Nnukwu Mgbalị Otu Onye Mere Iji Nyere Ndị Mmadụ Aka Ịgụ Bible
Nnukwu Mgbalị Otu Onye Mere Iji Nyere Ndị Mmadụ Aka Ịgụ Bible
Ọ nwụrụ n’ala ahịhịa jụrụ oyi nke Siberia, a katọrọ ya ma menye ya ihere. Ọ bụ nanị mmadụ ole na ole na-echeta na o so ná ndị bụ́ isi nyeere ndị Gris ibe ya aka ịmata Chineke. Aha onye a so ná ndị mbụ nyeere ndị Gris aka ịgụ Bible, bụ́ onye a na-ejighị kpọrọ ihe, bụ Seraphim. Nnukwu mgbalị o mere iji hụ na ọ dịịrị ndị mmadụ mfe ịgụ Bible so kpata ọnwụ ya.
SERAPHIM dịrị ndụ mgbe Gris nọ n’okpuru Alaeze Ukwu Ottoman. Onye ọkà mmụta na-ekpe Chọọchị Ọtọdọks nke Gris bụ́ George Metallinos kwuru na ihe e ji mara oge ahụ bụ na “e nweghị ezigbo ụlọ akwụkwọ” nakwa na “ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ agụghị akwụkwọ,” ọbụna ma ụfọdụ ndị ụkọchukwu.
E nwere ọdịiche dị ukwuu n’etiti Grik e ji dee Bible na Grik a na-asụ n’oge Seraphim, bụ́ nke nwere ọtụtụ olumba. Ọdịiche ahụ bịara buo nnọọ ibu nke na ndị na-agụghị akwụkwọ anaghị aghọta Koine bụ́ asụsụ e ji dee Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst. Mgbe nke ahụ kpatara esemokwu, chọọchị kwadoro Grik Koine ahụ ọtụtụ ndị mmadụ na-adịghị aghọta.
Mgbe ihe a nile na-eme, a mụrụ Stephanos Ioannis Pogonatus n’ezinụlọ a ma ama n’obodo mmiri gbara gburugburu bụ́ Lesbos, nke dị na Gris, n’ihe dị ka n’afọ 1670. Ọtụtụ ndị bi n’obodo ahụ dara ogbenye, ha amaghịkwa akwụkwọ. N’ihi ụkọ ụlọ akwụkwọ, Stephanos gara ụlọ akwụkwọ elementrị ya n’ebe obibi ndị mọnk dị n’obodo ahụ. Mgbe ọ ka bụ nnọọ obere nwa, e mere ya dikọn na Chọọchị Ọtọdọks nke Gris ma nye ya aha bụ́ Seraphim.
Ihe dị ka n’afọ 1693, ọchịchọ Seraphim na-achọ ihe ọmụma dugara ya Constantinople (nke bụ́zi Istanbul, Turkey). Ka oge na-aga, nkà ya mere ka ndị Gris a ma ama malite ịkwanyere ya ùgwù. N’oge na-adịghị anya, otu òtù ọchịchị nzuzo nke mba Gris dupụrụ ya ka ọ gaara ha ozi na nke Eze Peter Onye Ukwu nke Russia. Ojije ahụ Seraphim jere Moscow na ọlịla ya mere ka ọ gaa ọtụtụ ebe na Europe, bụ́ ebe ndị ọ nọ hụ mgbanwe ndị a na-eme n’ihe banyere okpukpe na echiche. N’afọ 1698, Seraphim gara England ma meta ndị a ma ama na London nakwa n’Oxford enyi. A kọwaara Achịbishọp Canterbury, bụ́ onyeisi Chọọchị Anglịkan, onye Seraphim bụ, mmata ahụ ha matara ga-abakwara Seraphim uru n’oge na-adịghị anya.
