Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Dị Njikere Ịlanahụ?

Ị̀ Dị Njikere Ịlanahụ?

Ị̀ Dị Njikere Ịlanahụ?

“Baa n’ụgbọ ahụ, gị onwe gị na ụlọ gị nile; n’ihi na gị ka M hụworo bụ́ onye ezi omume n’ihu m n’ọgbọ a.”—JENESIS 7:1.

1. Gịnị bụ ndokwa Jehova mere maka ịlanahụ iju mmiri nke oge Noa?

N’OGE Noa, Jehova “wetara iju mmiri n’elu ụwa nke ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke,” ma O mekwara ndokwa otú a ga-esi lanahụ mbibi ahụ. (2 Pita 2:5) Ezi Chineke ahụ nyere Noa bụ́ onye ezi omume ntụziaka doro anya banyere otú ọ ga-esi wuo ụgbọ iji chebe ndụ ndị ga-alanahụ iju mmiri ga-ezu ụwa ọnụ. (Jenesis 6:14-16) Dị ka anyị ga-atụ anya ka ohu Jehova ọ bụla kwesịrị ntụkwasị obi mee, “Noa wee mee ya; dị ka iwu nile si dị nke Chineke nyere ya.” N’ezie, “otú a ka o mere.” Isi Noa rubere so n’ihe mere anyị ji dịrị ndụ taa.—Jenesis 6:22.

2, 3. (a) Olee ihe ndị ha na Noa dịkọrọ ndụ mere mgbe ha hụrụ ọrụ ọ na-arụ? (b) Olee ihe kara Noa obi o ji baa n’ụgbọ ahụ?

2 Iwu ụgbọ ahụ abụghị obere ọrụ. O yiri nnọọ ka ihe Noa na ezinụlọ ya na-arụzu ò juru ọtụtụ mmadụ anya. Ma, nke ahụ emeghị ka ha kwere na ha aghaghị ịbanye n’ụgbọ ahụ ka e wee zọpụta ha. N’ikpeazụ, Chineke bibiri ụwa ajọ omume ahụ.—Jenesis 6:3; 1 Pita 3:20.

3 Mgbe Noa na ezinụlọ ya rụsichara ọrụ ike ruo ọtụtụ iri afọ, Jehova gwara ya, sị: “Baa n’ụgbọ ahụ, gị onwe gị na ụlọ gị nile; n’ihi na gị ka M hụworo bụ́ onye ezi omume n’ihu m n’ọgbọ a.” N’ihi okwukwe na obi ike Noa nwere n’okwu Jehova, ‘Noa wee baa n’ụgbọ ahụ, ya na ụmụ ya ndị ikom na nwunye ya na nwunye nile nke ụmụ ya ndị ikom.’ Jehova mechiri ụgbọ ahụ iji chebe ndị na-efe ya ofufe. Mgbe Iju Mmiri ahụ rikpuru ụwa, ọ bụ ụgbọ ahụ Chineke sịrị ka e wuo ka e ji zọpụta ndị mmadụ.—Jenesis 7:1, 7, 10, 16.

Ihe Ndị Na-eme n’Oge A Yiri Ihe Ndị Mere n’Oge Noa

4, 5. (a) Olee ihe Jizọs ji tụnyere oge ọnụnọ ya? (b) Olee ihe ndị na-eme n’oge a yiri ihe ndị mere n’oge Noa?

4 “Dị nnọọ ka ụbọchị Noa dịrị, otú ahụ ka ọnụnọ Nwa nke mmadụ ga-adị.” (Matiu 24:37) Jizọs ji okwu ndị a gosi na oge ọnụnọ ya a na-agaghị ahụ anya ga-eyi ụbọchị Noa, nke ahụ emezuwokwa nnọọ. Karịsịa kemgbe afọ 1919, a nọwo na-ekwusara ndị nke mba nile ozi ịdọ aka ná ntị yiri nke Noa kwusara. Ọnụ ọgụgụ ka ukwuu ná ndị mmadụ na-ele ozi anyị anya otú ndị biri n’oge Noa si lee nke ya anya.

