Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Olee ihe na-eme ka “ihe a na-achọsi ike nke mba nile” na-abata ‘n’ụlọ’ nke ezi ofufe?—Hagaị 2:7.

Jehova sitere n’ọnụ onye amụma bụ́ Hagaị buo amụma, sị: “M ga-emekwa ka mba nile mee mkpọtụ, ihe a na-achọsi ike nke mba nile ga-abịakwa, M ga-emejukwa ụlọ a n’ebube.” (Hagaị 2:7) Ime ka “mba nile” mee mkpọtụ, ọ̀ bụ ya na-eme ka “ihe a na-achọsi ike” nke mba nile—ndị nwere obi eziokwu—na-abata n’ezi ofufe? Azịza ya bụ ee e.

Tụlee ihe na-eme ka mba nile na-eme mkpọtụ na ihe nke ahụ ga-eduga na ya. Bible na-ekwu na ‘mba nile anọwo na-eme oké mkpọtụ, ndị nile dị n’ụwa ana-atụgharịkwa ihe efu n’uche.’ (Abụ Ọma 2:1) “Ihe efu” ahụ ha nọgidere ‘na-atụgharị n’uche’ bụ otú ha ga-esi nọgide n’ọchịchị. Ọ dịghị ihe na-eme ka ha mee mkpọtụ karịa ihe ọ bụla na-eyi ọchịchị ha egwu.

Nkwusa Ndịàmà Jehova na-ekwusa n’ụwa nile banyere Alaeze Chineke e guzobeworo eyiwo nnọọ ọchịchị ha egwu. E kwuwerị, Alaeze Mezaịa nke Chineke nke Jizọs Kraịst bụ onye ọchịchị ya gaje ‘itipịa alaeze ụmụ mmadụ nile mee ka ha gwụsịa.’ (Daniel 2:44) Ozi ikpe anyị na-akpọsa ka anyị na-arụ ọrụ nkwusa anyị na-eme ka mba nile na-eme mkpọtụ. (Aịsaịa 61:2) Mkpọtụ ahụ na-akawanye njọ ka ọrụ nkwusa ahụ na-agbasakwu ma na-esikwu ike. Gịnị ka ime mkpọtụ ahụ e buru n’amụma na Hagaị 2:7 ga-eduga na ya?

Na Hagaị 2:6, anyị na-agụ, sị: “Otú a ka Jehova nke usuu nile nke ndị agha sịrị: Ọ fọdụrụ otu ugboro, nwa mgbe nta ka ọ bụ, Mụ onwe m gaje ime ka eluigwe na ụwa na oké osimiri na ala kpọrọ nkụ mee mkpọtụ.” Pọl onyeozi hotara amaokwu a ma dee, sị: “O kwewo nkwa, na-asị: ‘Ma otu ugboro ọzọ m ga-etinye ọgba aghara ọ bụghị nanị n’ụwa kamakwa n’eluigwe.’” Ma okwu ahụ bụ́ ‘Ma otu ugboro ọzọ’ na-egosi mwepụ nke ihe ndị e mere ka ha maa jijiji dị ka ihe ndị e meworo eme, ka ihe ndị a na-adịghị eme ka ha maa jijiji [Alaeze ahụ] wee dịgide.” (Ndị Hibru 12:26, 27) Ee, usoro ihe nile dị ugbu a gaje ịpụ n’anya iji nye ohere maka ụwa ọhụrụ ga-esite n’aka Chineke.

Ndị nwere obi eziokwu na-abata n’ezi ofufe, ma ọ bụghị n’ihi na a na-eme ka mba nile mee mkpọtụ, ma ọ bụ maa jijiji. Ihe na-adọta ha n’ebe Jehova na ofufe ya nọ bụ otu ihe ahụ na-eme ka mba nile na-eme mkpọtụ, ya bụ nkwusa zuru ụwa ọnụ banyere Alaeze Chineke e guzobeworo. Mkpọsa nke ‘ozi obi ụtọ nke ozi ọma ebighị ebi’ na-adọta ndị nwere ezi ọchịchọ obi n’ofufe nke ezi Chineke ahụ.—Mkpughe 14:6, 7.

Ozi Alaeze ahụ bụ ozi ikpe na nke nzọpụta. (Aịsaịa 61:1, 2) Ihe na-esi n’ikwusa ozi Alaeze ahụ n’ụwa nile apụta dị ụzọ abụọ: ime ka mba nile mee mkpọtụ na ime ka ihe a na-achọsi ike nke mba nile bata n’ebube Jehova.