Chineke Na-eche Banyere Ndị Agadi
Chineke Na-eche Banyere Ndị Agadi
Ọ BỤGHỊ ihe ijuanya na a na-emeso ndị agadi mmeso ọjọọ n’ọtụtụ ebe taa. Bible buru amụma ogologo oge gara aga na “n’ụbọchị ikpeazụ” nke usoro ihe a nke na-adịghị asọpụrụ Chineke, ndị mmadụ ga-abụ “ndị hụrụ onwe ha n’anya, . . . ndị na-enweghị obi mmadụ.” (2 Timoti 3:1-3) Okwu Grik a sụgharịrị ịbụ ‘inwe obi mmadụ’ pụrụ ịgụnye inwe ịhụnanya nke kwesịrị nnọọ ịdị n’etiti ndị òtù ezinụlọ. Dị nnọọ ka amụma Bible ahụ kwuru, ịhụnanya dị otú ahụ kọrọ nnọọ ụkọ taa.
N’adịghị nnọọ ka ndị na-emegbu ndị agadi, Jehova Chineke ji ndị agadi kpọrọ ihe nke ukwuu ma na-eche banyere ha. Lee otú Bible si gosi na nke a bụ eziokwu.
“Onyeikpe nke Ndị Inyom Di Ha Nwụrụ”
Akwụkwọ Nsọ Hibru na-egosi n’ụzọ doro anya na Jehova Chineke na-eche banyere ndị agadi. Dị ka ihe atụ, n’Abụ Ọma 68:5, Devid kpọrọ Chineke “onyeikpe nke ndị inyom di ha nwụrụ,” bụ́ ndị ọtụtụ n’ime ha bụ ndị agadi. * Ná nsụgharị Bible ndị ọzọ, a sụgharịrị okwu ahụ bụ́ “onyeikpe” ịbụ “onye na-agbachitere,” “onye na-echebe,” na “ọnụ na-ekwuru.” Ihe ịrụ ụka adịghị ya na Jehova na-eche banyere ndị inyom di ha nwụrụ. Leenụ, Bible na-ekwu na ọ bụrụ na e mesoo ha mmeso ọjọọ, Jehova na-ewe iwe dị ọkụ. (Ọpụpụ 22:22-24) Chineke na ndị ohu ya ji ndị inyom di ha nwụrụ—na ndị agadi nile kwesịrị ntụkwasị obi—kpọrọ ihe nke ukwuu. Ilu 16:31 na-akọwa otú Jehova Chineke na ndị ya si ele ndị agadi anya mgbe o kwuru, sị: “Okpueze nke mara mma ka isi awọ bụ, n’ụzọ ezi omume ka a ga-ahụ ya.”
Levitikọs 19:32) Ya mere, n’Izrel, mmadụ ịkwanyere ndị agadi ùgwù na mmekọrịta onye ahụ na Jehova Chineke nwere njikọ. Mmadụ apụghị ikwu na ya hụrụ Chineke n’anya ma ọ bụrụ na ọ na-emeso ndị agadi mmeso ọjọọ.
Ka a sịkwa ihe mere ịkwanyere ndị agadi ùgwù ji bụrụ akụkụ dị mkpa nke Iwu ahụ Jehova nyere Izrel. E nyere ụmụ Izrel iwu, sị: “Ị ga-ebili ọtọ n’ihu onye isi awọ, sọpụrụkwa ihu okenye, tụọkwa egwu Chineke gị: Mụ onwe m bụ Jehova.” (Ndị Kraịst anọghị n’okpuru Iwu Mozis. Otú ọ dị, ha nọ n’okpuru “iwu nke Kraịst ahụ,” bụ́ ihe na-ekpebi ụdị àgwà ha ga na-akpa, gụnyere inwe ịhụnanya n’ebe ndị mụrụ ha meworo agadi nọ na ilekọta ha. (Ndị Galeshia 6:2; Ndị Efesọs 6:1-3; 1 Timoti 5:1-3) Ihe na-eme ka Ndị Kraịst na-ahụ ndị ọzọ n’anya abụghị nanị n’ihi na e nyere ha iwu ime otú ahụ kama ọ bụ n’ihi na obi ha na-akpali ha ime otú ahụ. Pita onyeozi gbara anyị ume, sị: “Na-enwenụ ịhụnanya siri ike n’ebe ibe unu nọ site n’obi.”—1 Pita 1:22.
