Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Isi Ihe Ndị Sitere ná Nkebi nke Abụọ nke Akwụkwọ Abụ Ọma

Isi Ihe Ndị Sitere ná Nkebi nke Abụọ nke Akwụkwọ Abụ Ọma

Okwu Jehova Dị Ndụ

Isi Ihe Ndị Sitere ná Nkebi nke Abụọ nke Akwụkwọ Abụ Ọma

DỊ KA ndị ohu Jehova, anyị na-atụ anya na anyị ga na-enweta ọnwụnwa na ule. Pọl onyeozi dere, sị: “A ga-akpagbukwa ndị nile na-achọ ibi ndụ ná nsọpụrụ Chineke ná mmekọrịta nke ha na Kraịst Jizọs.” (2 Timoti 3:12) Gịnị ga-enyere anyị aka idi ọnwụnwa na mkpagbu, si otú ahụ gosi na anyị na-anọgide na-eme ihe Chineke chọrọ?

A na-achọta enyemaka dị otú ahụ ná nkebi nke abụọ n’ime nkebi ise e kebiri akwụkwọ abụ ọma. Abụ Ọma nke 42 ruo nke 72 na-agwa anyị na ọ bụrụ na anyị chọrọ imeri ọnwụnwa, anyị aghaghị ịtụkwasị Jehova obi kpamkpam ma mụta ịdị na-echere ya maka nnapụta. Nke ahụ bụụrụ anyị ihe mmụta dị nnọọ oké ọnụ ahịa! Dịkwa nnọọ ka Okwu Chineke ndị ọzọ, ozi dị ná Nkebi nke Abụọ nke Akwụkwọ Abụ Ọma dị “ndụ ma na-akpa ike” ọbụna taa.—Ndị Hibru 4:12.

JEHOVA BỤỤRỤ ANYỊ “EBE MGBABA NA IKE”

(Abụ Ọma 42:1–50:23)

A dọọrọ otu onye Livaị n’agha gaa mba ọzọ. O wutere ya na ya apụghị ịga fee Jehova ofufe n’ebe nsọ Ya. N’ihi ya, o ji okwu na-esonụ kasie onwe ya obi: “Gịnị mere i ji rudaa n’ala, mkpụrụ obi m? Gịnị mere i ji sụọ ude nke ukwuu n’ime m? Chere Chineke.” (Abụ Ọma 42:5, 11; 43:5) Amaokwu a pụtaghachiri ugboro ugboro mere ka ahịrị atọ ahụ dị n’Abụ Ọma nke 42 na nke 43 bụrụ otu uri. Abụ Ọma nke 44 bụ arịrịọ a rịọrọ n’ihi Juda—bụ́ obodo nọ ná nsogbu, ma eleghị anya, n’ihi egwu ha nọ na-atụ n’oge Eze Hezekaịa na ndị Asiria na-achọ ịwakpo ha.

Abụ Ọma nke 45, nke bụ́ abụ a bụrụ banyere agbamakwụkwọ nke otu eze, bụ amụma banyere Eze Mesaịa ahụ. Abụ ọma atọ sochiri ya kọwara Jehova dị ka “ebe mgbaba na ike,” “Eze ukwu na-achị ụwa nile” na “ụlọ elu.” (Abụ Ọma 46:1; 47:2; 48:3) Abụ Ọma nke 49 mere nnọọ ka ọ pụta ìhè na ọ dịghị mmadụ ọ bụla “ga-agbapụta nwanne ya ma ọlị”! (Abụ Ọma 49:7) E kwuru na ọ bụ ụmụ Kora dere abụ ọma asatọ ndị mbụ nke nkebi nke abụọ nke akwụkwọ Abụ Ọma. Ọ bụ Esaf dere nke itoolu ya, ya bụ, Abụ Ọma nke 50.

Azịza nke Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:

44:19—Gịnị bụ ‘ọnọdụ nkịta ọhịa’? Ikekwe, ọbụ abụ ahụ nọ na-ekwu banyere ọgbọ agha, bụ́ ebe ndị e gburu ghọọrọ nkịta ọhịa ihe oriri.

