Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

‘Họrọ Ndụ, Ka I Wee Dị Ndụ’

‘Họrọ Ndụ, Ka I Wee Dị Ndụ’

‘Họrọ Ndụ, Ka I Wee Dị Ndụ’

“Ọ bụ ndụ na ọnwụ, ngọzi ahụ na nkọcha ahụ, ka m tinyeworo n’ihu gị: gị họrọkwa ndụ, ka i wee dị ndụ.”—Deuterọnọmi 30:19.

1, 2. N’echiche dị aṅaa ka e kere mmadụ n’onyinyo Chineke?

“KA ANYỊ kpụọ mmadụ n’onyinyo anyị, dị ka oyiyi anyị si dị.” E dere ihe a Chineke kwuru n’isiakwụkwọ mbụ nke Bible. Jenesis 1:26, 27 na-akọ, sị: “Chineke wee kee mmadụ n’onyinyo Ya, n’onyinyo Chineke ka O kere ya.” N’ihi ya, mmadụ mbụ dị iche n’ihe nile ọ bụla ọzọ e kere n’ụwa. O yiri Onye kere ya, nwee ike iche echiche dị ka Chineke, nweekwa ike ịhụ n’anya, ikpe ikpe ziri ezi, inwe amamihe, na iji ike eme ihe dị ka Chineke. O nwere akọnuche ga-enyere ya aka ime mkpebi ndị ga-abara ya uru na ndị na-eme Nna ya nke eluigwe obi ụtọ. (Ndị Rom 2:15) N’igbu ya nkenke, Adam nweere onwe ya ịhọrọ ihe ọ ga-eme. Mgbe Jehova hụsịrị otú o si kee nwa ya nọ n’ụwa, o kwuru nke a banyere aka ọrụ ya: “Lee, ọ dị mma nke ukwuu.”—Jenesis 1:31; Abụ Ọma 95:6.

2 Dị ka ụmụ Adam, e kekwara anyị n’onyinyo na n’ọdịdị Chineke. Otú ọ dị, ànyị nweere onwe anyị n’ezie ịhọrọ ihe anyị ga-eme? Ọ bụ ezie na Jehova nwere ikike nke ịma ihe ga-eme n’ọdịnihu, ọ dịghị ekpebi ihe onye nke ọ bụla n’ime anyị ga-eme na ihe ga-esi n’ihe anyị mere pụta tupu nke ahụ emee. Ọ dịtụghị ekwe ka akara aka na-achịkwa ndụ ụmụ ya nọ n’ụwa. Iji nyere anyị aka ịghọta mkpa ọ dị iji nnwere onwe anyị nwere ime nhọrọ eme nhọrọ ndị ziri ezi, ka anyị buru ụzọ mụta ihe site n’aka mba Izrel.—Ndị Rom 15:4.

Izrel Nweere Onwe Ha Ịhọrọ Ihe Ha Ga-eme

3. Olee iwu mbụ dị n’Iwu Iri ahụ, oleekwa otú ndị Izrel na-ekwesị ntụkwasị obi si họrọ irube isi na ya?

3 Jehova gwara ụmụ Izrel, sị: “Mụ onwe m bụ Jehova, bụ́ Chineke gị, Onye mere ka i si n’ala Ijipt, n’ụlọ ndị ohu, pụta.” (Deuterọnọmi 5:6) Na 1513 T.O.A., a tọhapụrụ Izrel n’agbụ ndị Ijipt n’ụzọ ọrụ ebube, n’ihi ya kwa, ha enweghị ihe ọ bụla mere ha ga-eji nwee obi abụọ n’ihe a Jehova gwara ha. N’Iwu Iri ahụ, iwu mbụ Jehova nyere site n’ọnụ onye na-ekwuchitere ya, bụ́ Mozis, bụ: “Gị enwela Chi ọzọ tinyere m.” (Ọpụpụ 20:1, 3) N’oge ahụ, mba Izrel họọrọ irube isi. Ha dị njikere ife nanị Jehova ofufe.—Ọpụpụ 20:5; Ọnụ Ọgụgụ 25:11.

4. (a) Nhọrọ dị aṅaa ka Mozis chere Izrel n’ihu? (b) Olee nhọrọ anyị nwere ime taa?

