Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Iji Ọṅụ Na-eje Ozi n’Agbanyeghị Ọrịa

Iji Ọṅụ Na-eje Ozi n’Agbanyeghị Ọrịa

Akụkọ Ndụ

Iji Ọṅụ Na-eje Ozi n’Agbanyeghị Ọrịa

DỊ KA VARNAVAS SPETSIOTIS SI KỌỌ

Na 1990, mgbe m dị afọ iri isii na asatọ, enwere m nnọọ ahụ́ mkpọnwụ site n’isi ruo n’ụkwụ. N’agbanyeghị nke ahụ, ejiriwo m ọṅụ na-eje ozi n’agwaetiti Saịprọs dị ka onye ozi oge nile ruo ihe dị ka afọ iri na ise ugbu a. Gịnị nyeworo m ume ịnọgide na-ekerechi òkè anya n’ozi Jehova n’agbanyeghị ọrịa?

A MỤRỤ m n’October 11, 1922. Anyị dị itoolu—ụmụ nwoke anọ na ụmụ nwanyị ise. Anyị bi na Xylophagou, bụ́ obodo nta dị na Saịprọs. Ọ bụ ezie na ndị mụrụ m nwetụrụ ego, ịzụ nnukwu ezinụlọ ha otú a pụtara na anyị aghaghị ịrụsi ọrụ ike n’ugbo.

Papa m, bụ́ Antonis, ejighị ịmụ ihe egwuri egwu, ọ bụkwa onye ajụjụ. N’oge na-adịghị anya ka a mụsịrị m, papa m hụrụ otu traktị isiokwu ya bụ Peoples Pulpit, bụ́ nke Ndị Mmụta Bible (dị ka a maara Ndịàmà Jehova n’oge ahụ) bipụtara, ka ọ na-eleta onye nkụzi na-akụzi ihe n’ụlọ akwụkwọ dị n’obodo anyị. Ọ malitere ịgụ ya, n’oge na-adịghịkwa anya, o kweghịzikwa ya ntọgbọ. N’ihi ya, papa m na otu n’ime ndị enyi ya, nke aha ya bụ Andreas Christou, so ná ndị mbụ sowere Ndịàmà Jehova n’agwaetiti ahụ.

Mmụba E Nwere n’Agbanyeghị Mmegide

Ka oge na-aga, ha abụọ nwetakwuru akwụkwọ ndị dabeere na Bible site n’aka Ndịàmà Jehova. N’oge na-adịghị anya, a kpaliri papa m na Andreas ịkọrọ ndị bi n’obodo ha eziokwu ndị ha na-amụta site na Bible. Ọrụ ime nkwusa ha kpalitere mmegide kpụ ọkụ n’ọnụ site n’aka onye ụkọchukwu nke chọọchị Ọtọdọks nke Gris nakwa ndị ọzọ bụ́ ndị chere na Ndịàmà Jehova na-eduhie ndị ọzọ ụzọ.

Ọtụtụ ndị obodo anyị na-akwanyere mmadụ abụọ a na-akụzi Bible ùgwù. A maara papa m nke ọma n’ihi obiọma na mmesapụ aka ya. Ọ na-enyekarịrị ezinụlọ ndị dara ogbenye aka. Mgbe ụfọdụ, ọ na-amịpụ n’abalị gaa dotere ezinụlọ ndị nọ ná mkpa ọka wit ma ọ bụ bred n’ọnụ ụzọ ha. Àgwà achọghị ọdịmma onwe onye nanị, bụ́ nke a chọrọ n’aka Onye Kraịst, mere ka ozi nke ndị ozi abụọ a na-adọrọkwu mmasị.—Matiu 5:16.

Ihe si na ya pụta bụ na imerime mmadụ bịara nwee mmasị n’ozi Bible. Ka ha na-aghọtakwu ihe Bible na-ekwu, ha bịara hụ na ọ dị mkpa ka ha na-ezukọ n’ụlọ ndị dị iche iche iji mụọ Bible dị ka otu ìgwè. N’ihe dị ka n’afọ 1934, Nikos Matheakis, bụ́ onye ozi oge nile nke si Gris, bịara Saịprọs ma sonyere ìgwè a nọ na Xylophagou. Nwanna Matheakis kpebisiri ike inye aka hazie ìgwè a ma nyere ha aka ịghọta Akwụkwọ Nsọ n’ụzọ ka mma, o jikwara ndidi mee nke a. Ìgwè a ghọrọ ntọala nke ọgbakọ mbụ nke Ndịàmà Jehova e nwere na Saịprọs.

