Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

N’Iwu Mozis, n’ihi gịnị ka ọrụ ụfọdụ akụkụ ahụ́ e ji enwe mmekọahụ na-arụ ji eme ka mmadụ ‘rụọ arụọ’?

Chineke kere mmekọahụ ka ọ bụrụ ma ihe e ji amụta ụmụ ma ihe ga na-enye di na nwunye obi ụtọ. (Jenesis 1:28; Ilu 5:15-18) Otú ọ dị, na Levitikọs isi 12 na nke 15, e depụtara nnọọ ụkpụrụ ndị metụtara ịrụ arụ nke ure na-agbapụ n’ahụ́ nwoke ji enwe mmekọahụ, ịhụ nsọ, na ịmụ nwa na-akpata. (Levitikọs 12:1-6; 15:16-24) Iwu ndị dị otú ahụ e nyere Izrel oge ochie mere ka ahụ́ gbasie ha ike, mee ka ha na-ebi ndụ dị nnọọ ọcha. Ha mekwara ka o doo ụmụ Izrel anya na ọbara dị nsọ nakwa na nanị ihe e kwesịrị iji ya mee bụ ikpuchi mmehie.

Otú n’ime uru ihe ndị ahụ Iwu Mozis kwuru banyere ọrụ ụfọdụ akụkụ ahụ́ e ji enwe mmekọahụ na-arụ baara ụmụ Izrel bụ na o mere ka ha ghara ịdị na-arịa ọrịa aghara aghara. Akwụkwọ bụ́ The Bible and Modern Medicine na-ekwu, sị: “Mmadụ ịghara inwe mmekọahụ n’oge ndị ahụ e nyere iwu ya mgbe nwanyị na-ahụ nsọ ya mere ka a ghara ibute ọrịa ndị a na-ebute site ná mmekọahụ . . . o gbochikwara ọrịa cancer akpa nwa.” Iwu ndị dị otú ahụ chebere ndị Chineke pụọ n’ọrịa ndị ọ pụrụ ịbụ na ha amatụdịghị banyere ha ma ọ bụkwanụ ndị ha na-agaaraghị achọpụtali. Idebe onwe ha ọcha n’ihe metụtara mmekọahụ mere ka mba ahụ, bụ́ mba Chineke kwere nkwa na ha ga-aba ụba ma nwee ọganihu, nwekwuo ike ịmụ ụmụ. (Jenesis 15:5; 22:17) Iwu ahụ mekwara ka obi ruo ndị Chineke ala. Ọ bụrụ na di na nwunye na-edebe iwu ndị a, ha na-amụta ịchịkwa agụụ mmekọahụ ha.

Ihe bụ́ isi na-akpata ịrụ arụ dịgasị iche iche nke akụkụ ahụ́ ndị e ji enwe mmekọahụ bụ ọbara na-esi na ha agbapụ. Iwu Jehova nyere banyere ọbara mere ka ụmụ Izrel ghọta na ọ bụghị nanị na ọbara dị nsọ kama o mekwara ka ha ghọta uru ọ bara n’ofufe Jehova, nke bụ́, iji ya achụ àjà na iji ya ekpuchi mmehie.—Levitikọs 17:11; Deuterọnọmi 12:23, 24, 27.

Ya mere, ihe ndị a e depụtasịrị n’Iwu ahụ bụ́ nke a chọrọ ka ụmụ Izrel na-eme, bụ n’ihi ezughị okè mmadụ. Ndị Izrel maara na mgbe Adam na Iv mesịrị mmehie, ha apụghị ịmụ ụmụ zuru okè. Ụmụ nile ha ga-amụ ga-eketacha mmehie —ezughị okè na ọnwụ. (Ndị Rom 5:12) N’ihi nke a, nanị ihe ndị nne na nna na-enye ụmụ ha bụ ndụ na-ezughị okè na mmehie, ọ bụ ezie na e keburu akụkụ ahụ́ ndị e ji amụ nwa ka di na nwunye na-eji ha enyefe ụmụ ha ndụ zuru okè.

N’ihi ya, ihe ndị Iwu ahụ chọrọ n’aka ụmụ Izrel banyere ịdị nsọ ga-echetara ha ọ bụghị nanị mmehie ha ketara eketa kama mkpa àjà mgbapụta ahụ dị ha iji kpuchie mmehie ha na iji mee ka ụmụ mmadụ zuo okè ọzọ. N’ezie, àjà anụmanụ ha na-achụbu emezughị nke a. (Ndị Hibru 10:3, 4) Ihe mere e ji nye ụmụ Izrel Iwu Mozis bụ iji duga ha na Kraịst na iji nyere ha aka ịghọta na ọ bụ nanị site n’àjà Jizọs ji ndụ mmadụ ya zuru okè chụọ ka a pụrụ ịgbaghara mmadụ mmehie, na-emeghere ndị kwesịrị ntụkwasị obi ohere nke inweta ndụ ebighị ebi.—Ndị Galeshia 3:24; Ndị Hibru 9:13, 14.