4 Ihe dị ka iri afọ anọ ka nke ahụ gasịrị, Mozis jiri olu ike chetara ọgbọ ọzọ nke ụmụ Izrel banyere nhọrọ ha nwere ime. O kwuru, sị: “Emewo m ka eluigwe na ala gbaa àmà megide unu taa, na ọ bụ ndụ na ọnwụ, ngọzi ahụ na nkọcha ahụ, ka m tinyeworo n’ihu gị: gị họrọkwa ndụ, ka i wee dị ndụ, gị onwe gị na mkpụrụ gị.” (Deuterọnọmi 30:19) N’otu aka ahụ taa, anyị pụrụ ịhọrọ ihe anyị ga-eme. Ee, anyị pụrụ ịhọrọ iji ikwesị ntụkwasị obi na-ejere Jehova ozi na-enwe olileanya nke ịdị ndụ ebighị ebi, ma ọ bụkwanụ, anyị pụrụ ịhọrọ inupụrụ ya isi ma taa ahụhụ ihe ọjọọ ga-esi na ya pụta. Tụlee ihe atụ abụọ nke ndị họọrọ ime ihe dịgasị iche.

5, 6. Olee ihe Jọshụa họọrọ ime, gịnị sikwa na ya pụta?

5 Na 1473 T.O.A., Jọshụa duuru ụmụ Izrel banye n’Ala Nkwa ahụ. N’okwu agbamume o kwuru tupu ya anwụọ, Jọshụa rịọrọ mba Izrel, sị: “Ma ọ bụrụ na ọ jọọ njọ n’anya unu ife Jehova ofufe, họpụtaranụ onwe unu taa onye unu ga-efe ofufe; ma ọ bụ chi nile nke nna unu hà fere ofufe nke dị n’ofe Osimiri ahụ, ma ọ bụ chi nile nke ndị Amọraịt, ndị unu onwe unu bi n’ala ha.” Ọ gaziri n’ihu ikwu banyere ezinụlọ ya, sị: “Ma mụ onwe m na ụlọ m, anyị ga-efe Jehova ofufe.”—Joshua 24:15.

6 Tupu mgbe ahụ, Jehova gbara Jọshụa ume ka ọ dị ike ma nwee ume, nyekwa ya ntụziaka ka ọ ghara inupụ isi n’iwu Chineke. Ọ bụrụ na Jọshụa anọgide na-agụ akwụkwọ Iwu ahụ ehihie na abalị, ije ya ga-aga nke ọma. (Joshua 1:7, 8) Jọshụa rubere isi, ihe gakwaara ya nke ọma. A gọziri Jọshụa n’ihi ihe ọ họọrọ ime. O kwuru, sị: “Ọ dịghị ihe ọ bụla dapụrụ n’ezi ihe nile nke Jehova gwara ụlọ Izrel; ha nile mere.”—Joshua 21:45.

7. N’oge Aịzaịa, olee ihe ụmụ Izrel ụfọdụ họọrọ ime, gịnị sikwa na ya pụta?

7 Ka anyị tụlee ihe dị nnọọ iche mere n’ihe dị ka narị afọ asaa sochirinụ n’Izrel. Ka ọ na-erule n’oge ahụ, ọtụtụ n’ime ndị Izrel amalitela ime ememe ndị ọgọ mmụọ. Dị ka ihe atụ, n’ụbọchị ikpeazụ nke afọ ọ bụla, ndị mmadụ na-agbakọta iri oriri nke jupụtara n’ụdị nri dịgasị iche iche na mmanya ndị dị ụtọ. Nke a abụghị nnọkọ nkịtị nke ndị òtù ezinụlọ. Ọ bụ ememe okpukpe ndị a na-emere arụsị abụọ. Aịzaịa onye amụma dekọrọ otú Chineke si ele ekwesịghị ntụkwasị obi a anya: “Unu onwe unu ndị na-ahapụ Jehova, ndị na-echezọ ugwu nsọ m, ndị na-edoro Gad [ma ọ bụ, “chi Ihu Ọma”] tebụl n’usoro, ndị na-agbajuru Meni [ma ọ bụ, “chi Akara Aka”] mmanya gwara ọgwa.” Ha chere na ọ bụghị Jehova na-eme ka ihe ha kọrọ n’ubi mee nke ọma kama na ọ bụ “chi Ihu Ọma” na “chi Akara Aka.” N’ikwu nke bụ́ eziokwu, ihe wetaara ha nsogbu bụ nnupụisi ha na ihe ha ma ụma họrọ ime. Jehova kwuru, sị: “M ga-agụkọta unu nye mma agha, unu nile ga-ehurukwa ala ka e wee gbuo unu; n’ihi na akpọrọ m unu òkù, ma unu azaghị m; ekwuru m okwu, ma unu anụghị; unu wee mee ihe jọrọ njọ n’anya m abụọ, ọ bụkwa ihe nke na-atọghị m ụtọ ka unu họpụtara.” (Aịsaịa 65:11, 12) Nhọrọ amamihe na-adịghị na ya ha mere wetaara ha mbibi, chi Ihu Ọma na chi Akara Aka azọpụtalighịkwa ha.

