Jehova Na-enye Ndị Ọzụzụ Atụrụ Ọzụzụ Maka Atụrụ Ya
Jehova Na-enye Ndị Ọzụzụ Atụrụ Ọzụzụ Maka Atụrụ Ya
“Jehova na-enye amamihe; n’ọnụ Ya ka ihe ọmụma na nghọta si apụta.”—ILU 2:6.
1, 2. N’ihi gịnị ka ụmụ nwoke e mere baptizim ji agbalị iru eru inwetakwu ihe ùgwù ije ozi n’ọgbakọ?
NICK, bụ́ onye jeworo ozi dị ka okenye ruo afọ asaa kwuru, sị: “Obi dị m nnọọ ụtọ mgbe a họpụtara m dị ka okenye. Elere m ihe ùgwù a anya dị ka ohere iji mụbaa ozi m na-ejere Jehova. M na-eche na m ji ya ụgwọ ekele maka ihe nile o mewooro m. Achọkwara m inyere ndị nọ n’ọgbakọ m aka ruo ókè m nwere ike, dị ka ndị okenye ndị ọzọ si nyere m aka.” Otú ọ dị, n’agbanyeghị na Nick nwere ọṅụ, e nwekwara ihe ụfọdụ ndị na-enye ya nsogbu n’obi. Nick gara n’ihu ikwu, sị: “Ebe ọ bụ na erubeghị m afọ iri atọ mgbe a họpụtara m, m na-echegbu onwe m na m gaghị enwe nkà dị mkpa—nghọta na amamihe—iji lekọta atụrụ Jehova nke ọma.”
2 Ndị Jehova họpụtara ịbụ ndị ọzụzụ atụrụ ya nwere ọtụtụ ihe mere ha ga-eji nwee obi ụtọ. Pọl onyeozi chetaara ndị okenye si Efesọs otu n’ime ihe ndị mere ha ga-eji ṅụrịa ọṅụ mgbe o hotara ihe Jizọs kwuru, sị: “A na-enwe obi ụtọ ka ukwuu n’inye ihe karịa ka a na-enwe n’ịnara ihe.” (Ọrụ 20:35) Ije ozi dị ka ohu na-eje ozi ma ọ bụ okenye na-eme ka ụmụ nwoke e mere baptizim nwekwuo ụzọ ha ga-esi nye Jehova na ọgbakọ ya ihe. Dị ka ihe atụ, ndị ohu na-eje ozi na-eso ndị okenye arụkọ ọrụ. Ha na-ahụkwa maka ọtụtụ ọrụ ndị dị mkpa na-ewekwa oge. Ọ bụ ịhụnanya ụmụnna ndị a nwere n’ebe Chineke na ndị agbata obi ha nọ na-akpali ha ije ozi ndị dị mkpa.—Mak 12:30, 31.
3. Gịnị pụrụ ime ka ụfọdụ na-ala azụ iru eru maka ihe ùgwù dị iche iche n’ọgbakọ?
3 Gịnị banyere nwanna nwoke bụ́ onye na-ala azụ iru eru ka e wee họpụta ya dị ka ohu na-eje ozi, nakwa dị ka okenye n’ihi na ọ na-eche na ya agaghị arụli ọrụ dị na ya? Dị ka Nick, ọ pụrụ ịdị na-eche na ya enweghị nkà a chọrọ iji bụrụ ezigbo onye ọzụzụ atụrụ. Ọ bụrụ na ị bụ nwanna nwoke e mere baptizim, ì so ná ndị na-eche na ha erughị ihe a chọrọ? Nchegbu ndị dị otú ahụ kwesịrị ekwesị. Ndị ọzụzụ atụrụ a họpụtara ahọpụta ga-aza Jehova ajụjụ maka ụzọ ha si mesoo atụrụ ya ihe. Jizọs kwuru, sị: “Onye ọ bụla e nyere ihe dị ukwuu, a ga-achọ ihe dị ukwuu n’aka ya; onye ndị mmadụ nyekwara ihe dị ukwuu ilekọta, ha ga-achọ ihe ka ukwuu n’aka ya.”—Luk 12:48.
