndị Kraịst ule?
15 N’ezie, Setan na-eji ụzọ nile o nwere ike eme ihe iji mee ka a ghara ikwusa ozi ọma ahụ, ndị ọchịchị bụ́ mmadụ adịghịkwa erubere ọchịchị Kraịst nke Chineke nyere ya isi. (Abụ Ọma 2:1-3, 6-8) N’ihi ya, Jizọs dọrọ ndị na-eso ụzọ ya aka ná ntị, sị: “Ohu adịghị aka nna ya ukwu. Ọ bụrụ na ha akpagbuwo m, ha ga-akpagbukwa unu.” (Jọn 15:20) Ya mere, ụmụazụ Kraịst na-alụ agha ime mmụọ bụ́ nke na-etinye ikwesị ntụkwasị obi ha n’ule.—2 Ndị Kọrint 10:3-5; Ndị Efesọs 6:10-12.
16. Olee otú ndị Alaeze ahụ ga-achị si akwụghachi “Chineke ihe nke Chineke”?
16 Ka o sina dị, Ndị Alaeze Chineke ga-achị na-anọgide na-akwụsi ike n’akụkụ eze ha a na-adịghị ahụ anya ma na-erubekwara ndị ọchịchị bụ́ mmadụ isi. (Taịtọs 3:1, 2) Jizọs kwuru, sị: “Kwụghachinụ Siza ihe nke Siza, ma kwụghachinụ Chineke ihe nke Chineke.” (Mak 12:13-17) N’ihi nke a, Ndị Kraịst ga-achị na-erubere iwu gọọmenti nke na-emegideghị iwu Chineke isi. (Ndị Rom 13:1-7) Otú ọ dị, mgbe ụlọikpe ukwu nke ndị Juu nyere iwu megidere nke Chineke site n’ịgwa ndị na-eso ụzọ Jizọs ka ha kwụsị ikwusa ozi ọma, ndị na-ezo ụzọ Jizọs ji nkwanye ùgwù jụ ime ihe ha kwuru ma gwa ha na ha “aghaghị irubere Chineke isi dị ka onye na-achị achị karịa mmadụ.”—Ọrụ 1:8; 5:27-32.
17. N’ihi gịnị ka anyị ga-eji jiri obi ike na-eche ule na-abịara anyị n’ihi ịkwụsi ike n’akụkụ Kraịst ihu?
17 N’eziokwu, ọ chọrọ obi ike n’aka ndị Kraịst ga-achị iji nọgide na-akwụsi ike n’akụkụ Eze ha n’agbanyeghị mkpagbu. Ka o sina dị, Jizọs kwuru, sị: “Obi ụtọ na-adịrị unu mgbe ndị mmadụ na-akọcha unu ma na-akpagbu unu, jirikwa ụgha na-ekwu ụdị ihe ọjọọ ọ bụla megide unu n’ihi m. Na-aṅụrịnụ ọṅụ, na-amalikwanụ elu n’ọṅụ, ebe ọ bụ na ụgwọ ọrụ unu dị ukwuu n’eluigwe.” (Matiu 5:11, 12) Ụmụazụ Kraịst oge mbụ bịara ghọta na okwu ndị ahụ bụ eziokwu. Ọbụna mgbe a pịara ha ihe n’ihi na ha nọgidere na-ezi ozi ọma banyere Alaeze ahụ, ha ṅụrịrị ọṅụ “n’ihi na a gụwo ha ná ndị ruru eru ịbụ ndị a ga-emenye ihere n’ihi aha ya. Kwa ụbọchị kwa, n’ụlọ nsọ na site n’ụlọ ruo n’ụlọ, ha nọgidere n’esepụghị aka na-ezi ihe ma na-akpọsa ozi ọma banyere Kraịst, bụ́ Jizọs.” (Ọrụ 5:41, 42) E kwesịrị ka a jaa gị mma mgbe ị na-egosipụta otu mmụọ ahụ nke ịkwụsi ike n’akụkụ Kraịst ka ị na-edi ihe isi ike, ọrịa, ọnwụ nke onye a hụrụ n’anya, ma ọ bụ mmegide.—Ndị Rom 5:3-5; Ndị Hibru 13:6.
