Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọ̀ Dị Onye Na-eche Banyere Ndị Agadi?

Ọ̀ Dị Onye Na-eche Banyere Ndị Agadi?

Ọ̀ Dị Onye Na-eche Banyere Ndị Agadi?

KA OTU onye nche abalị na-elegharị anya, ọ hụrụ ihe wụrụ ya akpata oyi. Ọ hụrụ ozu abụọ n’èzí otu ọmarịcha ụlọ—ozu di na nwunye meworo agadi bụ́ ndị si na windo nke okpukpu ụlọ nke asatọ wụtuo. Ọ bụ ezie na ogbugbu ha gburu onwe ha na-awụ akpata oyi, ma ihe mere ha ji gbuo onwe ha kadị awụ akpata oyi. Otu mpempe akwụkwọ a hụrụ n’akpa uwe nke nwoke sịrị: “Ihe mere anyị ji gbuo onwe anyị bụ n’ihi na nwa anyị nwoke na nwunye ya nọgidere jiri obi ọjọọ na-emeso anyị ihe ma na-emegbu anyị.”

Akụkọ a pụrụ iyi ihe na-adịghị emekebe, ma ọ dị mwute ikwu na ihe ahụ mere ha ji gbuo onwe ha bụ ihe zuru ebe nile. N’ezie, ọ dịghị ebe a na-adịghị emeso ndị agadi mmeso ọjọọ n’ụwa. Tụlee ihe ndị na-esonụ:

• N’otu nnyocha e mere, pasent anọ nke ndị agadi nọ na Canada kwuru na a na-emegbu ha. Ọ na-abụkarịkwa ndị ezinụlọ ha na-emegbu ha. Otú ọ dị, ihere na ụjọ adịghị ekwe ọtụtụ ndị agadi kwupụta ihe a na-eme ha. Ndị ọkachamara kwuru na ndị agadi a na-emeso mmeso ọjọọ pụrụ ịfọ nke nta ka ha ruo pasent iri.

• Akwụkwọ akụkọ bụ́ India Today na-akọ, sị: “Ọ bụrụ na e lebakwuo anya n’ime mba India, bụ́ ebe o yiri ka ndị mmadụ hà hụrụ nnọọ ndị ezinụlọ ha n’anya, ihe a ga-ahụ bụ imerime ndị agadi ndị ụmụ ha na-achọghịzi iji anya ahụ.”

• Dị ka atụmatụ kasị zie ezie nke e mere si kwuo, otu Ụlọ Ọrụ Na-emegide Mmegbu A Na-emegbu Ndị Agadi na-akọ, sị: “Ihe dị ka otu nde ma ọ bụ nde abụọ nke ndị America dị afọ iri isii na ise ma ọ bụ karịa abụwo ndị ndị ha na-elegara anya maka nchebe merụrụ ahụ́, megbuo, ma ọ bụ mesoo ihe n’ụzọ obi ọjọọ.” Osote ọkàiwu nke obodo San Diego, California, kwuru na imegbu ndị agadi “bụ nsogbu kasị njọ nke na-eche ndị na-ahụ na e debere iwu ihu taa.” Ọ gbakwụnyere, sị: “M na-achọpụta na nsogbu ahụ ga-akawanye njọ n’afọ ole na ole na-abịa n’ihu.”

• Na Canterbury, New Zealand, ihe kasị enye nsogbu n’obi bụ na ọ bụ ndị ezinụlọ ndị agadi a na-emesokarị ha ihe n’ụzọ obi ọjọọ. Ndị na-emekarịkwa nke a bụ ndị na-aṅụ ọgwụ ọjọọ, ndị aṅụrụma, ma ọ bụ ndị ịgba chaa chaa riri ahụ́. Ọnụ ọgụgụ nke ndị agadi a kọrọ na e mesoro mmeso ọjọọ na Canterbury rịrị elu site n’iri isii na ise na 2002 ruo n’otu narị na asaa na 2003. Onyeisi nke otu ụlọ ọrụ e hiwere iji gbochie mmeso ọjọọ ndị dị otú ahụ na-ekwu na ọ pụrụ ịbụ na ọnụ ọgụgụ ahụ dị nnọọ nta ma e jiri ya tụnyere ọnụ ọgụgụ ndị agadi a na-emeso ihe n’ụzọ obi ọjọọ n’ezie.

• Akwụkwọ akụkọ a na-ebipụta na Japan na-akọ na ndị Òtù Ọkàiwu nke Mba Japan na-atụ aro na e kwesịrị “ileba anya n’okwu banyere ndị agadi a na-emeso mmeso ọjọọ ngwa ngwa karịa ka e kwesịrị ileba anya n’okwu banyere ụmụaka ma ọ bụ ndị ọzọ a na-emeso mmeso ọjọọ n’ezinụlọ.” N’ihi gịnị? Akwụkwọ akụkọ ahụ na-ekwu na otu ihe kpatara ya bụ na “e jiri ya tụnyere ụmụaka ma ọ bụ ndị di ma ọ bụ nwunye a na-emeso mmeso ọjọọ, o yiri ka ọ̀ na-ete aka tupu a mata banyere ndị agadi a na-emeso mmeso ọjọọ. Otu n’ime ihe mere nke a ji dị otú a bụ na ọ na-adị ndị agadi ka ọ̀ bụ ha ka o si n’aka mgbe ụmụ ha mesoro ha mmeso ọjọọ. Ihe ọzọkwa mere o ji dị otú a bụ n’ihi na gọọmenti na ndị ọchịchị emebeghị ihe banyere ọnọdụ ahụ.”

Ihe atụ ole na ole a bụ́ ndị na-egosi ihe na-eme n’ụwa nile na-eme ka anyị na-ajụ, sị: N’ihi gịnị ka e ji eleghara ọtụtụ ndị agadi anya ma na-emeso ha mmeso ọjọọ? Olileanya ọ̀ dị na a ga-eme ihe banyere nsogbu a? Olee ihe pụrụ ịkasi ndị agadi obi?