4. Olee otú Jehova si enyere ndị ọ na-ahọpụta ka ha na-elekọta atụrụ ya aka?
4 Jehova ọ̀ na-atụ anya ka ndị ọ họpụtara dị ka ndị ohu na-eje ozi na ndị okenye na-ebu ibu ọrụ ha nanị ha? Ee e, ọ bụghị nanị na ọ na-enye ha ihe ndị na-enyere ha aka inwe ike ịrụ ọrụ ha kamakwa, ọ na-enye ha ihe ndị ga-enyere ha aka ịrụ ọrụ ha nke ọma. Dị ka anyị tụlere n’isiokwu bu ụzọ, Jehova na-enye ha mmụọ nsọ ya, bụ́ nke mkpụrụ ọ na-amịpụta na-enyere ha aka iji obiọma na-elekọta atụrụ ahụ. (Ọrụ 20:28; Ndị Galeshia 5:22, 23) Tụkwasị na nke ahụ, Jehova na-eme ka ha nwee amamihe, ihe ọmụma, na nghọta. (Ilu 2:6) Olee otú o si eme nke a? Ka anyị tụlee ụzọ atọ Jehova si azụ ndị ọ na-ahọpụta ka ha na-elekọta atụrụ ya.
Ndị Ndị Ọzụzụ Atụrụ Nwere Ahụmahụ Zụrụ
5. N’ihi gịnị ka Pita na Jọn ji bụrụ ndị ọzụzụ atụrụ bụ́ ịgba?
5 Mgbe ndịozi bụ́ Pita na Jọn nọ n’ihu ụlọikpe Sanhedrin, ndị ikpe nọ n’ụlọikpe ahụ bụ́ ndị maara ihe n’anya ụwa, lere ndịozi ahụ anya dị ka ndị “na-agụghị oké akwụkwọ na ndị Ọrụ 4:1-4, 13) N’ezie, ha anatawo mmụọ nsọ. (Ọrụ 1:8) Ma o dokwara onye ọ bụla anya—ọbụna gụnyere ndị ikpe ahụ kpuru ìsì n’ụzọ ime mmụọ—na Jizọs nyere ndị ikom ndị a ọzụzụ. Mgbe ya na ha nọ n’ụwa, Jizọs kụziiri ndịozi ya ma otú e si akpọkọta ndị yiri atụrụ ma otú e si azụ ha ozugbo ha sonyere n’ìgwè atụrụ ya.—Matiu 11:29; 20:24-28; 1 Pita 5:4.
nkịtị.” Nke a apụtaghị na ndịozi ahụ amaghị ka e si agụ na ka e si ede. Ihe ha bu n’uche bụ na a kụzighịrị ndịozi Akwụkwọ Nsọ dị ka a na-akụziri ndị rabaị. N’agbanyeghị nke ahụ, Pita na Jọn, na ndị ọzọ bụ́ ndị na-eso ụzọ, gosiri na ha bụ ndị nkụzi bụ́ ịgba, na-akpali ọtụtụ ndị gere ha ntị ịghọ ndị kwere ekwe. Olee otú ndị ikom a na-agụghị oké akwụkwọ si bụrụ ndị nkụzi bụ́ ịgba otú a? Mgbe ha gesịrị Pita na Jọn ntị, ndị ụlọikpe ahụ “wee malite ịmata ha na ha na Jizọs nọburị.” (6. Ihe nlereanya dị aṅaa ka Jizọs na Pọl setịpụrụ n’ịzụ ndị ọzọ?
