Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Chineke Zubere Maka Ụwa Ga-emezu n’Isi Nso

Ihe Chineke Zubere Maka Ụwa Ga-emezu n’Isi Nso

Ihe Chineke Zubere Maka Ụwa Ga-emezu n’Isi Nso

MGBE Adam na Iv ka nọ na Paradaịs, Chineke nyere ha iwu, sị: “Mụọnụ ọmụmụ, baanụ ụba, jupụta ụwa, buda ya n’okpuru onwe unu; nweekwanụ ike n’ahụ́ azụ nke oké osimiri, na n’ahụ́ anụ ufe nke eluigwe, na n’ahụ́ anụ nile ọ bụla dị ndụ nke na-akpụ akpụ n’elu ụwa.”—Jenesis 1:28.

Ibuda ụwa n’okpuru onwe ha abụghị nanị ilekọta obere akụkụ ya. Chineke zubere ka Adam na Iv na ụmụ ha gbasaa Paradaịs ahụ ruo mgbe o zuru ụwa nile. Otú ọ dị, di na nwunye mbụ ahụ bụ́ mmadụ mehiere, e wee chụpụ ha n’ogige Iden. (Jenesis 3:23, 24) Ma nke ahụ apụtaghị na ọ dịghị mgbe a ga-ebuda ụwa n’okpuru mmadụ.

Ụmụ mmadụ na-erube isi ga-enwe ike ibuda ụwa n’okpuru onwe ha n’ihi na Chineke ga-agọzi ha. Mgbe Chineke nọ na-agọzi Izrel oge ochie, ubi ha na osisi ha nọ na-amị ọmarịcha mkpụrụ. A ga-enwe ọnọdụ yiri nke ahụ mgbe ụwa anyị ga-eji nwayọọ nwayọọ na-aghọ paradaịs. Dị ka e kwere ná nkwa n’Okwu Chineke e dere n’ike mmụọ nsọ, bụ́ Bible, “ala [ga-eme] ihe omume ya: Chineke, bụ́ Chineke anyị, ga-agọzi anyị.” (Abụ Ọma 67:6) N’ezie, ala ahịhịa ndị dị n’ụwa na ugwu ya dị iche iche, osisi na okooko osisi ya, osimiri na oké osimiri ya ga-aṅụrị ọṅụ. (Abụ Ọma 96:11-13; 98:7-9) Ahịhịa ndụ, ụmụ nnụnụ tụrụ àgwà, anụmanụ ndị mara mma, na ụmụ mmadụ nwere obiọma ga-ejupụta ụwa anyị.

Ụwa Ọhụrụ Ga-abịa n’Isi Nso!

Anyị nọ ugbu a n’ọnụ ọnụ nke ụwa ọhụrụ ahụ Jehova Chineke kwere ná nkwa. Pita onyeozi dere, sị: “E nwere eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ ndị anyị na-echere dị ka nkwa ya si dị, ezi omume gajekwa ibi n’ime ha.” (2 Pita 3:13) Mgbe ụfọdụ ndị gụchara okwu ndị ahụ Pita dere, ha nwere ike ikwubi na ọ dịghị mgbe ụwa a ga-aghọ paradaịs. Ha nwere ike iche na a ga-agbanwe eluigwe na ụwa nkịtị dị ugbu a. Ọ̀ bụ eziokwu?

Gịnị bụ “eluigwe ọhụrụ” ahụ? Ọ bụghị eluigwe nkịtị Chineke kere. (Abụ Ọma 19:1, 2) Pita ka kwupụrụ banyere “eluigwe” ihe atụ—ọchịchị ụmụ mmadụ ndị e buliri elu karịa ndị ha na-achị. (2 Pita 3:10-12) “Eluigwe” a egbobeghị mkpa ụmụ mmadụ, a ga-ebibikwa ya. (Jeremaịa 10:23; Daniel 2:44) “Eluigwe ọhụrụ” ga-anọchi ya bụ Alaeze Chineke nke ndị ga-achị na ya bụ Eze Jizọs Kraịst na narị puku na iri puku mmadụ anọ na anọ ga-eso ya chịa, bụ́ ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ ibi n’eluigwe.—Ndị Rom 8:16, 17; Mkpughe 5:9, 10; 14:1, 3.