5 Jehova ji Iju Mmiri ahụ bibie ụwa nke “jupụtara n’ihe ike.” (Jenesis 6:13) Ndị nile hụrụ Noa na ezinụlọ ya maara nke ọma na ha esoghị na-eme ihe ike ndị dị otú ahụ, kama na ha legidere anya n’iwu ụgbọ ahụ. Anyị na-ahụkwa ihe yiri nke ahụ n’oge anyị a. Ugbu a, ndị nwere obi eziokwu pụrụ ‘ịhụ ihe dị iche n’etiti onye ezi omume na onye na-emebi iwu, n’etiti onye na-efe Chineke na onye na-adịghị efe Ya.’ (Malakaị 3:18) Ndị obi ha dị ọcha nọ n’ụwa na-enwe mmasị n’ebe Ndịàmà Jehova nọ n’ihi ime ihe n’eziokwu ha, obiọma ha, ịdị n’udo ha, na ịdị uchu ha, àgwà ndị a na-emekwa ka Ndịàmà dị iche n’ebe ndị ụwa nọ. Ndịàmà adịghị etinye aka n’ụdị ime ihe ike ọ bụla, ha na-ekwekwa ka mmụọ Jehova na-eduzi ha. Ọ bụ ya mere ha ji dịrị n’udo ma na-eme ezi omume.—Aịsaịa 60:17.

6, 7. (a) Olee ihe ndị bi n’oge Noa na-aghọtaghị, oleekwa otú ndị nke oge a si yie ndị nke oge ahụ? (b) Olee ihe atụ ndị na-egosi na a ma Ndịàmà Jehova ama ebe nile dị ka ndị dị iche?

6 Ndị ha na Noa dịkọrọ ndụ aghọtaghị na Chineke kwadoro ya, ha aghọtaghịkwa na ihe ọ na-eme bụ ihe Chineke gwara ya mee. N’ihi ya, ha ejighị ozi ịdọ aka ná ntị ọ na-ekwusa kpọrọ ihe, ọ dịghịkwa ihe ha ji ya mee. Gịnị banyere ndị nke oge a? Ọ bụ ezie na ọtụtụ nwere mmasị n’ọrụ Ndịàmà Jehova na-arụ na n’àgwà ha, ihe ka ọtụtụ adịghị eji ozi ọma ha na-ekwusa na ozi ịdọ aka ná ntị Bible akpọrọ ihe. Ndị ha na ezi Ndị Kraịst gbara agbata obi, ndị were ha n’ọrụ, ma ọ bụ ndị ikwu ha nwere ike ịja ha nnọọ mma n’ihi ezi àgwà ha ma kwaa arịrị, sị, “A sịtụ nnọọ na ha abụghị Ndịàmà Jehova!” Ma, ihe ndị a na-aghọtaghị bụ na ihe mere Ndịàmà ji na-egosipụta àgwà ndị dị ka ịhụnanya, udo, obiọma, ịdị nwayọọ, na njide onwe onye bụ n’ihi na mmụọ nsọ Chineke na-eduzi ha. (Ndị Galeshia 5:22-25) Nke a kwesịrị ime ka ndị mmadụ na-ege ntị n’ozi ha.