Jems onye na-eso ụzọ gwakwara anyị ihe ọzọ mere anyị ga-eji na-elekọta ndị agadi. O dere, sị: “Ụdị ofufe nke dị ọcha, nke a na-emerụghịkwa emerụ site n’ụzọ Chineke na Nna anyị si ele ihe anya bụ nke a: ilekọta ụmụ mgbei na ụmụ nwanyị di ha nwụrụ ná mkpagbu ha, na mmadụ idebe onwe ya n’enweghị ntụpọ n’ebe ụwa dị.” (Jems 1:27) Jems kwuru otu ihe e kwesịrị ichebara echiche. Ọ dọọrọ uche anyị gaa n’otú ndị a anyị hụrụ n’anya dịruru Jehova mkpa.
N’ihi ya, o bighị nanị n’ịghara imeso ndị agadi mmeso ọjọọ. Kama, anyị kwesịrị igosi ha site n’omume na anyị hụrụ ha n’anya site n’imere ha ihe ọma. (Lee igbe bụ́ “Ebe A Na-egosipụta Ịhụnanya,” nke dị na peeji nke 6-7.) Jems dere, sị: “Okwukwe nke na-enweghị ọrụ bụ nke nwụrụ anwụ.”—Jems 2:26.
Ịkasi Ndị Agadi Obi “ná Mkpagbu Ha”
O nwekwara ihe ọzọ anyị ga-amụta site n’ihe ahụ Jems kwuru. Rịba ama na Jems gwara Ndị Kraịst ka ha lekọta ndị inyom di ha nwụrụ “ná mkpagbu ha.” Ihe okwu Grik a a sụgharịrị ịbụ “mkpagbu” pụtara n’ụzọ bụ́ isi bụ obi erughị ala, nhụsianya, ma ọ bụ ahụhụ, bụ́ ihe ndị na-abịara anyị n’ihi ọnọdụ anyị nọ na ya ná ndụ. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na obi adịghị eru ọtụtụ ndị agadi ala. Owu na-ama ụfọdụ n’ime ha. Ndị ọzọ na-enwe nkụda mmụọ n’ihi na ha adịghịzi emeli ihe ndị ha na-emebu tupu ha emee agadi. Ọbụna ndị nke na-ejechi ozi Chineke anya pụrụ inwe nkụda mmụọ. Tụlee ihe banyere John, * bụ́ onye jiworo ikwesị ntụkwasị obi kpọsaa Alaeze Chineke ruo ihe karịrị iri afọ anọ ugbu a, bụ́ nke o jiri afọ iri atọ ikpeazụ n’ime afọ ndị ahụ jee ozi oge nile pụrụ iche. John, bụ́ onye dị afọ iri asatọ na ụma ugbu a, kwuru na ya na-enwe nkụda mmụọ mgbe ụfọdụ. Ọ na-ekwu, sị: “Ọtụtụ mgbe m na-eche echiche laa azụ, m na-echeta ọtụtụ ihe ndị m mejọrọ, ha dị nnọọ ọtụtụ. Ana m anọgide na-agwa onwe m na m gaara emeta ha.”
Ndị dị otú a pụrụ inweta nkasi obi site n’ịmara na n’agbanyeghị na Jehova zuru okè, ọ dịghị achọ ka anyị mee ihe dị ka ndị zuru okè. Ọ bụ ezie na ọ maara ebe ndị anyị na-emejọ, ma Bible na-ekwu banyere ya, sị: “Ọ bụrụ na Ị rịba ajọ omume nile ama, Ja, Onyenwe anyị, ònye ga-eguzo?” (Abụ Ọma 130:3) Jehova na-ahụ nnọọ ihe karịrị ebe ndị anyị mejọrọ, ọ na-ahụ ihe dị anyị n’obi. Olee otú anyị si mara nke a?
