Ì Nwere “Nkwuwa Okwu”?
Ì Nwere “Nkwuwa Okwu”?
IHE karịrị nde mmadụ isii bi na narị ala abụọ na iri atọ na ise nwere ihe Bible na-akpọ “nkwuwa okwu.” Okwu Bekee a sụgharịrị ịbụ “nkwuwa okwu” pụtara ugboro 16 n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst nke New World Translation of the Holy Scriptures. (Ndị Filipaị 1:20; 1 Timoti 3:13; Ndị Hibru 3:6; 1 Jọn 3:21) Gịnị ka “nkwuwa okwu” pụtara? Olee ihe na-enyere anyị aka inweta ya? N’ọnọdụ ndị dị aṅaa ka nnwere onwe a na-enyere anyị aka ikwu okwu n’enweghị ihe mgbochi?
Dị ka akwụkwọ ọkọwa okwu bụ́ Vine’s Expository Dictionary of Old and New Testament Words si kwuo, okwu Grik e ji mee ihe maka okwu ahụ bụ́ “nkwuwa okwu” pụtara “nnwere onwe ikwu okwu, mmadụ ikwupụta echiche ya, . . . ikwu okwu n’atụghị egwu; n’ihi ya, ọ pụtakwara inwe obi ike, inwe ihu ọchị na ịka obi, inwe anyaike, nke na-enwechaghị ihe jikọtara ya na ikwu okwu.” Otú ọ dị, inwe nkwuwa okwu dị otú ahụ na inwe ọnụ ọjọọ ma ọ bụ ịkparị mmadụ abụghị otu ihe. Bible kwuru, sị: “Kwenụ ka okwu unu dịrị n’amara mgbe nile.” (Ndị Kọlọsi 4:6) Nkwuwa okwu na-agụnye ịdị akọ ma ghara ikwe ka ọnọdụ ndị na-eweta obi erughị ala ma ọ bụ egwu mmadụ gbochie anyị ikwu okwu.
Ànyị bu nkwuwa okwu pụta ụwa? Tụlee ihe Pọl onyeozi degaara Ndị Kraịst nọ n’Efesọs. O kwuru, sị: “Ọ bụ m, bụ́ onye dị ala karịa onye kasị nta n’ime ndị nsọ nile, ka e nyere obiọma a na-erughịrị mmadụ, ka m wee kpọsaara ndị mba ọzọ ozi ọma banyere akụ̀ Kraịst ndị a na-apụghị ịghọta aghọta.” Pọl kwukwara na ọ bụ Jizọs Kraịst ka “anyị sitere n’aka ya nwee nkwuwa okwu a ma jiri obi ike bịaruo nso site n’okwukwe anyị n’ebe ọ nọ.” (Ndị Efesọs 3:8-12) Inwe nkwuwa okwu abụghị ihe anyị bu pụta ụwa, kama nke ahụ, ọ bụ ihe anyị na-enweta site ná mmekọrịta anyị na Jehova Chineke bụ́ nke dabeere n’okwukwe anyị nwere na Jizọs Kraịst. Ka anyị hụ ihe nwere ike inyere anyị aka inwe nkwuwa okwu na otú anyị pụrụ isi gosipụta ya mgbe anyị na-ekwusa ozi ọma, mgbe anyị na-ezi ihe, na mgbe anyị na-ekpe ekpere.
Gịnị Na-enyere Anyị Aka Iji Nkwuwa Okwu Ekwusa Ozi Ọma?
