Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gbasoo Ihe Nlereanya Jizọs Ma Gosi Nchegbu Maka Ndị Ogbenye

Gbasoo Ihe Nlereanya Jizọs Ma Gosi Nchegbu Maka Ndị Ogbenye

Gbasoo Ihe Nlereanya Jizọs Ma Gosi Nchegbu Maka Ndị Ogbenye

ỊDA ogbenye na imegbu mmadụ dịwara kemgbe ụwa. Ọ bụ ezie na n’Iwu Mozis, Chineke gbalịrị ịhụ na ndị ndị ogbenye atagbughị onwe ha n’ahụhụ, ma ọ bụghị mgbe nile ka ndị Izrel rubere isi na ya. (Emọs 2:6) Ezikiel onye amụma katọrọ otú e si na-emeso ndị ogbenye ihe. O kwuru, sị: “Ndị ala nke a emegbuwo emegbu, pụnara mmadụ ihe n’ike; onye e wedara n’ala na ogbenye ka ha meworo ihe ike, ọ bụkwa ọbịa ka ha megbuworo n’ekpeghị ikpe.”—Ezikiel 22:29.

Otú ahụ ka ọ dịkwa mgbe Jizọs nọ n’ụwa. Ndị ndú okpukpe egositụghị na ihe banyere ndị ogbenye na ndị nọ ná mkpa na-emetụ ha n’obi. A kọwara ndị ndú okpukpe dị ka ndị “hụrụ ego n’anya” bụ́ ndị ‘na-eripịa ụlọ ndị inyom di ha nwụrụ,’ ihe bụ́kwa nchegbu ha bụ́ ịhụ na e mere ọdịnala ha ọ bụghị ilekọta ndị agadi na ndị nọ ná mkpa. (Luk 16:14; 20:47; Matiu 15:5, 6) Ọ bụ ihe kwesịrị ịrịba ama na n’ihe atụ Jizọs banyere ezigbo onye Sameria ahụ, mgbe onye nchụàjà na onye Livaị hụrụ nwoke e merụrụ ahụ́, ha sitere n’akụkụ ọzọ gafere kama ịkwụsị nyere ya aka.—Luk 10:30-37.

Jizọs Nwere Nchegbu Maka Ndị Ogbenye

Ihe ndị e dekọrọ n’Oziọma ndị ahụ na-egosi na Jizọs ghọtara ụdị ihe isi ike ndị ogbenye na-enwe, o nwekwara nnọọ ọmịiko n’ahụ́ ha. Ọ bụ ezie na Jizọs ebiela n’eluigwe, o mere onwe ya ihe efu, ghọọ mmadụ, ma ‘daa ogbenye n’ihi anyị.’ (2 Ndị Kọrint 8:9) Mgbe ọ hụrụ ìgwè mmadụ ahụ, Jizọs “nwere ọmịiko n’ahụ́ ha, n’ihi na a gbara ha akpụkpọ, chụsasịakwa ha dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha.” (Matiu 9:36) Akụkọ banyere nwanyị ahụ di ya nwụrụ nke nọ ná mkpa gosiri na ihe metụrụ Jizọs n’ahụ́ abụghị ọtụtụ onyinye ndị ọgaranya nyere, bụ́ ndị sitere “n’ihe mafọọrọ ha” wee nye, kama ntakịrị onyinye ego nke nwanyị ahụ di ya nwụrụ nyere. Ihe nwanyị ahụ mere metụrụ Jizọs n’obi n’ihi na nwanyị ahụ “sitere n’ụkọ ya wee tụnye ihe nile e ji ebi ndụ o nwere.”—Luk 21:4.

Ọ bụghị nanị na Jizọs nwere ọmịiko n’ahụ́ ndị ogbenye kamakwa ọnọdụ ha metụrụ ya n’obi. Ya na ndịozi ya nwere igbe ha na-eji etinye ego bụ́ nke ha na-esi na ya e were ego enye ndị Izrel nọ ná mkpa. (Matiu 26:6-9; Jọn 12:5-8; 13:29) Jizọs gbara ndị chọrọ ịbụ ndị na-eso ụzọ ya ume ka ha mara na ha nwere ibu ọrụ nke inyere ndị nọ ná mkpa aka. Ọ gwara otu nwa okorobịa nke bụ onye ọchịchị bara ọgaranya, sị: “Ree ihe nile i nwere kesaara ndị ogbenye, ị ga-enwekwa akụ̀ n’eluigwe; bịakwa bụrụ onye na-eso ụzọ m.” Eziokwu ahụ bụ́ na nwoke ahụ achọghị ịhapụ ihe onwunwe ya gosiri na ọ hụrụ akụ̀ na ụba ya n’anya karịa Chineke na mmadụ ibe ya. N’ihi ya, o nweghị àgwà ndị a chọrọ iji bụrụ onye na-eso ụzọ Jizọs.—Luk 8:22, 23.

