Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Ihe Chineke Zubere Maka Ụwa?

Olee Ihe Chineke Zubere Maka Ụwa?

Olee Ihe Chineke Zubere Maka Ụwa?

N’IHI gịnị ka o ji amasị gị ịkpagharị n’ogige ntụrụndụ ma ọ bụ ịgagharị n’ebe e nwere okooko osisi ndị na-esi ísì ọma? N’ihi gịnị ka ị na-eji enwe obi ụtọ mgbe ị hụrụ ọdọ mmiri mara mma ma ọ bụ ugwu ndị dị nnọọ elu? N’ihi gịnị ka ị na-eji ege ntị mgbe ụmụ nnụnụ nọ n’elu osisi na-abụ abụ ụtọ? N’ihi gịnịkwa ka o ji enye gị obi ụtọ ikiri ka mgbada mara mma na-awụ ọsọ ma ọ bụ ka atụrụ na-ata ahịhịa n’ebe ahịhịa juru?

Ajụjụ nile a nwere otu azịza. E kere anyị ibi na Paradaịs! Nke ahụ bụ ebe nne na nna anyị mbụ, bụ́ Adam na Iv, malitere ndụ ha. Anyị si n’aka ha bute ọchịchọ a anyị nwere ibi na Paradaịs, ọ bụkwa Onye kere ha, bụ́ Jehova Chineke, kenyere ya n’ime ha. Ọ maara na anyị bụ́ ụmụ mmadụ ga-enwe obi ụtọ ibi na Paradaịs n’ihi na o kenyere anyị àgwà ndị dị mkpa iji bie n’ụwa dị otú ahụ magburu onwe ya.

N’ihi gịnị ka Jehova ji kee ụwa? Ọ ‘kpụrụ ya ka ụmụ mmadụ wee biri n’ime ya.’ (Aịsaịa 45:18) ‘Onye mere ụwa’ nyere Adam na Iv paradaịs mara mma, bụ́ ogige Iden, ka ọ bụrụ ụlọ ha. (Jeremaịa 10:12; Jenesis 2:7-9, 15, 21, 22) Iyi ndị dị na ya, okooko osisi ya, na osisi ya aghaghị nnọọ ịmasịwo ha! Ha pụrụ ịhụ nnụnụ ndị mara mma ka ha na-efegharị n’elu, hụkwa ụdị ụmụ anụmanụ dị iche iche ka ha na-agbagharị n’ala—ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ha mmadụ na-atụ egwu. Azụ na ihe ndị ọzọ e kere eke na-egwugharị ná mmiri ndị dị ọcha ma na-egbuke egbuke dị n’ụwa. Nke kasị mkpa bụ na Adam na Iv bi. Ha pụrụ ịmụta ndị yiri ha, ha na ezinụlọ ha na-amụba amụba ejirikwa ọṅụ gbasaa Paradaịs ahụ ha bi na ya.

Ọ bụ ezie na ụwa abụghị paradaịs ugbu a, a pụrụ iji ya tụnyere ọmarịcha ụlọ nke otu ezinụlọ nwere obi ụtọ. Ụwa Chineke nyere anyị dị ka ụlọ nwere ihe ndị dị anyị mkpa—ìhè, okpomọkụ, mmiri, na nri. Lee ka o si amasị anyị inweta ìhè na okpomọkụ nke anyanwụ na ìhè na-adịghị ekpo ọkụ nke ọnwa n’abalị! (Jenesis 1:14-18) N’ime ụwa, e nwere ihe ndị e ji emenwu ọkụ, ihe ndị dị ka kol na mmanụ, bụ́ ndị anyị pụrụ isi na ha nweta okpomọkụ. N’ihi otú mmiri si ezo ma na-alaghachi n’eluigwe iji zoo ọzọ, tinyere ọtụtụ osimiri, ọdọ mmiri, na oké osimiri ndị dị n’ụwa, anyị nwere mmiri. Ahịhịa ndụ kpuchikwara ala dị ka kapet.

Dị ka nnọọ ka a pụrụ ịkwaju ihe oriri n’ụlọ, ụwa nwere ọtụtụ ihe oriri. Jehova na-eji ihe ndị a kụrụ n’ubi na mkpụrụ osisi ‘enye anyị oge mkpụrụ ji amị ma na-eme anyị ezi obi ụtọ.’ (Ọrụ 14:16, 17) Ebe ọ bụ na ụwa bụ ezi ebe obibi ugbu a, cheenụ echiche otú ọ ga-adị mgbe “Chineke onye obi ụtọ,” bụ́ Jehova, ga-eme ka ọ ghọọ paradaịs!—1 Timoti 1:11.

[Ebe e si Nweta Foto dị na peeji nke 2]

IHU AKWỤKWỌ: Ụwa: Foto NASA; Kpakpando: NASA, ESA na AURA/⁠Caltech