n’Abụ Ọma 139:1-3: “Jehova, I gwupụtawo ala obi m, I wee mara m. Gị onwe gị amawo nnọdụ ala m na mbili ọtọ m, Ị na-aghọta echiche m nile site n’ebe dị anya. Okporo ụzọ m na ndina ala m ka Ị fụchaworo dị ka ọka, ọ bụkwa ụzọ m nile ka Ị maworo nke ọma.” N’ebe a, okwu ahụ bụ́ ‘ịfụcha’ pụtara n’ụzọ nkịtị “ịyọcha” dị nnọọ ka onye ọrụ ugbo si ayọchapụ igbogbo site n’ọka. Devid sitere n’ike mmụọ nsọ mesie anyị obi ike na Jehova maara otú ọ ga-esi yọchapụta ihe ọma ndị anyị mere ma debe ha ebe ọ ga na-echeta ha.
Chineke nyere Eze Devid—onye na-ezughị okè nke mekwara mmehie—ike mmụọ nsọ ide okwu ndị na-esonụ, bụ́ ndị e dekọrọNna anyị nke eluigwe, bụ́ onye nwere obi ebere, na-echeta ọrụ ọma nile anyị na-arụ ma ọ bụrụhaala na anyị anọgide na-ekwesị ntụkwasị obi, ọ na-ejikwa ha akpọrọ ihe. N’ezie, Bible kwuru na Chineke ga-ele ya anya dị ka ajọ omume ya ichefu ọrụ anyị na ịhụnanya anyị gosiri maka aha ya.—Ndị Hibru 6:10.
“Ihe Mbụ Agabigawo”
Bible na-egosi na Chineke ezubeghị ka ụmụ mmadụ na-eme agadi. Ọ bụ nanị mgbe nne na Jenesis 3:17-19; Ndị Rom 5:12) Nke a agaghị adịgide otú a na-aga n’ihu.
nna anyị, nwoke mbụ na nwanyị mbụ, mehiesịrị ka nsogbu ndị ya na ime agadi so aga malitere kpawa ụmụ mmadụ aka ọjọọ. (Dị ka e kwuru ná mmalite, ọtụtụ n’ime nsogbu ndị na-akpa anyị aka ọjọọ taa—gụnyere imeso ndị agadi mmeso ọjọọ—so n’ihe ndị na-agba akaebe na anyị bi “n’ụbọchị ikpeazụ” nke usoro ihe a. (2 Timoti 3:1) Nzube Chineke bụ iwepụ nsogbu nile nke mmehie na-akpata, tinyere mkpamkpa nile ime agadi na ọnwụ na-akpa. Bible na-ekwu, sị: “[Chineke] ga-ehichapụkwa anya mmiri ọ bụla n’anya ha, ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru újú ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ. Ihe mbụ agabigawo.”—Mkpughe 21:4.
N’ime ụwa ọhụrụ Chineke, ihe mgbu nke ime agadi na-akpata ga-abụ ihe akụkọ. A gaghịzikwa na-emeso ndị agadi mmeso ọjọọ. (Maịka 4:4) Ọbụna ndị nwụrụ anwụ bụ́ ndị nọ ná ncheta Chineke ga-adịghachi ndụ, ka ha wee nwee ohere nke ịdị ndụ ebighị ebi na paradaịs elu ala. (Jọn 5:28, 29) N’oge ahụ, ọ ga-agba nnọọ ka ọnwa na ọ bụghị nanị ndị agadi ka Jehova Chineke na-elekọta kamakwa ọ na-elekọta ndị nile na-erubere ya isi.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
^ par. 5 N’eziokwu, ụfọdụ ndị inyom di ha nwụrụ abụghị ndị agadi. Levitikọs 22:13 na-emekwa ka eziokwu ahụ bụ́ na Chineke na-echekwa banyere ndị inyom di ha nwụrụ bụ́ ndị na-emebeghị agadi pụta ìhè.
^ par. 11 Ọ bụghị ezigbo aha ya.