Ụmụazụ Kraịst Nwere Nchegbu Maka Ndị Ogbenye

Mgbe Jizọs nwụsịrị, ndịozi ya na ndị ọzọ na-eso ụzọ Kraịst nọgidere na-egosipụta nchegbu maka ndị ogbenye nọ n’etiti ha. N’ihe dị ka n’afọ 49 O.A, Pọl onyeozi jekwuuru Jems, Pita, na Jọn ma gwa ha banyere ọrụ Onyenwe anyị Jizọs Kraịst nyere ya ikwusa ozi ọma ahụ. Ha kwekọrịtara na Pọl na Banabas ga-aga kwusaara “ndị nke mba nile” ozi ọma, na-elekwasị anya karịsịa n’ebe ndị Jentaịl nọ. Otú ọ dị, Jems na ndị ibe ya gbara Pọl na Banabas ume ka ha “buru ndị ogbenye n’uche.” Nke ahụ bụkwa ihe Pọl “gbasiri mbọ ike ime.”—Ndị Galeshia 2:7-10.

N’oge ọchịchị Eze Ukwu Klọdiọs, oké ụnwụ kpara akụkụ dịgasị iche iche nke Alaeze Ukwu Rom aka ọjọọ. Mgbe nke a mere, Ndị Kraịst nọ n’Antiọk “kpebisiri ike, onye ọ bụla n’ime ha dị ka onye ọ bụla nwere ike inye, izigara ụmụnna bi na Judia ihe enyemaka; ha mekwara nke a, na-ezigara ya ndị okenye site n’aka Banabas na Sọl.”—Ọrụ 11:28-30.

Taakwa, ezi Ndị Kraịst maara na ụmụazụ Jizọs aghaghị inyere ndị ogbenye na ndị nọ ná mkpa aka, karịsịa ndị kwere ekwe ibe ha. (Ndị Galeshia 6:10) N’ihi ya, ọnọdụ ndị ụwa na-atụ n’ọnụ na-emetụ ha nnọọ n’obi. Dị ka ihe atụ, na 1998, oké ọkọchị mebisịrị ihe n’akụkụ ka ukwuu n’ebe ugwu ọwụwa anyanwụ Brazil. Oké ọkọchị ahụ gbusịrị osikapa, àgwà, nakwa ọka, bụ́ nke mere ka e nwee oké ụnwụ n’ebe ahụ nile bụ́ nke ana-enwetụbeghị ụdị ya kemgbe afọ iri na ise. N’ebe ụfọdụ, ọ na-esidị ike inweta mmiri ọṅụṅụ. Ndịàmà Jehova bi n’akụkụ ndị ọzọ nke mba ahụ hiwere kọmitii enyemaka n’egbughị oge, obere oge ka e hiwesịkwara kọmitii a, ha bukọtara nnukwu ihe oriri, ma kwụọ ụgwọ a ga-eji buga ihe oriri ndị ahụ n’ebe ndị a chọrọ ha.

Ndịàmà bụ́ ndị so nye ihe enyemaka a dere, sị: “Obi dị anyị nnọọ ụtọ na anyị nwere ike inyere ụmụnna anyị aka, karịsịa n’ihi na anyị maara na anyị emewo ka obi Jehova ṅụrịa. Anyị agatụghị echefu okwu Jems nke dị na Jems 2:15, 16.” Amaokwu Bible ndị a na-agụ, sị: “Ọ bụrụ na nwanna nwoke ma ọ bụ nwanna nwanyị na-agba ọtọ, n’enweghịkwa ihe oriri zuru ezu maka ụbọchị ahụ, ma otu onye n’ime unu agwa ha, sị: ‘Laanụ n’udo, nyaanụ ọkụ, rijuokwanụ afọ,’ ma unu adịghị enye ha ihe na-akpa ahụ́ ha, olee uru ọ bara?”