Ime Nhọrọ Ziri Ezi

8. Dị ka Deuterọnọmi 30:20 si kwuo, gịnị ka ime nhọrọ ziri ezi gụnyere?

8 Mgbe Mozis gbara Izrel ume ka ha họrọ ndụ, ọ gwara ha ihe atọ ha kwesịrị ime: “Ịhụ Jehova, bụ́ Chineke gị, n’anya, na ige ntị olu Ya, na ịrapara n’ahụ́ Ya.” (Deuterọnọmi 30:20) Ka anyị tụlee nke ọ bụla n’ime ihe ndị a ka anyị wee nwee ike ime nhọrọ ziri ezi.

9. Olee otú anyị pụrụ isi gosipụta na anyị hụrụ Jehova n’anya?

9 Site n’ịhụ Jehova bụ́ Chineke anyị n’anya: Anyị na-ahọrọ ijere Jehova ozi n’ihi na anyị hụrụ ya n’anya. Mgbe anyị naara ịdọ aka ná ntị nke ihe mere mba Izrel na-enye anyị, anyị na-agbanahụ ọnwụnwa nile a na-anwa anyị itinye aka n’omume rụrụ arụ na ịdaba n’ụzọ ndụ nke pụrụ ime ka a mata anyị n’ọnyà nke ịhụ ihe onwunwe n’anya. (1 Ndị Kọrint 10:11; 1 Timoti 6:6-10) Anyị na-arapara Jehova n’ahụ́ ma na-edebe iwu ya. (Joshua 23:8; Abụ Ọma 119:5, 8) Tupu ụmụ Izrel abanye n’Ala Nkwa ahụ, Mozis gbara ha ume, sị: “Lee, eziwo m unu ụkpụrụ dị iche iche na ikpe dị iche iche, dị ka Jehova bụ́ Chineke m, nyere m iwu, ka unu wee mee otú a n’etiti ala ahụ ebe unu onwe unu na-aba inweta ya. Debekwanụ ha, meekwa ha; n’ihi na nke a bụ amamihe unu na nghọta unu n’anya ndị nile ndị ga-anụ ụkpụrụ ndị a nile.” (Deuterọnọmi 4:5, 6) Ugbu a bụ oge anyị ga-eji gosipụta na anyị hụrụ Jehova n’anya site n’ibute ime uche ya ụzọ ná ndụ anyị. A ga-agọzirịrị anyị ma ọ bụrụ na anyị ahọrọ ime otú ahụ.—Matiu 6:33.

10-12. Olee ihe ndị anyị pụrụ ịmụta site n’ịtụle ihe mere n’ụbọchị Noa?

10 Site n’ige ntị olu Chineke: Noa bụ “onye na-ekwusa ezi omume.” (2 Pita 2:5) Uche ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mmadụ nile biri ndụ tupu Iju Mmiri ahụ adịghị n’okwu ịdọ aka ná ntị ndị Noa nọ na-ekwusa, ha ‘amadịghị’ na iju mmiri Noa na-adọ ha aka ná ntị ya na-abịa. Gịnị siri na ya pụta? “Iju mmiri ahụ bịara wee kpochapụ ha nile.” Jizọs dọrọ aka na ntị na oge anyị a, nke bụ́ oge “ọbịbịa Nwa nke mmadụ,” ga-adịkwa otú ahụ. Ihe mere n’oge Noa bụụrụ ndị nke oge a, bụ́ ndị na-ajụ ozi Chineke, ezigbo ihe ịdọ aka ná ntị.—Matiu 24:39.