Otú O Si Bipụta Bible
Mgbe Seraphim nọ n’England, o kwubiri na ọ dị ndị Gris ezigbo mkpa inwe nsụgharị ọhụrụ nke “Agba Ọhụrụ” (Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst) bụ́ nke ga-adị mfe nghọta. Seraphim si na Bible onye mọnk bụ́ Maximus sụgharịrị ihe karịrị iri afọ ise tupu mgbe ahụ malite ịsụgharị nke ọhụrụ, nke ndehie ihe na-adịghị na ya, na nke ga-aka adị mfe nghọta. O ji ịnụ ọkụ n’obi malite ọrụ ahụ ma n’oge na-adịghị anya ego gwụnahụrụ ya. Ọ bịara nwekwuo
olileanya mgbe Achịbishọp nke Canterbury kwere ya nkwa inye ya ego ahụ dị ya mkpa. Nkwado a Seraphim nwetara kpaliri ya ịzụ akwụkwọ a ga-eji bie Bible ahụ ma gaa ka ya na onye ga-ebi ya kwuo ego ole ọ ga-eji bie ya.Ma, obibi Bible ahụ kwụsịrị n’etiti Oziọma Luk. Mgbanwe e nweziri n’ọchịchị England mere ka Achịbishọp nke Canterbury kwụsị inye ya ego maka ọrụ ahụ. Kama Seraphim ikwe ka nke ahụ kụda ya obi, ọ gwara ụfọdụ ndị ọgaranya ka ha nyere ya aka, o jisikwara ike bipụta nke o degharịrị edegharị n’afọ 1703. Òtù Na-akwalite Mgbasa Ozi Ọma ná Mba Ofesi so weta ego e ji bipụta ya.
Bible nke Maximus bu ụzọ sụgharịa, bụ́ nke dị mpịakọta abụọ, bu ihe odide Grik nke oge ochie. O buru ibu ma na-anyị arọ. Seraphim ji mkpụrụ akwụkwọ ndị dị obere karị dee nsụgharị Bible ya nke o degharịrị edegharị, o nwere nanị nsụgharị nke Grik ọgbara ọhụrụ, ọ dịkwa obere ma dị ọnụ ala karịa nke mbụ ahụ.
O Mere Ka Otu Esemokwu Ka Njọ
Ọkà mmụta bụ́ George Metallinos kwuru, sị: “N’ezie, Bible a e degharịrị edegharị baara nnọọ ndị mmadụ uru. Otú ọ dị, Seraphim ji ohere ahụ katọọ ụfọdụ ndị ụkọchukwu bụ́ ndị na-emegide nsụgharị [Bible].” Iwe were ndị ụkọchukwu n’ihi ihe Seraphim kwuru n’okwu mmalite nke akwụkwọ ya nke bụ́ na ya bipụtara nsụgharị ahụ ‘kpọmkwem maka ụfọdụ ndị ụkọchukwu na ndị isi chọọchị bụ́ ndị na-adịghị aghọta Grik [Koine], ka Mmụọ Nsọ Dị Nsọ wee nyere ha aka ịgụ na ịghọta ihe dị n’ihe odide ndị mbụ nke Bible, iji nwee ike ịkụziri ya Ndị Kraịst nkịtị.’ (Akwụkwọ bụ́ The Translation of the Bible Into Modern Greek—During the 19th Century) Seraphim si otú ahụ tinye onwe ya n’esemokwu kpụ ọkụ n’ọnụ dị na Chọọchị Ọtọdọks nke Gris n’ihe banyere nsụgharị Bible.
Ụfọdụ n’ime ndị ahụ na-ese okwu ghọtara na ọ bụ nanị ịgụ Bible ga-eme ka ndị mmadụ na Chineke dị ná mma ma mee ka ha na-akpakwu ezi àgwà. Ha chekwara na ndị ụkọchukwu kwesịrị ịghọtakwu Akwụkwọ Nsọ nke ọma. E wezụga nke ahụ, ndị ahụ kwadoro ka a sụgharịa Bible kweere na e nwere ike ịsụgharị eziokwu nke Akwụkwọ Nsọ gaa n’asụsụ ọ bụla.—Mkpughe 7:9.
Ndị na-ekwu ka a ghara ịsụgharị Bible ji ihu abụọ na-ekwu na ịsụgharị Bible gaa n’asụsụ ọzọ ga-agwagbu ihe dị na ya ma napụ chọọchị ikike o nwere ịkọwa Bible na iwepụta ozizi ndị a ga na-ezi. Ma ihe na-atụ ha ụjọ n’ezie bụ na ndị Protestant ji ịsụgharị Bible na-anapụ Chọọchị Ọtọdọks nke Gris ikike ya. Ọtụtụ ndị ụkọchukwu chere na ọ bụ ọrụ dịịrị ha imegide ihe ọ bụla nwere ike inyere ndị Protestant aka, gụnyere mgbalị a na-eme ime ka ndị nkịtị ghọta Bible. Nsụgharị Bible si otú ahụ ghọọ isi ihe na-esere ndị Protestant na ndị Ọtọdọks okwu.