7 Dị ka ihe atụ, na Russia, Ndịàmà Jehova nọ na-ewu otu Ụlọ Nzukọ Alaeze. Otu nwoke nke kwụsịrị ebe ahụ ịgwa otu n’ime ndị na-arụ ọrụ ebe ahụ okwu, kwuru, sị: “Ahụtụbeghị m ụdị ndị ọrụ a—o nweghị onye na-ese siga, o nweghị onye na-akpọ ibe ya iyi, onye ọ bụla jikwa ọrụ ya kpọrọ ihe! Ewela iwe, ị̀ bụ Onyeàmà Jehova?” Onye ọrụ ahụ jụrụ ya, sị, “Ọ bụrụ na m gwa gị na mụ abụghị, ị̀ ga-ekwe?” Nwoke ahụ zara ozugbo, sị, “Agaghị m ekwetecha.” N’otu obodo ọzọ dị na Russia, obi tọrọ onyeisi obodo ahụ ụtọ nke ukwuu mgbe ọ hụrụ Ndịàmà ka ha na-ewu Ụlọ Nzukọ Alaeze ọhụrụ ha. O kwuru na ọ bụ ezie na ya leburu òtù okpukpe nile anya na ha bụ otu, ma mgbe ya hụsịrị obi ọcha na achọghị ọdịmma onwe onye Ndịàmà Jehova na-egosi, ya gbanwere echiche ya. Ihe ndị a bụ nanị ihe atụ abụọ na-egosi na ndị Jehova dị iche n’ebe ndị na-adịghị agbaso ụkpụrụ Bible nọ.

8. Gịnị ka anyị na-aghaghị ime ma ọ bụrụ na anyị ga-alanahụ ọgwụgwụ nke ajọ ụwa a?

8 N’ọgwụgwụ nke “ụwa ochie” ahụ, bụ́ nke e ji Iju Mmiri laa n’iyi, Noa ji ikwesị ntụkwasị obi rụọ ọrụ dị ka “onye na-ekwusa ezi omume.” (2 Pita 2:5) N’ụbọchị ikpeazụ nke usoro ihe dị ugbu a, ndị Jehova na-akpọsa ụkpụrụ ezi omume Chineke, na-ekwusakwa ozi ọma iji gwa ndị mmadụ na ha nwere ike ịlanahụ mbibi ma banye n’ime ụwa ọhụrụ. (2 Pita 3:9-13) Dị nnọọ ka e ji ụgbọ ahụ chebe Noa na ndị ezinụlọ ya bụ́ ndị na-atụ egwu Chineke, a ga-echebekwa ndị mmadụ taa nanị ma ọ bụrụ na ha enwee okwukwe ma jiri ikwesị ntụkwasị obi na-eso akụkụ nzukọ Jehova nke dị n’elu ala na-akpachi anya.

Okwukwe Dị Anyị Mkpa Iji Lanahụ

9, 10. N’ihi gịnị ka okwukwe ji dị anyị mkpa ma ọ bụrụ na anyị ga-alanahụ ọgwụgwụ nke usoro ihe Setan?

9 Gịnị ka mmadụ na-aghaghị ime iji lanahụ mbibi a gaje ibibi ụwa a nọ n’ike aka Setan n’isi nso? (1 Jọn 5:19) Onye ahụ aghaghị ịghọta na nchebe dị ya mkpa. Ọ ghaghịzi ime ihe iji nweta nchebe dị otú ahụ. Ndị oge Noa nọ na-arụ ọrụ ndị dịịrị ha kwa ụbọchị otú ha na-arụbu, ha aghọtaghịkwa na nchebe dị ha mkpa iji lanahụ mbibi a gaje ibibi ụwa. Ọ dị ihe ọzọ ha na-enweghị—okwukwe n’ebe Chineke nọ.

10 N’aka nke ọzọ, Noa na ezinụlọ ya ghọtara na nchebe na nzọpụta dị ha mkpa. Ha nwekwara okwukwe n’Eze Eluigwe na Ala, bụ́ Jehova Chineke. Pọl onyeozi dere, sị: “Ma okwukwe adịghị ọ gaghị ekwe omume ime ihe dị [Jehova] ezi mma, n’ihi na onye na-abịaru Chineke nso aghaghị ikwere na ọ dị adị, nakwa na ọ bụ onye na-akwụghachi ndị na-achọsi ya ike ụgwọ ọrụ.” Pọl kwukwara, sị: “Site n’okwukwe, Noa, mgbe e nyesịrị ya ịdọ aka ná ntị Chineke banyere ihe ndị a na-ahụbeghị anya, gosiri egwu Chineke ma wuo ụgbọ maka ịzọpụta ezinụlọ ya; sitekwa n’okwukwe a, ọ mara ụwa ikpe, o wee ghọọ onye nketa nke ezi omume ahụ nke dị dị ka okwukwe si dị.”—Ndị Hibru 11:6, 7.

11. Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta n’otú Jehova si chebe ndị mmadụ n’oge ndị gara aga?

11 Iji lanahụ ọgwụgwụ nke ajọ usoro ihe a, anyị aghaghị ime ihe karịrị nanị ikweta na a ga-ebibi ya. Anyị aghaghị igosipụta okwukwe, jiri ndokwa ndị Chineke mere maka nlanahụ na-eme ihe n’ụzọ zuru ezu. N’ezie, ọ dị anyị mkpa igosipụta okwukwe n’àjà mgbapụta nke Ọkpara Chineke, bụ́ Jizọs Kraịst. (Jọn 3:16, 36) Ma, anyị kwesịrị icheta na ndị lanahụrụ Iju Mmiri ahụ bụ nanị ndị nọ nnọọ n’ime ụgbọ ahụ Noa wuru. N’ụzọ yiri nke ahụ, obodo mgbaba ndị dị n’Izrel oge ochie chebere onye gburu mmadụ n’amaghị ama nanị ma ọ gbaba n’ime ya ma nọrọ ebe ahụ ruo mgbe onyeisi nchụàjà nwụrụ. (Ọnụ Ọgụgụ 35:11-32) N’ihe otiti nke iri e tiri ndị Ijipt n’oge Mozis, e gburu ụmụ ndị Ijipt e buru ụzọ mụọ, ma chebe nke ndị Izrel. N’ihi gịnị? Jehova eburula ụzọ nye Mozis iwu, sị: “Ha [ụmụ Izrel] ga-ewere ụfọdụ n’ime ọbara ya [nwa atụrụ e ji eme Ememe Ngabiga ahụ], tinyekwasị ya n’awara ụzọ abụọ na n’ohiere ụzọ n’ụlọ nile nke ha ga-eri ya n’ime ha. . . . Unu onwe unu agaghị apụkwa, onye ọ bụla n’ọnụ ụzọ ụlọ ya, ruo ụtụtụ.” (Ọpụpụ 12:7, 22) Olee nwa mbụ n’etiti ndị Izrel ga-anwa anwa leghara iwu ahụ Chineke nyere anya ma si n’ụlọ e tere ọbara n’awara ụzọ na n’ohiere ụzọ ya pụọ?

12. Olee ajụjụ onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịjụ onwe ya, n’ihi gịnịkwa?

12 N’ihi ya, anyị nwere ihe mere anyị kwesịrị iji chebara nnọọ ọnọdụ anyị echiche. Ànyị ji ndokwa Jehova mere maka ichebe anyị n’ụzọ ime mmụọ na-eme ihe n’ezie? Mgbe oké mkpagbu ahụ malitere, anya mmiri nke ọṅụ na ekele ga-agba ndị nile ji ndokwa dị otú ahụ mee ihe. Anya mmiri nke iru újú na nke ịkwa mmakwaara ga-agba ndị na-ejighị ya mee ihe.

Mgbanwe Ndị E Ji Nwayọọ Nwayọọ Na-eme Na-akwadebe Anyị

13. (a) Olee uru mgbanwe ndị e merela ná nzukọ a bara? (b) Kọwaa ihe ụfọdụ e jirila nwayọọ nwayọọ meziwanye.