11 Ndị na-akwa okwu ịdọ aka ná ntị sitere n’aka Chineke nke ndị ohu Chineke na-akpọsa taa emo kwesịrị ịghọta ihe ịjụ ịdọ aka ná ntị ahụ ga-apụtara ha. Pita onyeozi kwuru banyere ndị dị otú ahụ na-akwa emo, sị: “Dị ka ọchịchọ ha si dị, ha na-echezọ eziokwu a, na e nwere eluigwe nke sitere n’oge ochie na ụwa nke na-eguzopụta na mmiri nakwa n’etiti mmiri n’ụzọ kpụkọrọ ọnụ site n’okwu nke Chineke; sitekwa n’ihe ndị ahụ ka ụwa nke oge ahụ bịara ná mbibi mgbe e mere ka iju mmiri rikpuo ya. Ma site n’otu okwu ahụ a na-akwakọba eluigwe na ụwa dị ugbu a maka ọkụ, a na-edebekwa ha ruo ụbọchị ikpe na mbibi nke ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke.”—2 Pita 3:3-7.

12 Nhọrọ Noa na ezinụlọ ya mere dị nnọọ iche na nke ndị a mere. “Site n’okwukwe, Noa, mgbe e nyesịrị ya ịdọ aka ná ntị Chineke banyere ihe ndị a na-ahụbeghị anya, gosiri egwu Chineke ma wuo ụgbọ.” Ịṅa ntị n’ịdọ aka ná ntị ahụ mere ka a zọpụta ezinụlọ ya. (Ndị Hibru 11:7) Ka anyị dị ngwa n’ịnụ ozi Chineke ma ṅaa ntị na ya.—Jems 1:19, 22-25.

13, 14. (a) N’ihi gịnị ka ‘ịrapara Jehova n’ahụ́’ ji dị oké mkpa? (b) Olee otú anyị ga-esi kwe ka Jehova, bụ́ “onye na-akpụ anyị,” na-akpụzi anyị?

13 Site n’ịrapara Jehova n’ahụ́: Ọ bụrụ na anyị ‘ga-ahọrọ ndụ, wee dị ndụ’ ihe anyị ga-eme abụghị nanị ịhụ Jehova n’anya na ige ya ntị, anyị aghaghịkwa ‘ịrapara Jehova n’ahụ́,’ ya bụ, ịnọgide na-eme uche ya. Jizọs kwuru, sị: “Site ná ntachi obi unu, unu ga-enweta mkpụrụ obi unu.” (Luk 21:19) N’ezie, nhọrọ anyị mere n’akụkụ a na-ekpughe ihe dị anyị n’obi. Ilu 28:14 na-ekwu, sị: “Onye ihe na-agara nke ọma ka mmadụ ahụ bụ nke na-atụ oké egwu mgbe nile: ma onye na-eme ka obi ya sie ike ga-adaba n’ihe ọjọọ.” Fero nke Ijipt oge ochie bụ ihe atụ nke a. Fero mere ka obi ya sie ike na nke ọ bụla n’ime Ihe Otiti Iri ahụ e tiri Ijipt kama ịtụ egwu Jehova. Jehova amanyeghị Fero inupụrụ ya isi kama o nyere eze ahụ dị mpako ohere ịhọrọ nke ọ ga-eme. N’agbanyeghị nke Fero họọrọ ime, uche Jehova mezuru, dị nnọọ ka Pọl onyeozi kọwara n’ihe banyere otú Jehova si ele Fero anya: “N’ihi nke a kpọmkwem ka m ji kwe ka ị nọgide, ka m wee gosi ike m n’ihe banyere gị, ka e wee kpọsaakwa aha m n’ụwa nile.”—Ndị Rom 9:17.

14 Ọtụtụ narị afọ ka a napụtasịrị Izrel n’aka Fero, Aịzaịa onye amụma kwuru, sị: “Jehova, Nna anyị ka Ị bụ: anyị onwe anyị bụ ụrọ, Gị onwe gị bụ onye na-akpụ anyị; ọrụ aka Gị ka anyị nile bụ.” (Aịsaịa 64:8) Ka anyị na-ekwe ka Jehova na-akpụzi anyị site n’ọmụmụ ihe onwe onye na site n’itinye Okwu ya n’ọrụ, anyị na-eji nwayọọ nwayọọ eyikwasị onwe anyị mmadụ ọhụrụ. Anyị na-aghọ ndị dị umeala n’obi na ndị a pụrụ ịkpụzi akpụzi, bụ́ nke ga-eme ka ọ dịkwuoro anyị mfe ịraparasi ike n’ahụ́ Jehova n’ihi na anyị ji obi anyị nile na-achọ ime ihe ga-atọ ya ụtọ.—Ndị Efesọs 4:23, 24; Ndị Kọlọsi 3:8-10.

