Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Atụla Egwu Jehova Nọnyeere Gị!

Atụla Egwu Jehova Nọnyeere Gị!

Atụla Egwu Jehova Nọnyeere Gị!

IHE karịrị iri afọ ise gara aga, obere oge ka bọmbụ nuklia mbụ gbawasịrị, Harold C. Urey bụ́ ọkà mmụta sayensị nke nwetara Ihe Nrite Nobel kwuru banyere ọdịnihu, sị: “Anyị ga-eri nri n’egwu, hie ụra n’egwu, bie ndụ n’egwu ma nwụọ n’egwu.” Ọ bụghịkwanụ ihe ijuanya na ụwa anyị taa jupụtara nnọọ n’egwu! Kwa ụbọchị, akwụkwọ akụkọ na-ebu akụkọ ndị na-amapụ obi banyere ndị na-eyi ọha egwu, mpụ, ime ihe ike, na ọrịa ndị a na-amadịghị otú e si agwọ ha.

Anyị bụ́ Ndị Kraịst maara ihe ihe ndị a na-emenụ na-egosi. Ha na-egosi na anyị na-ebi “n’ụbọchị ikpeazụ” nke ajọ usoro ihe a, bụ́ nke Bible buru n’amụma na a ga-eji mara “oge pụrụ iche nke siri ike obibi.” (2 Timoti 3:1) N’ihi ya, obi na-esikwu anyị ike na n’isi nso, Jehova Chineke ga-eweta ụwa ọhụrụ nke ezi omume ga-ebi n’ime ya. (2 Pita 3:13) Ka ọ dịgodị, ọ̀ bụ na anyị adịghị atụ egwu?

Otú Egwu Si Emetụta Ndị Ohu Chineke

Jekọb, Devid, na Ịlaịja so ná ndị ohu Jehova bụ́ ndị tụtụrụ ụjọ mgbe ha nọ n’ihe ize ndụ. (Jenesis 32:6, 7; 1 Samuel 21:11, 12; 1 Ndị Eze 19:2, 3) Ọ bụghị na ndị ikom a enweghị okwukwe. Kama nke ahụ, ha dabesiri ike n’ebe Jehova nọ. Ka o sina dị, Jekọb, Devid, na Ịlaịja bụcha mmadụ; n’ihi ya kwa, ụjọ tụrụ ha. Jems onye na-eso ụzọ dere, sị: “Ịlaịja bụ nwoke nwere mmetụta ndị yiri nke anyị.”—Jems 5:17.

Ụjọ pụkwara ijide anyị mgbe anyị na-atụgharị uche banyere ihe isi ike anyị nọ na ya ugbu a ma ọ bụ nke anyị pụrụ izute n’ọdịnihu. Ọ bụghị ihe ijuanya na anyị na-atụ ụjọ otú ahụ. A sị ka e kwuwe, Bible na-ekwu na Setan bụ́ Ekwensu kpebisiri ike ‘ibuso ndị na-edebe ihe ndị Chineke nyere n’iwu, ndị nwekwara ọrụ ịgba àmà banyere Jizọs agha.’ (Mkpughe 12:17) Ọ bụ ezie na ọ bụ Ndị Kraịst e tere mmanụ ka ihe a e kwuru metụtara, Pọl dere, sị: “A ga-akpagbukwa ndị nile na-achọ ibi ndụ ná nsọpụrụ Chineke ná mmekọrịta nke ha na Kraịst Jizọs.” (2 Timoti 3:12) N’agbanyeghị nke ahụ, ụjọ ekwesịghị ijichi anyị mgbe anyị nwere nsogbu. N’ihi gịnị?