6 Mgbe a kpọlitesịrị Jizọs n’ọnwụ, ọ nọgidere na-enye ndị a họpụtara dị ka ndị ọzụzụ atụrụ ọzụzụ. (Mkpughe 1:1; 2:1-3:22) Dị ka ihe atụ, o ji aka ya họpụta Pọl ma hụ maka ọzụzụ ya. (Ọrụ 22:6-10) Pọl ji ọzụzụ e nyere ya kpọrọ ihe ma kụziere ndị okenye ndị ọzọ ihe ọ mụtara. (Ọrụ 20:17-35) Dị ka ihe atụ, o tinyere nnukwu oge na ume n’ịzụ Timoti ka ọ ghọọ “onye ọrụ” n’ozi Chineke, bụ́ onye “na-enweghị ihe ọ ga-emere ihere, na-ejizi okwu nke eziokwu ahụ ejizi.” (2 Timoti 2:15) Ha abụọ bịara ghọọ ezigbo enyi. Tupu ya enyewe Timoti ọzụzụ a, Pọl dere banyere Timoti, sị: “Dị ka nwata ya na nna ya nọ, o so m bụrụ ohu n’ime ka ozi ọma na-aga n’ihu.” (Ndị Filipaị 2:22) Pọl anwaghị ime Timoti ma ọ bụ onye ọ bụla ọzọ, onye na-eso ụzọ ya. Kama nke ahụ, ọ gbara ndị kwere ekwe ibe ya ume ka ha ‘na-eṅomi ya ọbụna dị ka ya onwe ya na-eṅomi Kraịst.’—1 Ndị Kọrint 11:1.
7, 8. (a) Olee ahụmahụ gosiri ezi ihe ndị okenye na-arụpụta mgbe ha ṅomiri Jizọs na Pọl? (b) Olee mgbe ndị okenye kwesịrị ịmalite ịzụ ndị pụrụ ịghọ ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi n’ọdịnihu?
7 N’iṅomi Jizọs na Pọl, ndị ọzụzụ atụrụ nwere ahụmahụ na-amalite ịzụ ụmụnna nwoke e meworo baptizim n’echeghị ka a gwa ha agwa, nke a na-arụpụtakwa ezigbo ihe. Tụlee ahụmahụ Chad. A zụlitere ya n’ezinụlọ na-anọghị n’otu okpukpe, ma a họpụtara ya dị ka okenye n’oge na-adịbeghị anya. Ọ na-ekwu, sị: “N’ime ọtụtụ afọ gaworo aga, ọtụtụ ndị okenye nyeere m aka inwe ọganihu ime mmụọ. Ebe ọ bụ na papa m bụ onye na-ekweghị ekwe, ndị okenye gosiri nnọọ mmasị n’ebe m nọ ma ghọọrọ m ndị nna ime mmụọ. Ha wepụtara oge zụọ m n’ozi, mgbe e mesịkwara, otu okenye nyere m ọzụzụ n’otú e si elekọta ọrụ e kenyere m n’ọgbakọ.”
8 Dị ka ahụmahụ Chad na-egosi, ndị ọzụzụ atụrụ nwere ezi nghọta na-amalite nnọọ n’ezigbo oge zụwa ndị a pụrụ ịhọpụta n’ọdịnihu dị ka ndị ohu na-eje ozi na ndị okenye tupu ha eruodị eruo maka ihe ùgwù ndị a. N’ihi gịnị ka nke a ji dị mkpa? Ọ bụ n’ihi na Bible nyere ma ndị ohu na-eje ozi ma ndị okenye iwu ka ha na-ebi ndụ dị mma ma hụ na mmekọrịta ha na Jehova siri ike tupu a họpụta ha ije ozi. Aghaghị ibu ụzọ ‘nwalee ha ma ha ruru eru.’—1 Timoti 3:1-10.
