Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọṅụ Ndị Dị n’Ije Ije n’Ikwesị Ntụkwasị Obi

Ọṅụ Ndị Dị n’Ije Ije n’Ikwesị Ntụkwasị Obi

Ọṅụ Ndị Dị n’Ije Ije n’Ikwesị Ntụkwasị Obi

“Ngọzi Jehova, nke ahụ na-eme mmadụ ọgaranya, ọ dịghị atụkwasịkwa ya ihe mwute.”—ILU 10:22.

1, 2. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji nọrọ na nche megide ichegbubiga onwe anyị ókè banyere ọdịnihu?

OTU ọkà ihe ọmụma bụ́ onye America kwuru, sị: “Ichegbubiga onwe anyị ókè banyere ọdịnihu . . . na-eme ka anyị ghara ịma ihe ndị na-eme ugbu a.” Nke ahụ bụ ihe na-eme ụmụaka bụ́ ndị na-echegbubiga nnọọ onwe ha ókè banyere uru ha ga-erite ma ha too nke na ha na-elefuru uru ndị a na-erite na nwata anya ruo mgbe ha toro.

2 Nke a na-eme ọbụna ndị na-efe Jehova. Tụlee ihe a nwere ike ime eme. Ọ na-agụsi anyị agụụ ike ịhụ mmezu nke nkwa Chineke kwere ime ka ụwa ghọọ paradaịs. Anyị ana-atụsi anya ndụ nke ọrịa, ime agadi, ihe mgbu, na ahụhụ na-agaghị adị na ya ike. Ọ bụ ezie na ọ dị mma ịtụ anya ihe ndị dị otú ahụ, olee ma ọ bụrụ na anyị amalite ichegbubiga onwe anyị ókè banyere ngọzi anụ ahụ́ ndị anyị ga-enweta n’ọdịnihu nke na anyị ejighịzi ngọzi ndị anyị na-enweta ugbu a n’ụzọ ime mmụọ kpọrọ ihe? Lee ihe jọgburu onwe ya nke ahụ ga-abụ! Nke ahụ nwere nnọọ ike ime ka anyị nwee nkụda mmụọ ma mee ‘ka anyị rịawa ọrịa n’obi mgbe anyị na-enwetaghị ihe anyị na-eche ruo nnọọ ogologo oge.’ (Ilu 13:12) Nsogbu na ihe isi ike ndị a na-enweta ná ndụ nwere ike ịkụda anyị mmụọ ma ọ bụ mee ka anyị mewere onwe anyị ebere. Kama ịnagide ihe isi ike, anyị pụrụ ịmalite ime mkpesa. Anyị pụrụ izere ihe a nile site n’iji ekele na-atụgharị uche ná ngọzi ndị anyị na-enweta ugbu a.

3. Na gịnị ka anyị ga-elekwasị anya n’isiokwu a?

3 Ilu 10:22 na-ekwu, sị: “Ngọzi Jehova, nke ahụ na-eme mmadụ ọgaranya, ọ dịghị atụkwasịkwa ya ihe mwute.” Ọ̀ bụ na ọganihu ime mmụọ ndị ohu Jehova nke oge a na-enwe abụghị ngọzi anyị kwesịrị ịṅụrịrị ọṅụ? Ka anyị tụlee ụfọdụ ọganihu ime mmụọ ndị anyị nwerela ma hụ ihe ha pụtara nye anyị n’otu n’otu. Iwepụta oge tụgharịa uche ná ngọzi ndị Jehova wụsarala ‘ndị ezi omume ndị na-ejegharị n’izu okè ha’ ga-eme nnọọ ka anyị kpebisikwuo ike ịnọgide na-eji ọṅụ ejere Nna anyị nke eluigwe ozi.—Ilu 20:7.

Ngọzi Ndị Na-eme Anyị Ọgaranya’ Ugbu A

4, 5. Olee ozizi Bible nke masịrị gị karịsịa, n’ihi gịnịkwa?