13 Jehova emeela ka e jiri nwayọọ nwayọọ gbanwee ihe ụfọdụ n’akụkụ nzukọ ya nke dị n’elu ala. Mgbanwe ndị a emewo ka ndokwa o mere maka ichebe anyị n’ụzọ ime mmụọ ka mma ma kwụsikwuo ike. Malite n’afọ ndị 1870 ruo n’afọ 1932, ọgbakọ na-eji ntụliaka ahọpụta ndị okenye na ndị dikọn. N’afọ 1932, e ji kọmitii ije ozi bụ́ nke ọgbakọ ji ntụliaka họpụta iji nyere onye nduzi ije ozi a họpụtara ahọpụta aka, dochie ndị okenye ahụ e ji ntụliaka họpụta. N’afọ 1938, a malitere ịhọpụta ndị nile na-eje ozi n’ọgbakọ n’ụzọ kwekọrọ n’Akwụkwọ Nsọ. Kemgbe afọ 1972, Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova na-ahụ na a tụrụ aro ndị a ga-ahọpụta, ọ bụrụkwa na a kwado ha, ọgbakọ enweta akwụkwọ ozi na-egosi ndị a họpụtara n’ụzọ kwekọrọ n’Akwụkwọ Nsọ ije ozi dị ka ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi. Kemgbe ọtụtụ afọ, ọrụ Òtù Na-achị Isi na-arụ amụbaala, a gbanwewokwa ihe ụfọdụ iji mee ka ọrụ ha dịkwuo mfe.

14. Olee ọzụzụ a malitere n’afọ 1959?

14 N’afọ 1950, mgbe e jisịrị nlezianya tụlee Abụ Ọma 45:16, a haziri otú a ga-esi na-azụ ndị mmadụ. Amaokwu ahụ na-ekwu, sị: “Ụmụ gị ga-anọchi anya nna gị hà, ị ga-edo ha ndị isi n’ụwa nile.” A na-azụ ndị okenye na-edu ndú n’ọgbakọ ugbu a inwe ike ịrụ ọrụ ọgbakọ ha ugbu a na ịrụ ọrụ Chineke ga-enye ha mgbe Amagedọn gasịrị. (Mkpughe 16:14, 16) A malitere Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Alaeze n’afọ 1959. N’oge ahụ, ọ na-abụkarị ihe ọmụmụ otu ọnwa maka ndị ohu ọgbakọ, bụ́ ihe a na-akpọ ndị isi oche ndị nlekọta n’oge ahụ. Ugbu a, ụlọ akwụkwọ a bụzi maka ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi nile. Mgbe e mesịrị, ụmụnna ndị a na-ebute ụzọ n’ịzụ ndị nọ n’ọgbakọ ha dị iche iche. N’ụzọ dị otú ahụ, a na-enyere mmadụ nile aka n’ụzọ ime mmụọ, na-enyekwara ha aka ịdịkwu irè n’ozi ha dị ka ndị nkwusa nke ozi ọma Alaeze.—Mak 13:10.

15. Olee ụzọ abụọ e si na-edebe ọgbakọ Ndị Kraịst ọcha?

15 Ndị chọrọ ịbata n’ọgbakọ Ndị Kraịst aghaghị iru ihe ụfọdụ a chọrọ ha n’aka. N’ụzọ dị otú ahụ, a naghị anabata ndị ọkwa emo nke oge a n’ọgbakọ, dị nnọọ ka a na-ekweghị ka ndị dị otú ahụ banye n’ụgbọ Noa. (2 Pita 3:3-7) Karịsịa kemgbe afọ 1952, Ndịàmà Jehova anọwo na-akwadokwu ndokwa nke na-echebe ọgbakọ—nke bụ́, ịchụpụ ndị mmehie na-enweghị nchegharị. Otú ọ dị, a na-eji ịhụnanya enyere ndị mmehie chegharịrị site n’obi ha aka ‘imere ụkwụ ha ụzọ kwụ ọtọ.’—Ndị Hibru 12:12, 13; Ilu 28:13; Ndị Galeshia 6:1.

