Ndị Ọzụzụ Atụrụ Ndị Bụ́ “Ihe Nlereanya Nye Ìgwè Atụrụ Ahụ”
Ndị Ọzụzụ Atụrụ Ndị Bụ́ “Ihe Nlereanya Nye Ìgwè Atụrụ Ahụ”
“Na-azụnụ ìgwè atụrụ Chineke nke unu na-elekọta, . . . n’ọchịchọ obi . . . , n’ịnụ ọkụ n’obi . . . , na-aghọnụ ihe nlereanya nye ìgwè atụrụ ahụ.”—1 PITA 5:2, 3.
1, 2. (a) Ihe ùgwù dị aṅaa ka Jizọs nyere Pita onyeozi, oleekwa ihe mere a pụrụ iji kwuo na obi ike Jizọs nwere n’ebe Pita nọ aghọghị ya ahịa? (b) Olee otú Jehova si ele ndị ọzụzụ atụrụ ọ họpụtara ahọpụta anya?
N’OTU oge tupu Pentikọst nke afọ 33 O.A., Pita na mmadụ isii n’ime ndị na-eso ụzọ Jizọs nọ n’akụkụ Oké Osimiri Galili na-eri nri ụtụtụ Jizọs kwadebeere ha. Nke a abụghị nke mbụ Pita hụrụ Jizọs kemgbe a kpọlitesịrị Jizọs n’ọnwụ, ihe ịrụ ụka adịghịkwa ya na o nwere obi ụtọ ịmara na Jizọs dị ndụ. Ma ọ pụkwara ịbụ na obi erughị Pita ala. Nke a bụ n’ihi na nanị ụbọchị ole na ole tupu mgbe ahụ, ọ gọrọ agụgọ n’ihu ọha na ya amatụghị onye Jizọs bụ. (Luk 22:55-60; 24:34; Jọn 18:25-27; 21:1-14) Jizọs ọ̀ baara Pita chegharịworonụ mbà na o mere omume dị ka onye na-enweghị okwukwe? O meghị otú ahụ. Kama nke ahụ, Jizọs nyere Pita ihe ùgwù nke ịzụ “ụmụ atụrụ” ya. (Jọn 21:15-17) Dị ka ihe ndekọ Bible banyere akụkọ ihe mere eme nke ọgbakọ Ndị Kraịst narị afọ mbụ na-egosi, obi ike Jizọs nwere n’ebe Pita nọ aghọghị ya ahịa. Pita na ndịozi ndị ọzọ na ndị okenye nọ na Jeruselem gara n’ihu ịzụ ọgbakọ Ndị Kraịst nke oge ahụ gabiga ọnwụnwa ndị siri oké ike, nakwa n’oge e nwere mmụba ngwa ngwa.—Ọrụ 1:15-26; 2:14; 15:6-9.
2 Taa, Jehova esitewo n’aka Jizọs Kraịst họpụta ndị ikom ruru eru ije ozi dị ka ndị ọzụzụ atụrụ ime mmụọ, iduru atụrụ Ya gabiga oge kasị sie ike obibi kemgbe e kere mmadụ. (Ndị Efesọs 4:11, 12; 2 Timoti 3:1) Obi ike dị otú ahụ o nwere n’ebe ndị ọzụzụ atụrụ ahụ nọ ọ̀ ghọwo ya ahịa? Udo nke dị n’etiti òtù ụmụnna e nwere n’ụwa nile na-egosi na Jehova ehieghị ụzọ n’inwe obi ike dị otú ahụ n’ebe ndị ọzụzụ atụrụ ọ họpụtara nọ. N’eziokwu, ndị ọzụzụ atụrụ a bụ ndị ikom na-ezughị okè, dị ka Pita bụ. (Ndị Galeshia 2:11-14; Jems 3:2) N’agbanyeghị nke ahụ, Jehova tụkwasịrị ha obi na ha ga-elekọtali atụrụ ndị “o ji ọbara nke Ọkpara ya zụta.” (Ọrụ 20:28) Jehova hụrụ ndị ikom ndị a n’anya nke ukwuu, na-ele ha anya dị ka “ndị ruru eru inweta nsọpụrụ okpukpu abụọ.”—1 Timoti 5:17.