Ọ bụ Jizọs Kraịst kasị setịpụ ihe nlereanya n’inwe nkwuwa okwu. Ịnụ ọkụ n’obi ya mere ka o jiri ohere ọ bụla o nwere kwusaa ozi ọma. Ma ọ̀ na-ezu ike, na-eri nri n’ụlọ mmadụ, ma ọ bụ na-aga n’okporo ụzọ, ọ na-eji ohere ọ bụla o nwere agwa ndị mmadụ banyere Alaeze Chineke. Ịkwa emo ma ọ bụ mmegide kpụ ọkụ Matiu 23:13-36) Ọbụna mgbe e jidere Jizọs ma na-ekpe ya ikpe, o kwuru okwu n’atụghị egwu.—Jọn 18:6, 19, 20, 37.
n’ọnụ emeghị ka Jizọs mechie ọnụ ya. Kama nke ahụ, o ji obi ike gbaa ndị ndú okpukpe ụgha nke oge ya n’anwụ. (Ụmụazụ Jizọs nwekwara otu nkwuwa okwu ahụ. Na Pentikọst 33 O.A., Pita ji nkwuwa okwu gwa otu ìgwè karịrị puku mmadụ atọ okwu. Ọ bụ ihe dị ịrịba ama na obere oge tupu mgbe ahụ, ụjọ jidere ya mgbe otu nwa agbọghọ kwuru na ya maara ya. (Mak 14:66-71; Ọrụ 2:14, 29, 41) Mgbe a kpụpụrụ Pita na Jọn n’ihu ndị ndú okpukpe, ha atụghị egwu. N’egbughị oge, ha ji nkwuwa okwu gbaa àmà banyere Jizọs Kraịst ahụ a kpọlitere n’ọnwụ. N’ezie, ọ bụ nkwuwa okwu a Pita na Jọn nwere mere ka ndị ndú okpukpe mata na ha na Jizọs nọbu. (Ọrụ 4:5-13) Gịnị mere ha ji nwee nkwuwa okwu otú ahụ?
Jizọs kwere ụmụazụ ya nkwa, sị: “Mgbe ha na-enyefe unu, unu echegbula onwe unu banyere otú unu ga-esi ekwu okwu ma ọ bụ ihe unu ga-ekwu; n’ihi na a ga-enye unu ihe unu gaje ikwu n’oge awa ahụ; n’ihi na ọ bụghị unu onwe unu na-ekwu okwu, kama ọ bụ mmụọ nke Nna unu si n’ọnụ unu na-ekwu okwu.” (Matiu 10:19, 20) Mmụọ nsọ nyeere Pita na ndị ọzọ aka imeri ihere ma ọ bụ egwu nke gaara egbochi ha inwe nkwuwa okwu. Ike ahụ dị ukwuu pụkwara inyere anyị aka.
Ọzọkwa, ọ bụ Jizọs nyere ụmụazụ ya ọrụ ime ndị na-eso ụzọ. Nke a kwesịrị ekwesị, ebe ọ bụ Ya ka e nyere “ikike nile n’eluigwe na n’elu ụwa.” ‘Ọ nọnyekwaara ha.’ (Matiu 28:18-20) Ebe ndị mbụ ahụ soro ụzọ Jizọs maara na mmụọ nsọ na Jizọs na-akwado ha, obi siri ha ike ka ha na-edi mkpagbu nke ndị ọchịchị bụ́ ndị kpebisiri ike igbochi ọrụ nkwusa ha. (Ọrụ 4:18-20; 5:28, 29) Ịmata na anyị nwere ụdị nkwado ahụ pụkwara ime ka obi sie anyị ike.
Mgbe Pọl na-egosi ihe ọzọ ga-eme ka anyị na-enwe nkwuwa okwu, o jikọtara olileanya na “nkwuwa okwu dị ukwuu.” (2 Ndị Kọrint 3:12; Ndị Filipaị 1:20) Ebe ozi olileanya ahụ masịrị Ndị Kraịst nke ukwuu, ọ dịghị otú ha ga-esi hapụ ịkọrọ ya ndị ọzọ. N’ezie, olileanya kwesịrị ime ka anyị nwee nkwuwa okwu.—Ndị Hibru 3:6.