9. Ibu ọrụ dị aṅaa ka ndị ọzụzụ atụrụ nwere ahụmahụ nwere, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?
9 O kwesịrị ekwesị ibu ụzọ nye ụmụnna nwoke ọzụzụ tupu a nwalewe ha. Iji maa atụ: Ọ bụrụ na a gwa nwata akwụkwọ ka ọ gaa lee ule mgbe onye nkụzi ya na-akụzirighị ya ihe ọ bụla a ga-ele n’ule ahụ, nwata akwụkwọ ahụ ọ̀ ga-agafe n’ule ahụ? Eleghị anya ọ ga-ada ya. N’ihi ya, ọzụzụ dị ya mkpa. Otú ọ dị, ndị nkụzi ji ọrụ ha kpọrọ ihe na-enye ụmụ akwụkwọ ọzụzụ ka ha jiri ihe ha mụtara na-eme ihe, ọ bụghị nanị ka ha wee gafee n’ule. N’ụzọ yiri nke ahụ, ndị okenye ji ịdị uchu na-arụ ọrụ ha na-enyere ụmụnna nwoke e mere baptizim aka ịzụlite àgwà ndị a chọrọ n’aka onye a họpụtara ije ozi site n’inye ha ọzụzụ dị mkpa maka ọrụ ha. Ha adịghị eme nke a nanị iji nyere ụmụnna ndị a aka ka a họpụta ha ije ozi kamakwa ha na-enyere ha aka inwe ike ilekọta atụrụ Jehova nke ọma. (2 Timoti 2:2) N’ezie, ụmụnna nwoke ndị e mere baptizim aghaghị ime ókè ha ma rụsie ọrụ ike iji ruo ihe a chọrọ tupu a họpụta mmadụ dị ka ohu na-eje ozi ma ọ bụ okenye. (Taịtọs 1:5-9) Otú o sina dị, ọ bụrụ na ndị ọzụzụ atụrụ nwere ahụmahụ e jiri ọchịchọ obi na-azụ ụmụnna ndị na-agbalị iru eru maka ịrụ ọrụ ndị dị n’ọgbakọ, ha pụrụ inyere ha aka inwe ọganihu ngwa ngwa.
10, 11. Olee otú ndị ọzụzụ atụrụ pụrụ isi nye ndị ọzọ ọzụzụ maka inweta ihe ùgwù ndị ọzọ?
10 N’ụzọ dị aṅaa kpọmkwem ka ndị ọzụzụ atụrụ nwere ahụmahụ pụrụ isi zụọ ndị ọzọ ịrụ ọrụ n’ọgbakọ? Nke mbụ, ha ga-eme nke a site n’inwe mmasị n’ebe ụmụnna ndị nwoke nọ n’ọgbakọ nọ—na-eso ha arụkọ ọrụ n’ozi ubi ma na-enyere ha aka inwe ike ‘ijizi okwu nke eziokwu ahụ ejizi.’ (2 Timoti 2:15) Ndị ọzụzụ atụrụ nwere ahụmahụ na-eso ụmụnna nwoke ndị ahụ ekwurịta ọṅụ a na-enweta site n’ijere ndị ọzọ ozi nakwa afọ ojuju ha onwe ha na-enweta site n’isetịpụ ihe mgbaru ọsọ ime mmụọ na iru ha. Ha na-ejikwa obiọma atụrụ ha aro otú nwanna nwoke pụrụ isi ghọọrọ ‘ìgwè atụrụ ahụ ihe nlereanya.’—1 Pita 5:3, 5.