Ka ọrụ Ndị Kraịst nọ na-aga n’ihu, e nwekwuokwa ndị ọzọ nabatara eziokwu Bible, ụmụnna ahụ bịara hụ na ọ dị mkpa ka ha nweta ebe ha ga-anọgide na-enwe ọmụmụ ihe. Ọkpara nne m, bụ́ George, na nwunye ya, bụ́ Eleni, nyere anyị ụlọ ha jiri mere ọba. A rụziri ụlọ a dị n’akụkụ ụlọ ha ka ọ bụrụ ebe kwesịrị ekwesị ịnọ na-enwe ọmụmụ ihe. Ọ bụ otú a ka ụmụnna si nweta Ụlọ Nzukọ Alaeze mbụ ha n’agwaetiti ahụ. Ha nwere nnọọ ekele! Nke a mekwara nnọọ ka ha nwee ọganihu!

Ime Ka Eziokwu ahụ Bụrụ nke M

Na 1938, mgbe m dị afọ iri na isii, ekpebiri m na m ga-abụ onye kapịnta. N’ihi ya, papa m kpọgara m Nicosia nke bụ́ isi obodo Saịprọs. N’ilepụ nnọọ anya n’ọdịnihu, o mere ndokwa ka mụ na Nikos Matheakis nọrọ. Ọtụtụ ụmụnna nọ n’agwaetiti ahụ ka na-echeta nwanna nwoke a na-ekwesị ntụkwasị obi n’ihi ịnụ ọkụ n’obi na mmesapụ aka ya. Ịnụ ọkụ n’obi na obi ike siri ike o nwere, bụ àgwà ndị dị Onye Kraịst ọ bụla nọ na Saịprọs n’oge ahụ mkpa.

Nwanna Matheakis nyeere m aka nke ukwuu ime ka m nweta ezigbo ihe ọmụma Bible ma mee ka mmekọrịta mụ na Jehova kakwuo mma. Mgbe ahụ mụ na ya bi, ana m agazu ọmụmụ ihe nile a na-anọ n’ụlọ ya enwe. Na nke mbụ ya, ọ bịara dị m ka ịhụnanya m nwere n’ebe Jehova nọ na-emiwanye emi. Ekpebisiri m nnọọ ike iso Chineke nwee ezi mmekọrịta. N’ime ọnwa ole na ole ka e mesịrị, ajụrụ m Nwanna Matheakis ma m̀ nwere ike isonyere ya n’ozi ubi. Nke a mere na 1939.

Ka oge ụfọdụ gasịrị, agara m leta ndị ezinụlọ m. Ịnọnyetụrụ papa m ruo nwa oge mekwuru ka m kweta na achọtawo m eziokwu ahụ ma mata nzube nke ndụ. Na September 1939, Agha Ụwa nke Abụọ malitere. Ọtụtụ ndị na-eto eto mụ na ha bụ ọgbọ wepụtara onwe ha ịga agha, ma n’ihi ịgbaso nduzi Bible, ekpebiri m na m gaghị alụ agha. (Aịsaịa 2:4; Jọn 15:19) N’afọ ahụ, araara m onwe m nye Jehova, e mekwara m baptizim na 1940. Na nke mbụ ya, ọ bịara dị m nnọọ ka m naghịzi atụ egwu mmadụ!

Na 1948, alụrụ m Efprepia. Anyị mụtara ụmụ anọ. N’oge na-adịghị anya, anyị ghọtara na anyị aghaghị ịrụsi ọrụ ike iji zụlite ha “n’ọzụzụ na nduzi echiche nke Jehova.” (Ndị Efesọs 6:4) Anyị kpesiri ekpere ike ma gbalịa ịkụziri ụmụ anyị ka ha hụ Jehova n’anya ma na-erubere ụkpụrụ na iwu ya isi.