‘Mee Ka A Mara Ha’

15. Dị ka Deuterọnọmi 4:9 si kwuo, olee ibu ọrụ gbara mkpị nke Mozis chetaara Izrel?

15 Mozis gwara mba Izrel ahụ gbakọtaranụ ma na-achọ nnọọ ịbanye n’Ala Nkwa ahụ, sị: “Nanị lezie onwe gị anya, debekwa mkpụrụ obi gị nke ọma, ka ị ghara ichezọ ihe nile nke anya gị abụọ hụworo, ka ha gharakwa isi n’obi gị wezụga onwe ha ụbọchị nile nke ndụ gị; kama gị mee ka ụmụ gị na ụmụ ụmụ gị mara ha.” (Deuterọnọmi 4:9) Ụmụ Izrel aghaghị ibu otu ibu ọrụ gbara mkpị nke Jehova Chineke nyere ha iji wee nwee ike inweta ngọzi Jehova ma nwee ọganihu n’ala ahụ ha na-aga iketa. Ha agaghị echefu ihe ndị dị ịtụnanya Jehova meere ha, ha ga-akụzikwara ya ọgbọ ha ndị ga-abịa n’ihu. Dị ka ndị Chineke nke oge a, anyị aghaghị ime otú ahụ ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ‘ịhọrọ ndụ wee dị ndụ.’ Olee ihe Jehova meerela anyị nke anyị jirila anya anyị hụ?

16, 17. (a) Olee ihe ndị ozi ala ọzọ a zụrụ n’Ụlọ Akwụkwọ Gilead rụzurula n’ọrụ nkwusa Alaeze? (b) Olee ihe atụ nke ndị na-anụsi ọkụ n’obi ike n’ozi Alaeze ahụ bụ́ ndị ị pụrụ inye?

16 Obi dị anyị ụtọ ịhụ otú Jehova sirila gọzie ọrụ nkwusa na nke ime ndị na-eso ụzọ. Kemgbe e hiwere Watchtower Bible School of Gilead na 1943, ndị ozi ala ọzọ anọwo na-ebute ụzọ n’ọrụ nke ime ndị na-eso ụzọ n’ọtụtụ ala. Ndị mbụ gụchara akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ a anọgidewo jiri ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma Alaeze ahụ ọbụna ruo taa n’agbanyeghị na ha emeela agadi, ọrịa adịghịkwa ekwecha ụfọdụ n’ime ha ime ihe ndị ha na-emebu. Otu ezigbo ihe atụ bụ Mary Olson, bụ́ onye gụchara akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ Gilead na 1944. Ebe mbụ o jere ozi ala ọzọ bụ na Uruguay, mechaa gaa Colombia, ọ na-ejekwa ozi ugbu a na Puerto Rico. Ọ bụ ezie na ọrịa nká na-akpata adịghị ekwecha ya jee ozi otú o si ejebu, Nwanna Nwanyị Olson ka na-anụ ọkụ n’obi maka ozi. Ebe ọ bụ na ọ mụtara ịsụ Spanish, ọ na-ewepụta oge kwa izu iji sonyere ụmụnna ndị nọ n’ebe ahụ ọ na-eje ozi na-aga ozi ọma.

17 Nancy Porter, bụ́ onye di ya nwụrụla, onye gụchara akwụkwọ n’Ụlọ Akwụkwọ Gilead na 1947, ka na-eje ozi na Bahamas. Ọ bụkwa onye ozi ala ọzọ nke na-ejechi ozi ọma anya. Nwanna Nwanyị Porter kọrọ n’akụkọ ndụ ya, sị: “Izi ndị ọzọ eziokwu Bible abụworo m ihe pụrụ iche na-enye ọṅụ. * Ọ na-eme ka m nwee ihe ime mmụọ dị n’usoro ndị m na-eme mgbe dum bụ́ ndị meworo ka ndụ m dị n’usoro ma bụrụ nke kwụsiri ike.” Mgbe Nwanna Nwanyị Porter na ndị ohu Jehova ndị ọzọ na-ekwesị ntụkwasị obi chere echiche laghachi azụ, ha adịghị echezọ ihe Jehova meere ha. Gịnị banyere anyị? Ànyị na-ekele Jehova mgbe anyị na-ahụ otú o si na-agọzi ọrụ Alaeze anyị na-arụ n’ógbè anyị?—Abụ Ọma 68:11.

18. Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’ịgụ akụkọ ndụ nke ndị ozi ala ọzọ?

18 Anyị na-enwe nnọọ ọṅụ n’ihe ụmụnna ndị a jerela ozi ogologo oge rụzurula na ihe ndị ha ka na-arụzu. Ịgụ akụkọ ndụ ha na-agba anyị ume n’ihi na mgbe anyị na-ahụ ihe ndị Jehova meere ndị a na-ekwesị ntụkwasị obi, nke ahụ na-eme ka anyị nwekwuo obi ike ma mee ka anyị kpebisikwuo ike ijere Jehova ozi. Ị̀ na-agụ ihe ndekọ ndị a na-akpali akpali a na-ebipụta n’Ụlọ Nche mgbe nile ma na-atụgharị uche na ha?

19. Olee otú ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst pụrụ isi jiri akụkọ ndụ ndị e bipụtara n’Ụlọ Nche mee ihe?

19 Mozis chetaara ụmụ Izrel na ha ekwesịghị ichefu ihe nile Jehova meere ha nakwa na ihe ndị ahụ ekwesịghị ịpụ n’obi ha ná ndụ ha nile. O kwuziri ihe ọzọ ha ga-eme: “Gị mee ka ụmụ gị na ụmụ ụmụ gị mara ha.” (Deuterọnọmi 4:9) Akụkọ ndụ na-enwe mmetụta pụrụ iche n’ahụ́ ndị mmadụ. Ezigbo ihe nlereanya dị ndị na-eto eto mkpa. Ụmụnna nwanyị ndị na-alụbeghị di pụrụ ịmụta ihe site n’ihe nlereanya nke ụmụnna nwanyị ndị katarala ahụ́ bụ́ ndị na-ekwesị ntụkwasị obi, ndị e bipụtara akụkọ ndụ ha n’Ụlọ Nche. Ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị ije ozi n’ógbè ndị na-asụ asụsụ ọzọ, bụ́ ndị dị ná mba ha, na-enye ha ohere ịmụba òkè ha na-ekere n’ozi ọma ahụ. Ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst, ọ̀ gaghị adị mma ma unu jiri ahụmahụ nke ndị ozi ala ọzọ kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ ndị gara Ụlọ Akwụkwọ Gilead nakwa ahụmahụ nke ndị ọzọ kpalie ụmụ unu ịhọrọ ozi oge nile?

20. Gịnị ka anyị na-aghaghị ime iji ‘họrọ ndụ’?

20 Oleezi otú onye ọ bụla n’ime anyị pụrụ isi ‘họrọ ndụ’? Ọ bụ site n’iji nnwere onwe magburu onwe ya nke ime nhọrọ eme ihe iji gosi Jehova na anyị hụrụ ya n’anya nakwa site n’ịnọgide na-eme ókè anyị nwere ike n’ozi ya ruo oge nile o nyere anyị ohere ime otú ahụ. I kwesịrị ime nke a n’ihi na, dị ka Mozis kwuru, ‘Jehova bụ ndụ gị, na ogologo nke ụbọchị gị.’—Deuterọnọmi 30:19, 20.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 17 Lee “Inwe Ọṅụ na Ekele n’Agbanyeghị Mfu Na-agbawa Obi,” nke e bipụtara n’Ụlọ Nche nke June 1, 2001, peeji nke 23-27.

Ì Chetara?

• Olee ihe ị mụtara site n’ihe atụ nke nhọrọ dịgasị iche nke ndị mmadụ mere bụ́ ndị anyị tụleworo?

• Olee ihe ndị anyị na-aghaghị ime iji ‘họrọ ndụ’?

• Olee ibu ọrụ gbara mkpị a na-agba anyị ume ibu?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 26]

‘Ọ bụ ndụ na ọnwụ, ka m tinyeworo n’ihu gị’

[Foto dị na peeji nke 29]

Ige Chineke ntị zọpụtara Noa na ezinụlọ ya

[Foto dị na peeji nke 30]

Mary Olson

[Foto dị na peeji nke 30]

Nancy Porter