45:13, 14a—Ònye bụ “ada eze” onye ‘a ga-eduru jekwuru eze’? Ọ bụ ada nke “Eze mgbe ebighị ebi,” bụ́ Jehova Chineke. (Mkpughe 15:3) Ada eze ahụ na-anọchite anya ọgbakọ Ndị Kraịst dị ebube nke otu narị puku mmadụ na iri puku anọ na anọ mejupụtara, bụ́ ndị Jehova jiri mere ụmụ ya site n’iji mmụọ nsọ tee ha mmanụ. (Ndị Rom 8:16) A ga-akpọgara nwoke ahụ na-alụ nwanyị ọhụrụ—Eze Mezaịa—“ada” Jehova a nke “a kwadebere dị ka nwanyị a na-alụ ọhụrụ a chọrọ mma maka di ya.”—Mkpughe 21:2.

45:14b, 15—Ole ndị ka “ụmụ agbọghọ na-amaghị nwoke” e kwuru okwu ha nọchiri anya ha? Ha bụ “oké ìgwè mmadụ” ahụ na-efe ezi ofufe, bụ́ ndị na-esonyere ma na-akwado ihe fọdụrụ ná ndị ahụ e tere mmanụ. Ebe ọ bụ na ha “si n’oké mkpagbu ahụ pụta,” ha ga-anọ n’ụwa mgbe Eze Mezaịa gbachara akwụkwọ n’eluigwe. (Mkpughe 7:9, 13, 14) Ha ga-ejupụta nnọọ ‘n’ọṅụ na otite egwú ọṅụ’ n’oge ahụ.

45:16—Olee otú o si bụrụ na ụmụ ga-anọchi anya ndị nna nna eze? Jizọs nwere ndị nna nna bụ́ mmadụ mgbe a mụrụ ya n’ụwa. Ha ga-aghọ ụmụ ya mgbe ọ ga-akpọlite ha n’ọnwụ n’oge Ọchịchị Puku Afọ ya. Ụfọdụ n’ime ha ga-eso ná ndị a ga-ahọpụta dị ka “ndị isi n’ụwa nile.”

50:2—Gịnị mere e ji kpọọ Jeruselem “ebe mazuru mma”? Nke a abụghị n’ihi otú obodo ahụ dị n’ile anya. Kama, ọ bụ n’ihi na Jehova ji ya na-eme ihe, o mekwara ka ọ dị ebube site n’ime ka ọ bụrụ ebe ụlọ nsọ ya dị nakwa ebe ndị eze ya e tere mmanụ jiri mere isi obodo.

Ihe Ndị Anyị Na-amụta na Ya:

42:1-3. Dị nnọọ ka agụụ mmiri si agụsi nne ele nọ n’ala kpọrọ nkụ ike, agụụ Jehova gụsiri onye Livaị ahụ ike. Nwoke ahụ nwere nnọọ mwute n’ihi na ọ pụghị ịga fee Jehova ofufe n’ebe nsọ Ya, bụ́ nke mere ‘anya mmiri ya ji ghọọrọ ya nri ehihie na abalị’—afọ machiri ya. Ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị inwe ekele na anyị na ndị kwere ekwe ibe anyị na-efekọ Jehova ofufe?

42:4, 5, 11; 43:3-5. Ọ bụrụ na e nwee ka ihe ụfọdụ si gbochie anyị iso ọgbakọ Ndị Kraịst na-akpachi anya ruo oge ụfọdụ, icheta ọṅụ ndị mkpakọrịta dị otú ahụ na-enyebu anyị pụrụ ịgba anyị ume. Ọ bụ ezie na ná mmalite, nke a pụrụ ime ka ihe mgbu nke owu ọmụma na-akpata ka njọ, ọ ga-emekwa ka anyị cheta na Chineke bụ ebe mgbaba anyị nakwa na anyị kwesịrị ichere ya iji nwere onwe anyị pụọ ná nsogbu anyị.

46:1-3. N’agbanyeghị ụdị ọdachi pụrụ ịdakwasị anyị, anyị aghaghị inwe nnọọ obi ike na “Chineke bụụrụ anyị ebe mgbaba na ike.”

50:16-19. Onye ọ bụla nke na-ekwu okwu aghụghọ ma na-eme ihe ndị na-ezighị ezi ekwesịghị ịnọchite anya Chineke.