3. Olee otú ndị ọzụzụ atụrụ ime mmụọ si anọgide jiri ọchịchọ obi na ịnụ ọkụ n’obi na-arụ ọrụ ha?
3 Olee otú ndị ọzụzụ atụrụ ime mmụọ si anọgide na-eji ọchịchọ obi na ịnụ ọkụ n’obi na-arụ ọrụ ha, si otú ahụ na-aghọrọ atụrụ ahụ ihe nlereanya? Dị ka Pita na ndị ọzụzụ atụrụ ndị ọzọ e nwere na narị afọ mbụ mere, ndị ọzụzụ atụrụ ime mmụọ dabeere ná mmụọ nsọ Chineke, bụ́ nke na-enye ha ume dị ha mkpa iji buo ibu ọrụ ha. (2 Ndị Kọrint 4:7) Mmụọ nsọ na-amịpụtakwa mkpụrụ nke mmụọ nsọ—ọṅụ, udo, ogologo ntachi obi, obiọma, ịdị mma, okwukwe, ịdị nwayọọ, na njide onwe onye—n’ime ha. (Ndị Galeshia 5:22, 23) Ka anyị tụlee ụfọdụ ụzọ ndị ọzụzụ atụrụ pụrụ isi setịpụ ihe nlereanya n’igosipụta mkpụrụ nke mmụọ nsọ ka ha na-azụ ìgwè atụrụ Chineke nyere ha ilekọta.
Na-ahụnụ Ma Ìgwè Atụrụ ahụ Ma Atụrụ nke Ọ Bụla n’Anya
4, 5. (a) Olee otú Jehova na Jizọs si egosipụta ịhụnanya n’ebe ìgwè atụrụ ahụ nọ? (b) Olee ụfọdụ ụzọ ndị ọzụzụ atụrụ ime mmụọ si egosipụta ịhụnanya n’ebe ìgwè atụrụ Jehova nọ?
4 Àgwà kasịnụ mmụọ nsọ Chineke na-amịpụta bụ ịhụnanya. Jehova gosipụtara ịhụnanya o nwere n’ebe ìgwè atụrụ ahụ n’ozuzu nọ site n’ịdị na-enye ha nri ime mmụọ n’ụba. (Aịsaịa 65:13, 14; Matiu 24:45-47) Ma ọ na-eme ihe karịrị inye ìgwè atụrụ ahụ nri. Ọ hụrụ nke ọ bụla n’ime atụrụ ahụ n’anya nke ukwuu. (1 Pita 5:6, 7) Jizọs hụkwara ìgwè atụrụ ahụ n’anya. O nyefere mkpụrụ obi ya n’ihi ìgwè atụrụ a, ọ makwaara atụrụ nke ọ bụla “n’aha.”—Jọn 10:3, 14-16.
5 Ndị ọzụzụ atụrụ ime mmụọ na-eṅomi Jehova na Jizọs. Ha na-egosipụta na ha hụrụ ìgwè atụrụ Chineke n’ozuzu n’anya site ‘n’ịgbalịsi ike izi ọgbakọ ihe.’ Isiokwu dabeere na Bible ndị ha ji agwa ọgbakọ okwu na-enye aka n’ịzụ na n’ichebe ìgwè atụrụ ahụ, mmadụ nile na-ahụkwa ha mgbe ha na-arụsị ọrụ ike iji mee nke a. (1 Timoti 4:13, 16) A dịghị ahụ oge ndị ha ji na-edekọ akụkọ ozi ọgbakọ, oge ndị ha ji ede ma na-eziga akwụkwọ ozi, nakwa oge ndị ha ji na-ahazi ihe omume. A dịghịkwa ahụ oge ndị ha ji ahụ maka ọtụtụ ihe omume ndị ọzọ iji hụ na ọmụmụ ihe na ihe omume ndị ọzọ a na-eme n’ọgbakọ weere ọnọdụ “n’ụzọ kwesịrị ekwesị nakwa dị ka ndokwa si dị.” (1 Ndị Kọrint 14:40) Ụmụnna adịghị ahụ mgbe a na-arụ ihe ka ukwuu n’ọrụ ndị a, ọtụtụ ndị nwekwara ike ha agaghị ama na ha dị mkpa. N’ezie, ha bụ ọrụ ndị na-egosi na ha hụrụ ụmụnna ha n’anya.—Ndị Galeshia 5:13.