Iji Nkwuwa Okwu Na-ekwusa Ozi Ọma
Olee otú anyị pụrụ isi jiri nkwuwa okwu na-ekwusa ozi ọma mgbe e nwere ọnọdụ ndị na-eyi egwu? Tụlee ihe atụ Pọl onyeozi. Mgbe ọ nọ mkpọrọ na Rom, ọ gwara ndị kwere ekwe ibe ya ka ha na-ekpe ekpere ka ‘e wee nye ya ike ikwu okwu ma ya meghee ọnụ ya, ka ya wee na-ekwu okwu n’atụghị egwu dị ka ya kwesịrị ikwu.’ (Ndị Efesọs 6:19, 20) À zara ekpere ndị ahụ? Ee! Ka Pọl nọ n’ụlọ mkpọrọ, ọ nọgidere ‘na-ekwusa alaeze Chineke, jirikwa nkwuwa okwu kasị ukwuu na-ekwu okwu n’enweghị ihe mgbochi.’—Ọrụ 28:30, 31.
Iji ohere ndị dapụtaara anyị n’ebe ọrụ, n’ụlọ akwụkwọ, ma ọ bụ mgbe anyị na-eme njem na-agba àmà pụrụ itinye nkwuwa okwu anyị n’ule. Ihere, ụjọ maka otú ndị ọzọ pụrụ isi meghachi omume, ma ọ bụ enweghị obi ike na anyị ga-ezili ozi ọma pụrụ ime ka anyị gbachie nkịtị. Pọl onyeozi setịpụkwara ezi ihe nlereanya n’akụkụ a. O dere, sị: ‘Anyị nwere nkwuwa okwu site na Chineke anyị iji oké ịgba mgba gwa unu ozi ọma Chineke.’ (1 Ndị Tesalonaịka 2:2) Nanị ihe mere Pọl ji nwee ike ime ihe ọ na-agaraghị emeli n’onwe ya bụ na ọ dabeere na Jehova.
Ekpere nyeere otu nwanyị aha ya bụ Sherry aka ikwuwa okwu mgbe o nwere ohere ịgba àmà n’oge ọ na-anọghị n’ozi. Otu ụbọchị, ka ọ na-eche di ya ka ọ lọta ebe ọ gara, Sherry hụrụ otu nwanyị na-echekwa mmadụ. Sherry kwuru, sị: “Ka ahụ́ na-ama m jijiji n’ihi ụjọ, ekpegaara m Jehova ekpere ka o nye m obi ike.” Ka Sherry na-agakwuru nwanyị ahụ, otu onye ụkọchukwu Chọọchị Baptist bịara ebe ahụ. Sherry atụghị anya izute onye ụkọchukwu. Otú ọ dị, o kpere ekpere ọzọ ma nwee ike ịgba àmà. O nyere nwanyị ahụ akwụkwọ ma mee ndokwa ịgara ya nletaghachi. Mgbe anyị ji ohere ndị anyị nwere na-agba àmà, anyị pụrụ
inwe obi ike na ịdabere n’ebe Jehova nọ ga-enyere anyị aka inwe nkwuwa okwu.Mgbe Anyị Na-ezi Ihe
Nkwuwa okwu na izi ihe nwere njikọ chiri anya. Bible kwuru banyere “ndị na-eje ozi n’ụzọ dị mma” n’ọgbakọ, sị: “[Ha] na-enwetara onwe ha nguzo dị mma na nkwuwa okwu dị ukwuu n’okwukwe e nwere n’ihe metụtara Kraịst Jizọs.” (1 Timoti 3:13) Ha na-enweta nkwuwa okwu a site n’ime ihe ndị ahụ ha na-ezi ndị ọzọ. Ha ime otú ahụ na-echebe ma na-ewusi ọgbakọ ike.