Ọ bụ ezie na Seraphim ebughị n’obi ịhapụ Chọọchị Ọtọdọks, o kwuru okwu megide amaghị nke a na-akọ na ịkpọasị nke ndị ụkọchukwu ahụ na-emegide ya. N’okwu mmalite nke “Agba Ọhụrụ” ya, o dere, sị: “Ọ dị Onye Kraịst ọ bụla na-atụ egwu Chineke mkpa ịgụ Bible Nsọ” ka o wee nwee ike “iṅomi Kraịst ma rube isi n’ihe [ọ] kụziri.” Seraphim nọgidere na-ekwu na iwu a machibidoro ndị mmadụ ịgụ Bible si n’aka Ekwensu.
A Kpagburu Ya n’Ụzọ Kpụ Ọkụ n’Ọnụ
Mgbe nsụgharị Bible Seraphim ruru Gris, ọ kpasuru ndị Chọọchị Ọtọdọks iwe. A machibidoro nsụgharị ọhụrụ ahụ iwu. A kpọrọ ụfọdụ Bible ahụ ọkụ ma yie onye ọ bụla nwere ya ma ọ bụ na-agụ ya egwu na a ga-achụpụ ya na chọọchị. Onyeisi Gabriel nke Atọ nke Chọọchị Ọtọdọks nyere iwu ka a kwụsị ikesa nsụgharị Bible Seraphim, kpọọ ya nsụgharị na-adịghị mkpa na nke na-abaghị uru.
Ọ bụ ezie na ike agwụghị Seraphim, ọ hụrụ na ọ dị ya mkpa iji akọ mee ihe. N’agbanyeghị na chọọchị machibidoro Bible ahụ ọ sụgharịrị iwu, ọtụtụ ndị ụkọchukwu na ndị nkịtị nọ na chọọchị nwere mmasị na ya. O kesara nnọọ ọtụtụ nsụgharị Bible ahụ. Ma, esemokwu ya na ndị iro ya nọ n’ọkwá dị elu ka na-amalite nnọọ amalite.
Ihe Ndị Dugara n’Ọnwụ Ya
E wezụga mgbalị Seraphim mere ịhụ na e kesara Bible, o sonyere n’òtù ndị chọrọ mgbanwe na ndị hụrụ mba n’anya. Iji rụọrọ òtù ndị a ọrụ, ọ gaghachiri Moscow n’oge okpomọkụ nke afọ 1704. Ọ ghọrọ ezigbo enyi nke Peter Onye Ukwu, ruokwa oge ụfọdụ, ọ rụrụ ọrụ dị ka prọfesọ n’Ụlọ Akwụkwọ Dị Elu nke Eze Russia. Otú ọ dị, n’ihi na Seraphim nọ na-eche ihe nwere ike ime Bible ahụ ọ sụgharịrị, ọ laghachiri Constantinople n’afọ 1705.
Mgbe Seraphim bipụtaghachiri Bible ya ahụ n’otu afọ ahụ, o wepụrụ okwu mmalite ahụ na-akpasu iwe dị na nke mbụ. O dere obere ihe ná mmalite ya bụ́ nke gbara ndị mmadụ ume ịgụ Bible. E kesara ọtụtụ Bible a, ọ dịghịkwa ihe ọjọọ a maara onyeisi Chọọchị Ọtọdọks mere banyere ya.
