Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Jehova Nwe Agha Nke A”

“Jehova Nwe Agha Nke A”

“Anyị Aghaghị Irubere Chineke Isi Dị Ka Onye Na-achị Achị Karịa Mmadụ”

“Jehova Nwe Agha Nke A”

NDỊ agha nke mba abụọ na-ese okwu nọ n’akụkụ abụọ nke otu ndagwurugwu. Ruo ụbọchị 40, ndị ikom Izrel nọ nnọọ n’ụjọ, dike ndị Filistịa bụ́ Golaịat jikwa okwu mkparị na-asa ha ahụ́.—1 Samuel 17:1-4, 16.

Golaịat ji okwu ndị a na-ama ndị Izrel aka: “Họpụtaranụ onwe unu otu nwoke, ka ọ rịdakwutekwa m. Ọ bụrụ na ọ pụrụ ịlụso m ọgụ, wee tigbuo m, anyị ga-abụkwara unu ndị ohu: ma ọ bụrụ na mụ onwe m pụrụ ịlụgbu ya, wee tigbuo ya, unu ga-abụkwara anyị ndị ohu, wee fee anyị ofufe. . . . Mụ onwe m atawo usoro agha nile nke Izrel ụta taa; nyenụ m otu nwoke, ka anyị wee lụrịta ọgụ.”—1 Samuel 17:8-10.

N’oge ochie, òtù ndị agha abụọ na-alụ ọgụ na-akpọpụta otu dike otu dike ka ha abụọ lụọ ọgụ. Òtù nke onye nke ha meriri n’ọgụ ahụ emeriela. Ma onye a na-ama ndị Izrel aka abụghị nnọọ onye agha nkịtị. Ọ bụ dike gbara agba ma topụ etopụ—onye iro na-eme ihe ike ma dị egwu n’ile anya. Ma Golaịat ji aka ya gbuo onwe ya site n’ịkparị ndị agha nke ndị Jehova.

Nke a abụghị agha nkịtị dị n’etiti òtù ndị agha abụọ. Ọ bụ agha dị n’etiti Jehova na chi nile nke ndị Filistia. Kama Eze Sọl nke Izrel iji obi ike duru ndị agha ya gaa lụso ndị iro Chineke agha, ụjọ kụjisịrị ya ụkwụ na aka.—1 Samuel 17:11.

Otu Nwa Okorobịa Atụkwasị Jehova Obi

N’oge a òtù ndị agha abụọ ahụ nọ na-ele ibe ha sọ anya, otu nwa okorobịa e terela mmanụ ịbụ eze Izrel bịara ileta ụmụnne ya nọ n’òtù ndị agha Sọl. Aha ya bụ Devid. Mgbe ọ nụrụ ihe Gọlaịat na-ekwu, ọ jụrụ, sị: “Ònye bụ onye Filistia nke a nke a na-ebighị úgwù, na ọ ga-ata usoro agha nile nke Chineke dị ndụ ụta?” (1 Samuel 17:26) N’anya Devid, Golaịat nọchiri anya ma ndị Filistia ma chi ha. Iwe ziri ezi kpaliri Devid ịchọ ịgbachitere Jehova na ndị Izrel ma lụso dike a na-ekpere arụsị ọgụ. Ma, Eze Sọl kwuru, sị: “Ị pụghị ijekwuru onye Filistia nke a ịlụso ya ọgụ: n’ihi na nwata ka ị bụ.”—1 Samuel 17:33.

Lee ka echiche Sọl si dị iche na nke Devid! Ihe na-echegbu Sọl bụ otú nwata na-azụ atụrụ ga-esi gaa lụso ajọ dike ọgụ. Ma, ihe na-echegbu Devid bụ otú mmadụ nkịtị ga-esi na-akparị Eze Onyenwe anyị Jehova. Ihe mere obi ji sie Devid ike bụ na o kwenyesiri ike na Chineke agaghị ahapụ onye ọ bụla katọrọ aha Ya na ndị Ya. Ka Golaịat na-etu ọnụ n’ihi ike ya, Devid tụkwasịrị Jehova obi, na-ele ọnọdụ ahụ anya otú Chineke si ele ihe anya.

Mụ Onwe M Na-ewere Aha Jehova Bịakwute Gị’

Devid nwere ezi ihe mere o ji nwee okwukwe ahụ o nwere. O chetara na Chineke nyeere ya aka ịnapụta atụrụ ya n’aka ọdụm na n’aka anụ ọhịa bea. Obi siri nwata nwoke a na-azụ atụrụ ike na Jehova ga-enyere ya aka ịlụso onye Filistia a siri ike ọgụ. (1 Samuel 17:34-37) Devid ji nanị èbè na nkume ise na-akwọ mụrụmụrụ gaa ịlụso Golaịat ọgụ.

Obere nwa ahụ bụ́ Devid kwetara ime ihe ahụ yiri ihe na-agaghị ekwe omume n’ihi na ọ dabeere n’ike Jehova na-enye. O ji obi ike gwa onye Filistia ahụ, sị: “Gị onwe gị na-ewere mma agha, werekwa ube, werekwa mkpụmkpụ ube, bịakwute m: ma mụ onwe m na-ewere aha Jehova nke usuu nile nke ndị agha bịakwute gị, bụ́ Chineke nke usoro agha nile nke Izrel, Onye ị taworo ụta. Ụbọchị taa ka Jehova ga-emechibido gị nye n’aka m . . . ka ụwa nile wee mara na Chineke dịịrị Izrel: ya na ka mkpọkọta nke a nile wee mara na ọ bụghị mma agha na ube ka Jehova ji azọpụta: n’ihi na Jehova nwe agha nke a.”—1 Samuel 17:45-47.

Gịnị si na ya pụta? Ihe ndekọ ahụ e dere n’ike mmụọ nsọ, na-ekwu, sị: “Devid wee were èbè, werekwa nkume, ka onye Filistia n’ike, o wee tigbuo onye Filistia ahụ, mee ka ọ nwuo; ma mma agha adịghị n’aka Devid.” (1 Samuel 17:50) Devid ejighị mma agha, ma Jehova Chineke kwadosiri ya ike. *

Lee ka okwukwe Devid nwere n’ebe Jehova nọ si rụpụta ezi ihe n’ọgụ ahụ! Mgbe anyị na-aghaghị ikpebi ma ànyị ga-atụ ụmụ mmadụ egwu ka ànyị ga-atụkwasị Jehova obi ịnapụta anyị, ihe anyị ga-eme doro anya: “Anyị aghaghị irubere Chineke isi dị ka onye na-achị achị karịa mmadụ.” (Ọrụ 5:29) Ọzọkwa, mgbe anyị lere nsogbu anyị anya otú Jehova Chineke si ele ihe anya, anyị na-enwe ike ile ọbụna nsogbu ndị tara akpụ anya n’ụzọ kwesịrị ekwesị.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 13 Lee 2006 Calendar of Jehovah’s Witnesses, May/June.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 9]

OLEE OTÚ GOLAỊAT HÀ?

Ihe e dere na 1 Samuel 17:4-7 na-agwa anyị na ogologo Golaịat karịrị kubit isii—ihe dị ka mita atọ. Ihe gosiri otú onye Filistia a toruru ogologo na otú o siruru n’ike bụ uwe agha ya e ji ọla kọpa mee. Ọ dị kilogram 57 n’arọ! Aka ube ya yiri ihe e ji osisi mee, isi ube ya dị kilogram asaa n’arọ. O yidịrị nnọọ ka uwe agha Golaịat ọ̀ ka Devid n’onwe ya arọ!