4 Anyị nwere ezi ihe ọmụma nke ozizi Bible. Okpukpe nile nke Krisendọm na-azọrọ na ha kweere na Bible. Ma, ha ekweghị n’ihe ọ na-akụzi. Ọbụna olu ndị nọ n’otu okpukpe na-agbakarị iche iche ma a bịa n’ihe Akwụkwọ Nsọ na-akụzi n’ezie. Lee nnọọ ka ọnọdụ ha si dị iche na nke ndị ohu Jehova! N’agbanyeghị mba, ebe, na otú e si zụlite anyị, anyị na-efe Chineke nke anyị maara aha ya. Ọ bụghị chi atọ n’ime otu dị omimi. (Deuterọnọmi 6:4; Abụ Ọma 83:18; Mak 12:29) Anyị makwaara na oge eruola ka e dozie oké ihe iseokwu ahụ metụtara oruru o ruuru Chineke ịchị eluigwe na ala, marakwa na site n’anyị ikwesị ntụkwasị obi nye Chineke, anyị na-akwado ya n’ihe iseokwu ahụ. Anyị maara eziokwu banyere ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ, anyị adịghịkwa atụ Chineke nke a sịrị na-emekpa ụmụ mmadụ ahụ́ na hel nke na-ere ọkụ ma ọ bụ nke na-atụba ha na pọgatrị egwu.—Eklisiastis 9:5, 10.

5 Ọzọkwa, ọ bụ nnọọ ihe ọṅụ ịmata na anyị esiteghị n’evolushọn bụ́ ihe a sịrị mere na mberede, nke a na-achịkwaghịkwa achịkwa! Kama nke ahụ, ọ bụ Chineke kere anyị n’onyinyo ya. (Jenesis 1:26; Malakaị 2:10) Ọbụ abụ ahụ bụkuru Chineke ya abụ, sị: “M ga-ekele Gị; n’ihi na e jiwo ihe dị iche iche dị egwu mee ka m bụrụ oké ọrụ: oké ọrụ ka ọrụ Gị nile dị; mkpụrụ obi m makwaara ya nke ọma.”—Abụ Ọma 139:14.

6, 7. Olee mgbanwe ndị i meworo ná ndụ gị ma ọ bụ ndị ị maara ndị ọzọ meworo ndị bụworo ngọzi?

6 Ntọhapụ a tọhapụrụ anyị n’àgwà na omume ndị na-emerụ ahụ́. Ụlọ ọrụ mgbasa ozi na-adọ ndị mmadụ aka ná ntị ugboro ugboro banyere ihe ize ndụ ndị dị n’ise siga, ịṅụbiga mmanya ókè, na n’inwe mmekọahụ aghara aghara. Ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ anaghị eji ịdọ aka ná ntị ndị a akpọrọ ihe. Ma, olee ihe na-eme mgbe onye obi ya dị ọcha mụtara na ezi Chineke ahụ katọrọ ihe ndị dị otú ahụ nakwa na ndị na-eme ihe ndị ahụ na-akpasu ya iwe? Leenụ, nke ahụ na-akpali onye ahụ ịkwụsị omume ndị dị otú ahụ! (Aịsaịa 63:10; 1 Ndị Kọrint 6:9, 10; 2 Ndị Kọrint 7:1; Ndị Efesọs 4:30) Ọ bụ ezie na isi ihe mere o ji eme nke ahụ bụ iji mee ihe na-atọ Jehova Chineke ụtọ, ọ na-abakwuru ya uru—ọ na-enwe ezi ahụ́ ike na obi iru ala.

7 Ọ na-esiri nnọọ ọtụtụ ndị ike ịkwụsị àgwà ọjọọ. N’agbanyeghị nke ahụ, ọtụtụ iri puku mmadụ na-eme ya kwa afọ. Ha na-arara onwe ha nye Jehova, e meekwa ha baptizim, ha esi otú ahụ gosi ọhaneze na ha akwụsịla àgwà ndị ahụ na-adịghị amasị Chineke. Lee nnọọ ka nke ahụ si agba anyị nile ume! Ọ na-eme ka anyị kpebisikwuo ike ịghara ịghọ ohu nke mmehie na àgwà ndị na-emerụ ahụ́.