Otú o sina dị, n’afọ 1714, Alexander Helladius, bụ́ onye Gris na-eme njem na onye na-emegide nsụgharị Bible, kpara Seraphim aka ọjọọ. N’akwụkwọ ya bụ́ Status Præsens Ecclesiæ Græcæ (Ọnọdụ Chọọchị Gris Nọ na Ya Ugbu A), ọ katọrọ ndị sụgharịrị Bible ahụ na otú ha si sụgharịa okwu dị iche iche ajọ nkatọ. Helladius wepụtaara Seraphim otu isiakwụkwọ zuru ezu, kọwaa Seraphim dị ka onye ohi, onye wayo, nakwa onye na-amaghị akwụkwọ na ajọ onye aghụghọ. Eziokwu ọ̀ dị n’ebubo ndị ahụ? Onye na-ede akwụkwọ bụ́ Stylianos Bairaktaris kwuru echiche ọtụtụ ndị ọkà mmụta maara nke a na-akọ nwere mgbe ọ kpọrọ Seraphim ‘onye nsụgharị oge ochie nke maara nke a na-akọ’ bụ́ onye a kpagburu n’ihi na ọ maara ihe karịa ndị oge ya. N’agbanyeghị nke ahụ, akwụkwọ Helladius so kpata ajọ ọnwụ Seraphim nwụrụ.
E Nyowere Ya Enyowe
Ka ọ na-erule mgbe Seraphim laghachiri Russia n’afọ 1731, Peter Onye Ukwu anwụọla. N’ihi ya, onye dikọn ahụ bụ́ onye Gris enwekwaghị eze na-echebe ya. Nnukwu Eze Nwanyị Anna Ivanovna bụ́ onye na-achị mgbe ahụ kpachaara anya ka a ghara inwe ihe ọ bụla ga-akpata ọgba aghara n’obodo ya. Na January 1732, a nụrụ kepu kepu na St. Petersburg na e nwere onye Gris bụ́ onye nledo nke na-adịghị echere alaeze ukwu ahụ echiche ọma. Onye ahụ a na-enyo enyo bụ Seraphim. E jidere ya ma kpọga ya n’ebe obibi ndị mọnk dị na Nevsky iji gbaa ya ajụjụ ọnụ. Akwụkwọ ahụ Helladius dere dị n’ebe obibi ndị mọnk ahụ, akwụkwọ ahụ bokwara Seraphim ebubo na o mere mpụ dị iche iche. Onye dikọn ahụ bụ́ Seraphim dere ihe odide atọ iji zọrọ isi ya. Ajụjụ ọnụ ahụ were ọnwa ise, o sikwara ike ime ka a kwụsị inyo Seraphim enyo.
Ebe ọ bụ na ọ dịghị ezi ihe a hụrụ megide Seraphim, a maghị ya ikpe ọnwụ. Otú ọ dị, n’ihi ebubo ndị ahụ Helladius boro Seraphim, o siiri ndị ọchịchị ike ịhapụ Seraphim. A mara onye dikọn a bụ́ onye Gris ikpe ịnọ na Siberia ruo mgbe ọ ga-anwụ. Mgbe a na-ama ya ikpe, e kwuru na ọmụma ikpe ahụ dabeere n’ebubo ndị dị “n’akwụkwọ Helladius bụ́ onye Gris dere.” Na July 1732, Seraphim bụ́ onye a tụrụ ịga rutere n’ebe ọwụwa anyanwụ Siberia, a tụbakwa ya n’ajọ ụlọ mkpọrọ Okhotsk.
Ihe dị ka afọ atọ ka nke ahụ gasịrị, Seraphim nwụrụ dị ka onye a gbahapụrụ agbahapụ ma chefuo. Mkpebi ụfọdụ o mere hiere ụzọ, otú o si mee ihe mgbe ụfọdụ egosighịkwa amamihe, ma Bible ahụ ọ sụgharịrị bụ otu n’ime ọtụtụ nsụgharị ndị e nwere ugbu a n’asụsụ Grik nke oge a. * Otu n’ime nsụgharị ndị ahụ bụ New World Translation of the Holy Scriptures, bụ́ nke dịkwa n’ọtụtụ asụsụ ndị ọzọ. Lee otú anyị kwesịrị isi nwee obi ụtọ na Jehova Chineke echebewo Okwu ya ka ndị si ebe nile nwee ike “bịaruo ezi ihe ọmụma nke eziokwu”!—1 Timoti 2:3, 4.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 26 Lee isiokwu bụ́ “Mgba A Gbara Iji Nwee Bible n’Asụsụ Grik Ọgbara Ọhụrụ,” nke dị n’Ụlọ Nche, November 15, 2002, peeji nke 26-29.
[Foto dị na peeji nke 12]
Peter Onye Ukwu
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 10]
Foto: Site n’ikike a natara American Bible Society