11 Ozugbo a họpụtara nwanna nwoke ịbụ ohu na-eje ozi, ndị okenye, bụ́ ndị maara ihe na-anọgide na-enye ya ọzụzụ. Bruce, bụ́ onye jeworo ozi dị ka okenye ruo ọtụtụ iri afọ na-ekwu, sị: “M na-enwe mmasị iso onye a họpụtara ọhụrụ ịbụ ohu na-eje ozi anọrị ma na-atụle ntụziaka ndị ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche bipụtara. Anyị na-agụkwa ntụziaka ọ bụla e nyere kpọmkwem maka ọrụ ya, e mesịa, m na-enwezi mmasị iso ya na-arụkọ ọrụ ruo mgbe ọrụ ya doro ya nnọọ anya.” Ka ohu na-eje ozi ahụ na-enwe ahụmahụ, a pụkwara inye ya ọzụzụ n’ọrụ ime nleta ọzụzụ atụrụ. Bruce gara n’ihu ikwu, sị: “Mgbe m na-akpọrọ ohu na-eje ozi aga nleta ọzụzụ atụrụ, m na-enyere ya aka ịhọrọ kpọmkwem akụkụ Akwụkwọ Nsọ ga-agba onye ma ọ bụ ezinụlọ anyị na-aga ileta ume ma kpalie ha ime ihe. Ịmụta iji Akwụkwọ Nsọ eme ihe n’ụzọ ga-eru mmadụ n’obi dị oké mkpa iji mee ka ohu na-eje ozi ahụ ghọọ okenye na-arụpụta ihe.”—Ndị Hibru 4:12; 5:14.
12. Olee otú ndị ọzụzụ atụrụ nwere ahụmahụ pụrụ isi nye ndị nke a họpụtara ọhụrụ ọzụzụ?
12 Ndị ọzụzụ atụrụ a họpụtara ọhụrụ na-eritekwa uru ma ọ bụrụ na e nyekwuoro ha aka. Nick, bụ́ onye a kpọtụrụ aha ná mmalite, na-ekwu, sị: “Ọzụzụ m natara n’aka ndị okenye abụọ kataworo ahụ́ nyeere m aka nke ukwuu. Ụmụnna a na-aghọtakarị otú e kwesịrị isi elebara ihe ụfọdụ anya. Ha na-ejikarị ndidi ege m ntị ma na-echebara ihe m na-ekwu echiche—ọbụna ma à sị na ha ekwetaghị n’ihe m kwuru. Amụtara m ọtụtụ ihe site n’ịhụ otú ha si eji obi umeala na nkwanye ùgwù emeso ụmụnna ndị nọ n’ọgbakọ ihe. Ndị okenye ndị a mere ka m ghọta mkpa ọ dị iji Bible eme ihe n’ụzọ dị irè mgbe m na-edozi nsogbu ma ọ bụ mgbe m na-agba ndị ọzọ ume.”
Ndị E Ji Okwu Chineke Zụọ
13. (a) Gịnị dị nwanna nwoke mkpa iji bụrụ ezigbo onye ọzụzụ atụrụ? (b) N’ihi gịnị ka Jizọs ji kwuo, sị: “Ihe m na-ezi abụghị nke m”?
13 N’ezie, n’Okwu Chineke, bụ́ Bible, e nwere iwu, ụkpụrụ, na ihe atụ ndị dị onye ọzụzụ atụrụ mkpa iji “ruo eru n’ụzọ zuru ezu, bụrụ onye a kwadebere n’ụzọ zuru ezu maka ezi ọrụ ọ bụla.” (2 Timoti 3:16, 17) Nwanna nwoke nwere ike ịbụ onye gụrụ ezigbo akwụkwọ, ma ọ bụ otú ọ maruru Akwụkwọ Nsọ na otú o si etinye ya n’ọrụ na-eme ya ka ọ bụrụ ezigbo onye ọzụzụ atụrụ. Tụlee ihe banyere Jizọs. Ọ bụ onye ọzụzụ atụrụ ime mmụọ kasị mara otú e si azụ atụrụ nakwa nke kasị nwee nghọta n’ime ndị nile bitụworo n’ụwa; n’agbanyeghị nke ahụ, ọ dabereghịdị n’amamihe nke onwe ya mgbe ọ na-akụziri atụrụ Jehova ihe. O kwuru, sị: “Ihe m na-ezi abụghị nke m, kama ọ bụ nke onye zitere m.” N’ihi gịnị ka Jizọs ji kwuo na ihe ọ na-ekwu sitere n’aka Nna ya nke eluigwe? Ọ kọwara, sị: “Onye na-ekwu echiche nke onwe ya na-achọ otuto nke ya.”—Jọn 7:16, 18.