N’otu n’ime ọgbakọ Ndịàmà Jehova ndị dị na São Paulo, e nwere otu Onyeàmà dị umeala n’obi ma na-anụ ọkụ n’obi. Ọ bụ ogbenye nke na-adọga mgbe nile iji kpata ihe ọ ga-eri. O kwuru, sị: “Ọ bụ ezie na m bụ ogbenye, ozi dị na Bible emewo ka m nwee olileanya ná ndụ. Amaghị m ihe gaara eme m ma a sị na Ndịàmà ibe m enyeghịrị m aka.” N’otu oge, nwanna nwanyị a na-arụsi ọrụ ike chọrọ ịwa ahụ́ ma ọ pụghị ịkwụ ụgwọ ụlọ ọgwụ. N’oge a, ụmụnna nọ n’ọgbakọ ya kwụụrụ ya ụgwọ ụlọ ọgwụ ahụ. Ezi Ndị Kraịst n’ụwa nile na-enyere ndị kwere ekwe ibe ha nọ ná mkpa aka.

Otú ọ dị, n’agbanyeghị otú ahụmahụ ndị dị otú a si na-enye obi ụtọ, o doro nnọọ anya na mgbalị ndị dị otú a sitere n’obi agaghị akwụsị ịda ogbenye. Ọ bụ ezie na ọbụna ọchịchị ndị kwụsiri ike nakwa òtù mba nile bụ́ ndị e hiwere iji nyere ndị ụwa na-atụ n’ọnụ aka enwetụwo ihe ịga nke ọma, ma ha enwebeghị ike ịkwụsị nsogbu nọteworo aka nke bụ́ ịda ogbenye. N’ihi ya, ajụjụ na-ebilitenụ bụ, Gịnị ga-akwụsị ịda ogbenye na nsogbu ndị ọzọ na-emekpọ ụmụ mmadụ ọnụ kpamkpam?

Ihe Ndị Bible Na-akụzi Na-enyere Ndị Mmadụ Aka n’Ụzọ Na-adịgide Adịgide

Ihe ndekọ Oziọma ndị ahụ kọrọ na Jizọs Kraịst meere ndị ogbenye ma ọ bụ ndị nwere mkpa ndị ọzọ ihe ọma mgbe nile. (Matiu 14:14-21) Ma olee ọrụ Jizọs butere ụzọ ná ndụ ya? N’otu oge, ka Jizọs nyesịịrị ndị nọ ná mkpa aka ruo oge ụfọdụ, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ka anyị gaa ebe ọzọ, n’obodo nta ndị dị nso, ka m wee meekwa nkwusa n’ebe ahụ.” Gịnị mere Jizọs ji kwụsịtụ ịgwọ ndị ọrịa na inyere ndị nọ ná mkpa aka ma gaa n’ihu n’ọrụ ime nkwusa ya? Ọ kọwara ihe kpatara nke a site n’ikwu, sị: “Ọ bụ n’ihi nzube a [ya bụ, ime nkwusa] ka m jiworo pụta.” (Mak 1:38, 39; Luk 4:43) Ọ bụ ezie na Jizọs weere imere ndị ọzọ ihe ọma dị ka ihe dị mkpa, ihe bụ́ isi mere o ji bịa bụ ikwusa banyere Alaeze Chineke.—Mak 1:14.

Ebe ọ bụ na Bible na-agba Ndị Kraịst ume ka ha ‘na-agbasochi nzọụkwụ Jizọs anya,’ taa Ndị Kraịst nwere nnọọ ihe doro anya ga-eduzi ha ma a bịa n’ihe banyere ibute ihe ndị ka mkpa ụzọ ka ha na-agbalị inyere ndị ọzọ aka. (1 Pita 2:21) Ha na-enyere ndị nọ ná mkpa aka, dị ka Jizọs mere. Otú ọ dị, dịkwa ka Jizọs, ha na-ebute ọrụ nke ikwusa ozi Alaeze Chineke nke dị na Bible ụzọ ná ndụ ha. (Matiu 5:14-16; 24:14; 28:19, 20) Gịnịzi mere e ji kwesị ile ikwusa ozi dị n’Okwu Chineke anya dị ka ihe ka ụdị enyemaka ọ bụla ọzọ mkpa?