Nsogbu Ahụ́ Ike Eweta Ihe Ịma Aka

Na 1964, mgbe m dị afọ iri anọ na abụọ, aka nri m na ụkwụ aka nri m malitere ịkpọnwụ. Nke a jiri nke nta nke nta gafere na nke aka ekpe. A chọpụtara na m nwere ọrịa na-akụjisị ahụ́ a na-akpọ muscle atrophy, nke bụ́ ọrịa na-enweghị ngwọta nke na-emesị kpata ahụ́ mkpọnwụ. Obi mafuru m mgbe m nụrụ nke a. Ihe a nile yiri ka hà mere n’otu ntabi anya na na mberede! Iwe na ọnụma juru m obi, echere m, sị: ‘Gịnị mere ihe a ga-eji mee m? Gịnị ka m mere m ji kwesị ịta ahụhụ a?’ Otú ọ dị, ka oge na-aga, obi mmafu ahụ m nwere mgbe a gwara m maka ọrịa m bịara jiri nwayọọ jụrụ. Ya mere, amalitere m inwe nchekasị, egwu jidekwara m. Ọtụtụ ajụjụ nọgidere na-agbata m n’obi. Ahụ́ m ọ̀ ga-akpọnwụ kpamkpam nke na ọ ga-abụ ndị ọzọ ga na-emeziri m ihe nile? Òlee otú m ga-esi nagide ọnọdụ a? M̀ ga-enwe ike igboro ezinụlọ m—nwunye m na ụmụ anyị anọ—mkpa ha? Iche banyere ihe ndị a wutere m n’ezie.

Achọpụtara m na iji ezi obi gakwuru Jehova n’ekpere ma kọsara ya nchegbu m nile dị nnọọ mkpa n’oge a ná ndụ m karị mgbe ọ bụla ọzọ. Ana m eji anya mmiri na-ekpe ekpere ehihie na abalị. N’oge na-adịghị anya, enwetara m nkasi obi. Okwu ndị na-akasi obi nke dị na Ndị Filipaị 4:6, 7 mezuru n’ọnọdụ m: “Unu enwela nchegbu banyere ihe ọ bụla, kama n’ihe nile site n’ekpere na ịrịọsi arịrịọ ike ya na inye ekele, meenụ ka Chineke mara ihe unu na-arịọ; udo nke Chineke nke karịrị echiche nile ga-echekwa obi unu na ike iche echiche unu nche site na Kraịst Jizọs.”

Ịnagide Ahụ́ Mkpọnwụ

Ọnọdụ m nọgidere na-aka njọ. Achọpụtara m na m kwesịrị ime mgbanwe ngwa ngwa n’ihi ọnọdụ m. Ebe ọ bụ na apụghịzi m ịrụ ọrụ dị ka onye kapịnta, ekpebiri m ịrụ ọrụ na-esighị ike, bụ́ nke na-agaghị enye m nsogbu n’ahụ́, nke ga-enyekwara m aka ịnọgide na-egboro ndị ezinụlọ m mkpa ha. Ọrụ mbụ m rụrụ bụ iji ụgbọala na-ere ice cream. Eregidere m ice cream ruo ihe dị ka afọ isii mgbe ọrịa m mere ka m nọrọzie n’oche a na-akwagharị akwagharị. Agafeziri m n’ụdị ọrụ ndị ọzọ dịgasị iche iche ga-adịrị m mfe ọrụrụ.

Kemgbe 1990, ahụ́ ike m anọwo na-akawanye njọ ruo n’ókè nke na apụghịzi m ịrụ ọrụ ọ bụla. Ugbu a, ọ bụ ndị ọzọ na-emere m ọbụna ihe mmadụ ọ bụla kpa ahụ́ na-emere onwe ya. Ọ bụzi mmadụ na-enyiwe m n’àkwà, na-asa m ahụ́ ma na-eyiwe m uwe. Ọ bụrụ na m chọọ ịga nzukọ Ndị Kraịst, a na-eji oche a na-akwagharị akwagharị akwaga m n’ebe akwụwara ụgbọala ma bubazie m n’ime ụgbọala. Erute n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, a na-esi n’ụgbọala bupụta m ma bunye m n’oche ahụ a na-akwagharị akwagharị ma kwaba m n’ime Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ka ọmụmụ ihe na-aga n’ihu, a na-edote ìgwè eletrik nke na-ekpo mmadụ ahụ́ ọkụ n’akụkụ m iji mee ka ụkwụ m na-ekpo ọkụ.