16. Olee ọnọdụ ndị Jehova nọ na ya n’ụzọ ime mmụọ?

16 Ọ naghị eju anyị anya na ndị Jehova na-enwe ọganihu n’ụzọ ime mmụọ, ọ bụghịkwa ihe mere ná ndaba. Jehova kwuru site n’ọnụ Aịzaịa onye amụma, sị: “Lee, ndị ohu m ga-eri ihe, ma agụụ ga-agụ unu onwe unu: lee, ndị ohu m ga-aṅụ ihe ọṅụṅụ, ma akpịrị ga-akpọ unu onwe unu nkụ: lee, ndị ohu m ga-aṅụrị ọṅụ, ma ihere ga-eme unu onwe unu: lee, ndị ohu m ga-eti mkpu ọṅụ site n’obi dị mma, ma unu onwe unu ga-eti mkpu site n’ihe mgbu nke obi, unu ga-esitekwa ná ntiwa nke mmụọ unu kwasie ákwá ike.” (Aịsaịa 65:13, 14) Jehova anọgidewo na-enye anyị ụbara nri ime mmụọ na-edozi ahụ́ na-abịa n’oge ya bụ́ nke na-eme ka anyị dị ike n’ụzọ ime mmụọ.—Matiu 24:45.

Jikere Ịlanahụ

17. Olee ihe ga-enyere anyị aka ijikere ịlanahụ ọgwụgwụ nke usoro ihe a?

17 Ọ dịtụbeghị mgbe ọ dị mkpa otú ọ dị ugbu a anyị ịdị ‘na-echebara ibe anyị echiche iji kpalie inwe ịhụnanya na ịrụ ezi ọrụ, ghara ịdị na-ahapụ nzukọ nke anyị onwe anyị, dị ka ọ bụ omenala ụfọdụ ndị, kama na-agbarịta ibe anyị ume.’ (Ndị Hibru 10:23-25) Iso otu n’ime puku ọgbakọ iri itoolu na asatọ nke Ndịàmà Jehova na-akpachi anya na ịrụsi ọrụ ike na ya ga-enyere anyị aka ịkwadebe ịlanahụ. Ndị kwere ekwe ibe anyị ga na-akwado anyị ka anyị na-agbalịsi ike igosipụta “ụdị mmadụ ọhụrụ ahụ” ma jiri obi anyị nile na-etinyesi mgbalị ike n’inyere ndị ọzọ aka ịmata ndokwa Jehova mere maka nzọpụta.—Ndị Efesọs 4:22-24; Ndị Kọlọsi 3:9, 10; 1 Timoti 4:16.

18. Gịnị mere i ji kpebisie ike gị na ọgbakọ Ndị Kraịst ịnọgide na-akpachi anya?

18 Ọ na-agụsi nnọọ Setan na ajọ ụwa ya agụụ ike iji aghụghọ kpọpụ anyị n’ọgbakọ Ndị Kraịst. Otú ọ dị, anyị pụrụ ịnọgide n’ọgbakọ ma nwee ike ịlanahụ ọgwụgwụ nke ajọ usoro ihe dị ugbu a. Ka ịhụnanya anyị nwere n’ebe Jehova nọ nakwa ekele anyị nwere maka ndokwa ya kpalie anyị ikpebisikwu ike ugbu a karịa mgbe ọ bụla ọzọ ime ka mgbalị nile Setan na-eme kụọ afọ n’ala. Ịtụgharị uche ná ngọzi ndị anyị na-enweta ugbu a ga-eme ka mkpebi anyị mere sikwuo ike. A ga-atụle ụfọdụ n’ime ngọzi ndị a n’isiokwu na-esonụ.

Gịnị Ka Ị Ga-aza?

• Olee otú oge anyị si yie oge Noa?

• Olee àgwà dị mkpa a chọrọ anyị n’aka iji lanahụ mbibi?

• Olee mgbanwe ndị Jehova jiworo nwayọọ nwayọọ mee bụ́ ndị meworo ka ndokwa o mere maka anyị ịlanahụ mbibi sikwuo ike?

• Olee otú anyị ga-esi kwadebe n’otu n’otu ịlanahụ mbibi?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 22]

Ndị ha na Noa dịkọrọ ndụ ejighị okwu ya kpọrọ ihe

[Foto dị na peeji nke 23]

Ọ bara uru iji okwu ịdọ aka ná ntị nke Chineke kpọrọ ihe

[Foto dị na peeji nke 24]

Olee ọrụ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Alaeze na-arụ?

[Foto dị na peeji nke 25]

Ugbu a bụ oge anyị kwesịrị iso ọgbakọ Ndị Kraịst na-akpachi anya