Ahụmahụ ndị mere eme e nwetara gburugburu ụwa na-egosi na mgbe ndị mmadụ ghọtara ndụmọdụ ndị bara uru dị na Bible ma na-agbaso ha, ha na-adịkwu njikere ịnagide nsogbu ndị ha na-ezute kwa ụbọchị, tinyere ịda ogbenye. Ọzọkwa, ozi banyere Alaeze Chineke bụ́ nke dị na Bible, nke Ndịàmà Jehova na-ekwusa taa, na-eme ka ndị mmadụ nwee olileanya maka ọdịnihu—olileanya nke na-eme ka ndụ dịkwuo ụtọ, ọbụna ma ọ bụrụ na anyị nọ n’ọnọdụ ndị kasị taa akpụ. (1 Timoti 4:8) Olileanya dị aṅaa ka nke ahụ bụ?

Okwu Chineke mesiri anyị obi ike banyere ọdịnihu, sị: “E nwere eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ ndị anyị na-echere dị ka nkwa [Chineke] si dị, ezi omume gajekwa ibi n’ime ha.” (2 Pita 3:13) Mgbe ụfọdụ, mgbe Bible na-ekwu banyere “ụwa,” ọ na-ezo aka n’ebe ndị mmadụ bi n’ime ụwa nọ. (Jenesis 11:1) N’ihi ya, “ụwa ọhụrụ” ezi omume e kwere ná nkwa na ọ ga-abịa bụ ụmụ mmadụ ndị ha na Chineke dị ná mma. Okwu Chineke kwekwara nkwa na n’ọchịchị Kraịst, a ga-eji ndụ ebighị ebi kwụghachi ndị ha na Chineke dị ná mma ụgwọ, ha ga-ebikwa ndụ na-eju afọ na paradaịs elu ala. (Mak 10:30) Ohere dịịrị mmadụ nile ibi ndụ n’ọdịnihu ahụ dị ebube, tinyekwara ndị ogbenye. ‘N’ụwa ọhụrụ’ ahụ, ịda ogbenye agaghị adịkwa ruo mgbe ebighị ebi.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 7]

OLEE OTÚ JIZỌS GA-ESI “NAPỤTA OGBENYE”?—Abụ Ọma 72:12

IKPE ZIRI EZI: “Ọ ga-ekpe ndị e wedara n’ala n’etiti ndị Gị ikpe, ọ ga-enye ụmụ nke ogbenye nzọpụta, zọpịakwa onye mmegbu.” (Abụ Ọma 72:4) A ga-ekpe onye ọ bụla ikpe ziri ezi mgbe Kraịst ga-amalite ịchị ụwa. A gaghị enwe nrụrụ aka, bụ́ ihe ọjọọ nke meworo ka ọtụtụ mba ndị gaara aba ọgaranya daa ogbenye.

UDO: “Onye ezi omume ga-ama akwụkwọ n’ụbọchị nile ya dị ka osisi ndụ; ọtụtụ udo ga-adịkwa ruo mgbe ọnwa agaghị adị.” (Abụ Ọma 72:7) Ihe na-akpatakarị ịda ogbenye n’ụwa bụ ọgba aghara na agha ndị ụmụ mmadụ na-akpata. Kraịst ga-eweta udo zuru okè n’ụwa, si otú ahụ kpochapụ otu n’ime isi sekpụ ntị na-akpata ịda ogbenye.

ỌMỊIKO: “Ọ ga-emere onye na-enweghị ike na ogbenye ebere, ọ bụkwa mkpụrụ obi ndị ogbenye ka ọ ga-azọpụta. Ọ ga-esi n’aka nzọgbu na n’aka ime ihe ike gbapụta mkpụrụ obi ha; ọbara ha ga-adịkwa oké ọnụ ahịa n’anya ya.” (Abụ Ọma 72:12-14) Ndị na-enweghị ike, ndị ogbenye, nakwa ndị a na-emegbu emegbu ga-esonye n’otu ezinụlọ mmadụ nwere obi ụtọ, bụ́ ndị e mere ka ha dị n’otu n’okpuru ịchịisi nke Eze bụ́ Jizọs Kraịst.

ỌGANIHU: “Ka ọtụtụ ọka dị n’ala n’elu ugwu nile.” (Abụ Ọma 72:16) N’oge ọchịchị Kraịst, ụmụ mmadụ ga-enwe ihe ndị dị ha mkpa n’ụba. Ụmụ mmadụ agakwaghị anọ n’ụkọ nri nakwa n’ụnwụ nri bụ́ ihe ndị na-akpatakarị ịda ogbenye taa.

[Foto dị na peeji nke 4, 5]

Jizọs gosiri na ọnọdụ ndị ogbenye na-emetụ ya n’obi

[Foto dị na peeji nke 6]

Ozi dị na Bible na-eme ka e nwee ezigbo olileanya