8. Olee ndụmọdụ dabeere na Bible nke na-eme ka e nwee obi ụtọ n’ezinụlọ?

8 Anyị nwere ezinụlọ nwere obi ụtọ. Ezinụlọ na-etisasị etisasị n’ọtụtụ mba. Ọtụtụ ndị lụrụ di na nwunye na-emesị gbaa alụkwaghịm, mgbe mgbe, ha na-agbahapụ ụmụ ha bụ́ ndị nke ahụ na-agbawa obi. Pasent 20 nke ezinụlọ nile dị ná mba ụfọdụ dị na Europe nwere nanị nne ma ọ bụ nna. Olee otú Jehova siworo nyere anyị aka ije ije n’ikwesị ntụkwasị obi n’ihe banyere ndụ ezinụlọ? Biko gụọ Ndị Efesọs 5:22–6:4, ma hụ ezigbo ndụmọdụ Okwu Chineke nyere ndị bụ́ di, ndị bụ́ nwunye na ndị bụ́ ụmụ. Ime ihe ndị e kwuru n’ebe ahụ nakwa n’akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị ọzọ, na-ewusikwu nnọọ alụmdi na nwunye ike, na-enyere ndị nne na nna aka ịzụ ụmụ ha nke ọma, ma na-enye aka eme ka ezinụlọ nwee obi ụtọ. Nke ahụ ọ́ bụghị ngọzi kwesịrị ime ka anyị na-aṅụrị ọṅụ?

9, 10. Olee otú olileanya anyị nwere maka ọdịnihu si dịrị iche na nke ndị ụwa?

9 E kwesịrị anyị nkwa ike na nsogbu ndị dị n’ụwa ga-akwụsị n’isi nso. N’agbanyeghị amamihe ndị ọkà mmụta sayensị na nke ndị nkà na ụzụ na mgbalị ndị ọchịchị ụfọdụ ji ezi obi na-eme, nnukwu nsogbu ndị e nwere n’oge a ka dị. Klaus Schwab, bụ́ onye hiwere Òtù Na-ahụ Maka Nsogbu Ụwa, kwuru n’oge na-adịbeghị anya na “nsogbu ndị na-eche ụwa ihu nọgidere na-amụba amụba ebe oge a ga-eji gboo ha na-ebelata ebelata.” O kwuru banyere “ihe ize ndụ ndị metụtara mba nile ndị dị ka iyi ọha egwu, mbibi gburugburu ebe obibi na nsogbu ego.” Schwab kwubiri, sị: “Ụwa nwere nsogbu ndị chọrọ ka ndị mmadụ gbakọọ aka ma mee ihe ngwa ngwa banyere ha, ọ dịbeghịkwa mgbe ụwa nọrọla n’ọnọdụ dị otú a.” Ka narị afọ nke 21 na-aga n’ihu, o nwebeghị olileanya dịnụ na ọdịnihu ụmụ mmadụ ga-adị mma.

10 Lee ka obi si atọ anyị ụtọ ịmata na Jehova ewepụtala ihe ga-akwụsịli nsogbu nile nke ụmụ mmadụ—Alaeze Mezaịa nke Chineke! Ezi Chineke ga-eji ya mee ka ‘agha nile kwụsị’ ma weta ‘ọtụtụ udo.’ (Abụ Ọma 46:9; 72:7) Eze e terela mmanụ nke Alaeze ahụ, bụ́ Jizọs Kraịst, ‘ga-anapụta ogbenye, onye e wedara n’ala, na onye na-enweghị ike n’aka nzọgbu na n’aka ime ihe ike.’ (Abụ Ọma 72:12-14) Mgbe Alaeze ahụ ga-amalite ịchị, a gaghị enwe ụkọ nri. (Abụ Ọma 72:16) Jehova “ga-ehichapụkwa anya mmiri ọ bụla n’anya [anyị], ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru újú ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ. Ihe mbụ agabigawo.” (Mkpughe 21:4) E hiwelarị Alaeze ahụ n’eluigwe, n’oge na-adịghịkwa anya, ọ ga-akwụsị nsogbu nile dị n’ụwa.—Daniel 2:44; Mkpughe 11:15.

11, 12. (a) Ịchụso ihe ụtọ, ọ̀ na-eweta obi ụtọ na-adịgide adịgide? Kọwaa. (b) Olee ihe na-eweta ezi obi ụtọ?