Mgbe anyị nwere nkwuwa okwu n’ụzọ dị otú a, ndị ọzọ ga na-anabatakwu ndụmọdụ anyị na-enye ha, ọ ga-akakwa dịrị ha mfe ime ha eme. Ndị na-ege anyị ntị ga na-achọ ime ihe anyị na-ezi ha kama ịbụ ndị a dọpụrụ uche ha n’ihi na àgwà anyị ekwekọghị n’ihe anyị na-ezi. Nkwuwa okwu a na-enyere ndị ruru eru n’ụzọ ime mmụọ aka ‘ịgbazigharị nwanna ha’ tupu nsogbu ya aka njọ. (Ndị Galeshia 6:1) Ma, onye na-akpa àgwà ọjọọ nwere ike ịla azụ n’inye ndụmọdụ, n’ihi na ọ na-eche na ya erughị eru inye ndụmọdụ. Igbu oge n’inye mmadụ ndụmọdụ dị ya mkpa pụrụ ịkpata ọdachi.
Anyị inwe nkwuwa okwu apụtaghị na anyị ga-abụ ndị nkatọ, ndị na-adịghị anabata echiche ndị ọzọ, ma ọ bụ ndị na-adịghị ekwe ekwe. Pọl gbara Faịlimọn ume ‘dabere n’ịhụnanya.’ (Faịlimọn 8, 9) O dokwara anya na Faịlimọn nabatara ume ahụ onyeozi ahụ gbara ya. N’ezie, o kwesịrị ịbụ ịhụnanya ga-akpali okenye inye ndụmọdụ!
N’ezie nkwuwa okwu dị oké mkpa mgbe a na-enye ndụmọdụ. Ọ dịkwa mkpa n’oge ndị ọzọ. Pọl degaara ọgbakọ dị na Kọrint akwụkwọ, sị: “Enwere m nkwuwa okwu dị ukwuu n’ebe unu nọ. Enwere m ịnya isi dị ukwuu n’ihe banyere unu.” (2 Ndị Kọrint 7:4) Pọl alaghị azụ n’ịja ụmụnna ya ndị nwoke na ndị nwanyị mma mgbe ha mere ihe a ga-eji jaa ha mma. Ịhụnanya mere ka o lekwasị anya n’àgwà ọma nke ndị kwere ekwe ibe ya, n’agbanyeghị na ọ maara amaghị eme ha. A na-ewulikwa ọgbakọ Ndị Kraịst taa elu mgbe ndị okenye ji ezi obi na-aja ụmụnna ha ndị nwoke na ndị nwanyị mma ma na-agba ha ume mgbe nile.
Ka Ndị Kraịst wee na-ezi ihe nke ọma, ha nile kwesịrị inwe nkwuwa okwu. Sherry, bụ́ onye a kpọtụrụ aha ná mmalite, chọrọ ịgba ụmụ ya ume ka ha na-agba àmà n’ụlọ akwụkwọ. O kwetara, sị: “N’agbanyeghị na a zụlitere m n’eziokwu, agbakarịghị m àmà n’ụlọ akwụkwọ mgbe m na-eto eto. Ọ na-esikwara m ike ịgba àmà mgbe m na-anọghị n’ozi. Ajụrụ m onwe m, sị, ‘Ihe nlereanya dị aṅaa ka m na-esetịpụrụ ụmụ m?’” Nke a kpaliri Sherry ịgbalịkwu ịdị na-agba àmà mgbe ọ na-anọghị n’ozi.
Ee, ndị ọzọ na-ele ihe anyị na-eme, ha na-achọpụtakwa mgbe anyị na-adịghị eme ihe ndị anyị na-akụzi. N’ihi ya, ka anyị nweta nkwuwa okwu site n’ịgbalị ime ka ihe anyị na-eme kwekọọ n’ihe ndị anyị na-ekwu.