Ana m agachi ọmụmụ ihe nile anya n’agbanyeghị ahụ́ mkpọnwụ. Aghọtara m na ọ bụ ebe Jehova na-akụziri anyị ihe, i sorokwa ụmụnna m nọrọ bụ nnọọ ihe nchebe nakwa ụzọ isi nweta nkwado na agbamume. (Ndị Hibru 10:24, 25) Nleta ụmụnna tozuru okè ibe m na-abịakarị eleta m anọgidewo na-enyere m aka. Ọ dị m nnọọ otú ọ dịrị Devid bụ́ onye dere, sị: “Iko m bụ inwebiga ihe ókè.”—Abụ Ọma 23:5.

Nwunye m m hụrụ n’anya enyewooro m nnọọ aka n’ụzọ dị egwu n’afọ nile a. Ụmụ m enyewokwarala m aka n’ụzọ dị ukwuu. Ruo ọtụtụ afọ ugbu a, ha anọwo na-enye m ihe ndị na-akpa m kwa ụbọchị. Ọrụ a ha na-arụ adịghị mfe, ka afọ na-agafe ka ọ na-esikwukwa ike ilekọta m. Ha bụ nnọọ ezi ihe nlereanya n’ịzụlite ndidi na n’iwepụta onwe ha iji nye aka, ana m ekpekwa ekpere ka Jehova nọgide na-agọzi ha.

Ekpere bụkwa ihe ọzọ magburu onwe ya Jehova mere ndokwa ya iji na-ewusi ndị ohu ya ike. (Abụ Ọma 65:2) Jehova azawo arịrịọ m sitere n’obi site n’inye m ume iji nọgide na-ejere ya ozi n’afọ nile a. Ekpere na-eme ka m nwee ahụ́ efe karịsịa mgbe m nwere nkụda mmụọ, ọ na-enyekwara m aka ịnọgide na-enwe ọṅụ. Ịdị na-ekpegara Jehova ekpere mgbe nile na-eme ka m nwee ume ọhụrụ ma mee ka m nwee ọchịchọ ịnọgide na-ejere ya ozi. O doro m nnọọ anya na Jehova na-anụ ekpere ndị ohu ya ma na-eme ka obi ruo ha ala.—Abụ Ọma 51:17; 1 Pita 5:7.

Karịsịa, ana m enweghachi ume ọhụrụ mgbe ọ bụla m chetara na Chineke ga-emecha gwọọ ndị nile ga-enwe ihe ùgwù nke ịdị ndụ ebighị ebi na Paradaịs mgbe Ọkpara ya, bụ́ Jizọs Kraịst, ga-achị n’Alaeze ya. Anya mmiri nke ọṅụ agbawo m ihe karịrị otu ugboro ka m na-atụgharị uche n’olileanya a dị ebube.—Abụ Ọma 37:11, 29; Luk 23:43; Mkpughe 21:3, 4.

Ije Ozi Dị Ka Onye Ozi Oge Nile

Na 1991, ka m tụlechara ọnọdụ m, achọpụtara m na ụzọ kasị mma isi zere ịdị na-emetere onwe m ebere bụ ịdị na-agachi ozi ọma anya, na-ezi ndị ọzọ ozi ọma dị oké ọnụ ahịa nke Alaeze ahụ. N’afọ ahụ, aghọrọ m onye ozi oge nile.

Ebe ọ bụ na m nwere nkwarụ, ana m ejikarị akwụkwọ ozi agba àmà. Otú ọ dị, ọ na-esiri m ike ide ihe; ọ chọrọ nnọọ mgbalị dị ukwuu. Ọ naghị adịrị m mfe ijidesi mkpịsị akwụkwọ ike n’ihi ọrịa muscle atrophy. Ma site n’ịnọgidesi ike nakwa site n’ikpe ekpere, anọwo m na-eji akwụkwọ ozi agba àmà kemgbe ihe karịrị afọ iri na ise ugbu a. Ana m ejikwa telifon agbara ndị mmadụ àmà. Ọ dịbeghị mgbe m kwere ka ohere ọ bụla m ga-eji gbaara ndị ikwu m, ndị enyi m na ndị agbata obi m na-abịa eleta m àmà banyere olileanya m nwere maka ụwa ọhụrụ ahụ nakwa banyere Paradaịs elu ala gafenahụ m.