11 Anyị maara ihe na-eweta ezi obi ụtọ. Olee nnọọ ihe na-eweta ezi obi ụtọ? Otu ọkà n’akparamàgwà mmadụ kwuru na e nwere ihe atọ na-enye mmadụ obi ụtọ—ihe ụtọ, ọrụ (ịrụ ọrụ ndị dị ka ọrụ ego na ilekọta ezinụlọ), na inwe afọ ojuju (ime ihe ga-abara ndị ọzọ uru). N’ime ha atọ, o kwuru na nke kasị bụrụ nke na-adịghị mkpa bụ ihe ụtọ ma kwuo, sị: “Nke a na-adọrọ mmasị n’ihi na ọtụtụ mmadụ na-eji ndụ ha nile achụso ihe ụtọ.” Gịnị bụ echiche Bible banyere ya?

12 Eze Solomọn nke Izrel oge ochie kwuru, sị: “Mụ onwe m sịrị n’obi m, Biko, bịa, m ga-eji ọṅụ nwaa gị; gị lekwasịkwa ezi ihe anya: ma, lee, nke ahụ bụkwa ihe efu. Ekwuru m okwu banyere ịchị ọchị, sị, Ọ na-awị ara: m kwukwara okwu banyere ọṅụ, sị, Gịnịkwa ka ọ na-eme?” (Eklisiastis 2:1, 2) Dị ka Akwụkwọ Nsọ si kwuo, obi ụtọ ọ bụla a na-enweta n’ihe ụtọ adịghị anọte aka. Gịnị banyekwaranụ ịrụ ọrụ? Anyị nwere ọrụ kasị baa uru anyị ga-arụ—ọrụ nkwusa Alaeze na nke ime ndị na-eso ụzọ. (Matiu 24:14; 28:19, 20) Site n’izi ndị ọzọ ozi nzọpụta dị na Bible, anyị na-arụ ọrụ nke pụrụ ịzọpụta anyị onwe anyị na ndị na-ege anyị ntị. (1 Timoti 4:16) Dị ka “ndị ha na Chineke na-arụkọ ọrụ,” anyị maara na “a na-enwe obi ụtọ ka ukwuu n’inye ihe karịa ka a na-enwe n’ịnara ihe.” (1 Ndị Kọrint 3:9; Ọrụ 20:35) Ọrụ a na-eme ka ndụ anyị nwee nzube ma mee ka Onye Okike anyị nwee ihe ọ ga-azaghachi onye na-ata ya ụta bụ́ Setan bụ́ Ekwensu. (Ilu 27:11) N’eziokwu, Jehova egosiwo anyị na nsọpụrụ Chineke na-eweta ezigbo obi ụtọ na-adịgide adịgide.—1 Timoti 4:8.

13. (a) Olee otú Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke si bụrụ ngọzi kwesịrị ime ka anyị na-aṅụrị ọṅụ? (b) Olee otú i siworo rite uru n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke?

13 Anyị nwere ọzụzụ dị mkpa na nke na-arụpụta ihe. Gerhard bụ okenye n’otu ọgbakọ nke Ndịàmà Jehova. Mgbe o chetara oge ọ bụ nwa okorobịa, o kwuru, sị: “Mgbe m na-eto eto, ọ na-esiri m nnọọ ike ikwu okwu. Mgbe ahụ́ na-erughị m ala, ọ na-esiri m ike ikwu ihe ndị mmadụ ga-aghọta, m na-amalitekwa ịsụ nsụ. Amalitere m ile onwe m anya dị ka onye na-abaghị uru, m nwekwara nkụda mmụọ. Nne m na nna m mere ndokwa ka m mụọ otú e si ekwu okwu n’ihu ọha ma mgbalị ha enyeghịrị m aka. Ihe na-eme m dị m n’uche, ọ bụghị n’ahụ́. Ma, e nwere nnọọ otu ndokwa magburu onwe ya Jehova mere—Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke. Mgbe m denyere aha n’ụlọ akwụkwọ ahụ, amaliteghachiri m inwe obi ike. Emere m ike m ime ihe ndị m na-amụta. Nke ahụ nyekwaara m aka! Ahụ́ rukwuru m ala, akwụsịrị m inwe nkụda mmụọ ma nwekwuo nkwuwa okwu n’ozi. Ugbu a, m na-ekwudị okwu ihu ọha. Ekelere m nnọọ Jehova, bụ́ onye jiri ụlọ akwụkwọ a mee ka ndụ m ka mma.” Ọ̀ bụ na ụzọ Jehova si enye anyị ọzụzụ iji rụọrọ ya ọrụ ekwesịghị ime ka anyị na-aṅụrị ọṅụ?