[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 6, 7]
Ebe A Na-egosipụta Ịhụnanya
N’ọgbakọ Ndịàmà Jehova, ọ bụ ndị okenye na-ebute ụzọ n’ilekọta ndị agadi. Ndị okenye na-eji ndụmọdụ a Pita onyeozi nyere ha akpọrọ ihe: “Na-azụnụ ìgwè atụrụ Chineke nke unu na-elekọta.” (1 Pita 5:2) Ilekọta ndị agadi site n’inyere ha aka so n’otu ụzọ e si elekọta ìgwè atụrụ Chineke. Oleekwanụ ihe nke a gụnyere?
Ọ chọrọ ndidi na ma eleghị anya, ileta ndị agadi ugboro ugboro na iso ha akparịta ụka, iji matachaa ihe ndị na-akpa ha. Ikekwe, ha chọrọ onye ga-enyere ha aka zụta ihe n’ahịa na onye ga-azachara ha ụlọ, ma ọ bụkwanụ ha chọrọ onye ga-akwọta ha n’ọmụmụ ihe Ndị Kraịst. Ọ pụkwara ịbụ na ha chọrọ onye ga na-agụrụ ha Bible na akwụkwọ ndị ọzọ Ndị Kraịst na-ebipụta, nakwa onye ga na-emere ha imerime ihe ndị ọzọ na-akpa ha. N’ebe ọ ga-ekwe omume, e kwesịrị ime ndokwa dị irè ma gbasoo ya. *
Gịnịkwanụ ma ọ bụrụ na nwanna nwoke ma ọ bụ nwanna nwanyị merela agadi nke nọ n’ọgbakọ nọ ná nnukwute nsogbu, ikekwe ya e nwee mkpa ego? Ihe mbụ e kwesịrị ime bụ ịchọpụta ma onye ahụ ò nwere ụmụ ma ọ bụ ndị ikwu ndị ọzọ pụrụ inye aka. Nke a dabara nnọọ adaba n’ihe e kwuru na 1 Timoti 5:4: “Ọ bụrụ na nwanyị ọ bụla di ya nwụrụ nwere ụmụ ma ọ bụ ụmụ ụmụ, ka ndị a buru ụzọ mụta itinye nsọpụrụ Chineke n’ọrụ n’ezinụlọ nke ha na ịnọgide na-akwụ ndị mụrụ ha na ndị nne na nna ha ochie ụgwọ ruuru ha, n’ihi na nke a bụ ihe a na-anara nke ọma n’anya Chineke.”
O nwere ike ịbụ na onye agadi ahụ chọrọ ka e nyere ya aka ịchọpụta ma ya ruru eru inweta enyemaka ndị gọọmenti na-enye. Ikekwe e nwere ndị nọ n’ọgbakọ pụrụ inyere ya aka. Ọ bụrụ na a pụghị inyere ya aka site n’ụzọ ndị a, ndị okenye pụrụ ikpebi ma onye dị otú ahụ ò ruru eru ka ọgbakọ nyere ya aka. N’ọnọdụ ụfọdụ, e nyere ikike ka e mee otú ahụ n’ọgbakọ narị afọ mbụ, n’ihi na Pọl onyeozi degaara Timoti bụ́ onye ya na ya rụkọrọ ọrụ akwụkwọ, sị: “Ka e denye aha nwanyị di ya nwụrụ n’ihe ndepụta bụ́ onye gbaworo ihe na-adịghị ala karịa afọ iri isii, nwunye nke otu di, onye a na-agbara àmà maka ezi ọrụ, ma ọ bụrụ na ọ zụlitere ụmụ, ma ọ bụrụ na o lekọtara ndị ọbịa, ma ọ bụrụ na ọ sara ụkwụ ndị nsọ, ma ọ bụrụ na o nyeere ndị nọ ná mkpagbu aka, ma ọ bụrụ na o ji ịdị uchu gbasoo ezi ọrụ ọ bụla.”—1 Timoti 5:9, 10.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 25 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịgụkwu banyere nke a, lee isiokwu bụ́ “Igbo Mkpa Ndị Agadi n’Etiti Anyị—Ihe Ịma Aka Ndị Kraịst,” nke dị n’Ụlọ Nche nke July 15, 1988.
[Foto dị na peeji nke 5]
Dọkas lekọtara ndị inyom di ha nwụrụ.—Ọrụ 9:36-39