50:20. Kama ịdị na-akọsa emezighị emezi nke ndị ọzọ, anyị kwesịrị ileghara ya anya.—Ndị Kọlọsi 3:13.

“NA-EDERE NANỊ CHINEKE DUU, MKPỤRỤ OBI M”

(Abụ Ọma 51:1–71:24)

Abụ ọma ndị a jiri ekpere sitere n’obi Devid kpere mgbe ya na Batsheba mechara mmehie malite. Abụ Ọma nke 52 ruo nke 57 gosiri na Jehova ga-anapụta ndị tụkwasịrị ya ibu ha ma chere ya maka nzọpụta. Dị ka e gosiri n’Abụ Ọma nke 58 ruo nke 64, Devid mere Jehova ebe mgbaba ya n’oge nile ọ nọ n’ihe isi ike. Ọ bụrụ, sị: “Na-edere nanị Chineke duu, mkpụrụ obi m; n’ihi na ọ bụ ya ka olileanya m si pụta.”—Abụ Ọma 62:5.

Iso Onye Mgbapụta anyị na-enwe mmekọrịta chiri anya kwesịrị ịkpali anyị ‘ịbụ nsọpụrụ aha ya n’abụ ọma.’ (Abụ Ọma 66:2) E toro Jehova dị ka onye na-emesapụ aka n’Abụ Ọma nke 65, too ya dị ka Chineke nke na-azọpụta azọpụta n’Abụ Ọma nke 67 na nke 68, tookwa ya n’Abụ Ọma nke 70 na nke 71 dị ka Onye na-eme ka a gbapụ.

Azịza nke Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:

53:1—Olee otú onye na-ekwu na Chineke adịghị si bụrụ “onye nzuzu”? Nzuzu a na-ekwu okwu ya n’ebe a abụghị enweghị ọgụgụ isi. Ihe gosiri na onye ahụ na-eme omume nzuzu bụ omume rụrụ arụ nke a kọwara n’Abụ Ọma 53:1-4.

58:3-5—Olee otú ndị na-emebi iwu si dị ka agwọ? Ụgha ndị na-emebi iwu na-aghagide ndị ọzọ yiri èlù agwọ. Ha na-emebi aha ọma ndị ọzọ. “Dị ka ajụala nke ntị chiri nke na-akpọchi ntị ya,” ndị na-emebi iwu adịghị anara ntụziaka ma ọ bụ mgbazi.

58:7—Olee otú ndị na-emebi iwu si ‘agbaze dị ka mmiri nke na-erugharịrị onwe ya’? Ọ pụrụ ịbụ na Devid nọ na-eche banyere mmiri dị na ndagwurugwu ụfọdụ nke Ala Nkwa ahụ. Ọ bụ ezie na idei mmiri nwere ike ime ka mmiri ndị dị na ndagwurugwu ndị dị otú ahụ too, mmiri ndị a na-atakọ ngwa ngwa ma pụọ n’anya. Devid nọ na-ekpe ekpere ka ndị na-emebi iwu pụọ n’anya ngwa ngwa.

68:13—Olee otú ‘e si jiri ọlaọcha kpuchie nkù abụọ nke nduru, jirikwa ọlaedo ọma na-enwu akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ kpuchie nkù ya abụọ’? Ụfọdụ nduru ndị na-acha anụnụ anụnụ nwere àgwà dị iche iche na-egbuke egbuke n’ábụ́bà ha ụfọdụ. Ọ bụrụ na anyanwụ achasa ábụ́bà ha, ábụ́bà ndị ahụ na-eyi ọla. Ikekwe Devid ji ndị dike Izrel bụ́ ndị meriri ndị iro ha ma si n’ọgbọ agha na-alọtaghachi tụnyere nduru dị otú ahụ, bụ́ nke na-efesi ike ma na-egbuke egbuke. Dị ka ụfọdụ ndị ọkà mmụta Bible si kwuo, ọ pụkwara ịbụ na ihe ọ na-ekwu okwu ya bụ ọrụ nkà nke a lụtara n’agha. Nke ọ sọrọ ya ya bụrụ, Devid na-achọ ịkọwa otú Jehova si mee ka ndị ya merie ndị iro ha.