“Chineke Na-azọpụta Azọpụta”

Ọbụ abụ bụ́ Devid dere, sị: “Chineke bụụrụ anyị Chineke na-azọpụta azọpụta.” (Abụ Ọma 68:20) Jehova egosila ugboro ugboro na ya nwere ike ịzọpụta ndị ya site n’ịnapụta ha n’ọnọdụ ndị dị ize ndụ ma ọ bụkwanụ site n’inye ha ume iji die ọnọdụ ndị dị otú ahụ. (Abụ Ọma 34:17; Daniel 6:22; 1 Ndị Kọrint 10:13) Site n’ọmụmụ Bible gị, ole n’ime oge ndị ‘Chineke zọpụtarala’ ndị ya ka ị pụrụ icheta?

Ị pụrụ iji Watch Tower Publications Index * mee nnyocha banyere ihe omume ndị mere nnọọ eme ndị dị ka Iju Mmiri zuru ụwa ọnụ nke e nwere n’oge Noa, nnapụta a napụtara Lọt na ụmụ ya nwanyị abụọ site na Sọdọm na Gọmọra, Ọpụpụ Izrel pụrụ n’Ijipt na otú ha si gafee Oké Osimiri Uhie, ma ọ bụ atụmatụ Heman mere igbukpọ ndị Juu bụ́ nke e mere ka ọ kụọ afọ n’ala. Ịgụ ihe ndekọ ndị a na-akpali akpali na ịtụgharị uche na ha ga-eme ka okwukwe i nwere na Jehova bụ Chineke na-azọpụta azọpụta sikwuo ike. Nke a ga-enyeziri gị aka iji obi ike na-eche ihe ndị na-ele okwukwe gị ule ihu.

Ihe Atụ Ndị nke Oge A

Ị̀ pụrụ icheta ndị tachiworo obi n’oge a bụ́ ndị nọ n’ógbè gị? Ọ pụrụ ịbụ onye a tụrụ mkpọrọ n’ihi na ọ kwụsiri ike n’akụkụ Chineke. Ị pụrụ icheta Onye Kraịst merela agadi nke na-ejere Jehova ozi n’agbanyeghị na ọ na-arịa ọrịa. Ma ọ bụ ị pụrụ icheta ndị ntorobịa bụ́ ndị nọpụrụ iche n’ụwa n’agbanyeghị nrụgide siri ike ụmụ akwụkwọ ibe ha na-arụgide ha. E nwekwara ndị nne na nna nanị ha na-azụ ụmụ ma ọ bụ ndị na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye bụ́ ndị na-ejere Jehova ozi n’agbanyeghị owu ọmụma. Olee ihe ị na-amụta site n’aka ndị dị otú ahụ? Ịtụgharị uche banyere otú ha si kwụsie ike n’akụkụ Chineke ga-enyere gị aka ịtachi obi ma ghara ịtụ egwu n’agbanyeghị ule ndị na-abịara gị.

Ọ bụghị nanị mgbe a na-emegide anyị ka ọ dị anyị mkpa ịghara ịtụ egwu, kamakwa ọ dịkwa anyị mkpa ịghara ịtụ egwu mgbe anyị malitere inwe obi abụọ ma Jehova ọ̀ hụkwara anyị n’anya. Ọ dị mkpa ka anyị nwekwuo obi ike na àjà mgbapụta Kraịst bụ maka anyị n’otu n’otu. (Ndị Galeshia 2:20) Anyị pụziri ịbịakwute Jehova ma ghara ịtụ egwu na-enweghị isi. Ọ bụrụ na anyị echee na anyị erughị eru ka Jehova hụ anyị n’anya, anyị pụrụ ịtụgharị uche n’okwu a Jizọs gwara ụmụazụ ya: “Ọ̀ bụ na a dịghị ere nza abụọ otu mkpụrụ ego nke ga-azụta nanị ihe dị nta? Ma o nweghị otu n’ime ha ga-ada n’ala Nna unu aghara ịma. Ma a gụwo ntutu nile nke isi unu ọnụ. Ya mere unu atụla egwu: Unu dị oké ọnụ ahịa karịa ọtụtụ nza.”—Matiu 10:29-31.