“Ụwa ọhụrụ” ahụ Pita kwuru banyere ya abụghị mbara ụwa ọhụrụ. Jehova kere nnọọ ụwa otú ọ ga-ekwe ụmụ mmadụ omume ibi na ya ruo mgbe ebighị ebi. (Abụ Ọma 104:5) Mgbe ụfọdụ, Bible na-akpọ ụmụ mmadụ “ụwa.” (Jenesis 11:1) Ụwa nke a ga-ebibi n’isi nso bụ ụmụ mmadụ ndị meworo onwe ha akụkụ nke ajọ ụwa a. N’ụzọ yiri nke ahụ, e bibiri ụwa nke ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke n’Iju Mmiri nke oge Noa. (2 Pita 3:5-7) Oleekwanụ ihe bụ́ “ụwa ọhụrụ” ahụ? Ọ bụ ọha mmadụ ọhụrụ—ndị na-efe Chineke ezi ofufe, bụ́ ndị “ziri ezi n’obi.” (Abụ Ọma 125:4; 1 Jọn 2:17) Iwu nile a ga na-agbaso ‘n’ụwa ọhụrụ’ ahụ ga-esite ‘n’eluigwe ọhụrụ’ ahụ. A ga-enwe ndị ikom kwesịrị ntụkwasị obi n’ụwa bụ́ ndị ga-ahụ na a gbasoro iwu ndị ahụ.

A Ga-enwe Ihe Ọhụrụ Ndị Magburu Onwe Ha!

Jehova nyere anyị nnọọ ebe obibi magburu onwe ya mgbe o kere ụwa ka ụmụ mmadụ biri n’ime ya. Ya onwe ya kwuru na ihe nile ya kere n’ụwa “dị mma nke ukwuu.” (Jenesis 1:31) Setan bụ́ Ekwensu mere ka Adam na Iv nupụ isi. (Jenesis 3:1-5; Mkpughe 12:9) N’agbanyeghị nke ahụ, n’isi nso, Chineke ga-ahụ na ndị obi ha ziri ezi nwetara “ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie.” Ya bụ “ndụ ebighị ebi” n’ọnọdụ magburu onwe ya na Paradaịs. (1 Timoti 6:12, 19) Ka anyị tụlezie ụfọdụ n’ime ngọzi ndị anyị ga-enweta mgbe ahụ.

N’oge Ọchịchị Puku Afọ Kraịst, a ga-atụ Setan mkpọrọ, ọ gaghịkwa enwe ike ịkpatara ụmụ mmadụ nsogbu. Jọn onyeozi kwuru, sị: “M wee hụ otu mmụọ ozi [onyeisi ndị mmụọ ozi bụ́ Maịkel, ma ọ bụ Jizọs Kraịst] ka o si n’eluigwe na-agbadata, jiri mkpịsị ugodi nke abis na nnukwu agbụ ígwè n’aka ya. O wee jichie dragọn ahụ, bụ́ agwọ mbụ ahụ, onye bụ́ Ekwensu na Setan, ma kee ya agbụ ruo otu puku afọ. Ọ tụbakwara ya n’ime abis ahụ, mechiekwa ya ma kaa ya akara n’elu ya, ka o wee ghara iduhie mba nile ọzọ ruo mgbe puku afọ ahụ ga-agwụsị.” (Mkpughe 20:1-3; 12:12) Ọ bụghị nanị na ụmụ mmadụ ga-enwere onwe ha pụọ n’aka Setan mgbe a ga-atụba ya n’abis, kamakwa, ha ga-enweta ọtụtụ ngọzi ndị ọzọ n’oge ọchịchị Alaeze ahụ.

Ajọ omume, ime ihe ike, na agha ga-akwụsị. Bible na-ekwe nkwa, sị: “Ọ fọdụrụ nwa mgbe, onye na-emebi iwu agaghị adịkwa: ị ga-elekwasịkwa ọnọdụ ya anya, ma ọ gaghị anọ. Ma ndị dị umeala n’obi ga-enweta ala; ịba ụba nke udo ga-atọkwa ha ụtọ. Ndị ezi omume ga-enweta ala, birikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.” (Abụ Ọma 37:10, 11, 29) Jehova Chineke ‘ga-eme ka agha kwụsị ruo nsọtụ ụwa.’ (Abụ Ọma 46:9) Lee ka okwu ndị ahụ si bụrụ ọmarịcha nkwa ndị a pụrụ ịtụkwasị obi bụ́ ndị na-egosi na obi ga-eru onye ọ bụla ala, nakwa na udo ga-adị!