68:18—Ole ndị bụ “onyinye dị iche iche n’etiti mmadụ”? Ha so ná ndị ahụ a dọọrọ n’agha mgbe e meriri Ala Nkwa ahụ. Ha mechara na-enyere ndị Livaị aka n’ọrụ ha.—Ezra 8:20.

68:30—Gịnị ka arịrịọ ahụ bụ́ “basiere anụ ọhịa nke amị mba ike” pụtara? N’ịkọwa ndị iro nke ndị ohu Jehova n’ụzọ ihe atụ dị ka anụ ọhịa, Devid gwara Chineke ka ọ basiere ha mba ike ma ọ bụ ka Jehova chịkwaa ike ha.

69:23—Gịnị ka ‘ime ka úkwù onye iro na-ama jijiji’ pụtara? Uru ahụ́ ndị dị gburugburu úkwù dị oké mkpa iji rụọ ọrụ ndị siri ike, dị ka ibuli ihe na iburu ibu ndị dị arụ. Ọ bụrụ na úkwù mmadụ ana-ama jijiji, nke ahụ na-egosi na ike adịghị onye ahụ n’ahụ́. Devid kpere ekpere ka a napụ ndị iro ya ike ha.

Ihe Ndị Anyị Na-amụta na Ya:

51:1-4, 17. Ime mmehie ekwesịghị imebi mmekọrịta anyị na Jehova Chineke. Ọ bụrụ na anyị echegharịa, anyị pụrụ inwe obi ike na ọ ga-emere anyị ebere.

51:5, 7-10. Ọ bụrụ na anyị emee mmehie, anyị pụrụ ịrịọ Jehova ka ọ gbaghara anyị mmehie anyị mere n’ihi mmehie anyị ketara eketa. Anyị kwesịkwara ịgwa Jehova n’ekpere ka o mee ka anyị dị ọcha, ka ọ nabataghachi anyị, ka o nyere anyị aka iwepụ ọchịchọ ime mmehie n’obi anyị, nakwa ka o nye anyị mmụọ nke ga-eme ka anyị nọgide na-eme ezi ihe.

51:18. Mmehie ndị Devid mere tinyere obodo ahụ dum n’ihe ize ndụ. Ya mere, o kpere ekpere ka Chineke gosi Zaịọn ihu ọma. Mgbe anyị mere mmehie dị oké njọ, ọ na-ewetakarịrị aha Jehova na ọgbakọ nkọcha. Ọ dị mkpa ka anyị kpee ekpere ka Chineke mezie ihe mmehie anyị pụrụ ịkpatawo.

52:8. Anyị pụrụ ịdị “ka osisi oliv nwere akwụkwọ ndụ n’ụlọ Chineke”—nọrọ Jehova nso ma na-amị mkpụrụ n’ozi ya—site n’irubere ya isi nakwa site n’iji ọchịchọ obi na-anakwere ịdọ aka ná ntị ya.— Ndị Hibru 12:5, 6.

55:4, 5, 12-14, 16-18. Devid nwere nnọọ mwute n’ihi izu nwa ya bụ́ Absalọm gbara megide ya nakwa n’ihi nrara onye ndụmọdụ ọ tụkwasịrị obi bụ́ Ahitofel raara ya nye. Otú ọ dị, nke ahụ emeghị ka Devid kwụsị inwe obi ike n’ebe Jehova nọ. Anyị ekwesịghị ikwe ka mwute mee ka anyị kwụsị inwe obi ike n’ebe Chineke nọ.

55:22. Olee otú anyị si atụkwasị Jehova ibu anyị? Anyị na-eme nke a (1) site n’ịgwa ya mkpa anyị n’ekpere, (2) site n’ịdabere n’Okwu ya na ná nzukọ ya maka nduzi na nkwado, nakwa (3) site n’ime ihe ọ bụla anyị nwere ike ime iji belata nsogbu ahụ.—Ilu 3:5, 6; 11:14; 15:22; Ndị Filipaị 4:6, 7.

56:8. Jehova maara ọnọdụ anyị, marakwa otú ọnọdụ ahụ si emetụta anyị.