N’ihi nke a, enwetawo m ọtụtụ ahụmahụ ndị na-agba ume. Enwere m nnọọ obi ụtọ ịhụ ka nwa nwa m m mụụrụ Bible ihe dị ka afọ iri na abụọ gara aga nwere ọganihu n’ụzọ ime mmụọ ma gosi na ya ji eziokwu Bible kpọrọ ihe. Akọnuche ya e ji Bible zụọ kpaliri ya ịkwụsi ike n’akụkụ Jehova ma ghara itinye aka n’ihe ndị na-ekwesịghị Ndị Kraịst.

Obi na-adị m nnọọ ụtọ mgbe ndị m deere akwụkwọ ozi na-achọta m iji mụtakwuo ihe ndị Bible na-ekwu. Mgbe ụfọdụ, ụfọdụ n’ime ha na-arịọ ka m nyekwuo ha akwụkwọ ndị e ji amụ Bible. Dị ka ihe atụ, otu nwaada kpọrọ m na fon ma kelee m maka akwụkwọ ozi na-agba ume m deere di ya. Nwaada ahụ nwere nnọọ mmasị n’ihe ndị e kwuru n’akwụkwọ ozi ahụ. Nke a dugakwara m n’iso ya na di ya kwurịta ọtụtụ ihe ndị dabeere na Bible n’ụlọ m.

Olileanya Magburu Onwe Ya

Kemgbe ọtụtụ afọ, ahụwo m ka ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa Alaeze na-amụba n’akụkụ a nke ụwa. A rụgharịwo obere Ụlọ Nzukọ Alaeze ahụ dị n’akụkụ ụlọ nwanne m nwoke bụ́ George ma mee ka o bukwuo ibu ọtụtụ ugboro. Ọ bụ ebe mara mma ịnọ fee Jehova, bụ́ nke ọgbakọ abụọ ji eme ihe.

Papa m nwụrụ na 1943, mgbe ọ dị afọ iri ise na abụọ. Ma ọ hapụụrụ ụmụ ya ihe nketa ime mmụọ! Ụmụ ya asatọ natara eziokwu ahụ, ha ka na-ejekwara Jehova ozi. Ugbu a, e nwere ọgbakọ atọ na ndị nkwusa Alaeze dị narị abụọ na iri atọ n’obodo Xylophagou bụ́ ebe a mụrụ papa m, nakwa n’obodo nta ndị dị ya nso!

Ọganihu ndị a e nweworo abụwo nnọọ isi ihe na-enye m ọṅụ. Ugbu a m dị afọ iri asatọ na atọ, eji m obi ike na-ekwughachi okwu ọbụ abụ ahụ: “Mkpa akpawo ụmụ ọdụm, agụụ agụwokwa ha: ma ndị na-achọ Jehova, ọ dịghị ezi ihe ọ bụla ga-akọ ha.” (Abụ Ọma 34:10) Ana m echesi ike oge amụma a e dekọrọ n’Aịsaịa 35:6 ga-emezu: “Mgbe ahụ ka onye ngwụrọ ga-amali dị ka ele.” Ekpebisiwo m ike ịnọgide jiri ọṅụ na-ejere Jehova ozi n’agbanyeghị ọrịa ruokwa mgbe a ga-emezu amụma ahụ.

[Map dị na peeji 17]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

TURKEY

SIRIA

LEBANỌN

SAỊPRỌS

Nicosia

Xylophagou

Oké Osimiri Mediterenian

[Foto dị na peeji nke 17]

Ụlọ Nzukọ Alaeze mbụ e nwere na Xylophagou, a ka ji ya eme ihe

[Foto ndị dị na peeji nke 18]

Mụ na Efprepia na 1946 nakwa taa

[Foto dị na peeji nke 20]

Iji fon na akwụkwọ ozi agba àmà na-enye m ọṅụ