Anyị ga-enwe ụbara nri ndị na-atọ ụtọ ma na-edozi ahụ́. Ọbụ abụ ahụ bụrụ, sị: “Ka ọtụtụ ọka dị n’ala n’elu ugwu nile.” (Abụ Ọma 72:16) N’oge ahụ, ọ dịghịkwa onye ga na-edi agụụ.

Ọ dịghị onye ga-arịa ụdị ọrịa ọ bụla. N’ezie, “onye obibi ya agaghị asị, Ana m arịa ọrịa.” (Aịsaịa 33:24; 35:5, 6) Mgbe Jizọs Kraịst nọ n’ụwa, ọ gwọrọ ndị ekpenta, ndị ngwụrọ na ndị ìsì. (Matiu 9:35; Mak 1:40-42; Jọn 5:5-9) Cheedịnụ ihe ọ ga-eme n’ụwa ọhụrụ! Chee nnọọ ụdị obi ụtọ ndị mmadụ ga-enwe mgbe a ga-agwọ ndị ìsì, ndị ngwụrọ, na ndị ogbi.

Ka ụmụ mmadụ na-erube isi na-ezu okè, a ga-ewepụ nsogbu nile ndị ịka nká na-akpata. Enyo anya, mkpara, oche nkwagharị, ụlọ ọgwụ, na ọgwụ agaghị adịkwa ụmụ mmadụ mkpa. Cheedịnụ otú ahụ́ ga-adịzi anyị mgbe a ga-eme ka anyị nwetaghachi ike okoro na agbọghọ anyị! (Job 33:25) Mgbe anyị hichara ezigbo ụra n’abalị ma teta, ahụ́ ga-agbasi anyị ike, anyị adịrịkwa njikere ịrụ ọrụ ndị ga-enye anyị ọṅụ n’ụbọchị ahụ.

Mbilite n’ọnwụ nke ndị anyị hụrụ n’anya na nke ndị ọzọ ga-eme ka ọṅụ ju anyị obi. (Jọn 5:28, 29; Ọrụ 24:15) Lee ihe obi ụtọ ọ ga-abụ ịnabataghachi Ebel, Noa, Ebreham, Sera, Job, Mozis, Rut, Devid, Ịlaịja, Esta, na ọtụtụ ndị ọzọ! A ga-akpọlitekwa ọtụtụ nde ndị ọzọ n’ọnwụ. Ọtụtụ n’ime ha anụtụbeghị banyere Jehova, ma a ga-enwe ndị ga-eji ịnụ ọkụ n’obi na-eche ha ịkụziri ha banyere Chineke, nzube ya, na Ọkpara ya, bụ́ Jizọs Kraịst. Ka ndị a kpọlitere n’ọnwụ na-amata Onye Okike ha, ihe ọmụma Jehova ga-ejupụta ụwa n’ezie.

Nke kasị nke, anyị ga-enwe ike ife nanị ezi Chineke ahụ ruo mgbe ebighị ebi. Anyị ga-enwe ihe ùgwù nke ‘iji ọṅụ fee Jehova ofufe,’ anyị ga-arụkọkwa ọrụ ọnụ ka anyị na-ewu ụlọ ndị mara mma, na-arụ ọrụ ugbo, ma mesịa buda ụwa nile n’okpuru onwe anyị. (Abụ Ọma 100:1-3; Aịsaịa 65:21-24) Lee ihe obi ụtọ ọ ga-abụ ibi na paradaịs mara mma nke ala ya na-emepụta ihe, na nke udo ga-adị na ya bụ́ nke ga-ewetara aha nsọ Jehova nsọpụrụ!—Abụ Ọma 145:21; Jọn 17:3.