A na-ebipụtakarị ahụmahụ nke Ndịàmà Jehova nke oge a bụ́ ndị meriri ọnọdụ ndị tara akpụ n’atụghị egwu na magazin Ụlọ Nche na Teta! Nke a apụtaghị na ọnọdụ ọjọọ ha nọ na ya adịghị ewute ha. Ma ha adịghị ekwe ka mwute ahụ mee ka ha kwụsị ijere Jehova ozi. Akụkọ ha ndị e bipụtara ebipụta pụrụ inyere gị aka idikwa ihe bịara gị n’atụghị egwu. Ka anyị tụlee ihe atụ abụọ.

Mmerụ Ahụ́ Gbanwere Ndụ Ya

E bipụtara isiokwu bụ́ “Otú Mmerụ Ahụ́ Si Gbanwee Ndụ M” na Teta! nke April 22, 2003, (Bekee). N’isiokwu ahụ, Stanley Ombeva, bụ́ otu n’ime Ndịàmà Jehova nọ na Kenya, kọrọ ihe isi ike ndị o nwere mgbe otu ụgbọala nọ n’oké ọsọ kụturu ya. Ka ahụ́ ike ya na-akawanye njọ, a kwụsịrị ya ọrụ, kwụsịkwa ịkwụ ya ụgwọ nile a na-akwụbu ya. Nwanna Ombeva kwuru n’akụkọ ya, sị: “Mgbe m bịara ghọta ụdị ọnọdụ ọjọọ m nọ na ya, amalitere m iche echiche ọjọọ, na-eche banyere nanị onwe m, ahụ́ malitekwara ịgbakasị m. Mgbe ụfọdụ, iwe na-ewe m.” N’agbanyeghị ọnọdụ ọjọọ ahụ bịakwasịrị ya, nwanna nwoke a atụghị egwu. O kweghị ka nkụda mmụọ rikpuo ya ma mee ka ọ daa mbà. Kama nke ahụ, ọ dabeere n’ebe Jehova nọ. Nwanna Ombeva kwuru, sị: “Jehova kwadoro m n’ihe nile m gabigara—nke na ihere onwe m na-eme m mgbe ụfọdụ. Ekpebisiri m ike ịgụ akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị m maara na ha ga-akasi m obi n’ọnọdụ ahụ m nọ na ya.”

Ihe ahụ Nwanna Ombeva kwuru na-ezoghị ọnụ enyerela ọtụtụ ndị aka idi ule ndị bịara ha n’atụghị egwu. Otu nwanna nwanyị kwuru, sị: “Ebere m ákwá mgbe m gụrụ isiokwu a. Ọ dị m ka Jehova ji isiokwu a na-egosi na ya hụrụ m n’anya ma na-akasi m obi.” Onyeàmà ọzọ dere, sị: “Isiokwu ndị dị ka nke a na-agba ụfọdụ n’ime anyị bụ́ ndị nọ n’ọnọdụ yiri nke ahụ na ndị na-adịghị onye ha na-akọsara mkpa ha ume.”

Ịnagide Ihe Ndị Na-egbu Mmụọ

Ahụmahụ ọzọ na-akpali akpali bụ nke Herbert Jennings, bụ́ nke a kọrọ n’isiokwu bụ́ “Unu Bụ Ndị Na-amaghị Ihe Ga-eme Echi.” * Nwanna Jennings rịara ọrịa nke metụrụ ya n’ụbụrụ. O kwuru banyere mgbe ọrịa ya malitere, sị: “Ọ bụ ọgụ na mgba n’ezie nanị ịga nzukọ Ndị Kraịst. Ka o sina dị, ekwenyesiri m ike n’uru dị ná mkpakọrịta ime mmụọ. Iji nagide nsogbu m, ana m abanyekarị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze mgbe ndị mmadụ nọdụsịrị ala, pụọkwa obere oge tupu ọ malite ịzụ wuruwuru ná ngwụsị nke usoro ihe omume.”