6, 7. (a) Olee otu ụzọ ndị ọzụzụ atụrụ si ama banyere atụrụ Jehova nke ọma? (b) N’ihi gịnị ka o ji aba uru mgbe ụfọdụ ịkọrọ ndị okenye mmetụta ndị anyị na-enwe?
6 Ndị Kraịst bụ́ ndị ọzụzụ atụrụ na-ahụ n’anya na-agbalịsi ike igosi mmasị n’ebe atụrụ nke ọ bụla nọ n’ọgbakọ nọ. (Ndị Filipaị 2:4) Otu ụzọ ndị ọzụzụ atụrụ si amata atụrụ nke ọ bụla nke ọma bụ site n’iso ha na-arụkọ ọrụ n’ozi ubi. Jizọs na ụmụazụ ya soro rụkọọ ọrụ nkwusa ugboro ugboro, o jikwa oge ndị dị otú ahụ gbaa ha ume. (Luk 8:1) Otu okenye nwere ahụmahụ na-ekwu, sị: “Achọpụtara m na ụzọ kasị mma isi mata nwanna nwoke ma ọ bụ nwanna nwanyị nke ọma bụ site n’iso ya na-arụkọ ọrụ n’ozi ubi.” Ọ bụrụ na i nwebeghị ike iso ndị okenye rụkọọ ọrụ n’ozi ubi n’oge na-adịbeghị anya, leenụ ma ị ga-eme ndokwa ime nke ahụ n’isi nso a.
7 Ọ bụ ịhụnanya kpaliri Jizọs iso ụmụazụ ya nwee ọṅụ mgbe ha nwere ọṅụ na iso ha nwee mwute mgbe ha nwere mwute. Dị ka ihe atụ, mgbe mmadụ iri asaa n’ime ndị na-eso ụzọ ya ji ọṅụ lọta ná nkwusa ha gara, Jizọs nwere “oké ọṅụ.” (Luk 10:17-21) Otú ọ dị, mgbe Jizọs hụrụ ka Meri na ndị ezinụlọ ya na ndị enyi ya na-eru újú n’ihi ọnwụ nke Lazarọs, “anya mmiri gbara Jizọs.” (Jọn 11:33-35) N’ụzọ yiri nke ahụ, ọnọdụ atụrụ Jehova na-emetụkwa ndị ọzụzụ atụrụ na-ahụ n’anya e nwere taa n’ahụ́. Ịhụnanya na-akpali ha ‘iso ndị na-aṅụrị ọṅụ ṅụrịa ọṅụ’ nakwa ‘iso ndị na-akwa ákwá kwaa ákwá.’ (Ndị Rom 12:15) Ọ bụrụ na i nwee ọṅụ ma ọ bụ mwute ná ndụ gị, alala azụ ịkọrọ ndị okenye banyere ya. Akụkọ banyere ihe nyere gị ọṅụ ga-agba ha ume. (Ndị Rom 1:11, 12) Ịma banyere ule ndị ị na-eche ihu ga-eme ka ha nwee ike iwusi gị ike na ịkasi gị obi.—1 Ndị Tesalonaịka 1:6; 3:1-3.
8, 9. (a) Olee otú otu okenye si gosi na ya hụrụ nwunye ya n’anya? (b) Olee otú ọ dịruru mkpa ka ndị ọzụzụ atụrụ gosipụta ịhụnanya n’ebe ezinụlọ ha nọ?
8 Ịhụnanya onye ọzụzụ atụrụ nwere n’ebe ìgwè atụrụ Jehova nọ na-akasị apụta ìhè n’otú o si emeso ezinụlọ ya. (1 Timoti 3:1, 4) Ọ bụrụ na ọ lụọla nwanyị, otú o si ahụ nwunye ya n’anya ma na-akwanyere ya ùgwù ga-abụrụ ndị ọzọ bụ́ di ihe nlereanya ha ga-agbaso. (Ndị Efesọs 5:25; 1 Pita 3:7) Tụlee ihe otu nwanna nwanyị aha ya bụ Linda kwuru. Di ya jere ozi dị ka okenye ruo afọ iri abụọ tupu ya anwụọ. Linda na-ekwu, sị: “Di m anatụghị enwe ohere n’ihi ilekọta ọgbakọ. Ma o mere ka obi sie m ike na ọ dịghị ihe ya pụrụ imeli ma e wezụga nkwado m na-enye ya. Ọ na-ekelekarị m maka nkwado m na-enye ya, mụ na ya na-anọrịkwa mgbe ọ bụla ọ na-ejighị ọrụ ọgbakọ n’aka. N’ihi ya, m nwere mmetụta na ọ hụrụ m n’anya, adịghịkwa m enwe anya ụfụ maka oge ndị o ji arụ ọrụ ọgbakọ.”