62:11. Ọ dịghị Chineke mkpa ịdabere n’ihe ọ bụla ọzọ maka ike. Ike nile sitere n’aka ya. ‘Ike nile bụ nke ya.’

63:3. ‘Ebere Chineke dị mma karị ndụ’ n’ihi na e wezụga ya, ndụ anyị enweghị nzube. Ọ bụ ihe amamihe dị na ya anyị ịbụ ndị enyi Jehova.

63:6. Abalị pụrụ ịbụ nnọọ oge kwesịrị ekwesị iji tụgharịa uche n’ihi na ebe nile na-adị jụụ, adịghịkwa enwe ihe ndọpụ uche.

64:2-4. Asịrị na-emebi ihe pụrụ imebi aha ọma nke onye aka ya dị ọcha. Anyị ekwesịghịdị ige ntị n’asịrị dị otú a ma ọ bụ soro na-agba ya.

69:4. Iji mee ka udo dịrị, ọ pụrụ ịbụ ihe amamihe dị na ya anyị “inyeghachi” ihe site n’ịrịọ mgbaghara mgbe ụfọdụ, ma ọ bụrụgodị na anyị echeghị na ọ bụ anyị mejọrọ.

70:1-5. Jehova na-anụ arịrịọ anyị na-arịọ ka ọ gbatara anyị ọsọ enyemaka ngwa ngwa. (1 Ndị Tesalonaịka 5:17; Jems 1:13; 2 Pita 2:9) Chineke nwere ike ikwe ka ọnwụnwa bịaara anyị dịgide, ma ọ ga-enye anyị amamihe na ume iji nagide ma die ọnọdụ ahụ. Ọ gaghị ekwe ka a nwaa anyị karịa ka anyị pụrụ ịnagide.—1 Ndị Kọrint 10:13; Ndị Hibru 10:36; Jems 1:5-8.

71:5, 17. Devid zụlitere obi ike na ume site n’ịdabere n’ebe Jehova nọ mgbe ọ ka na-eto eto—ọbụna tupu ya alụso dike ndị Filistia bụ́ Golaịat ọgụ. (1 Samuel 17:34-37) Ndị na-eto eto kwesịrị ịdabere na Jehova n’ihe ọ bụla ha na-eme.

“Ka Ụwa Nile Jupụtakwa ná Nsọpụrụ Ya”

Abụ ikpeazụ nke nkebi nke abụọ nke abụ ọma, Abụ Ọma nke 72, bụ banyere ọchịchị Solomọn, bụ́ nke na-egosi ọnọdụ a ga-enwe n’oge ọchịchị Mezaịa. Lee nnọọ ọnọdụ na-enye obi ụtọ a kọwara n’ebe ahụ—a ga-enwe udo n’ụba, mmegbu na ime ihe ike ga-akwụsị, ọtụtụ ọka ga-adị n’elu ala! Ànyị ga-eso ná ndị ga-erite uru ná ngọzi ndị a nakwa ngọzi ndị ọzọ Alaeze ahụ ga-eweta? Anyị pụrụ iso ma ọ bụrụ na anyị dị njikere ichere Jehova, mee ya ebe mgbaba anyị na ike anyị dị ka ọbụ abụ ahụ mere.

‘Ekpere nke Devid ji okwu ndị a mechie’: “Onye a gọziri agọzi ka Jehova, bụ́ Chineke, bụ, bụ́ Chineke nke Izrel, Onye nanị Ya na-arụ oké ọrụ dị iche iche: ihe a gọziri agọzi ka aha nsọpụrụ Ya bụkwa ruo mgbe ebighị ebi; ka ụwa nile jupụtakwa ná nsọpụrụ Ya. Amen, na Amen.” (Abụ Ọma 72:18-20) N’otu aka ahụ, ka anyị jiri obi anyị nile na-agọzi Jehova ma na-eto aha ya dị ebube.

[Foto dị na peeji nke 9]

Ị̀ maara onye “ada eze” nọchiri anya ya?

[Foto dị na peeji nke 10, 11]

Ị̀ maara ihe mere e ji kpọọ Jeruselem “ebe mazuru mma”?