14. Olee otú ndị ọzụzụ atụrụ si ezere ịchọ otuto nke onwe ha?
14 Ndị ọzụzụ atụrụ, bụ́ ndị na-edo onwe ha n’okpuru Jehova, na-ezere ịchọ otuto nke onwe ha. Ha na-ahụ na ndụmọdụ na agbamume ha na-enye adịghị adabere n’amamihe nke onwe ha kama n’Okwu Chineke. Ha na-aghọta na ọrụ dịịrị onye ọzụzụ atụrụ bụ inyere atụrụ Jehova aka inwe “uche nke Kraịst,” ọ bụghị uche nke ndị okenye. (1 Ndị Kọrint 2:14-16) Dị ka ihe atụ, gịnị pụrụ ime ma ọ bụrụ na okenye nke na-enyere di na nwunye aka idozi nsogbu ha nwere n’etiti onwe ha adabere n’ahụmahụ nke onwe ya mgbe ọ na-enye ha ndụmọdụ kama ịdabere n’ụkpụrụ Bible na n’ihe ọmụma ndị “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche” bipụtara? (Matiu 24:45) Ndụmọdụ ya pụrụ ihiwe nnọọ isi n’omenala e ji mara ógbè ya. Ọ pụkwara ịbụ na ihe ọ na-enye ha ndụmọdụ banyere ya edochaghị ya anya. Ọ bụ eziokwu na omenala ụfọdụ adịghị njọ n’onwe ha, nweekwa ike ịbụ na okenye ahụ maara ihe ọ na-enye ndụmọdụ banyere ya nke ọma. Ma atụrụ Jehova na-erite uru karịsịa mgbe ndị ọzụzụ atụrụ na-agba ha ume ige Jizọs ntị na ige ntị n’okwu nile nke Jehova kama ige ntị n’echiche nke mmadụ ma ọ bụ n’ihe ndị a na-emekarị n’ógbè ha.—Abụ Ọma 12:6; Ilu 3:5, 6.
Ndị “Ohu ahụ Na-ekwesị Ntụkwasị Obi, nke Nwekwara Uche” Zụrụ
15. Ọrụ dị aṅaa ka Jizọs nyere “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche,” gịnịkwa bụ otu ihe mere ohu ahụ jiworo na-enwe ihe ịga nke ọma?
15 Ndị ọzụzụ atụrụ, dị ka ndịozi bụ́ Pita, Jọn, na Pọl socha n’otu ìgwè Jizọs kọwara dị ka “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche.” Ihe mejupụtara òtù a bụ ụmụnna Jizọs ndị e tere mmanụ, bụ́ ndị nọ n’ụwa, ndị nwere olileanya nke iso Kraịst chịa n’eluigwe. (Mkpughe 5:9, 10) N’ụbọchị ikpeazụ nke usoro ihe a, ọnụ ọgụgụ nke ụmụnna Jizọs ndị ka nọ n’ụwa agbadala nnọọ. Otú ọ dị, ọrụ Jizọs nyere ha ka ha rụọ—ikwusa ozi ọma nke Alaeze ahụ tupu ọgwụgwụ eruo—amụbawo ugbu a karịa mgbe ọ bụla ọzọ. N’agbanyeghị nke ahụ, òtù ohu ahụ enwewo nnọọ ihe ịga nke ọma! N’ihi gịnị? Otu n’ime ihe so kpata ya bụ na ha azụwo ndị so ‘n’atụrụ ọzọ ahụ’ inyere ha aka n’ọrụ ime nkwusa na nke izi ihe e nyere ha. (Jọn 10:16; Matiu 24:14; 25:40) Taa, ọ bụ ìgwè a na-eguzosi ike na-arụ ihe ka ukwuu n’ọrụ ahụ.