9 Ọ bụrụ na onye ọzụzụ atụrụ ime mmụọ nwere ụmụ, otú o si eji ịhụnanya enye ha ọzụzụ ma na-aja ha mma ga-abụrụ ndị nne na nna ihe nlereanya. (Ndị Efesọs 6:4) N’ezie, ịhụnanya o nwere n’ebe ezinụlọ ya nọ na-enyekwu ihe àmà na ntụkwasị obi e nwere n’ebe ọ nọ, bụ́ nke mere ka e jiri mmụọ nsọ họpụta ya, abụghị n’efu.—1 Timoti 3:4, 5.
Mee Ka Ọṅụ na Udo Dịrị n’Ọgbakọ Site n’Iso Ndị Ọzọ Na-ekwurịta Okwu
10. (a) Gịnị pụrụ imebi ọṅụ na udo e nwere n’ọgbakọ? (b) Olee okwu bilitere na narị afọ mbụ bụ́ nke chọrọ itisasị udo nke ọgbakọ, oleekwa otú e si dozie nsogbu ahụ?
10 Mmụọ nsọ pụrụ ime ka Onye Kraịst nwee ọṅụ na udo, ọ pụkwara ime ka ọṅụ na udo dịrị n’etiti ndị okenye, nakwa n’ọgbakọ n’ozuzu. Otú ọ dị, ịghara iso ndị ọzọ na-enwe ezi nkwurịta okwu pụrụ ime ka a ghara inwe ọṅụ na udo dị otú a. Solomọn oge ochie kwuru, sị: “Mmebi echiche nile dị mgbe izu nzuzo na-adịghị: ma n’ọtụtụ ndị na-adụ ọdụ ka ha na-eguzosi ike.” (Ilu 15:22) N’aka nke ọzọ, iji nkwanye ùgwù soro ndị ọzọ na-enwe nkwurịta okwu sitere n’obi na-eme ka e nwee ọṅụ na udo. Dị ka ihe atụ, mgbe okwu banyere ibi úgwù chọrọ itisa udo nke dị n’ọgbakọ nke narị afọ mbụ, òtù na-achị isi nke nọ na Jeruselem chọrọ nduzi nke mmụọ nsọ n’okwu ahụ. Onye nke ọ bụla n’ime ha kwukwara ihe o chere banyere okwu ahụ. Mgbe ha nwesịrị nkwurịta okwu na-ekpo ọkụ, ha kpebiri ihe a ga-eme. Mgbe ha gwara ọgbakọ mkpebi ha gbakọrọ aka mee, ụmụnna “ṅụrịrị ọṅụ n’ihi agbamume ahụ.” (Ọrụ 15:6-23, 25, 31; 16:4, 5) Nke a mere ka ha nwee ọṅụ, meekwa ka udo dị n’etiti ha.
11. Olee otú ndị okenye pụrụ isi mee ka ọṅụ na udo dịgide n’ọgbakọ?
11 N’otu aka ahụ taa, ndị ọzụzụ atụrụ na-eme ka e nwee ọṅụ na udo n’ọgbakọ site n’iso ndị ọzọ na-ekwurịta okwu nke ọma. Mgbe nsogbu na-achọ itisasị udo e nwere n’ọgbakọ, ha na-ezukọta ma kwupụta ihe bụ́ echiche ha n’atụghị egwu. Ha na-eji nkwanye ùgwù egere ihe ndị ọzụzụ atụrụ ibe ha nwere ikwu. (Ilu 13:10; 18:13) Mgbe ha kpesịrị ekpere maka mmụọ nsọ, ha na-eme ka mkpebi ha dabere n’ụkpụrụ Bible nakwa ná ntụziaka ndị “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche” nyere. (Matiu 24:45-47; 1 Ndị Kọrint 4:6) Ozugbo òtù ndị okenye mere mkpebi dabeere nnọọ n’Akwụkwọ Nsọ, okenye nke ọ bụla na-anakwere nduzi nke mmụọ nsọ site n’ịkwado mkpebi ahụ ọbụna ma à sị na ndị ka n’ọnụ ọgụgụ anakwereghị echiche ya. Ịdị umeala n’obi otú a na-eme ka ọṅụ na udo dịgide, ọ na-abụkwara atụrụ ahụ ezi ihe nlereanya nke otú ha pụrụ isi soro Chineke na-eje ije. (Maịka 6:8) Ì ji obi umeala na-akwado mkpebi ndị dabeere na Bible nke ndị ọzụzụ atụrụ na-eme n’ọgbakọ?
