Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Iru n’Obi Nwatakịrị

Iru n’Obi Nwatakịrị

Iru n’Obi Nwatakịrị

Ọ̀ DỊTỤLA mgbe o wutere gị ịhụ ka nwatakịrị ji ihe ndị e ji egwuri egwu yiri ngwá agha na-egwuri egwu? Ọbụna ụmụaka dị nnọọ obere taa na-eji ụdị ihe egwuregwu ndị a egwuri egwu ebe ọ bụ na ndị na-emepụta ihe ndị e ji atụrụ ndụ emeela ka ime ihe ike ju ebe nile n’ụwa. Olee otú ị ga-esi nyere nwatakịrị aka iji ihe ndị e ji egwuri egwu na-eyighị ihe e ji alụ agha dochie anya ndị nke yiri ngwá agha? Waltraud, bụ́ Onyeàmà Jehova nọ n’Africa nke jerela ozi ala ọzọ ruo ogologo oge, chọpụtara ụzọ isi nyere otu nwata nwoke aka ime nke ahụ.

N’ihi agha, Waltraud kwapụrụ n’obodo o bibu na ya ma kwaga n’obodo ọzọ dị n’Africa. N’ebe ahụ, ọ malitere ịmụrụ otu nwanyị nwere nwa nwoke dị afọ ise Bible. Mgbe ọ bụla Waltraud gara ileta nwanyị ahụ, nwa nwanyị ahụ na-eji obere égbè e ji plastik mee egwuri egwu. Nke ahụ bụ nanị ihe e ji egwuri egwu o nwere. Ọ dịtụghị mgbe Waltraud hụrụ ka nwatakịrị ahụ tụdoro égbè ahụ n’ihe ọ bụla, kama ihe ọ na-eme bụ ikpughe na ikpuchi ya dị nnọọ ka à ga-asị na ọ na-akwanye mgbọ égbè n’ime ya.

Waltraud gwara nwata ahụ, sị: “Werner, ị̀ maara ihe mere m ji biri n’obodo unu? Ọ bụ n’ihi agha—agbapụrụ m n’obodo m bi n’ihi na ụmụ nwoke dị obi ọjọọ ji ụdị égbè gị a na-agbagbusị ndị mmadụ. Ì chere na ọ dị mma otú ahụ ha si na-agbagbusị ndị mmadụ?”

Werner ji mwute zaa, sị: “Ee e, ọ dịghị mma.”

Waltraud kwuru, sị: “Ị zara nke ọma.” Ọ jụziri nwa ahụ, sị: “Ị̀ maara ihe mere m ji abịa eleta gị na mama gị n’izu ọ bụla? Ọ bụ n’ihi na Ndịàmà Jehova chọrọ inyere ndị mmadụ aka ka ha na Chineke na ndị agbata obi ha na-adị n’udo.” Waltraud natara ikike n’aka mama nwatakịrị ahụ ma gwa nwa ahụ, sị: “Ọ bụrụ na gị enye m égbè gị, m ga-atụfu ya, m ga-ewetakwara gị obere ụgbọala ị ga-eji na-egwuri egwu.”

Werner nyere Waltraud égbè ahụ. Nwata ahụ cheere ruo otu ọnwa bụ́ mgbe e wetaara ya ihe ọhụrụ ọ ga-eji na-egwuri egwu—obere ụgbọala e ji osisi rụọ. O ji ihu ọchị nara ya.

Ị̀ na-ewepụta oge iji soro ụmụ gị na-ekwurịta okwu, na-agbalị iru n’obi ha iji kpalie ha ịtụfu ihe egwuregwu ndị yiri ngwá agha? Ọ bụrụ na ị na-eme otú ahụ, ị ga na-akụziri ha ihe ga-abara ha uru ruo ogologo ndụ ha nile.