A Ga-ele Ụmụ Mmadụ Ule Ikpeazụ

N’oge Ọchịchị Puku Afọ Jizọs, ọ ga-eji uru àjà mgbapụta ya rụọrọ mmadụ ọ bụla na-erube isi ọrụ. N’ikpeazụ, a ga-esi otú ahụ wepụ mmehie nile, ụmụ mmadụ ga-ezukwa okè. (1 Jọn 2:2; Mkpughe 21:1-4) Mgbe e wepụsịrị ihe nile mmehie Adam kpatara, ụmụ mmadụ zuru okè ga-eme ihe Chineke chọrọ ha n’aka n’ụzọ anụ ahụ́, n’echiche, n’omume, nakwa n’ụzọ ime mmụọ. Ha ga-esi otú ahụ ‘bịa dịrị ndụ’ n’ụzọ zuru ezu mgbe ha zuru okè, n’enweghịkwa mmehie ọ bụla. (Mkpughe 20:5) Lee otú nke a na ụwa Paradaịs ahụ ga-esi wetara Jehova otuto!

Obere oge ka Ọchịchị Puku Afọ Kraịst gasịrị, a ga-atọhapụ Ekwensu na ndị mmụọ ọjọọ ya n’abis bụ́ ebe a tụbara ha ihe dị ka otu puku afọ tupu mgbe ahụ. (Mkpughe 20:1-3) A ga-enye ha ohere ime mgbalị ikpeazụ iji mee ka ndị mmadụ gbakụta Chineke azụ. Ọ bụ ezie na ụfọdụ ndị ga-emehie, nnupụisi a ga-akụ afọ n’ala. Jehova ga-egbu ndị nnupụisi ahụ na-eche nanị banyere onwe ha na Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya. Mmebi iwu agaghị ebilite ọzọ. A ga-ebibi ndị mmehie nile ruo mgbe ebighị ebi, ndị ezi omume ga-enwetakwa ndụ ebighị ebi.—Mkpughe 20:7-10.

Ị̀ Ga-anọ Ebe Ahụ?

Ndị hụrụ Jehova Chineke n’anya ga-enwe obi ụtọ ruo mgbe ebighị ebi. Ọ dịghị ihe ga-eme ka Paradaịs gbụ ndị mmadụ. N’ezie, ndụ ga na-atọkwu ụtọ ka oge na-aga, n’ihi na anyị agaghị amụtacha ihe banyere Jehova Chineke amụtacha. (Ndị Rom 11:33) Ọ dịghị mgbe ị na-agaghị enwe ihe ọhụrụ ị ga-amụ, ị ga-enwekwa oge zuru ezu iji mụọ ya. N’ihi gịnị? N’ihi na ị gaghị adị ndụ ruo nanị afọ 70 ma ọ bụ 80, kama ruo mgbe ebighị ebi.—Abụ Ọma 22:26; 90:10; Eklisiastis 3:11.

Ọ bụrụ na ị hụrụ Chineke n’anya, ị ga na-enwe nnọọ obi ụtọ ime uche ya mgbe nile. Jọn onyeozi dere, sị: “Nke a bụ ihe ịhụ Chineke n’anya pụtara, ka anyị debe ihe ndị o nyere n’iwu; ma ihe ndị o nyere n’iwu adịghịkwa arọ.” (1 Jọn 5:3) N’ihi ya, ekwela ka ihe ọ bụla kwụsị gị ime ihe na-atọ Jehova Chineke ụtọ site n’ime ihe ziri ezi. Nọgide na-eburu n’uche olileanya ahụ magburu onwe ya Okwu Chineke, bụ́ Bible, chere gị n’ihu. Lekwasị anya n’ime uche Jehova, ya adịkwala mgbe ị ga-ala azụ n’ime otú ahụ. Ọ bụrụ na i mee otú ahụ, ị ga-anọ ya mgbe ihe Chineke zubere maka ụwa ga-emezu, ụwa anyị aghọọkwa paradaịs nke ga-adịru mgbe ebighị ebi.

[Foto dị na peeji nke 4]

Mgbe Chineke nọ na-agọzi ndị Izrel, ubi ha mepụtara ihe n’ụba

[Foto dị na peeji nke 7]

Olee ngọzi ndị ị na-atụ anya inweta na Paradaịs?