Nwee Ogologo Ntachi Obi na Obiọma
12. Gịnị mere o ji dị mkpa ka Jizọs jiri ogologo ntachi obi na obiọma mesoo ndịozi ya ihe?
12 Jizọs nwere ogologo ntachi obi na obiọma n’ebe ndịozi ya nọ n’agbanyeghị na ha mehiere ihe ugboro ugboro. Dị ka ihe atụ, Jizọs gbalịrị ịkụziri ha ugboro ugboro mkpa ọ dị ịdị umeala n’obi. (Matiu 18:1-4; 20:25-27) N’agbanyeghị nke ahụ, n’abalị ikpeazụ Jizọs dịrị ndụ dị ka mmadụ n’ụwa, mgbe ọ kụzisịịrị ha mkpa ọ dị ịdị umeala n’obi site n’ịsa ha ụkwụ, “esemokwu kpụ ọkụ n’ọnụ bilitekwara n’etiti ha banyere onye ọ bụ n’ime ha nke yiri ka ọ bụ ya kasị ukwuu.” (Luk 22:24; Jọn 13:1-5) Jizọs ọ̀ baara ndịozi ya mbà? Ee e, o ji obiọma soro ha kparịta ụka, na-ekwu, sị: “Olee onye ka ukwuu, ọ̀ bụ onye nọ na-eri ihe na tebụl ka ọ̀ bụ onye na-eje ozi? Ọ́ bụghị onye nọ na-eri ihe na tebụl? Ma anọ m n’etiti unu dị ka onye na-eje ozi.” (Luk 22:27) Ogologo ntachi obi Jizọs na obiọma ya—nakwa ezi ihe nlereanya ya—mesịrị metụ ndịozi ya n’obi.
13, 14. Olee mgbe ndị ọzụzụ atụrụ na-aghaghị ịdị obiọma karịsịa?
13 N’ụzọ yiri nke ahụ, ọ pụrụ ịdị mkpa ka onye ọzụzụ atụrụ ime mmụọ nye mmadụ ndụmọdụ ugboro ugboro n’ihi otu ebe onye ahụ na-adịghị emezi emezi. Onye ahụ pụrụ ịkpasu onye ọzụzụ atụrụ ahụ iwe. Otú ọ dị, ọ bụrụ na ka ọ na-adụ ‘ndị na-akpa aghara ọdụ,’ ya echeta na ya onwe ya na-emehiekwa ihe, ọ ga-enyere ya aka igosipụta ogologo ntachi obi na obiọma n’ebe nwanna ya nọ. N’ụzọ dị otú ahụ, ọ na-eṅomi Jizọs na Jehova bụ́ ndị na-egosipụta àgwà ndị a n’ebe Ndị Kraịst nile nọ—gụnyere ndị ọzụzụ atụrụ n’onwe ha.—1 Ndị Tesalonaịka 5:14; Jems 2:13.
14 Mgbe ụfọdụ, ọ pụrụ ịdị mkpa ka ndị ọzụzụ atụrụ nye onye meworo mmehie dị oké njọ ndụmọdụ siri ike. Ọ bụrụ na onye ahụ egosighị nchegharị, ndị ọzụzụ atụrụ ahụ aghaghị ịchụpụ onye ahụ n’ọgbakọ. (1 Ndị Kọrint 5:11-13) N’agbanyeghị nke ahụ, otú ha ga-esi mesoo onye ahụ ihe ga-egosi na ihe ha kpọrọ asị bụ mmehie ahụ onye ahụ mere ọ bụghị onye ahụ mere mmehie. (Jud 23) Ọ bụrụ na ndị ọzụzụ atụrụ enwee obiọma n’ahụ́ atụrụ na-akpafu akpafu, nke a pụrụ ime ka ọ dịrị ya mfe imesị lọghachi n’ìgwè atụrụ ahụ.—Luk 15:11-24.