Mgbe Anyị Na-ekpe Ekpere
Nkwuwa okwu dị ezigbo mkpa karịsịa n’ekpere anyị na-ekpegara Jehova. N’enweghị ihe ọ bụla na-egbochi anyị, anyị pụrụ ịgwa Jehova obi anyị nile, nwee obi ike na ọ ga-anụ ekpere anyị ma zaa ha. Anyị na Nna anyị nke eluigwe na-esi otú ahụ enwe ezi mmekọrịta chiri anya. Anyị ekwesịtụghị ịla azụ n’ịbịakwute Jehova, na-eche na anyị erutụghị eru ịbịakwute ya. Gịnị ma ọ bụrụ na obi amamikpe anyị na-enwe n’ihi ihe ụfọdụ anyị mejọrọ ma ọ bụ mmehie anyị mere na-egbochi anyị ikwupụta obi anyị? Ànyị ka pụrụ ikpegara Eze eluigwe na ala ekpere n’enweghị ihe mgbochi?
Ọkwá dị elu nke Jizọs dị ka Nnukwu Onye Nchụàjà bụ ihe ọzọ ga-enye anyị obi ike mgbe anyị na-ekpe ekpere. Ná Ndị Hibru 4:15, 16, anyị na-agụ, sị: “Anyị nwere dị ka nnukwu onye nchụàjà, ọ bụghị onye na-apụghị imetara anyị ebere n’adịghị ike anyị, kama onye a nwaleworo n’ụzọ nile dị ka anyị onwe anyị, ma o nweghị mmehie. Ya mere, ka anyị jiri nkwuwa okwu na-abịaru nso n’ocheeze nke obiọma na-erughịrị mmadụ, ka e wee meere anyị ebere, anyị enwetakwa obiọma na-erughịrị mmadụ maka enyemaka n’oge kwesịrị ekwesị.” Nke ahụ bụ uru ọnwụ Jizọs na ọrụ ya dị ka Nnukwu Onye Nchụàjà bara.
Ọ bụrụ na anyị ejiri obi anyị nile na-agbalị irubere Jehova isi, anyị ga-enwe nnọọ obi ike na ọ ga-aza ekpere anyị. Jọn onyeozi dere, sị: “Ndị m hụrụ n’anya, ọ bụrụ na obi anyị adịghị ama anyị ikpe, anyị nwere nkwuwa okwu n’ebe Chineke nọ; anyị na-anatakwa ihe ọ bụla anyị rịọrọ n’aka ya, n’ihi na anyị na-edebe ihe ndị o nyere n’iwu, na-emekwa ihe ndị dị mma n’anya ya.”—1 Jọn 3:21, 22.
Inwe nkwuwa okwu ịgakwuru Jehova n’ekpere pụtara na anyị pụrụ ịgwa ya ihe ọ bụla. N’agbanyeghị otú ụjọ si na-atụ anyị, otú nchegbu na obi erughị ala anyị hà, anyị nwere ike ịgwa ha Jehova, nwee obi ike na ọ dịghị mgbe ọ ga-eleghara ekpere ndị anyị ji ezi obi na-ekpegara ya anya. Ọ bụrụgodị na anyị mere mmehie dị oké njọ, obi amamikpe ekwesịghị ime ka anyị ghara ikwupụta obi anyị n’ekpere ma ọ bụrụ na anyị ji obi anyị nile chegharịa.
Nkwuwa okwu nke bụ́ onyinye na-erughịrị mmadụ dị nnọọ oké ọnụ ahịa. Anyị pụrụ iji ya wetara Chineke otuto n’ọrụ nkwusa na izi ihe anyị, ọ pụkwara ime ka anyị na-abịarukwu ya nso n’ekpere. Ka anyị ‘ghara ịtụfu nkwuwa okwu anyị, bụ́ nke nwere ụgwọ ọrụ dị ukwuu a ga-akwụ maka ya’—ụgwọ ọrụ nke bụ́ ndụ ebighị ebi.—Ndị Hibru 10:35.
[Foto dị na peeji nke 13]
Pọl kwuru okwu n’atụghị egwu
[Foto ndị dị na peeji nke 15]
Nkwuwa okwu dị mkpa iji zie ihe nke ọma
[Foto dị na peeji nke 16]
Nkwuwa okwu dị ezigbo mkpa n’ekpere