18. Gịnị ka ihe Jizọs gwara Pọntịọs Paịlet na-egosi?
18 Mgbe ọ ka bụ Onye A Họpụtara Ịbụ Eze, Jizọs kọwaara Pọntiọs Paịlet bụ́ gọvanọ ndị Rom, sị: “Alaeze m abụghị akụkụ nke ụwa a. A sị na alaeze m bụ akụkụ nke ụwa a, ndị na-ejere m ozi gaara alụ ọgụ ka a ghara inyefe m n’aka ndị Juu. Ma, dị ka ihe si dịrị, alaeze m esiteghị n’ebe a.” (Jọn 18:36) N’ihi ya, ndị Alaeze eluigwe ga-achị adịghị ebu ngwá agha iji gbuo onye ọ bụla, ha adịghịkwa etinye aka n’agha ụmụ mmadụ na-alụ. Ha na-akwụsi ike n’akụkụ “Onyeisi Udo,” ha adịtụghị etinye aka n’ihe omume ndị na-akpata nkewa n’ụwa.—Aịsaịa 2:2-4; 9:6, 7.
Nkwụghachi Ụgwọ Ga-adịru Ebighị Ebi nke Ndị Na-akwadosi Eze ahụ Ike Ga-enweta
19. N’ihi gịnị ka ndị Kraịst ga-achị ji nwee obi ike na ọdịnihu ga-aka mma?
19 Ndị na-akwadosi Kraịst, bụ́ “Eze nke ndị eze” ike, nwere obi ike na ọdịnihu ga-aka mma. Ha na-atụsi anya ike ịhụ mgbe ọ ga-egosipụta ike ọchịchị ya karịrị nke mmadụ ọ bụla. (Mkpughe 19:11–20:3; Matiu 24:30) Ndị fọdụrụ ‘n’ụmụ nke alaeze ahụ’ bụ́ ndị e ji mmụọ nsọ tee mmanụ na-atụsi anya ike maka ihe nketa ha dị oké ọnụ ahịa, nke bụ́ iso Kraịst bụrụ eze n’eluigwe. (Matiu 13:38; Luk 12:32) “Atụrụ ọzọ” bụ́ ndị kwụsi ike n’akụkụ Kraịst na-echesi nnwapụta nke Eze ha ike mgbe ọ ga-ekwupụta, sị: “Bịanụ, unu ndị Nna m gọziworo, ketanụ alaeze [Paradaịs elu ala] ahụ a kwadebeere unu malite mgbe a tọrọ ntọala ụwa.” (Jọn 10:16; Matiu 25:34) N’ihi ya, ka ndị nile Alaeze ahụ ga-achị kpebisie ike ịnọgide na-akwụsi ike n’akụkụ Kraịst bụ́ Eze.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 2 Lee Reasoning From the Scriptures, “Gịnị mere Ndịàmà Jehova ji ekwu na e hiwere Alaeze Chineke na 1914?” peeji nke 95-97, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.
Ị̀ Pụrụ Ịkọwa?
• N’ihi gịnị ka Kraịst ji ruo eruo ka anyị kwụsie ike n’akụkụ ya?
• Olee otú ndị Kraịst ga-achị si egosi na ha kwụsi ike n’akụkụ ya?
• N’ihi gịnị ka anyị ji kwesị ịkwụsi ike n’akụkụ Kraịst bụ́ Eze?
[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]
[Igbe dị na peeji nke 31]
ÀGWÀ NDỊ ỌZỌ MAGBURU ONWE HA KRAỊST NWERE
Eleghị mmadụ anya n’ihu—Jọn 4:7-30.
Ọmịiko—Matiu 9:35-38; 12:18-21; Mak 6:30-34.
Ịhụnanya ịchụ onwe onye n’àjà—Jọn 13:1; 15:12-15.
Ikwesị ntụkwasị obi—Matiu 4:1-11; 28:20; Mak 11:15-18.
Obi ebere—Mak 7:32-35; Luk 7:11-15; Ndị Hibru 4:15, 16.
Ezi uche—Matiu 15:21-28.
[Foto dị na peeji nke 29]
Anyị na-egosi na anyị ji obi anyị nile na-erubere “iwu nke Kraịst” isi site n’ịhụ ibe anyị n’anya
[Foto ndị dị na peeji nke 31]
Àgwà Kraịst ọ̀ na-akpali gị ịkwụsi ike n’akụkụ ya ma na-ejere ya ozi?