Ọ Bụ Okwukwe Na-akpali Mmadụ Ịrụ Ezi Ọrụ
15. Olee otu ụzọ ndị ọzụzụ atụrụ si eṅomi ịdị mma Jehova, gịnịkwa na-akpali ha ime otú ahụ?
15 “Jehova dị mma n’ebe ihe nile e kere eke dị” ọbụna n’ebe ndị na-enweghị ekele maka ihe ọ na-emere ha nọ. (Abụ Ọma 145:9; Matiu 5:45) Ịdị mma Jehova pụtara ìhè ná nzipụ o zipụrụ ndị ya ka ha gaa kwusaa “ozi ọma nke a nke alaeze.” (Matiu 24:14) Ndị ọzụzụ atụrụ na-eṅomi ịdị mma Chineke site n’ibute ụzọ n’ọrụ nkwusa a. Gịnị na-akpali ha itinye mgbalị siri ike otú a? Ọ bụ okwukwe siri ike ha nwere n’ebe Jehova nọ nakwa ná nkwa ya.—Ndị Rom 10:10, 13, 14.
16. Olee otú ndị ọzụzụ atụrụ pụrụ isi ‘na-eme ihe ọma’ n’ebe atụrụ ahụ nọ?
16 Tụkwasị ‘n’ime ihe ọma n’ebe mmadụ nile Ndị Galeshia 6:10) Otu ụzọ ha si eme nke a bụ site n’ịga nleta ọzụzụ atụrụ ma gbaa ndị ha letara ume. Otu okenye na-ekwu, sị: “Ọ na-amasị m ime nleta ọzụzụ atụrụ. Ọ na-enye m ohere ịja ụmụnna mma maka mgbalị ndị ha na-eme ma nyere ha aka ịghọta na e ji ọrụ ha na-arụsi ike kpọrọ ihe.” Mgbe ụfọdụ, ndị ọzụzụ atụrụ pụrụ ịtụrụ mmadụ aro otú ọ pụrụ isi mee ka ozi ọ na-ejere Jehova kakwuo mma. Ndị ọzụzụ atụrụ maara ihe na-eṅomi Pọl onyeozi mgbe ha na-eme nke a. Lee otú o si ruo n’obi ụmụnna ndị nọ na Tesalonaịka: “Anyị nwere obi ike n’Onyenwe anyị n’ihe banyere unu, na unu na-eme ma bụrụ ndị ga-anọgide na-eme ihe ndị anyị na-enye n’iwu.” (2 Ndị Tesalonaịka 3:4) Okwu ndị dị otú a nke na-egosi na ha nwere obi ike n’ebe atụrụ ahụ nọ na-akpali atụrụ ahụ ime ezi ihe ma na-eme ka ọ dịkwuoro atụrụ ahụ mfe ‘irubere ndị na-edu ndu isi.’ (Ndị Hibru 13:17) Mgbe ndị okenye letara gị ma gbaa gị nnọọ ume, ọ̀ gaghị adị mma ma i kelee ha maka ịbịa leta gị?
nọ’ site n’ime nkwusa, ndị ọzụzụ atụrụ nwekwara ibu ọrụ nke ime ihe ọma “karịsịa n’ebe ndị ezinụlọ nke okwukwe [ha] nọ.” (Njide Onwe Onye Dị Mkpa Iji Bụrụ Onye Dị Nwayọọ
17. Gịnị ka Pita mụtara site n’aka Jizọs?
17 Jizọs dị nwayọọ, ọbụna mgbe a kpasuru ya iwe. (Matiu 11:29) Mgbe a raara ya nye n’aka ndị iro ya, ha anwụdekwa ya, Jizọs gosipụtara mmụọ nke ịdị nwayọọ na njide onwe onye. Pita mịpụtara mma agha ya n’echeghị eche ma gbachitere Jizọs. Ma Jizọs chetaara ya, sị: “Ì chere na mụ apụghị ịrịọ Nna m ka o zitere m ugbu a ihe karịrị ìgwè ndị mmụọ ozi iri na abụọ?” (Matiu 26:51-53; Jọn 18:10) Pita mụtara ezigbo ihe na nke a, o mesịkwara chetara Ndị Kraịst, sị: “Kraịst taara unu ahụhụ, na-ahapụrụ unu ihe nlereanya ka unu wee gbasochie nzọụkwụ ya anya. . . . Mgbe a na-ekwujọ ya, ọ dịghị ekwujọgwara. Mgbe ọ na-ata ahụhụ, ọ nọghị na-eyi egwu.”—1 Pita 2:21-23.