14, 15. Olee enyemaka anyị na-enweta n’oge ihe isi ike? Nye ihe atụ.

14 Anyị na Jehova dị ná mma, òtù ụmụnna anyị dị n’otu, nke zuru ụwa ọnụ, na-akwadokwa anyị. Obi kooro nnọọ Katrin, bụ́ onye bi na Germany, n’elu mgbe ọ nụrụ banyere otu ajọ ala ọma jijiji mere n’ebe ndịda ọwụwa anyanwụ Eshia bụ́ nke meere baa n’oké osimiri. Nwa ya nwanyị gara Thailand mgbe ọdachi ahụ mere. Ruo awa 32, nwanyị a amaghị ma nwa ya nwanyị ọ̀ ka dị ndụ ka ò so n’ọtụtụ ndị a na-ekwu na-anwụ kwa awa. Lee ka obi si ruo Katrin ala mgbe e mesịrị kpọọ ya na telifon ma gwa ya na ọ dịghị ihe mere nwa ya!

15 Gịnị nyeere Katrin aka n’awa ndị ahụ obi kooro ya n’elu? O dere, sị: “Ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na m ji oge nile ahụ kpegara Jehova ekpere. Ọtụtụ ugboro, ahụrụ m otú nke ahụ si nye m ume ma mee ka obi rutụ m ala. E wezụga nke ahụ, ụmụnna m na-ahụ n’anya bụ́ ndị mụ na ha nọ n’ọgbakọ letara m ma gbaa m ume.” (Ndị Filipaị 4:6, 7) Lee ka ọnọdụ ya gaara esi ka njọ n’awa nile ahụ obi na-erughị ya ala, ma a sị na o kpegaraghị Jehova ekpere, gharakwa inweta nkasi obi site n’aka òtù ụmụnna ya na-ahụ n’anya! Mmekọrịta chiri anya dị n’etiti anyị na Jehova, Ọkpara ya na òtù ụmụnna anyị bụ ngọzi pụrụ iche, dịkwa nnọọ oké ọnụ ahịa nke na anyị ekwesịghị iji ya gwurie egwu!

16. Kọọ ahụmahụ na-egosi uru mbilite n’ọnwụ bara.

16 Anyị nwere olileanya ịhụ ndị anyị hụrụ n’anya nwụrụ anwụ ọzọ. (Jọn 5:28, 29) A zụlitere otu nwa okorobịa aha ya bụ Matthias dị ka Onyeàmà Jehova. Otú ọ dị, n’amaghị ngọzi ndị ọ na-enweta, o si n’ọgbakọ Ndị Kraịst pụọ mgbe ọ dị afọ iri na ụma. Ọ na-ede ugbu a, sị: “Ọ dịghị nnọọ mgbe mụ na nna m nwere mkparịta ụka miri emi. Ruo ọtụtụ afọ, anyị na-abarịta mba mgbe nile. Ma, nanị ihe nna m chọrọ bụ ka ihe gaara m nke ọma. Ọ hụrụ m nnọọ n’anya, bụ́ ihe m na-aghọtaghị n’oge ahụ. N’afọ 1996, ka m nọ ọdụ n’akụkụ àkwà ya, jide ya n’aka ma na-ebe ezigbo ákwá, asịrị m ya gbaghara m ihe nile m mere, nakwa na m hụrụ ya n’anya nke ukwuu. Ma ọ nụghị ihe m na-ekwu. Mgbe ọ rịasịrị ọrịa ruo obere oge, ọ nwụrụ. Ọ bụrụ na mụ adị ndụ hụ nna m ná mbilite n’ọnwụ, anyị ga-ekpezi. Obi ga-adịkwa ya nnọọ ụtọ ịnụ na m bụzi okenye nakwa na mụ na nwunye m nwere ihe ùgwù nke ije ozi dị ka ndị ọsụ ụzọ.” Lee ka olileanya nke mbilite n’ọnwụ si bụrụ nnọọ ngọzi!