Ọ na-esikwara ya ike ịga ozi ọma. Nwanna Jennings na-akọ, sị: “Mgbe ụfọdụ, ọbụna mgbe m rutesịrị n’otu ụlọ, adịghị m enwe obi ike ruo n’ókè nke ịkụ mgbịrịgba ụzọ. Otú ọ dị, adịghị m alawa n’ihi na amaara m na ozi anyị pụtara nzọpụta nye anyị onwe anyị na ndị ọ bụla ga-aṅa ntị. (1 Timoti 4:16) Mgbe obere oge gasịrị, ana m enwe ike ịkata obi gaa n’ọnụ ụzọ nke ọzọ, ma gbalịa ọzọ. Site n’ịnọgide na-ekere òkè n’ozi, anọgidere m na-enwe ezi ahụ́ ike ime mmụọ, nke ahụ mekwara ka m nwekwuo ike ịtachi obi.”

Akụkọ Nwanna Jennings kọrọ n’ezoghị ọnụ nyeere ọtụtụ ndị gụrụ ya aka ịnagide nsogbu nke ha n’atụghị egwu. Dị ka ihe atụ, otu nwanna nwanyị, dere, sị: “N’afọ iri abụọ na asatọ m nọworo na-agụ magazin Ụlọ Nche na Teta!, ọ dịtụbeghị nke metụrụ m n’ahụ́ otú isiokwu a si metụ m. Akwụsịrị m ozi oge nile, obi na-amakwa m nnọọ ikpe, m na-eche na ọ bụrụ na m nwekwuru okwukwe na m gaara anọgidewo n’ozi oge nile. Ịgụ banyere otú Nwanna Jennings si hapụ ozi ya iji lekọta onwe ya nyeere m aka ile ọnọdụ m anya n’ụzọ ziri ezi. Nke a bụ nnọọ azịza nye ekpere m!”

N’ụzọ yiri nke ahụ, otu nwanna nwoke dere, sị: “Mgbe m jesịrị ozi dị ka okenye ọgbakọ ruo afọ iri, akwụsịrị m ije ozi dị ka okenye n’ihi isi mgbaka. Ọ bịara dị m ka ọ dịghịzi ihe ọ bụla m bara uru ya, nke ahụ mere ka o siere m ike ịgụ isiokwu ndị bu akụkọ ndụ nke ụfọdụ ndị, bụ́ ebe a na-akọkarị ihe ndị dị ịrịba ama ndị ndị Jehova rụzurula. Ma otú Nwanna Jennings si nọgidesie ike kwaliri mmụọ m. Agụọla m isiokwu ahụ ọtụtụ ugboro.”

Iji Obi Ike Na-aga n’Ihu

Dị ka Nwanna Ombeva na Nwanna Jennings, ọtụtụ n’ime Ndịàmà Jehova anọgidewo na-efe Jehova Chineke n’atụghị egwu n’agbanyeghị nsogbu ndị siri oké ike. Ọ bụrụ na i so na ha, e kwesịrị ịja gị mma. Nwee obi ike na: “Chineke abụghị onye ajọ omume ichefu ọrụ unu na ịhụnanya unu gosiri maka aha ya, ebe unu jewooro ndị nsọ ozi ma nọgide na-eje ozi.”—Ndị Hibru 6:10.

Dị nnọọ ka Jehova nyeere ndị ya nke oge ochie kwụsiri ike n’akụkụ ya aka imeri ndị iro ha, ọ pụrụ inyere gị aka imeri nsogbu ọ bụla pụrụ ịbịara gị. Ya mere, echefula ihe a Jehova kwuru site n’ọnụ Aịzaịa onye amụma: “Atụla egwu, gị ka M nọnyeere: elela anya gburugburu n’ụjọ, n’ihi na Mụ onwe m bụ Chineke gị: M ga-agba gị ume; ee, M ga-enyere gị aka; ee, M ga-eji aka nri nke ezi omume m kwagide gị.”—Aịsaịa 41:10.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 9 Nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

[Foto ndị dị na peeji nke 16]

Dị ka Stanley Ombeva (n’elu) na Herbert Jennings (n’aka nri), ọtụtụ ndị na-ejere Jehova ozi n’atụghị egwu

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 14]

Foto USAF