18, 19. (a) Olee mgbe karịsịa ka ndị ọzụzụ atụrụ na-aghaghị igosipụta mmụọ dị nwayọọ na njide onwe onye? (b) Olee ajụjụ ndị anyị ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?
18 N’ụzọ yiri nke ahụ, ọ bụrụ na ndị ọzụzụ atụrụ chọrọ ime nke ọma n’ọrụ ha, ha aghaghị inwe obi dị nwayọọ ọbụna mgbe e mesoro ha ihe n’ụzọ na-ezighị ezi. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ ndị ha na-agbalị inyere aka pụrụ ịkpọ ekwo nkụ. Ọ bụrụ na onye ahụ a chọrọ inyere aka na-arịa ọrịa n’ụzọ ime mmụọ, ọ pụrụ ‘ikwu okwu n’echeghị eche dị ka ndụpu nke mma agha’ mgbe e nyere ya ndụmọdụ. (Ilu 12:18) Otú ọ dị, dị ka Jizọs, ndị ọzụzụ atụrụ adịghị agwagwara onye ahụ okwu ọjọọ, ma ọ bụkwanụ megwara ihe o mere ha. Kama nke ahụ, ha na-ejide onwe ha ma gosikwa onye ahụ na ọnọdụ ya na-emetụ ha n’obi. Nke a pụrụ ịbụ ngọzi nye onye ahụ enyemaka dị mkpa. (1 Pita 3:8, 9) Ị̀ na-amụta ihe site n’ihe nlereanya nke ndị okenye ma gosipụta mmụọ nke ịdị nwayọọ na njide onwe onye mgbe e nyere gị ndụmọdụ?
19 Ihe ịrụ ụka adịghị ya na Jehova na Jizọs nwere ekele maka otú ndị ọzụzụ atụrụ si na-arụsi ọrụ ike na otú ha si jiri obi ha dum na-elekọta ìgwè atụrụ Jehova n’ụwa nile. Jehova na Ọkpara ya nwekwara ịhụnanya miri emi n’ahụ́ ọtụtụ puku ndị ohu na-eje ozi bụ́ ndị na-akwado ndị okenye ‘n’ijere ndị nsọ ozi.’ (Ndị Hibru 6:10) Gịnịzi mere ụfọdụ ụmụnna nwoke meworo baptizim ji ala azụ iru eru maka “ọrụ ọma” a? (1 Timoti 3:1) Oleekwa otú Jehova si enye ndị ọ họpụtara dị ka ndị ọzụzụ atụrụ ọzụzụ? Anyị ga-atụle ajụjụ ndị a n’isiokwu na-esonụ.
Ì Chetara?
• Olee ụfọdụ ụzọ ndị ọzụzụ atụrụ si egosi ịhụnanya n’ebe ìgwè atụrụ Jehova nọ?
• Olee otú mmadụ nile nọ n’ọgbakọ pụrụ isi mee ka ọṅụ na udo dịgide n’ọgbakọ?
• Olee ihe mere ndị ọzụzụ atụrụ ji kwesị inwe ogologo ntachi obi ma dị obiọma mgbe ha na-enye ndụmọdụ?
• Olee otú ndị okenye si egosipụta ịdị mma na okwukwe?
[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]
[Foto dị na peeji nke 18]
Ọ bụ ịhụnanya na-akpali ndị okenye ijere ọgbakọ ozi
[Foto ndị dị na peeji nke 18]
Ha na-ewepụtakwa oge iji soro ezinụlọ ha na-enwekọ ntụrụndụ ọnụ . . .
. . . ma na-ejekọ ozi ọnụ
[Foto dị na peeji nke 20]
Ndị okenye na ibe ha ikwurịta okwu nke ọma na-eme ka ọṅụ na udo dịgide n’ọgbakọ