16. Olee otú òtù ohu ahụ si azụ ndị ikom a họpụtara ahọpụta?
1 Ndị Kọrint 4:17) Otú ahụ ka ọ dịkwa taa. Òtù Na-achị Isi—obere ìgwè nke ndị okenye e tere mmanụ bụ́ ndị na-anọchi anya òtù ohu ahụ—na-enye ndị na-anọchi anya ha ntụziaka ịzụ na ịhọpụta ndị ohu na-eje ozi na ndị okenye n’ọtụtụ iri puku ọgbakọ ndị e nwere n’ụwa nile. Tụkwasị na nke ahụ, Òtù Na-achị Isi na-ahazi ụlọ akwụkwọ dị iche iche iji nye ndị so na Kọmitii Alaka, ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị, ndị okenye, na ndị ohu na-eje ozi, ọzụzụ banyere ụzọ kasị mma isi lekọta atụrụ Jehova. Òtù a na-enyekwu ntụziaka site n’akwụkwọ ozi, isiokwu ndị e bipụtara n’Ụlọ Nche, nakwa n’akwụkwọ anyị ndị ọzọ, dị ka akwụkwọ bụ́ Ndị A Haziri Ime Uche Jehova. *
16 Olee otú òtù ohu ahụ si enye ọzụzụ a? Na narị afọ mbụ, e nyere ndị na-anọchi anya òtù a ikike ịzụ na ịhọpụta ndị nlekọta n’ọgbakọ. Ndị nlekọta a ga-azụzi atụrụ Jehova. (17. (a) Olee otú Jizọs siworo gosi na ya tụkwasịrị òtù ohu ahụ obi? (b) Olee otú ndị ọzụzụ atụrụ ime mmụọ si egosi na ha tụkwasịrị òtù ohu ahụ obi?
17 Jizọs nwere nnọọ obi ike n’ebe òtù ohu ahụ nọ nke mere ka ọ họpụta ya ka ọ “na-elekọta ihe nile o nwere”—ya bụ, ihe nile metụtara ọgbakọ ya n’ụwa. (Matiu 24:47) Ndị ọzụzụ atụrụ a họpụtara ahọpụta na-egosi na ha nwekwara obi ike n’ebe òtù ohu ahụ nọ site n’iji ntụziaka ha na-enweta n’aka Òtù Na-achị Isi na-eme ihe. N’ezie, mgbe ndị ọzụzụ atụrụ na-enye ndị ọzọ ọzụzụ, mgbe ha na-ekwe ka Okwu Chineke na-azụ ha, nakwa mgbe ha na-eji ọzụzụ òtù ohu ahụ na-enye ha eme ihe, ha na-eme ka ìgwè atụrụ Jehova dịgide n’otu. Anyị nwere nnọọ ekele na Jehova azụwo ndị ikom bụ́ ndị na-elekọta nnọọ onye ọ bụla nọ n’ọgbakọ Ndị Kraịst nke ọma!
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 16 Nke Ndịàmà Jehova bipụtara.
Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?
• Olee otú ndị ọzụzụ atụrụ nwere ahụmahụ si enye ndị ọzọ ọzụzụ?
• Gịnị mere na ndị okenye adịghị akụzi ihe site n’echiche nke onwe ha?
• N’ụzọ dị aṅaa ka ndị ọzụzụ atụrụ si egosi na ha tụkwasịrị òtù ohu ahụ obi, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị ka ha ji eme nke a?
[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]
[Foto ndị dị na peeji nke 24, 25]
Ndị okenye ọgbakọ na-enye ụmụ okorobịa ọzụzụ n’ọgbakọ
[Foto ndị dị na peeji nke 26]
“Ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche” na-enye nnọọ ndị okenye ọzụzụ