“Ọ Dịghị Atụkwasịkwa Ya Ihe Mwute”

17. Olee otú ịtụgharị uche ná ngọzi ndị Jehova gọziworo anyị si enyere anyị aka?

17 Jizọs Kraịst kwuru banyere Nna ya nke eluigwe, sị: “Ọ na-eme ka anyanwụ ya na-awakwasị ndị ọjọọ na ndị ọma, na-emekwa ka mmiri na-ezokwasị ndị ezi omume na ndị ajọ omume.” (Matiu 5:45) Ọ bụrụ na Jehova Chineke na-agọzi ọbụna ndị ajọ omume, lee ka ọ ga-esi agọzi ndị na-eje ije n’ikwesị ntụkwasị obi karị! Abụ Ọma 84:11 na-ekwu, sị: ‘Jehova agaghị egbochi ezi ihe n’ebe ndị na-ejegharị n’izu okè nọ.’ Lee ka obi anyị si ejupụta n’ọṅụ na n’ekele mgbe anyị tụgharịrị uche n’ịhụnanya na nlekọta pụrụ iche anyị nwetaworo n’aka Jehova!

18. (a) Gịnị mere a pụrụ iji kwuo na Jehova adịghị atụkwasị ngọzi ya ihe mwute? (b) N’ihi gịnị ka ọtụtụ ndị ohu Chineke na-ekwesị ntụkwasị obi ji ata ahụhụ?

18 “Ngọzi Jehova”—nke ahụ bụ ihe mere ndị ya jiworo nwee ọganihu ime mmụọ. E mesikwara anyị obi ike na “ọ dịghị atụkwasịkwa ya ihe mwute.” (Ilu 10:22) Gịnịzi mere ọnwụnwa ji adakwasị ọtụtụ ndị ohu Chineke na-ekwesị ntụkwasị obi, na-eme ka ha nọrọ nnọọ ná mwute na n’ahụhụ? Ọ dị ihe atọ bụ́ isi na-akpatara anyị ihe isi ike na nchekasị. (1) Ọchịchọ anyị nwere ime mmehie. (Jenesis 6:5; 8:21; Jems 1:14, 15) (2) Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya. (Ndị Efesọs 6:11, 12) (3) Ụwa ajọ omume anyị bi n’ime ya. (Jọn 15:19) Ọ bụ ezie na Jehova na-ekwe ka ihe ọjọọ na-eme anyị, ọ bụghị ya na-akpata ha. N’ezie, “ezi onyinye ọ bụla na onyinye ọ bụla zuru okè sitere n’elu, n’ihi na o si n’ebe Nna nke ìhè eluigwe nọ na-abịa.” (Jems 1:17) Ngọzi Jehova adịghị akpata ihe mwute.

19. Gịnị na-echere ndị nọgidere na-eje ije n’ikwesị ntụkwasị obi?

19 Inwe ọganihu ime mmụọ na-achọ ka anyị na Chineke na-enwe mmekọrịta chiri anya. Mgbe anyị na Chineke nwere mmekọrịta chiri anya, anyị ‘na-atọrọ onwe anyị ezi ntọala maka ọdịnihu n’ụzọ nwere nchebe, ka anyị wee jidesie aka ike ná ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie’—ndụ ebighị ebi. (1 Timoti 6:12, 17-19) N’ụwa ọhụrụ Chineke ga-eweta n’ọdịnihu, a ga-agọzi anyị ma n’ụzọ ime mmụọ ma n’ụzọ anụ ahụ́. Ndị nọgidere ‘na-ege ntị n’olu Jehova’ ga-enwetazi ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie. (Deuterọnọmi 28:2) Ka anyị kpebisikwuo ike iji ọṅụ nọgide na-eje ije n’ikwesị ntụkwasị obi.

Gịnị Ka Ị Mụtara?

• N’ihi gịnị ka o ji bụrụ ihe amamihe na-adịghị na ya ichegbubiga onwe anyị ókè banyere ọdịnihu?

• Olee ngọzi ndị anyị na-enweta ugbu a?

• N’ihi gịnị ka ndị ohu Chineke na-ekwesị ntụkwasị obi ji ata ahụhụ?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]